You dont have javascript enabled! Please enable it! ABU 301 - 400 - Abu Anglican Communion 301 to 400

Abu Anglican Communion 301 to 400 (Igbo Hymn)

Search Contents

ABU 301 – 400 

ABU 301 – 400. Igbo Hymn known as Abu or Ekpere Na Abu (Ancient and Modern) is one of the Anglican Communion heritages. It is composed and compiled for spiritual worship in the church and for personal devotion. We have made it easier here. You can now surf for your Anglican Igbo hymn from 1 to 400.

Looking for Abu? Check inside the Table of Content and Click on the Abu Number.

ABU 301 – 400 TABLE OF CONTENT 

 

Click here for your:

Abu 1 to 50

ABU 51 to 100

ABU 101 to 150

ABU 151 to 200

ABU 201 to 300


ABU 301 to 400

Now that the daylight fills the sky.

Abu 301- Ugbu ak’anyanwu putara

 

Verse 1

Ugbu ak’anyanwu putara,

Ayi nenye Chuku obi-ayi,

K’Ọ gbopur’ayi ih’ojo ta,

Nim’okwu n’omume-ayi dum.

 

Verse 2

Chuku, nejide ire-ayi,

Wepu onuma na ndu-ayi;

Wezug’any’ayi n’ih’ojo dum,

Ekwela k’ayi nu ih’efu.

 

Verse 3

K’ako-n’uche-ayi di ọcha,

K’ayi char’ich’echiche nzuzu;

K’ayi were ijide-onw’ayi

Merie nganga n’agu-nmehie.

 

Verse 4

Ka mgbe ubọchi nka gagwu,

Ochichiri we laghachi,

Ayi gej’obi nenwegh ntupo

Neto Chuku n’ihi nmeri.

 

Verse 5

Otutọ diri Chuku Nna,

Na Gi Okpar’ebigh-ebi,

Nyere Mọ Nsọ, Ony’ayi neto,

Rue mgbe nile ebigh-ebi. Amen.

 

Abu 302- Bia n’ekper’ututu

Come to the morning prayer

Verse 1

Bia n’ekper’ututu,

Bia k’ayi gbue ikpere;

Ekpere b’ike ony’ije

Ji eso Chineke.

 

Verse 2

N’ehihie, zur’ike

N’okpuru Nkume-ayi;

Ndo-Ya bu ihe di utọ

Mgbe anyanwu nacha.

 

Verse 3

N’anyasi, mechi’uzọ,

Kpe nime ulo-Gi;

I gahu n’o bulo Chuku,

On’uzọ el’igwé. Amen.

 

Forth in Thy name, O Lord, I go.

Abu 303- Onye-nwem, ka m’je n’Aha-Gi

 

Verse 1

Onye-nwem, ka m’je n’Aha-Gi

Ilu onu nk’ubọchi ta;

Gi, nani Gi ka m’gamara

N’echichem, n’okum, n’omumem.

 

Verse 2

Olu nk’amara-Gi nyerem

Ka m’were onu luzue ya;

Nachota iru-I nime ya;

Nanwaputa uche nsọ-Gi.

 

Verse 3

Gi ka ngedebe n’aka nrim,

Anya-Gi nahu im’obim;

Ka m’nalu k’iwu-Gi si di,

Che olum nile n’iru Gi.

 

Verse 4

Ka m’buru ibu-Gi di nfe,

Neche nche, nekpe mgbe nile;

Nele anya ihe nk’igwé.

Nagbaso uboch’otuto-I.

 

Verse 5

Ka m’wer’onu nar’ihe dum

Nk’uju amara-Gi nyerem;

Wer’obi utọ nagba osom,

Nejeso Gi ba n’el’igwé. Amen.

 

 

At thy feet, O Christ, we lay.

Abu 304- Kraist, n’ukwu-I k’ayi dobara

 

Verse 1

Kraist, n’ukwu-I k’ayi dobara

Onyinye-I nk’ubọchi ta;

Namagh ih’o geweta

Ayi nar’o iny’aka-Gi;

K’o ghar’ibu mgbe iyi,

Jisus wer’obe-I ka ya.

 

Verse 2

M’ubọchi di nma, di ju,

Gi bur’isi-onu-ayi;

M’o weta ihe-nwuta,

Ngozi-Gi bu nani nma;

Ayi nario I, n’isi-mbu-ya,

Jisus, wer’obe-I ka ya.

 

Verse 3

Ayi mar’adigh-ike-ayi,

Nahu nd’iro-ayi nwanti;

Ih’ize-ndu-ayi nile

Putar’ihe n’iru Gi;

Ajul’ayi mgbe ayi nario

Omiko-Gi na nkpa-ayi.

 

Verse 4

Ayi chor’imaku okwu-I,

Nadi ndu n’amara-Gi;

Were onwe-ayi nye Gi,

Neme k’uche-Gi sic ho;

Neche, nekwu, neme kaw,

Nani ihe nato Gi.

 

Verse 5

Onye-nw’ayi, nur’olu-ayi,

K’ihu-n’anya-Gi nye ayi

Onyinye-I nke kachasi:

Ezi ntukwasi-obi;

Otu a k’ubọchi-ayi dum

Gegosi otuto-Gi. Amen.

 



New every morning is the love

Abu 305- Nteta n’ututu negosi

 

Verse 1

Nteta n’ututu negosi

Ihu-n’anya-Gi kw’ubọchi;

Ayi si n’ura n’ochichiri

Puta na ndu n’ike ohu.

 

Verse 2

 

Ebere ohu kw’ubọchi

Nabiakut’ayi n’og’ekpere:

Nzota na ngbahara ohu,

Ecihe ohu nke Chuku.

 

Verse 3

Ma echiche-ayi kw’ubọchi

Nedo ihe ayi huru nsọ,

Aku ohu di ok’onu

hukwu genye dik’ih’aja.

 

Verse 4

Olu nke ubọchi nile

Geny’ihe kwesiri k’ayi rio:-

Efe iju onw’ayi, uzọ

Gewet’ayi nsọ Chuku kari.

 

Verse 5

Nani, Nn’ayi, n’ihu-n’anya-Gi,

Jiker’ayi iz’ike n’elu;

Nyer’ayi aka, ubọchi dum,

Idi ndu k’ekper’ayi si di. Amen.

 

 

EVENING

 

Abide with me: fast falls the eventide. 

Abu 306- Nonyerem: o rube wo anyasi;

 

Verse 1

Nonyerem: o rube wo anyasi;

Ochichi nagba: Jisus, nonyerem;

Mgb’inye-aka na nkasi gwusiri,

Gi, Inye-aka nkem, bia nonyerem.

 

Verse 2

Ubochi ndu-ayi nagafe ngwa ngwa,

Onu n’otuto nk’uwa nka nefe;

Ngbanwe n’ure di n’akuku nile:

Gi, Onye nenwegh ngbanwe, nonyerem.

 

Verse 3

Abiala n’egwu, dik’Eze nk’igwé;

Kama, bia n’obi’ọma igw’oria dum;

Gi, Onye-nkasi-obi n’ahuhu,

Enyi nke ndi-nmehie, bia nonyerem.

 

Verse 4

Ọ dim nkpa k’I nonyerem mgbe nile,

Nani amara-I ganyi Ekwensu;

Onye dika Gi gabu Onye-ndum?

N’udu-miri n’okochi, nonyerem.

