You dont have javascript enabled! Please enable it! Abu Anglican (Igbo Hymn) Abu 101 - 150 - 9JAINFORMED

Abu Anglican (Igbo Hymn) Abu 101 – 150

Search Contents

Igbo hymn known as Abu or Ekpere Na Abu (Ancient and Modern) is one of the Anglican Communion heritages. It is composed and compiled for spiritual worship in the church and for personal devotion. We have made it easier here. You can now surf for your Anglican Igbo hymn from 1 to 400.

Click here for your:

Abu 1 to 50

ABU 51 to 100

ABU 151 to 200

ABU 201 to 300

ABU 301 to 400

Please, look for the hymn number you are looking for on the table of content below. Click on it for easy navigation.

Abu Anglican (Igbo Hymn) Abu 101 – 150



 

Lord, dismiss us with Thy blessing

Abu 101- Nna were ngọzi-I zilag’ayi.

 

Verse 1

Nna were ngọzi-I zilag’ayi,

Mejue ayi n’onu n’udo;

K’ayi nile nwe ihu-n’anya-I,

Naṅuri na nzọputa-I.

Nagb’ayi ume,

Nd’ije n’ohia uwa nka.

 

Verse 2

N’ihi olu Ozi-ọma

Ayi nekele, neto Gi;

K’amia nkpuru nzọputa-Gi

Nim’obi-ayi na ndu-ayi.

Ka iru-Gi

Nonyere ayi mgbe nile

 

Verse 3

Mgb’aganu olu nke opi,

Ayi gesi n’uwa bilie;

Were nku m’ozi la n’igwé,

Neji onu za oku.

Mgb’ebigh-ebi

K’ayi na Kraist buko Eze. Amen.

 

 

Come, Holy Ghost, descend from high

Abu 102- Mọ Nsọ, si n’elu ridata.

 

Verse 1

Mọ Nsọ, si n’elu ridata,

Gi onye nasach’obi-ayi;

Ka akara nke amara,

Ji miri nkagb’ama ugbu a.

 

Verse 2

Wusa ike-I ka Chineke,

Fesa obara nke Jisus;

Ka Nna, n’Ọkpara, na Mọ Nsọ

Do umu Ndia umu Chuku. Amen.

 

 

BAPTISM

 

O God, our strength, our hope,our rock.

Abu 103- Chuku, Ike n’Olil’any’ayi


 

Verse 1

Chuku, Ike n’Olil’any’ayi,

Onye nkwa-I adigh-ada,

Nar’umu ndia mgb’ebigh-ebi

N’otu nd’I j’obara gba.

 

Verse 2

Ayi ewer’Ah’ato-nsọ-Gi

Ka h’akara na miri;

Nario I k’I nye ha onodu

N’etiti umu nke-Gi.

 

Verse 3

Ayi kara obe-I n’iru-ha,

Ih’ama nk’ahuhu-Gi;

Ka nkwa ha kwer’ugbu a buru

Nkwuputa ndu-ha nile.

 

Verse 4

Ekwela, Nna, ka ndu n’onwu

Kewapu ha n’eb’I no;

Ka ha kwesi ntukwas’obi,

Buru nke-I mgb’ebigh-ebi. Amen.

 

 

Jesus, we lift our souls to Thee

Abu 104- Jisus, ayi cher’obi’ayi n’iru I.

 

Verse 1

Jisus, ayi cher’obi’ayi n’iru I,

Kunyer’ayi No Nsọ-Gi;

K’eme umu-nta ndia baptism

B anime onwu-Gi.

 

Verse 2

Nye obi-ha amara-Gi,

Te manu nke-Gi;

Udi-Gi n’aha-Gi di nsọ

De nim’obi-nro-ha.

 

Verse 3

K’ewer’ez’okwu ke n’ukwu

Ndi-oru ọma ndia;

Ka ha ket’ihu-n’anya-Gi,

Buru ndi neso Gi.

 

Verse 4

Kraist, kuny’ayi nile n’onwu-Gi,

Ayi we gosi ndu-Gi

Ndi-nketa nk’obe-Gi n’uwa,

Nk’okpu-eze-I n’igwé. Amen.

 

 

Stand, soldier of the cross

Abu 105- Gi ony’ogu obe.

 

Verse 1

Gi ony’ogu obe,

Guzọ, kwe nkwa nke-gi,

Na I gag’uwa n’ih’efu

N’ihi aha Jisus.

 

Verse 2

Bilie, k’eme I baptism,

Sachapu nmehie-gi;

Gin a Chineke gba ndu ta,

Kwuput’okwukwe-gi.

 

Verse 3

El’igwé bu nke-gi,

Ọ bu Kraist nwere gi;

Aha-gi na nke ndi nsọ dum

K’edekoro n’otu.

 

Verse 4

Yir’ih’agha Chuku,

Guzọgid’Ekwensu;

Ogu ahu gesi ike,

Ma nmeri gabu nk’ayi.

 

Verse 5

Okpu-nmeri genwu,

Ab’onu di utọ,

Mgb’okwukwe gatogb’olu-Ya

N’ukwu nk’onye-nwe-ayi. Amen.


 

In token thou shall not fear.

Abu 106- K ‘I ghar’ it’ ujo ib’ onye.

 

Verse 1

K ‘I ghar’ it’ ujo ib’ onye

Nke Kraist akpogburu,

Ayi aka obe- Ya n’iru-i

Me gi nani nke-Ya.

 

Verse 2

K’ihere ghara ime gi

Ito aha nsọ-Ya,

Ayi me K’aput’ihe n’iru-i

Nleda n’otuto-Ya.

 

Verse 3

K’I ghar’ilaghachi azu

N’iluru Kraist ogu

N’okpuru okoloto -Ya

Jis’ike ka nwoke.

 

Verse 4

K’I mara na I ghagh iso

Uzo nk’Ọ gafere,

Buru obe, lel’ihere.

Nodu ala n’igwé.

 

Verse 5

Ayi si otu a n’iru ora

Ka gi nke- Ya n’ezie;

K’iru nke nebu obe- Ya

Keta okp’eze- Ya!

 

 

God of that glorious gift of grace.

Abu 107- Chuku nk’onyinye otuto.

 

Verse 1

Chuku nk’onyinye otuto-

Amara ayi ji nacho Gi;

Mgb’ayi putur’ihe n’iru Gi,

Ny’yi okwukwe k’ayi norue nsọ.

 

Verse 2

Natukwas’obi n’ez’okwu-I,

Ayi togbo aku nk’I nyere

N’ebe a n’ir’och’eze Jisus,

K’I zulite ya n’ih’igwé.

 

Verse 3

Gi were ya nye ayi nwa mgbe,

Ayi nyeghachi y’ebigh-ebi,

Namata na mgb’o diri I ndu,

Ayi, bu ndi nyere, nwe ngọzi.

 

Verse 4

Ngozi ukwu, nke bar’uba

Dik’ekper’ayi, di n’isi-ya;

Zowusa obi-y’amara

K’ayi nefesa ya miri nka.

 

Verse 5

Me ya nwa-Gi, chebe kwa ya

Onye nes’uzọ Onye-nw’ayi,

Ony’amara n’ihu-n’anya,

Onye nketa al’ez’igwé. Amen.

 

 

Father, our children keep.

Abu 108- Nna, chebe umu-ayi.