 

Verse 5

M’I nonyerem m’gagh-at’ujo nd’iro;

Nsọgbu n’anya-miri adigh ilu;

Onwu, ole ebe nmeri-gi di?

Anom nemeri ma Gi nonyerem.

 

Verse 6

Gosim obe-I mgbe m’gekpuchi anyam,

Nenwu na ngbachi, zim uzọ nk’igwé

Ch’igwé nabo, onyinyo uw’aga:

Na ndu, n’onwu, Onye-nwem, nonyerem. Amen.


 

 

The day Thou gavest, Lord, is ended.

Abu 307- Uboch’I nyere, Nna, agwuwo

 

Verse 1

Uboch’I nyere, Nna, agwuwo,

Gi mere k’ochichiri gba;

Gi k’ayi buru ututu,

Otutọ-I gedo ur’ayi nsọ.

 

Verse 2

Ayi nekele Gi, na Nzuko-Gi,-

K’uwa nagbahari n’ihe,-

Neche nche n’ebe nile n’uwa,

Ghar’izu ike mgb’o bula.

 

Verse 3

Ka chi ohu nabo nim’ala

Nagw’etiti dum n’usoro,

Onu ekpere adigh-echi,

Otutọ nada mgbe nile.

 

Verse 4

Anyanwu, nke gwar’ayi zur’ike,

Nakpote ndi bi n’odida;

Oge dum ire ohu neme

K’anuru ebube-I n’elu.

 

Verse 5

Amen, Ony-nw’ayi! och’eze-Gi

Agagh-ebi dika nk’uwa;

Aleze-Gi di mgb’ebigh-ebi,

Rue mgb’ora madu gefe Gi. Amen.

 

Saviour, again to Thy dear name raise.

Abu 308- Jisus, ayi nabu abu ikp’azu

 

Verse 1

Jisus, ayi nabu abu ikp’azu

Ito Aha-Gi tutu ayi ala;

Ayi eguzọ k’ayi gozie gi n’otu,

Gbue ikpere chere udo nke-Gi.

 

Verse 2

Nye ayi udo-Gi mgb’ayi nala n’ulo,

K’anyasi buru nke-I dik’ututu,

Gbochiere onu n’obi-ayi nmenie,

Bu ndi kpokur’aha-I nim’ulo nka.

 

Verse 3

Jisus, nye ayi udo-I n’abali ta,

Me k’ochichiri-ya ghor’ayi ihe;

Ekwel’umu-I daba n’ih’ize-ndu:

Ochichri di k’ihe n’anya-Gi.

 

Verse 4

Nenye ayi udo-I na-ndu ayi nile:

Ogwu ahuhu, iny’aka n’ogu;

Mgbe I gasi ogu-ayi nile bie,

Onye-nw’ayi, kpor’ayi ba n’udo nk’igwé. Amen.

 

 



Saviour, breathe an evening blessing.

Abu 309- Jisus, nye ngọzi anyasi

 

Verse 1

Jisus, nye ngọzi anyasi

Tutu ayi ezu ike;

njọ na nkpa k’ayi nekwuputa:

Gi nazọpu, Gi nagwo.

 

Verse 2

Ma nbibi di n’akuku-ayi,

Aku efeghari ayi,

Ndi-m’ozi-Gi nechebe ayi,

Ayi no n’udo m’I no nsọ.

 

Verse 3

M’abali gba ochichiri,

Ọ gagh-ezo iru-Gi;

Ik’adigh-agwu Gi, Onye

Nechebe umu-Gi dum. Amen.

 

Glory to Thee, my God, this night.

Abu 310- Chineke, otuto diri I

Verse 1

Chineke, otuto diri I

N’ihi ngọzi nile nke ta;

Biko, chebem, Eze nk’igwé,

N’okpuru nku-Gi di ike.

 

Verse 2

Gbagharam, n’ihi Ọkpara-I,

Ihe ojo nke m’mere ta;

Ka tutu mu arar’ura

Mu na Gi n’uwa di n’udo.

 

Verse 3

Zim idi nndu, k’egwu onwu

Ghar’itum kar’ihe-ndinam;

Zim ka m’gesi nwu, ka m’bilie

N’otuto n’ubọchi ikpe.

 

Verse 4

Biko, k’obim dabere Gi,

K’ura utọ mechie anyam:

Ura geme k’arum d’ike

Ife Chukum mgbe m’tetara.

 

Verse 5

N’abnali mgbe ura natughm,

K’echiche nk’igwé ju obim;

K’ajo nro ghara isogbum,

M’obu ike nk’ochichiri.

 

Verse 6

To chineke, Onye-ngọzi;

To Ya, ihe nile n’uwa;

To Ya, usu nile nk’igwé;

To Nna, n’Ọkpara, na Mọ Nsọ. Amen.

 

 

Sun of my soul, Thou Saviour dear

Abu 311- Anwu nk’obim, Onye-nzọtam.

 

Verse 1

Anwu nk’obim, Onye-nzọtam,

Abal’adigh ma I no nsọ;

Ekwela igw’oji nk’uwa

zọpu Gi n’anya nk’oru-Gi.

 

Verse 2

Mgbe ura ji nwayọ natu

Anyam abua ike gwuru,

Ka m’necheta n’o di utọ

Izu nk’obi Jisus.

 

Verse 3

Nonyerem na mgbe ehihie:

M’obugh Gi, apughm idi ndu;

Nonyerem mgb’anyasi nabia,

Achogm inwu ma I nogh nsọ.

 

Verse 4

Ọ di nwa-Gi kpafuru ta,

Nekwegh inu olu nsọ-Gi?

Jisus, malite olu-Gi;

Ekwela k’o dina na njọ.

 

Verse 5

Chebe nd’oria, nye nd’ogbenye

Ngozi si n’ulo-aku-Gi;

K’ura nke ndi ner’uju ta

Di utọ k’ura nke nwata.

 

Verse 6

Bia, gozie ayi mgb’ayi tetara,

Tutu ayi eje ije-ayi;

Rue mgbe ayi geru n’el’igwé,

Biri n’ok’ihu-n’anya-Gi. Amen.


 

 

At even, ere the sun was set

Abu 312- N’anyasi, tut’anwu ada.

 

Verse 1

N’anyasi, tut’anwu ada,

Jisus, ndi-oria nonyere I;

Ha zukotara n’ihe-ngbu

Ha lara n’ulo n’ok’onu.

 

Verse 2

Ọ bu mgbe anyasi ugbu a,

Ihe-ngbu k’ayi ji biakute I;

Ayi ahugh udi-Gi anya,

N’ayi mara n’I nonsọ n’ebe a.

 

Verse 3

Jisus, chupu ahuhu-ayi;

Ufodu no n’oria na nkpa;

Ndi’ozo akahugh Gi n’anya;

Ihu-n’anya ndi’ozo nwuru.

 

Verse 4

Ufodu chotara n’uwa

B’efu, ma ha arapugh ya;

Nyi ndi’ozo newuta ha,

Ma h’achogh k’I bur’Enyi-ha.

 

Verse 5

Ọ digh onye nwer’ezi’udo,

Mgbe njọ metur’ayi nile;

Ndi nacho ife Gi nk’ọma

K’obi nata uta keri.

 

Verse 6

Onye-nw’ayi, I ghoro madu;

Anwara Gi n’uzọ nile;

Anya obi’ọma-Gi nahu

Onya nk’ihere chor’izo.