 

Verse 1

Nna, chebe umu-ayi;

Ayi amagh ihe nke nabia n’uwa;

N’okpuru ndo nku el’igwé nke-Gi

Debe ha: Gi onye nyere ha ndu.

 

Verse 2

Nna, biarute ayi nsọ;

K’aka-nchegide-Gi di n’isi-ayi;

Makua umu-ayi nsọ n’akuku-Gi,

Ha we di n’udo n’oge og’uwa.

 

Verse 3

Zo ha n’im’ulo-Gi;

Zo ha, debe kwa ha n’idi-ọcha,

Mgbe njọ na nchehie bar-uba n’uwa;

Mgb’Ekwensu nanwa, n’agu-njọ nadi.

 

Verse 4

Nedebe ha na nsọ,

Nemwegh ntupo nim’onwunwa nk’uwa;

Ka ha we soro ayi n’uwe ọcha,

Ba nim’on’uzọ igwé na nmeri. Amen.


 

 

O Jesus, I have promised.

Abu 109- Jisus, ekwerewom nkwa

 

Verse 1

Jisus, ekwerewom nkwa

Ife I rue ogwugwu;

Biko, no nsọm mgbe nile,

Onye-nwem n’Enyi nkem.

 

M’gagh-atu egwu agha

M’I nodu n’akukum;

M’gagh-ejehie n’uzọ-Gi

M’I buru Onye-ndum.

 

Verse 2

Ka m’mata na Gi no nsọm,

Uwa no nsọm mgbe dum;

M’nahu ih’isu-ngongo,

M’nanu ol’onwunwa.

 

Nd’irom no nsọm mgbe nile,

No nimem, n’akukum;

Ma Jisus, bia nsọm kari,

Gbopur’obim nmehie.

 

Verse 3

Biko, ka m’nuru okwu-I,

Olu d’ezie nwayọ,

Nke kar’olu agu-njọ,

N’olu nnupu-isim.

 

Kwue k’I we kasiem obi,

Gbam ume, jidekwam;

Biko, kwue, me ka m’ge nti,

Gi Onye-nche obim.

 

Verse 4

Jisus, Gi kwere nkwa nye

Ndi nile neso Gi,

N’ebe I no n’otuto,

Eb’ahu ndi-Igano.

 

Jisus, ekwerewom nkwa

Ife I rue ogwugwu;

Nyem amra ka m’neso

Onye-nwem n’Eyi nkem.

 

Verse 5

Biko, ka m’hu nzo-ukwu-I,

Zonye nkem nime ha;

Olil’anya na m’geso

Bu nani n’ike-Gi.

 

Biko, kpom, dorom, nedum,

Nejidemmgbe nile;

Kpobatakwam n’el’igwé,

Onye-nzọtam n’Enyim .Amen.

 

 

Jesus, I my cross have taken.

Abu 110- Jisus, eburuwom obem.

 

Verse 1

Jisus, eburuwom obem

Irap’uwa sobe Gi;

Ogbnye eledar’anya,

I gabu ihem nile.

 

K’ihe m’ler’anya la n’iyi,

Ihe m’choro, nke m’mara !

Le k’onodum si di elu,

Chineke n’igwé bu nkem !

 

Verse 2

Madu gesogbum, kpagbukwam,

Ogeme ka m’gbakute I;

Onwunwa-ndu gabikwasim,

igwé gwet’iz’ike.

 

Ahuhu agah-ewutam

Mgbe ihu-n’anya-I bu nkem;

Onu agah-atom utọ,

Nke nesitegh n’aka-Gi.

 

Verse 3

Nara nzọputa-I, nkpur’obim;

Merie nmehie na nchegbu;

Nuria, n’onodu o bula

I gachot’olu di nkpa !

 

Cheta Mọ Nsọ bi nime gi,

Chet’ihu-n’anya nke Nna;

Chet’Onye-nzota nke nwuru:

Nwa nk’igwé, atamula !

 

Verse 4

Si ‘amara ba n’otuto,

Jid’okwukwe n’ekpere;

Ndu ebigh-ebi di n’iru,

Chineke geduzi gi.

 

Ozi-gi n’uwa gebi ngwa,

Ubochi ije-I gagwu;

Olil’anya nenwe nmezu,

Ekpere gagh’otuto. Amen.

 

 

 

My God, accept my heart this day.

Abu 111- Chukum, nara nkpur’obim ta.

 

Verse 1

Chukum, nara nkpur’obim ta,

K’Ọ buru nke-I mgbe dum;

Ka m’ghar’irapu Gi kpafue,

Ghar’idaghach’azu.

 

Verse 2

N’iru obe nk’Onye nwuru,

Le, ka m’gbur’ikpere;

Kwe k’akpogbue nmehie nile,

Ka Kraist bur’ihe dum.

 

Verse 3

Tem manu amara nk’igwé,

Me kwa ka m’buru nke-I;

Ka m’hu iru otuto-Gi,

Fe Gi n’och’eze-Gi.

 

Verse 4

K’echiche, n’olu n’okwu dum

Buru nke-Gi mgbe dum;

Jisus, ka m’were ndum fe Gi;

Onwu gab’uz’igwé ! Amen.

 

INYE IKE

Abu 112- Nke-I mgbe dum! Chuku ọma.

Thine for ever! God of love.

 

Verse 1

Nke-I mgbe dum! Chuku ọma,

Si n’igwé nur’olu-ayi;

K’ayi buru nke-Gi mgbe dum,

Ugbu a na mgb’ebigh-ebi.

 

Verse 2

Nke-I mgbe dum ! Onye-nwe ndu,

Cheb’ayi n’ogu nk’uwa nka;

Gi b’uzọ, Ndu, n’Ezi’okwu:

Dur’ayi la n’ala ihe.

 

Verse 3

Nke-I mgbe dum ! ha di ngọzi,

Ndi nwer’iz’ike na Gi;

Onye-nzọtam n’Onye-nchem,

Lur’ayi ogu mgbe nile.

 

Verse 4

Nke-I mgbe dum ! Jisus, cheb’ayi,

B’umu-aturu nke-Gi;

Ayi di ndu nani na Gi,

K’ayi keta ih’ọma-Gi.

 

Verse 5

Nke-I mgbe dum ! Onye-ndu-ayi,

Nkp’ayi nile ka Gi negbo;

I gagbahara njọ-ayi,

Si n’uwa dul’ayi n’igwé. Amen.


 

 

ORIRI NSỌ

Abu 113- Jisus, Gi onu nke obi.

Jesus, Thou love of loving hearts.

 

Verse 1

Jisus, Gi onu nke obi,

Iyi nke ndu, Ihe madu;

Site n’onu nile nk’uwa

Ayi biakute I ozo n’agu.

 

Verse 2

Ezi’okwu-Gi enwegh ngbanwe,

I nazo ndi nakpoku Gi;

I diri ndi nacho Gin ma,

Ndi chotara Gi-ihe dum !

 

Verse 3

Ayi neri Gi, Nri nenye ndu,

Nacho k’ayi neri Gi mgbe dum;

Ayi nanu Gi, Isi-iyi,

Nacho k’I mejue obi-ayi.

 

Verse 4

Obi-nchegbu-ayi nacho Gi

N’ebe nile ayi no n’uwa;

Ayi naṅuri n’iru-ọma-I,

Ayi nwe ngọzi m’ayi kwes’ike.