 

Verse 7

Ike-Gi di kua k’o diri;

Ọ digh okwu-I nke bu n’efu;

Nuru na mgbe anyasi nka,

Wer’ebere-I gwo ayi nile. Amen.

 

 

Now the day is over.

Abu 313- Ehihie agawo

 

Verse 1

Ehihie agawo,

Abali di nsọ,

Onyinyo anyasi

Nada n’ebe dum.

 

Verse 2

Ochichiri nagba,

Kpakpando neti;

Anumanu nile

Gedina n’ura.

 

Verse 3

Kraist, nye nd’ike gwuru

iz’ike utọ;

Were ngọzi nwayọ-I

Mechie anya nkem.

 

Verse 4

Me k’umu ntakiri

Ro nro banyere I;

Chebe ndi no n’ugbo

N’ok’osimiri.

 

Verse 5

Kasie nd’oria nile

Neche n’aru-ngbu;

Ndi nagb’ajo izu

Gbochie nmehie-ha.

 

Verse 6

Biko, mgbe chi boro

Ka m’teta n’ura,

Dike, di’ọcha n’obi

N’anya-Gi di nsọ.

 

Verse 7

Ọtutu diri Nna,

N’Ọkpara nke-Ya,

Na Gi, Mọ di ngọzi,

Rue mgb’ebigh-ebi. Amen.

 

Our day of praise is done

Abu 314- Ubochi ta nagwu.

 

Verse 1

Ubochi ta nagwu,

Anwu nada ugbu a;

Agabigal’ayi dik’anwu,

Ez’ihe nk’ora dum.

 

Verse 2

N’ir’oche’eze-I n’elu,

Eb’abali nadigh,

Ndi ọma nakp’ubo n’igwé,

Nabuku Imgbe nile.

 

Verse 3

Abu-ayi jur’oyi;

Ik’otuto gwur’ayi;

M’olu abu ndi no n’igwé

Nadas’ike mgbe dum.

 

Verse 4

Biko, dozi’obi-ayi,

Jisus, ime uche-I;

K’ayi soro abu ndi m’ozi,

Nefe Gi n’uwa nka.

 

Verse 5

Gi nadaju obi,

Neweghachi’echiche;

Me ka ndu-ayi bur’ab’utọ

Nk’otuto nye Aha-I.

 

Verse 6

Ọ fọduru nw’oge

Na ndu nk’uwa gagwu;

Madu na m’ozi gabuko;

Abu nke zur’oke. Amen.

 

 



Ere I sleep, for every favour.

Abu 315- Tutu mu araru ura

 

Verse 1

Tutu mu araru ura

M’gekele

Chinekem

N’ihi obi’ọma-Ya.

 

Verse 2

Chinekem, gini ka m’genye

Aha-Gi.

Di nwayọ,

Di kwanma mgbe nile?

 

Verse 3

Gi neduzi ijem nile

N’uzọ-Gi,

Nu kw’olum,

Me k’omumem di nsọ.

 

Verse 4

Arapula, ma hum n’anya;

K’udo-Gi

Nur’onum

Rue mgbe I gewepum.

 

Verse 5

Were nzọputa-Gi letam;

Ka ncebe-I

Di ugbu a

Nsọ ebe-obibim.

 

Verse 6

Nkumem, Onye-ndum, N’Ul’elum,

Wer’ike-I

nedebem

Mgbe m’gedina n’ura.

 

Verse 7

Mgbe m’gatu or’ura onwu

Ka m’bilie

N’ikp’azu

Sonyere ndi ọma. Amen.

 

The day, O Lord, is spend.

Abu 316- Jisus, chi ejiwo.

 

Verse 1

Jisus, chi ejiwo;

Nonyer’ayi, zur’ike;

Nkpur’obi-ayi nachos’ike

Ilezi Gi obia.

 

Verse 2

Ayi akerugh n’ala,

Ala onu ahu

Ebe ndi-m’ ozi-I neguzọ,

Anwu y’adigh-ada.

 

Verse 3

Anwu nke-ayi nada,

Ubochi-ayi nagwu;

Gi Anwu nk’ezi-omume,

Mukwasi ayi mgbe dum. Amen.

 

 

The day is past and over.

Abu 317- Ubochi agafewo;

 

Verse 1

Ubochi agafewo;

Jisus ayi nekele I,

We kpe njọ ghar’idi

N’oge ochichiri.

Jisus, nedeb’ayi n’iru Gi,

Chebe kw’ayi n’abali nabia.

 

Verse 2

On’ubọchi agawo;

Ayi ebuli obi’ayi;

Ekwela k’ayi ma n’onya

N’oge ochichiri.

Jisus, nedeb’ayi n’iru Gi,

Chbe kw’ayi n’abali nabia.

 

Verse 3

Ol’ubọchi agawo;

Ayi bekur’I abu,

We kpe k’egwu ghar’idi

N’oge ochichiri.

Jisus, nedeb’ayi n’iru Gi,

Chebe kw’ayi n’abali nabia.

 

Verse 4

Bur’Onye-nche nkpur’obi’ayi;

Nani Gi matara

Ka ihe-ize-ndu ra

Nk’ayi naghagh igafe.

Jisus, nuru aririo-ayi,

We gbochiri ayi ha nile.   Amen.

 

*THANKSGIVING

Come, ye thankful people, come.

Abu 318 – Buanu, ndi ji ekele

Verse 1

Buanu, ndi ji ekele,

Abu nk’owuw’ih’ubi;

Ayi nekpokobata nri

Tutu uguru abia.

Chuku-Okike nenye

Ihe nile di ayi nkpa;

Bianu n’ulo Chineke,

Bulie abu nk’owukwe.

 

Verse 2

Uwa dum b’ubi Chuku,

K’o mia nkpuru nk’otuto;

Anagh oka n’ata

K’onu na ngbu we puta.

Ihe-npute, n’uzari,

N’ezi oko n’ikp’azu;

Chuku nk’owuwe-nri, kwe

K’ayi bur’oka char’acha.

 

Verse 3

Chuku, onye-nw’ayi, gabia

were owuwe-Ya la,

Si n’ubi-Ya kpochapu

njọ nile n’ubọchi’ahu;

Nye ndi-m’ozi-Ya iwu

Ka ha rechapu ata,

Tite kwa ezi oka

N’ulo-Ya ebigh-ebi.

 

Verse 4

Onye-nw’ayi, biko, bia ngwa

Wer’owuwe-I ikp’azu,

Kpokobata ndi nke-Gi

Si na ngbu na njọ puta:

Ndi anuchara n’obi

Ka ha biri n’ulo-Gi;

Were ndi-m’ozi-Gi bia,

Bulie owuw’otuto! Amen.


 

We plough the fields, and scatter.

Abu 319- Ayi nasu ala ubi,

 

Verse 1

Ayi nasu ala ubi,

Ko ji ọma na ya,

Ma Chuku ji aka-Ya

Nemeka ha neto.

Ọ nyere mir’ozuzọ

K’ome-ji we pute;

Anyanwu n’igirigi,

Nenye ayi nri n’uba.

 

Kọrọs:-

Onyiny’ọma nila

Ha dum si n’elu bia;

Kele Chuku, kele Chuku

N’ihu-n’anya-Ya!

 

Verse 2

Ọ bu nani Ya kere

Ihe nile n’uwa:

Okoko neto n’ohia,

Kpakpando nk’anyasi.

Ifufe nan’olu-Ya,

Ya nenye nnunu nri;

Nke ka, Ọ neny’umu-Ya

Nri-ha kwa-ubọchi.

 

Verse 3

Nna, ayi nenye I ekele

N’ihi ih’ọma dum:

Mgb’igha-nkpuru n’owuwe,

Ndu, nri, n’aru-ike.

Nar’onyinye ayi chere

N’ih’ihu-n’anya-Gi;

N’ihe nato Gi kari:

Obi-ekele-ayi. Amen.

 

 

O Lord of heaven, and earth, and sea.

Abu 320- Chineke nk’el’igwé n’ala,

 

Verse 1

Chineke nk’el’igwé n’ala,

Otutọ nile diri Gi!

Ayi gesi ana kele Gi,

Ony’onyinye?

 

Verse 2

Anwu, na miri, n’ikuku,

Negosi ihu-n’anya-Gi;

I no n’owuwe-ih’ubi,

Ony’onyinye!

 

Verse 3

N’ihi udo n’aru-ike,

N’ihi ngọzi nile nk’uwa,

Ekele n’otuto diri I,

Ony’onyinye!

 

Verse 4

I zodogh nani otu Nwa-I

M’I nyere Ya n’ihi uwa

We sor’Onye ngọzi ahu

Nye ihe dum.

 

Verse 5

Gi nenye onyinye Mọ Nsọ:

Mọ ndu, n’ike, n’ihu-n’anya,

We zokwasi amara Ya

N’elu ayi dum.

 

Verse 6

N’ihi ndi agbaputara,

N’ihi olil’anya igwé,

Otutọ nile diri Gi,

Ony’onyinye!

 

Verse 7

Icho nani nk’ayi bu iyi!

Ọ bu aku gadi mgbe dum:-

Ih’obula ayi genye Gi,

Ony’onyinye!

 

Verse 8

Nna, ayi binye I ih’o bula

I gakwu ayi ugwo nk’ukwu;

Ayi geji obi utọ nye Gi,

Ony’onyinye!

 

Verse 9

Gi, Onye ayi nesi n’aka I

Nwe ndu ayi n’oninye nile,

K’ayi binyere I ebigh ebi,

Ony’onyinye! Amen.

 

Lord of the harvest, Thee we hail.                                     

Abu 321- Ayi nekele Gi, Onye nw’ayi!

 

Verse 1

Ayi nekele Gi, Onye nw’ayi!

Nkwa-Gi ochie adigh ada;

Udumiri sor’okochi,

Nenye ayi ih’ọma kw’aro.

Ayi nekele I ubọchi ta:

K’obi-ayi jiker’onwe ha!

 

Verse 2

Mgbe oyi uguru natu,

Mgb’anwu okochi namagbu,

Mgbe ifufe nefes’ike,

Mgb’udumiri need ala:

Ayi ganabu nye Gi, Ez’ayi!

Nime ngbanwe ndia I nachi!

 

Verse 3

Nke ka ukwu, mgbe aka-Gi

Nyere ayi nri ohu n’uba;

Mgb’olu abu di n’ebe dum,

Mgbe ayi nebulat’ih’ubi:

Ayi geweli ab’otuto:

Ayi dum neketa ngọzi-Gi.

 

Verse 4

Chuku, ihe nile bu nke-I:

Miri nezo, n’anwu namu,

Nkpuru ezoro nim’ala,

Nka mere k’o nami n’uba.

Kw’aro onyinye-I naputa;

Onu-ayi ganeto I ohi! Amen.


 

 

We give Thee but Thine own.

Abu 322- Ayi nenye I ihè-Gi;

 

Verse 1

Ayi nenye I ihè-Gi;

Onyinye o bula;

Ihe dum ayi nwere bu nke-I,

Iji lua olu-Gi.

 

Verse 2

K’ayi nara ngọzi-Gi

Dik’ezi ndi-oru;

K’ayi wer’onu nyeghachi Gi

Nkpuru-mbu nk’I nyere.

 

Verse 3

Obi di nke nwuru,

Ulo togbo n’efu,

N’aturu Jisus nwururu

Nefughari n’uwa!

 

Verse 4

Ikasi, n’igọzi,

Ich’ogwu ahuhu,

Ilekota ndi-ogbenye:

B’olu m’ozi n’uwa!

 

Verse 5

Itopu ndi-nmehie,

I cho ndi fur’efu,

Izi uzọ nke ndu n’udo:

Bu ime dika Kraist!

 

Verse 6

Ayi kwere okwu-Gi,

N’okwukwe-ayi di nta:

Ih’ayi mere ndi nke-Gi, Kraist,

Ayi mere ha nye Gi! Amen.

 

Now thank we all our God.

Abu 323- K’ayi kele Nn’ayi ugbu a,

 

Verse 1

K’ayi kele Nn’ayi ugbu a,

Newer’obi n’olu-ayi;

Nke nalu ok’olu,

Neme k’uwa-Ya nuria;

Onye j’ihu-n’any

Nagozi ayi mgbe dum

Site n’aka nn-ayi;

Ọ bu kwa nk’ayi ugbu a.

 

Verse 2

Ka Chuku omanka

Nano nsọ ayi mgbe nile,

Natute obi-ayi

N’onu n’udo di ngọzi;

Deb’ayi n’amara-Ya,

Gbochier’ayi obi’abua

Me k’ayi pua na njọ dum

N’uwa nka na nk’ozo.

 

Verse 3

Otutọ n’ekele

Bu nke-Gi, Chineke, Nna,

N’Ọkpara na Mọ Nsọ,

N’ebe kachasi elu:

Chinek’ebigh-ebi,

Nk’ihe nile neto:

Ọ diri, di kw’ugbu a,

Gadigide mgbe dum. Amen.

 

 

NEW YEAR

 

 

A few more years shall roll

Abụ 324- Arọ ole-n’ole

 

Verse 1

Arọ ole-n’ole

Gabịa we gabiga,

Ayị gesoro ndị nez’ike

Rar’ụra nim’ili.

 

Kọrọs:-

Onye-nwem, dozi’obim

N’ihi uboch’ahu;

Were obara-Gi sachem,

We hichapu nmehiem.

 

Verse 2

Anwu ole- n’ole

Gada n’ugwu nk’uwa,

Ayi gano n’uwa nke ka nma,

Ebe anwu nadigh.

 

Verse 3

Ifuf’ole-n’ole

Gefegid’ayi n’ebe a,

Ayi gano n’ebe ndaju di,

N’udo rue mgbe nile.

 

Verse 4

Igba-ngba na nkewa

Ole-n’ole gadi;

Anya-miri ole-n’ole,

N’akwa adigh ozo.

 

Verse 5

Ọ fọduru Mgbe Ọ gania ozo;

Ọ nwuru n’ihi ayi, di ndu

K’ayi soro Ya b’Eze. Amen.

 

 



For Thy mercy and Thy grace

Abu 325- N’ih’ebere-I amara-I

Verse 1

N’ih’ebere-I amara-I

N’aro gafere ugbu a,

Nuru abu ekele,

Jisus, Onye-ngbaput’ayi.

 

Verse 2

Ayi amagh odi-n’iru:

Dur’ayi, Kpakpand’ututu;

Agha na nd’iro d’ike:

Jisus, lu-kwa-r’ayi ogu.

 

Verse 3

N’ahuhu n’adigh-ike

Buru Nkume d’ike-ayi;

Nime nfughari nk’uwa

Bir’ezi Uzo ndu-ayi.