 

Verse 5

Jisus, noyer’ayi mgbe nile,

Me k’ubọchi-ayi dum di nma;

Chupu ochichiri nke njọ,

Me k’ihe nsọ-Gi nwue n’uwa. Amen.

 

Abu 114- Ugbu a, Nna , necheta ihu-n’anya.

And now, Ọ Father, mindful of the love.

 

Verse 1

Ugbu a, Nna , necheta ihu-n’anya

Nke gbatar’ayi n’obe nke Kalvari;

Eb’Onye narior’ayi nanonyer’ayi,

 

Ayi nagbasa, niche kwa n’iru Gi

Aj’ahu zur’oke n’anya nke-Gi,

Ezi aja nadigide mgbe dum.

 

Verse 2

Nna, le iru-Ya etere manu,

Le kw’ayi dika nd’ahuru nime Ya;

Elekwala nleli amara-Gi,

 

Ekpere n’okwukwe-ayi jur’oyi:

N’etiti nmehie-ayi n’ugw’olu-ha

Ayi debere ahuhu nk’Onye-nw’ayi.

 

Verse 3

N’ihi ndi nile ayi huru n’anya,

Site na Nnonye uku k’ayi nario:

Makuaha nsọ n’obi-ebere-Gi,

 

Me k’ike-I ra n’ihi nkpur’obi-ha;

Site na ntupo njọ debe h’ọcha,

Werike nmeri kpukwas’onyinye-I.

 

Verse 4

Ayi abia; dorue ayi nsọ n’ukwu-Gi,

Onye-nzọputa nahu ayi n’anya;

Site na nri utọ nka di egwu

 

Doput’ayi na nmetu-aka njọ dum;

Me k’ayi nwe onu n’ije-ozi-Gi,

Ghar’ikewapu na Gi mgb’o bula. Amen.

 

Abu 115- Jehova bu onye nazum.

The King of love my Shepherd is.

 

Verse 1

Jehova bu onye nazum,

Obi’ọma-Y’adigh-ebi;

Ọ digh ihe korom uko,

Abum nke-Ya mgbe nile.

 

Verse 2

Ebe miri nke ndu neru

K’Ọ nedu nkpur’obim;

N’ebe ahihia ndu neto

K’Ọ jinri nk’igwé nazum.

 

Verse 3

Akpafurum n’uzọ nke-Ya,

Ọ chorom n’ihu-n’anya;

Ọ tukwasirim n’ubu-Ya,

Wer’ok’onu bulagam.

 

Verse 4

N’onyiny’onwu atughm egwu,

N’ihi na Gi nonyerem;

Nkpa-n’aka-I nakasim obi,

Obe-Gi n’irum nedum.

 

Verse 5

N’iru nd’irom K’I nenyem nri,

Tekwam manu amara;

Onu kachasi onu dum

Si n’iko-I rudataram.

 

Verse 6

E, idi-nma n’ebere-Gi

Gagbasom na ndum nile;

Ez’Onye-nche, ka m’neto Gi

Nim’ulo-I mgb’ebigh-ebi. Amen.


 

Abu 116- Jisus, dik’Okwu-Gi si di.

According to Thy glorious word.

 

Verse 1

Jisus, dik’Okwu-Gi si di,

N’obi ume-ala,

Nka ka m’geme, Onye nwuru,

Agamecheta Gi.

 

Verse 2

Aru-Gi anyawara nyem,

Gabu nrim si n’igwé;

Agamanu n’iko ngọzi-I,

Were ya cheta Gi.

 

Verse 3

M’ganechefu Getsemane?

M’gahu igba-ngba-Gi,

N’osus’obara n’ahuhu-I,

Ghara icheta Gi?

 

Verse 4

Mgbe m’chere iru n’obe-Gi,

Lekwasi Kalvari:

Nw’aturu Chuku, Aja nkem,

Aghaghm-icheta Gi;

 

Verse 5

Cheta Gi, n’ihe-ngbu-Gi dum,

N’ihu-n’anya-I n’arum;

Ebe ume-ndu fọduru,

Agamecheta Gi.

 

Verse 6

Ma mgbe onum kpuchitara,

M’akpa-uchem lara,

Mgbe I gabia n’al’eze-Gi,

Jisus, biko, chetam. Amen.

 

Abu 117- Bia n’okukwe nar’aru Onye-nwe-I.

Draw nigh and take the Body of the Lord.

 

Verse 1

Bia n’okukwe nar’aru Onye-nwe-I,

Nua obara-nsọ-Ya nk’Ọ wusiri.

 

Verse 2

Aru n’obara-Ya zọputar’ayi,

Obi di ndu k’ayi ji kele Chuku.

 

Verse 3

Kraist, Nwa Chineke, Onye-nzọputa,

Site n’onwu-Ya n’obe nwe nmeri.

 

Verse 4

Achuru Ya n’ihi madu nile,

Ya b’Onye-nchu-aja, n’anu aja.

 

Verse 5

Iw’ochie ji anu achu aja,

Nenomi ihe-omimi nk’igwé.

 

Verse 6

Jisus, Onye-ngbaputa na ihe,

Ji amara nyere ndi nsọ aka.

 

Verse 7

Werenu obi ezi-okwu bia,

Nar’ihe-mbe nke nzọputa n’ebe a.

 

Verse 8

Onye nechebe ndi nsọ-Ya n’uwa,

Nenye ndi kwere ndu ebigh-ebi.

 

Verse 9

Nri nk’igwé k’Ọ nenyejundi-agu,

Nye obi nke nachomiri nke ndu.

 

Verse 10

Ony’ikpe uwa, Onye-nzọput’ayi,

N’oriri ihu-n’anya-I nonyer’ayi ! Amen.

 

Abu 118- Chukum, I dozir’oriri.

My God, and is Thy table spread?

 

Verse 1

Chukum, I dozir’oriri,

Ya na iko ihu-n’anya?

Duta umu-Gi dum n’ebe a,

Ka ha mar autọ nke-Gi.

 

Verse 2

Oriri Nsọ Jisus doro,

Aru na Obara nke-Ya !

Ọ nwer’onu, b’onye nara

Manya nsọ nka na Nri nk’igwé.

 

Verse 3

N’ihi gini k’edoziri

Ezi oriri nka n’efu?

Jisus anwugh n’ihi unu,

Enyegh unu nri umu-nta?

 

Verse 4

Me k’asopuru Oriri-I,

Ka ndi nile akporo bia;

Ka madu dum hu nzọputa,

Ndi nara ihe-mbe n’ebe a.

 

Verse 5

Ka madu nile jikere,

Wer’obi nanu oku bia;

Mgbe ayi gesi n ebe a bilie,

K’ayi were onu n’uru la !

Amen.

 

Abu 119- Ekwesighm, Onye-nw’ayi di nsọ.

I am not worthy, holy Lord.

 

Verse 1

Ekwesighm, Onye-nw’ayi di nsọ,

Ka I gabiakutem;

Kwue otu okwu amara,

Ọ gatop’agbu njọ.

 

Verse 2

Ekwesighm; ime nkpur’obim

Jur’oyi, di n’efu;

I gesi ana bata n’ebe a?

Kwue okwu ka m’di ndu !

 

Verse 3

Ekwesighm; ma Chineke nkem,

M’gesi ana ju Gi?