 

Verse 4

Onye gagbaso uizo

Nk’onwu nime aro nka,

Ka ndele na nkpa-n’aka-I

Nenye ya nkasi-obi.

 

Verse 5

K’ayi di ọcha, zueoke,

K’ayi buru nke-Gi mgbe dum;

Nyer’ayi aka k’ayi kwesi

Inata okpu-eze. Amen.

 

 

Through all the changing scenes of life

Abu 326- nime ngbanwe nile nke dum,

Verse 1

nime ngbanwe nile nke dum,

Nim’ahuhu n’onu,

Agameji irem n’obim

Neto Chineke nkem.

 

Verse 2

Som me ka Chuku di ukwu,

Som neto aha-Ya;

Mgbe m’lpokuru Ya n’ahuhu

Ọ biara zọputam.

 

Verse 3

Ndi-agha Chineke niche

Ulo ndi ọma-Ya;

Ndi natukwasi Ya obi

K’Ọ neneye ngbaputa.

 

Verse 4

Biko, nwa ihu-n’anya-Ya:

I gamata nk’ọma

Na nani ndi kwere na Ya

Bu ndi agoziri.

 

Verse 5

Ndi-nsọ, m’unu tua egwu-Ya:

Egwu ozo adigh;

K’ozi-Ya nato un’utọ:

Ọ gegbo nkpa-unu.

 

Verse 6

Nna, na Ọkpara, na Mọ Nsọ,

Ony’ayi nasopuru,

Ka otuto diri ugbu a

We rue mgb’ebigh-ebi. Amen.

 

 

 

My times are in Thy hand. 

Abu 327- Mgbe nkem di n’aka-Gi:

 

Verse 1

Mgbe nkem di n’aka-Gi:

Otu a ka o si tom;

Ndum, ndi-enyim, na nkpur’obim,

Ka m’ara nye n’aka-I.

 

Verse 2

Mgbe nkem di n’aka-Gi,

Ih’o bula ha bu:

Ngbu n’onu, ochichi n’ihe,

Otu o si to Gi.

 

Verse 3

Mgbe nkem di n’aka-Gi,

Agaghm-atu egwu:

Nna apugh ime nwa nke-Ya

K’o kwa akwa n’efu.

 

Verse 4

Mgbe nkem di n’aka-Gi;

Jisus akpogburu:

Aka nke nmehiem kpopuru

Bu onye-ndum ugbu a.

 

Verse 5

Mgbe nkem di n’aka-Gi:

Ka m’tukwasi I obim;

Onwu gasia, n’aka-nri-Gi

Ka m’gano mgbe nile. Amen.

 

 

 

Father, let me dedicate

Abu 328- – Chineke, Nna, kwe ka m’do

 

Verse 1

Chineke, Nna, kwe ka m’do

Aro nka nsọ nye I,

Nim’onodu o bula

I genyem n’uwa:

Ipu n’ahuhu na nkpa

Abugh oke nkem;

Wkperem bu nani nka:

K’eto Aha-Gi!

 

Verse 2

Nwa garioro onwe-ya

Ndu nke o gadi?

Ihu-n’anya Nna gaju

Inye ih’ọma?

Gi nenye ayi kw’ubọchi

Kari nk’ayi rioro;

I napugh ih’o bula

Geto Aha-Gi!

 

Verse 3

Ọ buru kwa n’ebere

Gi genyem onu;

Ọ buru n’iru-ọma-I

Gamukwasindum;

K’obimnim’abu onu,

Kwuput’aha-Gi;

Ka ih’echi geweta

Tobe Aha-Gi!

 

Verse 4

M’I kpom ka m’buru obe,

Ihe-ngbu-ya bia,

Uru, we gho ih’ayi,

Onwu nogidem:

Kwe ka m’chetaotu Nwa-I

Nara otuto;

Ka n’nekpe nim’ahuhu:

K’eto Aha-Gi! Amen.

 



Bless, O Lord, the opening year.

Abu 329- Nn’ayi, gozie ar’ohu nka

 

Verse 1

Nn’ayi, gozie ar’ohu nka

Nye ndi nile no n’ebe a;

Nye okwu-I ike di nsọ

K’ayi kwere ibu ndi-Gi.

 

Verse 2

Onye-nche aturu Gi,

K’obi-etili kwa njọ;

Me ka nd’isi nan’uzọ

We le nani Gi anya.

 

Verse 3

Olu nk’I malitere

Nye ike ohu n’oso;

Chupu ochichi n’egwu,

Hichapu anya-miri.

 

Verse 4

Gozie nwata n’okenye,

K’onu nileneto Gi;

Ka nzuko nka nwaputa

Ike-I na ihu-n’anya-I. Amen.

 

 

 

Another year is dawning.

Abu 330- Ar’ohu namalite.

 

Verse 1

Ar’ohu namalite;

Onye-nw’ayi, k’o buru,

N’olu m’obu n’iche-nche,

Aro nke diri Gi.

 

Verse 2

Aro ntukwasi-obi,

Nk’ebere n’amara;

Ar’ohu nk’ezi onu

Nk’iru-I gamukwasi.

 

Verse 3

Aro nke iga- n’iru,

Aro nke otuto;

Ar’ohu nke nnwaputa

Nnonyere-Gi mgbe dum.

 

Verse 4

Aro nke ije-ozi,

N’ama ihu-n’anya-I;

Ar’ohu nke njikere

Ilu olu n’igwé.

 

Verse 5

Ar’ohu namalite:

Onye-nw-ayi,k’o buru,

Nim’uwa m’obu n’igwé,

Aro nke diri Gi. Amen.

 

 

THE SICK

 

Thou, to whom the sick and young.

Abu 331- Gi, onye ndi no nim’oria

 

Verse 1

Gi, onye ndi no nim’oria

Biakutere mgbe nile,

K’okwu-ngwoputa-Gi naza

Akwa nke ndi no na ngbu.

Nuru, Jisus, m’ayi nario

Aririo n’och’ebere-I.

 

Verse 2

Ndi nanwu, ndi nenwegh ike,

Nacho iny’aka-Gi

K’ayi me k’ibu-ha di nfe,

Necheta ha mgb’ayi nario

Aririo n’och’ebere-I.

 

Verse 3

Ka nwa-Gi o bula kwere

Iji aka n’obi-ya,

nemez’iwu ihu-n’anya,

Nakasi obimgbe dum;

nebute ih’onyinye

N’aririo n’och’ebere-I.

 

Verse 4

Ka nmehie, oria, n’ahuhu,

Chota ngopu nime Gi;

Rue mgbe ndi-oria ganuri

N’agworo ha, sacha ha.

Ha genwekongbaputa,

Zuko kwa n’och’ikpe-Gi. Amen.

 

 

 



Thine arm, O Lord, in days of old.

Abu 332- Aka-Gi, Kraist, na mgbe ochie

 

Verse 1

Aka-Gi, Kraist, na mgbe ochie

D’ike meriri oria n’onwu,

Ochichiri n’ili.

Ndi kpur’isi, ndi dar’ogbi,

Ndi-ngwurojekuru I;

Ndi ekpenta n’aru-ọcha-ha,

Ndinwer’aru-oku.

 

Verse 2

Nmetu-aka-Gi nyere ndu,

Ih’uzọ n’okw’onu;

Ndi m’ojo, ndi wiri ara,

Mara Gi, Nna nk’ihe.