Gi nyere aru n’obara-I

Ikw’ugwo ngbaputam.

 

Verse 4

Biko, bia n’oge utọ nka,

Were Nri nsọ nazum;

Me k’ike n’ihu-n’anya-Gi

Ju obim joro njọ. Amen.


 

Abu 120- N’abal’ahu k’arara Ya.

‘Twas on that night when doomed to know.

 

Verse 1

N’abal’ahu k’arara Ya

Nye n’aka iwe nd’iro dum,

Ka Onye-nzọputa uwa

Ji nara ogbe achicha.

 

Verse 2

Mgb’Ọ nyesiri Ya ekele,

Bu Onye nwe uwa n’igwé.

Ọ nyaw’ih’atu nk’aru-Ya,

Nye ndi nes’uzọ-Ya, nasi:-

 

Verse 3

“Arum nke anyawara nye

N’ih’unu, nara, rie, di ndu:

Mgbe nile unu geme ya,

Necheta ihu-n’anya nkem.”

 

Verse 4

Ọ nara iko n’aka-Ya,

Nye Chuku otuto ozo;

K’omiko nenwu n’obi-Ya,

Nzọputa si n’onwu-Ya bia.

 

Verse 5

“Obara nkem k’awusiri

K’o sacha obi nke nmehie;

Ogbugba-ndu nka gosiri

Amar’ebigh-ebi nk’igwé.

 

Verse 6

Ihu-n’anya jur’iko nka,

K’ora nua manya nsọ ahu;

Nanunu ya n’ogbo nile,

Necheta oge onwu nkem.” Amen.

 

Abu 121- Jisus, dut’ayi n’oriri-I.

Jesus, to Thy table led.

 

Verse 1

Jisus, dut’ayi n’oriri-I,

Wer’ezi nri nenye ndu

Nazu nkpur’obi nile.

 

Verse 2

Mgb’ayi gbur’ikpere nwayọ,

Me k’ayi mar’ir’utọ-Gi,

Gosi ayi ihu-n’anya.

 

Verse 3

Mgb’ayi nelekwas’obe-Gi,

Nakwar’uzọ-nmehie-ayi,

Me k’uju-ayi gho onu.

 

Verse 4

Mgb’ayi nanu manya di nsọ,

Ih’ama nk’obara-Gi,

Nye ayi ihu-n’anya-Gi.

 

Verse 5

Dor’ayi bia n’akuku-Gi

Miri-ngwopu si eru,

Zobe nmehi’ayi n’eb’ahu.

 

Verse 6

Topu ayi n’agbu nke njọ,

K’okwukwe-nt’ayi ba uba,

Nwat’ru Chuku, ny’ayi udo.

 

Verse 7

Wer’aka-I amapuru

Dur’ayi ga n’ir’och’eze-I,

N’ala ihe nke ka nma. Amen.


 

Abu 122- Nri nenye ndu nagum.

I hunger and I thirst.

 

Verse 1

Nri nenye ndu nagum,

Jisus, burum manna;

Miri ndu, waputa

Na nkume ka m’we nua.

 

Verse 2

Achich’anyawara,

Gi gbo nkpa ndum nile;

K’esi azu obi

Nazum, ka m’ghar’inwu.

 

Verse 3

Gi, osisi nke ndu,

Ka m’mara utọ-Gi;

Kenyem ohu na ndu-I,

K”ihu-n’anya j’obim.

 

Verse 4

Uzo njọ m’gafere

Site namgb’amurum;

Nazum, Nri Chineke:

Nye’ak, Nwa nke madu.

 

Verse 5

N’ihi na ozara

Di n’iru n’uzọ nkem;

Miri ndu, waputa

Nimem mgb’ebigh-ebi.

Amen.

 

Abu 123- “Rue mgb’Ọ gabia!”-K’okwu nka.

Till He come- Ọ, let the word.

 

Verse 1

“Rue mgb’Ọ gabia!”-K’okwu nka

Nodu nim’obi nile;

K’ayi wer’ihe-Ya nahu

Na nw’oge nta fọduru;

K’ayi cheta na el’igwé

Nechere “Rue mgb’Ọ gabi.”

 

Verse 2

Mgbe ndi-ayi ike gwuru

Bara n’iz’ike n’elu,

Ayi neche n’uwa b’efu,

Onu nke ndu nagafe?

Ka ntamu nile dajua,

Nka gagwusi “Mgb’Ọ gabia.”

 

Verse 3

Og’uwa nemegid’ayi,

Nsọgbu-ayi dikar’ukwu?

Ihe-ogbugba nk’obe,

Ihe si n’uwa b’efu,

Onwu, n’ili, n’ochichi,

Kwue nwayọ “Rue mgb’Ọ gabia.”

 

Verse 4

Le, iror’ihu-n’anya;

Nua manya, nyaw’achicha;

Ihe-ncheta-Onye-nw’ayi

Gakpobat’ayi n’el’igwé;

Ndi si n’uwa, n’otuto,

Kewara “Rue mgb’Ọ gabia.” Amen.


 

ORIRI NSỌ

Abu 124- Icheta ihu-n’anya Kraist.

In memory of the saviour’s love.

 

Verse 1

Icheta ihu-n’anya Kraist,

Ayi nwer’oriri nsọ,

Ebe obi di um’ala

Nwere nkpobata-ya.

 

Verse 2

N’okwukwe ayi ji nri nke ndu

Nazu nkpur’obi-ayi;

Iko negosi obara

Nk’awusiri ayi.

 

Verse 3

Ebube nk’ihu-n’anya-Ya

Bu abu-ayi ugbu a;

N’okwukwe k’ayi nele anya

Oriri nk’el’igwé. Amen.

 

 

ORIRI NSỌ

Abu 125- Bia, Mọ Nsọ, Kwalie obi ayi.

Come, Holy Ghost, our spirit inspire.

 

Verse 1

Bia, Mọ Nsọ, Kwalie obi ayi

Muye oku nk’elu igwé

Gi bu Mọ nke nete manu

Nke nenye onyinye asa;

Otite manu- I di ngọzi

Bu nkasi, ndu, n’ihu n’anya.

 

Verse 2

 

Wer’ih ebigh-ebi yere

Any’ayi kpuru isi aka;

Wer’uba’ amara-Gi te

Iru-ayi nke ruru inyi

Chua nd’iro-ayi, zite udo;

Eb’I nedu, egwu adigh.

 

Verse 3

 

Me k’ayi mara na Gi, na Nna,

Na Nwa bu otu Chineke

Ka nka we buru abu-ayi

Rue mgbe nile ebigh-ebi

Otutọ diri olu-Gi,

Nna, na Ọkpara, na Mọ Nsọ. Amen

 

 

IDO NDỊ OZI NSỌ

Abu 126- Chineke, wusa Mọ Nsọ-Gi.

Pour out Thy Spirit from on high.

 

Verse 1

Chineke, wusa Mọ Nsọ-Gi,

Gozie ndi-oru-Gi n’ebe a;

Nye ha onyinye n’amara,

Ka nd’uko-I yir’ez’omume.

 

Verse 2

Mgbe ha neguzọ n’ulo nsọ-I

Izi ezi okwu k’I si zi,

Jisus, ka ndi-m’ozi-zi nenwu

Dika kpakpando n’aka-Gi.