Bia nsọ ugbu a Kraist, k’I gozie

N’ike dika na mbu;

N’ama m’obu n’ime-ulo,

Dika na Galili.

 

Bur’Onye-nzọput’ayi ugbu a,

Onye-nwe ndu n’onwu;

Wer’ume-Gi d’ike gozie,

Tute, weghachi ndu.

Nye aka dum nke nagw’oria

Amam-ihe nk’igwé;

Ka ndi’oria na ndi d’ike

We to Gi mgbe nile. Amen.

 

God be with you till we meet again.

Abu 333- Chukunonyere I k’ayi zuk’ozo.

Verse 1

Chukunonyere I k’ayi zuk’ozo,

Wer’izuzu-Ya nedu Gi,

Chebe I n’ulo-aturu-Ya:

Chuku nonyere I k’ayi zuk’ozo!

 

Kọrọs:-

K’ayi we zu! k’ayi zu!

K’ayi zuko n’ukwu Jisus!

K’ayi we zu! k’ayi we zu!

Chuku nonyere i k’ayi zuk’ozo!

 

Verse 2

Chuku nonyere I k’ayi zuk’ozo,

Zo gi n’okpuru nde nku-Ya,

Nenye I nri ubọchi nile:

Chuku nonyere I k’ayi zuk’ozo!

 

Verse 3

Chuku nonyere I k’ayi zuk’ozo,

Mgbe ih’egwu ndu natu gi,

Makua gi n’ihu-n’anya-Ya:

Chuku nonyere I k’ayi zuk’ozo!

 

Verse 4

Chuku nonyere I k’ayi zuk’ozo,

Wer’ota-Ya nekpuchi gi,

Chughachi onwu di n’uzọ-i:

Chuku nonyere I k’ayi zuk’ozo! Amen.

 

God will take care of you.

Abu 334- Atul’egwu ih’obula:

 

Verse 1

Atul’egwu ih’obula:

Chineke gechebe i:

Nodu nim’ihu-n’anya-Ya;

Chineke gechebe i.

 

Kọrọs:-

Chineke gechebe i

N’ubọchi nile; k’uzọ ra

Ya onwe-Ya no nsọ:

Chineke gechebe 1.

 

Verse 2

Olu neme kaike gwu:

Chineke gechebe I;

Ihe-ize-ndu di n’uzọ:

Chineke gechebe i.

 

Verse 3

Nkpa-gi nile ka Ọ gegbo:

Chineke gechebe i;

Ọ kwesiri ntukwas’obi:

Chineke gechebe i.

 

Verse 4

I guzọro nenwegh enyi?

Chineke gechebe I;

Ọ geme k’obi-gi d’ike:

Chineke gechebe i.

 

Verse 5

Nime onwunwa o bula,

Chineke gechebe i;

Ony’ume-ngwu, kwere na Ya!

Chineke gechebe i! Amen.

 

For the dear ones parted from us.

 Abu 335- N’ihi ndi-ayi no n’eb’ozo.

Verse 1

N’ihi ndi-ayi no n’eb’ozo

Ayi gabu n’ekpere-ayi:

Wer’ihu-n’anya-Gi di nro

Nke nech’umu-I n’ebe dum,

Nna Nke di nsọ,

Chebe ha na mgbe nile.

 

Nime onwunwa na nsọgbu,

N’ih’egwu ubọchi dum,

Wer’omiko ebigh-ebi

Narior’obi kpafuru,

Onye-nzot’ayi,

Debe ha n’uzọ di nkpa.

 

Verse 3

N’oge ujo n’ahuhu-ha,

Mgb’ananwa okwukwe-ha,

Wer’amara-I nke natute

Obi nke Kraist nwururu,

Mọ nk’amara,

Bur’Onye-ndu ha mgbe dum.

 

Verse 4

Nim’onu n’etiti ndi’enyi,

N’ogu megide nd’iro,

Ka ngọzi-Gi nonyere ha,

K’iru-Gi nye iz’ike,

Chuku d’ike:

Nna, n’Ọkpara, na Mọ Nsọ. Amen.


 

 

Holy Father, in Thy mercy.

Abu 336- Nna dinsọ, wer’ebere-Gi

 

Verse 1

Nna dinsọ, wer’ebere-Gi

Nur’aririo-ayi:

Chebe ndi no n’ebe di anya

Na nsọ Gi.

 

Verse 2

Jisus Kraist, ka nnonyere-Gi

Nedu ha n’ihe;

Debe ha, n’adigh-ike-ha,

N’akuku-I.

 

Verse 3

N’og’ ahuhu, n’og’ize-ndu,

Na nk’idi-nani,

K’ihu-n’anya-Gi nakasi

Ha obi.

 

Verse 4

Ka onu nke nzọputa-Gi

Buru ike-ha;

Ka ha hu Gi n’anya, to Gi,

Kw’ubọchi.

 

Verse 5

Mọ Nsọ kwe k’ozizi nke-Gi

Nedo ndu-ha nsọ;

Nye amara-I ka ha merie

Nim’ogu.

 

Verse 6

Nna, na Ọkpara, na Mọ Nsọ,

Atọ nim’otu,

Gozie, nedu, nedebe ha

Na nsọ Gi. Amen.

 

 

DEDICATION

 

Christ is our Corner-stone.

Abu 337- Kraist bu Nto-ala-ayi,

 

Verse 1

Kraist bu Nto-ala-ayi,

Ayi newu n’elu Ya;

Nani ndi nsọ nke-Ya

Neju ulo nk’igwé;

Ọ nenye ayi olil’anya

Nk’ike n’uwa, n’onu n’elu.

 

Verse 2

K’abu nke otuto

Nada n’ulo nsọ nka;

Ayi geweli olu

To Atọ nim’otu;

Wer’abu onu nekwusa

Aha otuto-Ya mgbe dum.

 

Verse 3

N’ebe a, Nna nk’amara,

Nabia nsọ ayi mgbe dum;

Nara nkwa nsọ nile,

Nuru aririo-ayi;

Were ngọzi wukwasi ndi

No n’ekpere n’ubọchi nsọ.

 

Verse 4

N’ebe a k’ayi nariota

Amara si n’igwé;

Kwe k’amara ahu

Diyer’ayi mgbe nile;

We rue mgbe ndi-ngọzi nile

Gala n’igwé, we zue ike. Amen.

 

We love the plce, O God.

Abu 338- Chineke, ayi nahu.

 

Verse 1

Chineke, ayi nahu

Ebe nsọ nka n’anya;

Onu nke Ulo-Gi

Ka onu dum nk’uwa.

 

Verse 2

Ọ b’ulo ekpere

Ebe ayi nezuko;

Gi, Nna, no kwa n’ebe a

Ikele ndi nke-Gi.

 

Verse 3

Ihe-ime-baptism

Nato, ebe Mọ Nsọ

Nawusa mgbe nile

Ngozi so n’el’igwé.

 

Verse 4

Okwu ndu nato ayi,

Nke kwuwara udo,

Nkasi nime ogu,

N’onu ebigh-ebi.

 

Verse 5

Oriri-I,Onye-nw’ayi,

Nato ayi, ebe Gi,

Onye bu Nri nke ndu,

Nenye umu-Gi nri.

 

Verse 6

N’uwa o nato ayi

Ito ebere-Gi;

Man ayi nachos’ike

Ibu abu nk’igwé.