 

Verse 3

Nye h’amam-ihe n’okwukwe,

Obi-um’ala n’id’ike,

Ka ha nenwe ndi nke-I n’obi,

Hu ha n’anya dik’I si hu.

 

Verse 4

Neche, nekpe, ghar’ida mba

Ehiehie n’abali nile;

Nado ndi-njọ aka na nti,

Nazu umu-aturu-Gi.

 

Verse 5

Ka mgb’olu-ha gagwu n’uwa,

Ha wer’olil’anya lubie;

Mgbe Ony’isi-nche-ayi gabia

Kwe k’ayi nah u buru ndi nke-I. Amen.


 

Abu 127- Chineke, wedat’onwe-Gi.

Bow down Thine ear, Almighty Lord.

 

Verse 1

Chineke, wedat’onwe-Gi,

Nuru ekpere Nzuko-Gi,

N’ihi ndi gekwus’okwu-Gi,

Ndi jikere ije ozi-I.

 

Verse 2

Nna, were ebere-I kunye

Ume ndu Mọ Naso-Gi n’aru

Ndi akpor’izu aturu

Nke Kraist ji onwu-Ya gbata.

 

Verse 3

Kraist, si n’aka-I amapuru,

Wukwasi ha onyi-Gi;

Ka ndi guzọro n’iru Gi

Neme uche-I n’ihu-n’anya.

 

Verse 4

Mọ di ngọzi, binyere ha,

Nye amara ikp’ekpere;

K’ebe ha nedu aturu-I,

Ha we naga n’uzọ di nkpa.

 

Verse 5

Chuku, zitere ha ike-I,

Chebe ha ka ha pua na njọ;

Ka ha nogide nime Gi,

Nat’okpu nke ndu m’emesia. Amen.

Abu 128- Were ndum, Nna, k’o buru.

Take my Life and let it be.

 

Verse 1

Were ndum, Nna, k’o buru

Ih’edoro nsọ nye Gi;

Were ubochim nile,

Ka ha neru n’otuto.

 

Verse 2

Wer’akam ka ha neme

K’ihu-n’anya-Gi si cho;

Were ukwum, me ka ha

Di nfe n’ije-ozi-Gi.

 

Verse 3

Were olum, ka m’nabu

Abu nye nani Ezem;

Were irem, me k’o jue

N’ozi ọma si na Gi.

 

Verse 4

Were akum na egom,

Ọ nwegh nke gafodurum;

Were uchem n’ikem dum,

Me ka o si di Gi nma.

 

Verse 5

Wer’ochichom, me ya nke-I,

Ọ gagh-abu nkem ozo;

Were obim: Gin we ya,

Ọ gabu och’eze-Gi.

 

Verse 6

Onye-nwem, ihu-n’anyam

Ka m’togboro n’ukwu-Gi;

Wer’onwem, agambu

Nani nke-Gi mgbe nile. Amen.

 

Abu 129- Jisus, gwam okwu, ka m’were.

Lord, speak to me, that I may speak.

 

Verse 1

Jisus, gwam okwu, ka m’were

Olu di ndu kwuputa ya;

Ka m’cho kwa, otu I choro,

Umu-Gi ndi furu efu.

 

Verse 2

Nedum, Jisus, ka m’nedu kwa

Ukwu ndi nke nawaghari;

Nazum, Jisus, ka n’were kwa

Manna zuz ndi agu nagu.

 

Verse 3

Nyem ike’k’ebe m’neguzọ

N’elu Nkume, d’ike na Gi,

M’geseti ak’ihu-n’anya

Nye ndi nagba ngba n’ahuhu.

 

Verse 4

Ziem ihe, Jisus, ka m’zi kwa

Ih’ok’onu I gosiri;

Nye okwum nku ka ha feba

N’ebe-nzuzọ nk’obi nile.

 

Verse 5

Nyem izu ike utọ-Gi.

Ka m’wer’ike nkasi-obi

Kwuru Gi okwu kwesiri

Nye nd’ike gwuru n’oge nkpa.

 

Verse 6

Jisus, mejuem n’ozuzu-Gi,

Rue mgbe obim gejuputa

N’okwu n’echiche nenw’enwu,

Ito Gi, ko ihu-n’anya-I.

 

Verse 7

Werem, Jisus, ma werekwam,

Ka m’nej’ozi-Gi k’I si cho;

Rue mgbe m’gahu iru ngọzi-I,

Ket’iz’ike n’otuto-Gi. Amen.


 

Abu 130- Na nkwere nke zur’oke.

In full and glad surrender.

 

Verse 1

Na nkwere nke zur’oke

Enyekwam Gi onwem;

Abuzum nani nke-Gi

Rue mgbe ebigh-ebi.

 

Verse 2

Ọkpara hurum n’anya,

M’gabu nani nke-Gi;

Ihe m’bu na nke m’nwere

Gabu nke-I sit’ugbu a.

 

Verse 3

Jisus, buru Eze nkem!

K’obim bur’och’eze-I;

Jisus, Onye-nzọputam,

Ọ gabu nani nke-I.

 

Verse 4

Jisus, bia buru Eze,

Bur’eze ihe dum!

Ka m’na Gi nti mgbe nile,

Nefe kwa Gi, Ezem. Amen.

 

 

IDO NDỊ OZI NSỌ

 

Abu 131- Otu m’di ibu nke-I, Onye

Just as I am, Thine own to be.

Verse 1

Otu m’di ibu nke-I, Onye

Hurum n’anya, Eny’umu-nta,

Ka m’do onwem nsọ, ma nye Gi,

Ọ jisus Kraist-Abiam.

 

Verse 2

N’ututu onu nk’ubochim

Ka m’nye Gi ndum, mezu nkwa nkem,

Me ngwa, newezugagh ihe,

Wer’obim nile bia.

 

Verse 3

Agamebi n’ihé mgbe dum,

M’galuru ih’ọma olu,

Were ikem nile fe Gi,

Ya mere ka m’ji bia.

 

Verse 4

Otu m’di, nwata, di ike,

Ibu ezi’onye k’ikem ra,

N’ihi ezi’omume na Gi,

Onye-nwe-ndum-Abiam.

 

Verse 5

N’ihi Gi ka m’luzue olum,

We nata kwa okpu-nmeri,

Bia togbo ya n’ukwu nke-Gi,

Onye-nzọtam-Abiam. Amen.

 

IJIKỌ DI NA NWUNYE

Abu 132- Gi Ihu-n’anya, kachas’uche madu

Ọ perfect Love, all human thought transcending.

 

Verse 1

Gi Ihu-n’anya, kachas’uche madu,

N’ekpere k’ayi nada n’och’eze-Gi,

Ka ha nwe ihu-n’anya nadigide,

Bu ndi I jikọrọ ebigh-ebi.

 

Verse 2

Gi Ndu zur’ezu, nye ha nghota nke-Gi,

Nk’obi-ọma n’okwukwe sir’ike,

Nk’olil’anya, n’ezi nkasi-obi,

Na ntukwasi-obi nenwegh egwu.

 

Verse 3

Nye ha onu neme k’ahuhu di nfe,

N’udo neme k’og’uwa nka dajua;

Nye ubọchi ndu-ha echi mara nma,

Mgbe chi gabo n’ihu-n’anya na ndu.

 

Abu 133- Njiko nke di ngọzi.

Blest be the tie that binds.