 

Verse 7

Jisus, nye amara

K’ayi hu I n’anya n’uwa,

Hu iru-Gi n’igwé,

So ndi nsọ-Gi neto. Amen.


 

 

 

Great Shepherd of Thy people, hear.

Abu 339- Ezi’Onye-nche ndi-Gi, nuru.

 

Verse 1

Ezi’Onye-nche ndi-Gi, nuru,

Gosi iru-I ugbu a;

I nyere ulo ekpere;

Nye ayi obi nekpe.

 

Verse 2

Nim’ulo nka k’ihu-n’anya

N’olil’anya nebi;

Nye ako-n’uche iz’ike,

Gw’onya nkpur’obi-ayi.

 

Verse 3

K’ayi wer’okwukwe nar’okwu-I,

Nekpe nim’okwukwe;

We buru nkpa nile togbo

N’iru Gi, Onye-nw’ayi.

 

Verse 4

Nye nti nanu, n’anya nahu,

N’obi ume-ala;

Si n’elu musa ihè-Gi,

K’ayi neto n’amara. Amen.

 

 

 

Christ is made the sure foundation.

Abu 340- Kraist bu Nto-ala di ike,

 

Verse 1

Kraist bu Nto-ala di ike,

Kraist, Isi Nkume-nkuku

Nke Chineke roputara,

Nejiko Nzuko mgbe nile,

Na ntukwasi-obi-ya.

 

Verse 2

N’ulo eb’ayi nakpo Gi,

Chuku, bia n’ubọchi ta;

Were kwa obi-ọma-Gi

Nuru aririo ndi nke-I;

Wusa ngọzi-Gi zur’oke

Nim aja-ya mgbe nile.

 

Verse 3

N’ebe a nye ndi-oru-Gi dum

Aririo nke ha nario,

Ka ha soro ndi-ngọzi-Gi

Jid’ihe ha riotara;

So kwa Gi nime otuto,

Bur’eze mgb’ebih-ebi.

 

Verse Otutọ, nsọpuru nile

Diri Chineke, bu Nna,

Di-kwa-r’Ọkpara na Mọ Nsọ,

Atọ nim’otu mgbe dum,

Onye d’ike nim’otuto

Rue n’uwa ebigh-ebi! Amen.

 

 

 

Be with us, gracious Lord, to-day.

Abu 341- Nna nk’amara, nonyer’ayi ta;

 

Verse 1

Nna nk’amara, nonyer’ayi ta;

Ulo nka k’ayi nedo nsọ nye I;

Biko, Nna, to nti-Gi n’a la

Nur’olu ekpere ndi-Gi.

 

Verse 2

K’udo nsọ nebi nime ya,

N’ihu-n’anya, n’ezi-okwu;

K’obi di aro nwe nkasi

N’amara-Gi di ok’onu.

 

Verse 3

K’anu olu ony’aririo,

K’ony’ike gwuru zur’ike;

K’onye nakwa njọ Gi,

Ndi nechere I nata ngọzi.

 

Verse 4

Mgb’ananu ozi’ọma n’ebe a,

Mgb’anekwusa Aha-nzota,

K’atute obi nwur’anwu,

Ọ we di ndu, nenwu k’oku.

 

Verse 5

Ka ndi dara ogbi nabu,

Ndi nti chiri nanu ihe;

Nye ndi di um’ala n’obi

Ngbahara n’onodu egwu.

 

Verse 6

Nna, me k’ulo nka buru nke-I,

K’achota ru-Gi n’ebe a;

K’o bur’ul nke Chineke,

On’uzọ el’igwé n’ezie. Amen.

 

 

 

Be present at our table, Lord.

Abu 342- Jisus, nonyer’ayi n’oriri;

Jisus, nonyer’ayi n’oriri;

K’ekele Gi n’ebe nile;

Gozie ih’oriri-ayi nka;

Kwe k’ayi na Gi riko n’igwé. Amen.

 

 

We thank Thee, Lord, for this our food.

Abu 343- Onye-nw’ayi, ayi nekele Gi.

 

Onye-nw’ayi, ayi nekele Gi

N’ihi nri nka n’ih’ọma dum;

Biko, nazu nkpur’obi-ayi,

Zidatar’ayi Nri nenye ndu. Amen


 

 

Lead me, lord; Lead me in Thy righteousness.

Abu 344- Onye-nwem, nedum n’ezi-omume-I.

 

Onye-nwem, nedum n’ezi-omume-I,

K’uzọ-Gi di lari n’irum;

N’ihi na nani Gi, Onye-nwem,

Neme ka m’biri na ntukwas’obi. Amen.

 

 

The Lord is in His holy temple.                                           

Abu 345- Onye-nw’ayi no n’ulo ukwu Ya di nsọ

Onye-nw’ayi no n’ulo ukwu Ya di nsọ;

Onye-nw’ayi no n’ulo ukwu Ya di nsọ;

Dere du n’iru Ya, gi uwa nile;

Dere du n’iru Ya gi uwa nile. Amen

 

God is Spirit

Abu 346- Chineke bu Mọ: ndi nekpere Ya

Chineke bu Mọ: ndi nekpere Ya

Nime Mọ n’ezi’okwu gekpere Ya.

Gi, Onye nebi n’ebe kasi nsọ,

Biakute ayi mgbe ayi nabiakute I.

 

 

Let Thy mercy, O Lord.

Abu 347- K’ebere-Gi, Nna, nonyer’ayi

 

K’ebere-Gi, Nna, nonyer’ayi

Mgb’ayi napu n’ulo nsọ nka;

Cheb’ayi pua n’ih’ojo nile,

K’ayi nagb’oso ndu nk’igwé;

Haleluya!

Haleluya!

Rue mgb’ayi gahu iru-Gi. Amen.

 

 

Great God, Who knowest each man’s need.

Abu 348- Chineke, Onye mara nkp’ayi,

 

Chineke, Onye mara nkp’ayi,

Chebe ayi n’ura, gozie ayi;

Gbahara nmehie-ayi nile,

Debe ndi-oru-I n’udo-Gi.

N’ihi olu nile nke ta,

Ayi ekele I, nel’any’echi;

Kraist, ziter’ayi ihu-n’anya-I,

K’ayi nile nye Gi otuto. Amen.

 

 

 

Grant, we beseech Thee, merciful Lord.

Abu 349- Ayi nario Gi, Nna nk’ebere,

 

Ayi nario Gi, Nna nk’ebere,

K’I nye ndi kwere na Gi

Ngbahara nmehie-ha, n’udo,

K’ewe sachapunjo-ha.

Otu a ka ha gewere kwa

Uche di ezi nwayọ

Nejere I ozi, site na

Jisus Kraist, bu Onye-nw’ayi. Amen

 

 

Now, Father, we commend.

Abu 350- Nna, ayi rara onw’ayi

Nna, ayi rara onw’ayi

Nye n’aka-Gi; biko,

Nonyer’ayi, cheb’ayi, me k’ayi no

N’udo rue ututu. Amen.

 

Abu 351- K’amara nk’Onye-nzoput’ayi

 

K’amara nk’Onye-nzoput’ayi,

Na ihu-n’anya nke Nna,

Nyere iru-oma Mo Nso,

Si n’elu dikwasi ayi.