 

Verse 1

Njiko nke di ngọzi

N’ihu-n’anya Jisus!

Idi-n’otu nke obi-ayi

Yiri nke di n’elu.

 

Verse 2

N’iruoch’eze Nna

Ayi nekpe ekpere;

Ochich’ayi, nkasi, nkpa, n’egwu,

N’olil’any’ayi b’otu.

 

Verse 3

Ayi nweko ahuhu,

Neburit’ibu-ayi;

Ihe newuta ot’onye

Gewuta ibe-ya.

 

Verse 4

Mgbe nwoke na nwanyi

Nekwe nkwa n’iru nna

Na ha gebi n’ihu-n’anya

Rue mgb’onwu gekewa:

 

Verse 5

Ọ bu nkwa nke di nsọ,

Di kwa ike n’ezie;

Ekwela k’ihe o bula

Me k’i jehie na ya.

 

Verse 6

Tukwasi Kraist obi,

Wepu uche uwa;

Ọ mawo adigh-ike-gi,

Ọ genyere i aka.

 

Verse 7

Mgb’ayi gapu n’ihé-ngbu,

N’olu na nmehie-ayi,

Ayi gebi n’ez’ihu-n’anya

Rue mgbe ebigh-ebi. Amen.


 

Abu 134- Chineke nke ihu-n’anya.

Ọ God of love, to Thee we bow.

 

Verse 1

Chineke nke ihu-n’anya,

Ayi nario n’ihi madu ndia,

Ka ha jiko na nkwa di nsọ,

Buru otu na Gi.

 

Verse 2

Mgb’ubọchi dum juru n’onu,

Mgbe uzọ-ha ma-kwa-ra nma,

Ka ha wer’okwukwe naga,

Buru otu na Gi.

 

Verse 3

Mgbe nsọgbu n’ahuhu biara,

Nma-ha we di ka ihe-njọ,

Ka ha tukwasi Gi obi,

Buru otu na Gi.

 

Verse 4

Ih’o bula gezute ha,

Ok’onu m’obu ich’uche;

N’ike n’amara-Gi ka ha

Buru otu na Gi.

 

Verse 5

Ihu-n’anya, nonyere ha,

Ka ha zoro na Gi mgbe dum;

Eb’onwu apugh ikewa

Nd’I jikọrọ n’otu. Amen.

 

IJIKỌ DI NA NWUNYE

Abu 135- Chuku, Nna, Ony’okike

Ọ Father, all creating.

 

Verse 1

Chuku, Nna, Ony’okike,

Onye j’ihu-n’anya

Jiko ndu abua n’otu

Nim’ogige iden:

Wer’onyinye-Gi ochie

Nye umu-Gi ndia ta:-

Ulo ebe onu di,

N’ezi ihu-n’anya.

 

Verse 2

Jisus, Obia nenyezu

Dika na Galili,

Biko, nonyere ndia ta,

Bu ndi nakpoku Gi;

Mọ k’onu-ha nke uwa

Gho manya nk’el’igwé;

Zi ha mgbe ha nanu ya

N’onyinye bu nke-Gi.

 

Verse 3

Mọ nke Nna, si n’el’igwé

Kukwasi ha ume;

Idi-ọcha-Gi d’ike,

Ihu-n’anya-I di nro.

K’iru-Gi nechebe ha

Site na njọ n’ogu;

Bur’onye-ndu nke ndu-ha,

N’Eze nim’obi-ha.

 

Verse 4

Nna, mgbe I newugh ulo,

Owuw’ulo b’efu;

Jisus, mgb’i nazozigh ya,

Onu gagh’ihe-ngbu.

Ọ digh ihe gekewa

Ndi I jikotara;

Ihu-n’anya Mọ doro

Nsọ enwegh ogwugwu. Amen.


 

 

ILI OZU

 

Abu 136- Ọ bu n’aka nke Jisus

Safe in thee arms of Jesus.

 

Verse 1

Ọ bu n’aka nke Jisus,

N’obi-nwayọ nke-Ya,

Na ndo ihu-n’anya-Ya,

K’obim gezu ike.

Ge nti! olu ndi-m’ozi

Nabiarutem n’abu,

Site n’ala otuto,

N’osimiri enyo.

 

Kọrọs:-

Ọ bu n’aka nke Jisus,

N’obi-nwayọ nke-Ya,

Nando ihu-n’anya-Ya,

K’obim gezu ike.

 

Verse 2

Ọ bu n’aka nke Jisus,

Ka m’gapu na nchegbu,

Pua n’onwunwa nke uwa,

njọ agagh-emegbum.

Pua n’ihe-nwuta dum,

Pua n’it’ujọm nile;

Onwunwa nta fọduru,

Nani nw’anya-miri.

 

Verse 3

Jisus, ebe-nzuz’obim,

Jisus nwuru n’ihim;

Na nkume ebigh-ebi

Ka m’gatukwas’obim.

Ka m’tachie obi n’ebe a,

Chere k’abali ga;

Rue mgbe chi igwé gabo

N’ala ọma ahu. Amen.

 

Abu 137- N’utut’ubọchi Nbilite

On the resurrection morning.

 

Verse 1

N’utut’ubọchi Nbilite

Obi n’aru zuk’ozo;

Akwa na ir’uju adigh

M’obu ngbu.

 

Verse 2

N’ebe a ha kewara nw’oge,

Aru debe iz’ike,

Neche nimke ndaju di nsọ,

No n’ura.

 

Verse 3

Nwa mgbe  k’aru ike gwuru

No n’ebe iz’ike-Ya;

Rue mgbe chi nke Easter ọma

Bo-kwa-ra.

 

ILI OZU

Verse 4

M’obi natughri uche

Nekpesi ekper’ike

Tiwa n’ubọchi Nbilite

Nim’abu.

 

Verse 5

Obi n’aru ejik’ozo,

Ọ digh ihe gekewa;

Teta nime udi nke Kraist,

Zue oke.

 

Verse 6

A! Ima-nma n’oke onu

Nk’ubọchi Nbilit’ahu,

Nke nagagh-agabiga kwa

Mgbe nile.

 

Verse 7

N’utut’onu Easter ahu,

Ili nyeghach’ozu-ha;

Nna, na nne, na nwa, na nwa-nne

Zuk’ozo.

 

Verse 8

Na nzuk’ahu kachasi nma,

Kraist, wet’ayi n’ikpe-azu;

K’ayi si n’onwu n’ikpe jide

Obe-Gi. Amen.


 

Abu 138- Ge nti! akuko di ebube.

Redemption! Ọ wonderful story.

 

Verse 1

Ge nti! akuko di ebube!

Ozi’ọma n’ihi mu na gi:

Na Jisus wetar’ayi ngbahara,

Ọ kwusia ugwo-ayi n’obe.

 

Kọrọs:-

Kwere ya, ony’ojo, kwere Ya;

Nara ozi onu ahu;

Tukwasi obi-gi na Jisus,

Nzọputa k’Ọ nenye gi ta.

 

Verse 2

Ọ zọput’ayi n’onwu k’ayi di ndu,

Ọ me k’ayi gho umu Chuku;

Otu nsacha di n’ihi ndi-njọ:

Nsacha n’obara nke Jisus.

 

Verse 3

njọ agagh-enwe ike ozo,

Ọ bu ezie n’o ganwa gi;

N’ihi na Kraist, site n’onwu-Ya,

Gemeb’ike nile nke njọ.

 

Verse 4

Ugbu a nara ebere Chuku,

Gba oso jeku Jisus ta;

Ọ gakpobata onye biara,

Ọ digh onye Ọ gachupu. Amen.

 

Abu 139- N’ebe a k’ayi nenwe nsọgbu

Here we suffer grief and pain.

 

Verse 1

N’ebe a k’ayi nenwe nsọgbu,

N’ebe a nzuko nwe nkewa,

Nkewa adigh n’igwé.

 

Kọrọs:-

Ọ gabu ih’onu,

Ọ gabu ih’onu,

Ọ gabu ih’onu,

Mgbe nkewa nagagh-adi.

 

Verse 2

Ndi huru jisus n’anya

Galakuru Ya n’igwé,

Soro ndi nsọ n’elu.

 

Verse 3

Umu-nta gebi n’igwé,

Ndi choro Nn’ayi n’ekpere

N’ulo-Ya n’uwa nka.

 

Verse 4

Nd’ozizi-ayi gadi ukwu,

N’ihi n’ayi huru n’anya,

ILI OZU

Ghar’ikewa ozo.

 

Verse 5

Onu-ayi gadi ukwu,

N’ihi n’ayi gahu Jisus

K’Ọ no n’och’eze-Ya.

 

Verse 6

Ayi nile geji onu

Neto Kraist, bu Onye-nw’ayi,

Rue mgbe ebigh-ebi. Amen.

 

Abu 140- Ndi kwuru nwe ngọzi.

Hush! blessed arethe dead.

 

Verse 1

Ndi kwuru nwe ngọzi,

Nez’ike na Jisus,

Ndi tukwasir’isi

N’obi-Ya mgbe nile.

 

Verse 2

Ohu nke di ngọzi,

Nenwegh ochichiri!

Ha hu Ihe nk’ihe,

Nke ha huru n’anya.

 

Verse 3

H’aagafewo uwa,

Ya na ahuhu-Ya;

Ih’egwu nk’abali,

N’anwu nekpo oku.

 

Verse 4

Jisus geduru ha

N’eb’ifufe adigh;

Eb’ahihia neto

Na nsọ is’iyi ndu.

 

Verse 5

Nani ayi, ndi no nsọ

Ili, bu ndi kwara

Ih’oge gar’aga,

N’onyinyo fọduru.

 

Verse 6

Olu-ha n’iru-ha,

Ihu-n’anya ha ji-

Na mgbe-ya fọduru,

Uwa amagh kwa ha.

 

Verse 7

Ndi nwer’obi-ọma,

Nche ikp’azu agwu!

Ayi nakwa n’ih’unu,

Atal’ayi, Kraist kwara!

 

Verse 8

Ngwa ngwa mgbe chi gabo,

Olu oku Jisus

Nke ka onwu n’ike

Gasi, Bilie, nuria! Amen.


 

Abu 141- Mgbe ayi ruru n’ahuhu.

When our hands are bowed with woe.

 

Verse 1

Mgbe ayi ruru n’ahuhu,

Mgbe anya-miri nagb-ayi,

Mgb’ayi nakwa ndi-ayi lara,

Jisus, Nwa Devid, nuru.

 

Verse 2

I yir’anu-aru-ayi,

I buru ihe-ngbu-ayi;

I gbapur’anya-miri,

Jisus, Nwa Devid, nuru.

 

Verse 3

I rubew’isi-I n’onwu,

wisiw’obara-ndu;

Adobar’ozu-I n’ili,

Jisus, Nwa Devid, nuru.

 

Verse 4

Mgbe obi neru uju,

Neche nmehie-ya nile;

Mgbe mo-ayi natu egwu,

Jisus, Nwa Devid, nuru.

 

Verse 5

Mgbe atan onwu naku

N’ihi obi-ayi nala;

Mgb’ubọchi’ikpe-ayi di nsọ,

Jisus, Nwa Devid, nuru.

 

Verse 6

I mar’ihere na ngbu

N’ihi njọ nabugh nke-Gi;

Ma I kwere ibu ha,

Jisus, Nwa Devid, nuru.

 

Verse 7

I gabigara n’onwu,

I sachapuru njọ-ayi;

I no n’aka-nri Chuku,

Ọkpara Chuku nuru. Amen.

 

 

ELU-IGWE

Abu 142- Abum obia n’ebe a.

There is no night in heaven.

 

Verse 1

Abum obia n’ebe a,

igwé b’ulom;

Nani onye-ije,

igwé b’ulom.

Ih’egwu n’ahuhu

Gbaram gburugburu;

igwé bu ala-Nnam,

igwé b’ulom.

 

Verse 2

Ifufe fes’ike,

igwé b’ulom;

Ije nkem di nkpunkpu,

igwé b’ulom.

Ma mgbe nsọgbu uwa

Geme ngwa gabiga,

Agamano n’udo,

igwé b’ulom.

 

Verse 3

N’akuku Onye-nwem,

igwé b’ulom;

Agenyem otuto,

igwé b’ulom;

Ebe ndi nsọ Chuku

Nebi ebigh-ebi

Ka ha jesiri ije,

igwé b’ulom.

 

Verse 4

Agham-atamu kwa,

igwé b’ulom;

Otu uwa dirim,

igwé b’ulom.

N’ezie mu geguzọ

N’aka-nri Onye-nwem;

El’igwé b’ala-Nnam,

igwé b’ulom. Amen.


 

Abu 143- Abal’adigh n’igwé.

There is no night in heaven.

 

Verse 1

Abal’adigh n’igwé;

N’uwa-ngọzi ahu

Olu agah-agwu ike,

Olu b’ihu-n’anya.

 

Verse 2

Akwa adigh n’igwé,

N’ihi na ndu n’onu;

Akqwa b’otu nim’ihe mbu

Nke gabigasiri.

 

Verse 3

Nmehie adigh n’igwé,

N’etiti ndi-ngọzi;

Uwe ọcha-ha dizu nsọ,

Abu-ha di kwa nsọ.

 

Verse 4

Onwu adigh n’igwé;

Ndi ruru n’eb’ahu

ELU-IGWE

 

Eritawo anwugh-anwu,

H’agah-anwu ozo.

 

Verse 5

Jisus, bur’Onye-ndu!

K’ayi gafe abali,

Akwa, nmehie nile, n’onwu,

Ayi we rue n’el’igwé.Amen.

 

Abu 144- Ayi nekwu okwu banyere.

We speak of the realm of the blest.

 

Verse 1

Ayi nekwu okwu banyere

Ala ọma nke ndi-ngọzi,

Nekwus’otuto-ya mgbe dum;

Gini k’ibi n’igwé gabu?

 

Verse 2

Ayi nekwuam’ol’edo-ya,

Icho-nm’aja-obodo-ya,

Ih’ebube n’ih’utọ-ya;

Gini k’ibi n’igwé gabu.

 

Verse 3

Ayi nekwu n’ab’tutọ-ya

Kachasi abu dum n’utọ

Nke madu nabu n’el’uwa;

Gini k’ibi n’igwé gabu.

 

Verse 4

Ayi nekwu ihu-n’anya,

Uwe nka ndi bi n’otuto,

Nzuko nke Ọkpara n’elu;

Gini k’ibi n’igwé gabu.

 

Verse 5

Biko, Nna, nime njọ na nma,

Dozie mo-ayi ila n’igwé;

Emesia ayi gamata kwa

Ih’o bu-ibi n’eb’ahu! Amen.


 

Abu 145- Ala di mara nma kar’ihe.

There’s is a land that is fairer than day.

 

Verse 1

Ala di mara nma kar’ihe,

Site n’okwkwe k’ayi ji hu ya;

Nn’ayi, Chineke, nechere na ya

K’O doziri ayi eb’obibi.

 

Kọrọs:-

M’emesia, m’emesia,

Ayi gezukọ n’ala ọm’ahu.

M’emesia, m’emesia,

Ayi gezukọ n’ala ọm’ahu!

 

Verse 2

Ayi ganabu n’ala ọm’ahu

Ab’utọ ahu nke ndi-ngọzi;

Mọ-ayi gapu n’ihe-nwuta dum,

Ghara is’ude n’ih’iz’ike.

 

Verse 3

Ọ bu ezi Nn’ayi nke bi n’elu

K’ayi geny’otuto kwesiri Ya,

N’ihi onyiny’ihu-n’anya-Ya

Na ngọzi nke nedo ndu-ayi nsọ.

Amen.

 

 

OTUTO

Abu 146- Tob’Onye kasi nsọ n’elu.

Praise to the Holiest in the highest.

 

Verse 1

Tob’Onye kasi nsọ n’elu,

Tobe kwa Ya n’ogbu;

Okwu-Ya dum di ebube,

Uzo-Ya dum di nma.

 

Verse 2

Amam-ihe Chineke-ayi!

Mgb’ihe dum joro njọ,

Adam nk’abua biara n’ogu

Ib’Onye-ngbaputa.

 

Verse 3

Ez’iju-n’anya! n’anu’aru

Nke dara nim’Adam,

Gebuso nd’iro agh’ozo,

Gebuso we merie.

 

Verse 4

Onyinye kari amara

Nemezi anu’aru:

nnonye nke Chuku Onwe-Ya,

Na udi-Ya di nsọ!

 

Verse 5

Ihu-n’anya nenwegh atu,

K’Ọ ji lur’ayi ogu!

Ibu aro n’aru na mo

K’Ọ bur’umu-madu.

 

Verse 6

Na nzuzọ nime ogige,

N’ir’ora n’el’obe,

K’Ọ zi ndi-Ya uzọ ihu

Ahuhu na inwu.

 

Verse 7

Tob’Onye kasi nsọ n’elu,

Tobe kwa Ya n’ogbu;

Okwu Ya dum di ebube,

Uzo-Ya dum di nma. Amen.


OTUTO

Abu 147- K’ora tobe ike Jisus.

All hail the power of Jesus name.

 

Verse 1

K’ora tobe ike Jisus,

Ka ndi-m’ozi Ya da,

Weputa okpu nke eze,

Bia me Ya Ez’ora.

 

Verse 2

Me Y’Eze, ndi-ama Chuku

Neguzọ n’iru Ya;

To Ya, b’Onye unu soro,

Bia me Ya Ez’ora.

 

Verse 3

Umu Isreal arotara,

Ndi agbaputara,

Kelenu Onye-nzọputa,

Bia me Ya Ez’ora.

 

Verse 4

Ndi-njọ, ndi napugh ichefu

Olulu di ilu,

Nagbas’ak’unu n’ukwu-Ya,

Bia me Ya Ez’ora.

 

Verse 5

K’ebo nile n’asusu dum,

Naz’oku anakpo,

Bunye Ya ebube nile,

Bia me Ya Ez’ora.

 

Verse 6

K’ayi soro ndi nsọ bi n’igwé

Da n’ala n’ukwu-Ya,

Soro n’abu ebigh-ebi,

Bia me Ya Ez’ora. Amen.

 

Abu 148- Obim, tob’Eze nk’el’igwé.

Praise, my soul, the King of heaven.

 

Verse 1

Obim, tob’Eze nk’el’igwé,

But’onyinye-I n’ukwu-Ya;

Nagbahara n’ozizo dirim,

Onye geto Ya dikam?

To Ya! To Ya!

To Ya! To Ya!

Tob’Eze nk’ebigh-ebi.

 

Verse 2

To Ya n’ihi amara-Ya

Nk’Ọ mere nn’ayi n’ahuhu;

To ya, b’Onye nenwegh ngbanwe,

Ọ nenye ngọzi n’uba.

To Ya! To Ya!

To Ya! To Ya!

Ọ kwesi ntukwas’obi!

 

Verse 3

Ọ nemeso ayi dika Nna,

Ọ mar’aigh-ike-ayi;

Ọ kur’ayi nwayọ n’aka-Ya,

Doput’ayi n’aka nd’iro.

To Ya! To Ya!

To Ya! To Ya!

Ebere-Ya nerusa.

 

Verse 4

Ndi-m ozi, dur’ayi tobe Ya,

Unu nahu iru-Ya;

Anwu n’onwa da n’ukwu-Ya,

Ndi bi n’el’uwa nile.

To Ya! To Ya!

To Ya! To Ya!

Sor’ayi tob’Ony’amara! Amen.


 

Abu 149- Madu nile bi n’uwa.

All people that on earth do dwell.

 

Verse 1

Madu nile bi n’uwa,

Tobenu Chineke n’onu;

Werenu egwu febe Ya,

Unu bia n’iru Ya n’onu!

 

Verse 2

Onye-nw’ayi bu Chuku n’ezie,

Ọ bu nani Ya kpuru ayi;

Ọ si n’ayi bu aturu-Ya,

Ọ bu Onye nenye ayi nri.

 

Verse 3

Wer’otuto ba n’uloYa,

We4r’onu ba n’ogige-Ya;

Neto aha-Ya Mgbe nile,

Ọ kwesiri ime otu a.

 

Verse 4

N’ihi na Chineke di nma,

Ebere-Ya adigh-agwu;

Okwu-Ya neguzọs’ike,

Ọ gadigide mgbe nile.

 

Verse 5

To Chineke, Onye-ngọzi!

To Ya, ihe nile n’uwa!

To Ya, usu nke di n’igwé!

To Nna , n’Ọkpara, na Mọ Nsọ! Amen.

 

Abu 150- K’ebo nile kpo isi’ala.

Before Jehovah’a awful throne.

 

Verse 1

K’ebo nile kpo isi’ala

N’iru och’eze Chineke;

Onye-nw’ayi bu Chuku n’ezie,

Yak ere, pur’imebi kwa.

 

Verse 2

Nani ike-Ya ker’uwa,

Ọ ji aja kpua ayi madu;

Mgbe ayi kpafuru k’ auturu,

Ọ kpoghachi ayi n’ulo-Ya.

 

Verse 3

Ayi geji abu ekele

Bia bulie olu-ayi n’igwé;

Uwa geji asusu-ya

Melue ogigie-I n’otuto.

 

Verse 4

Nna, Iwu-Gi gazur’uwa,

Ihu-n’anya-I di n’ebe dum;

Ezi’okwu-Gi ganeguzọ

Dika nkume mgb’ebigh-ebi. Amen.


Abu

3 thoughts on “Abu Anglican (Igbo Hymn) Abu 101 – 150

  1. Pingback: - 9JAINFORMED.COM

Comments are closed.