Otu a k’ayi nile n’Onye-nw’ayi

Biko nim’idi-n’otu;

Nenwe onu nime nnweko

Nke uwa napugh inye. Amen

 

Abu 352- Tutu ayi agbasa

 

Verse 1

Tutu ayi agbasa

K’ayi tobe aha Jisus!

K’ora nile n’uwa

Tobe Ya n’otu olu.

 

Chorus

Jisus, Enyi ndi-njo,

K’ayi nasopuru Ya,

N’obi ihu-n’anya,

Net ya ebigh-ebi.

 

Verse  2

Jisus, okwu nke-Gi

Gabu nri nke obi-ayi;

Ayi gefegide Gi

K’ayi nadi ndu n’uwa nka.

Amen


 

Abu 353- To Chineke, Onye-ngozi

 

To Chineke, Onye-ngozi,

To Ya, ihe nile n’uwa;

To Ya, usu nke di n’igwe,

To Nna, n’okpara, na Mo Nso.

Amen

 

Abu 354- Otuto diri Chukwu: Nna

 

Otuto diri Chukwu: Nna,

Okpara, na Mo Nso;

K’o diri mbu, o di ugbu a,

O gadi mgbe nile.

Amen.

 

Abu 355- Chukwu, no n’isim

 

Chukwu, no n’isim,

No kwa nime nghota nkem.

Chukwu, no n’anyam,

Na n’ile-anyam,

Chukwu, no n’onum

Na n’ikwu-okwum.

Chukwu, no n’obim,

Na n’iche-uchem.

Chukwu, no n’onwum,

No kwa n’ila-alam.

God bless you and keep you 

Abu 356- Chukwu gozie gi, debe gi

 

Chukwu gozie gi, debe gi:

Chukwu me iru-Ya k’O mukwasi I,

Me-kwa-ra gi amara:

Chukwu bulie iru-Ya n’aru-gi, nye gi udo.

Amen.


 

 

*CHORUS

Abu 357- Neto Jisus! Neto Jisus!

 

Neto Jisus! Neto Jisus!

O nasachapu nmehie

Nime obara nke-Ya.

Neto Jisus! Neto Jisus!

Ayi nwer’onu mgbe nile

Nime Jisus.

 

Abu 358- Rionu, agenye kw’unu

 

Rionu, agenye kw’unu;

Chinu, unu gachota kwa;

Kuanu, agemeghe-kwa-r’unu:

Nwen’okwukwe na Chukwu!

 

Abu 359- Ubochi ok’onu

 

Ubochi ok’onu!

Mgbe Jisu sachapurum njom.

O zirim ikpe ekpere,

Na inuri ubochi dum.

Ubochi ok’onu!

Mgbe Jisus sachapuru njom.

 

Abu 360- Nano nso Jisus

Nano nso Jisus!

Nano nso Jisus!

Nano nso Jisus mgbe nile!

N’ehihie, n’abali, esihiela uzo;

Nano nso Jisus mgbe nile.

 

Abu 361- Kraist di ndu nimem!

 

Kraist di ndu nimem!

Kraist di ndu nimem!

Nka bu nzoputa oma:

Na Kraist di ndu nimem!

 

 

Abu 362- O bu ezie! obu ezie!

 

O bu ezie! obu ezie!

O siwo n’onwu bilite;

Jisus bu Onye-nzoput’ayi;

O nwuru n’ihi ayi nile;

M’O siwo n’onwu bilite;

Ugbu a O nebi n’el’igwe.

 

Abu 363 – ibu njom, ibu njom

 

Ibu njom, ibu njom,

Ibu aro nke obim,

Gakporepu n’ob’ebe

Akpogburu Jisus!


 

Abu 364- Anameri ezi nri nke ndu

 

Anameri ezi nri nke ndu,

Anamanu miri is’iyi;

Jisus si, “Onye ganu miri nka,

Akpir’agag-akpo ya nku ozo.”

 

Abu 365- Anamabia ososo

 

“Anamabia ososo:”

Otu a ka Jisus kwere nkwa;

Ndi huru Ya n’anya gaza,

“Amen: bia, Onye-nw’ayi Jisus.”

 

Abu 366- Enyi kachasi nma bu Jisus!

 

Enyi kachasi nma bu Jisus!

Enyi kachasi nma bu Jisus!

O genyere gi aka,

O ganu kwa olu-gi:

Enyi kachasi nma bu Jisu!

 

Abu 367- Nani Kraist gegbo nkpam ugbu a

 

Nani Kraist gegbo nkpam ugbu a,

Enweghm onye ozo;

Ihu-n’anya, na ndu, n’onu,

Ka m’huru na Jisus.



SONGS BY THE IGBOS

 

GOD THE FATHER

Abu 368- Nna nk’ihu-n’anya

 

Verse 1

Nna nk’ihu-n’anya, Gi

B’Onye-nwe ndu;

Gi pur’isi n’elu

Nye ya Ugbu a.

Ndu nke di omimi,

Bu ezi ndu;

Ndu nke nadigide

mgb’ebigh-ebi.

 

Verse 2

K’uch’ayi nadi ohu

Kwa-ubochi;

Sacha njo zor’ezo,

‘ayi ghar’ida.

Ndu nke-Gi zur’ezu

Di kwa ohu;

Site n’aka ohu;

Site n’aka nke-Gi

K’ayi nwe ngozi.

 

Verse 3

Nna nk’ihu-n’anya,me

K’ayi namata

Ka I si nakpo ayi

Kar’ihe dum:-

K’ayi fe Gi ofufe,

Nekp’ekpere,

Eb’ayi nwere ndu-Gi

Nk’ebigh-ebi. Amen.

 

Abu 369- Chineke bu Ony’Okike

 

Verse 1

Chineke bu Ony’Okike;

O kere ihe dum;

N’igwe nile n’uwa nile

K’agahu olu-Ya.

 

Verse 2

K’ayi gua ihe ole-n’ole

N’etiti olu-Ya;

N’ihi n’ebigh-ebi ezugh

Iguko ha nile

 

Verse 3

Na mbu O si, “Ka ihe di”:

Ma, le, ihe we di;

O kere mbara el’igwe,

Ke kwa al’akoro.

 

Verse 4

O kere osisi nile

Nke di nim’ok’hia,

Yikwasi ha nma dik’uwe

Na mkpuru di’ich’iche.

 

Verse 5

Lekwasi anyanwu anya,

Onwa, na kpakpando:

I gatu egwu-Ya kari,

Bu Chukwu-Okike.

 

Verse 6

O ker’anu nakpu akpu,

N’an’ufe di n’elu;

O kpu’olu-Ya okp’eze

Site n’ikpu madu.

 

Verse 7

Madu nka k’O yikwasiri

Nghota n’amam-ihe,

Ka madu we me uche-Ya,

Bu Onye kere Ya.

 

Verse 8

K’uwa rapu npako-ya, we

Sopuru Chineke,

K’o we diri ya nma ugbu a,

We rue mgb’ebigh-ebi. Amen.


 

 

 

 

BIRTH OF JESUS

Abu 370- Jisus, Nw’amuru ta

 

Verse  1

Jisus, Nw’amuru ta

N’obi di um’ala,

Ibu Onye-nzoputa nke madu,

K’I were Chukwu

Gosi ora madu.

 

Chorus

Bianu, soro tobe Ya;

Bianu, soro tobe Ya;

Bianu, soro tobe Ya, Kraist,

Eze-ayi!

 

 

Verse 2

Mgb’amuru Gi n’uwa,

O bugh n’ok’ebube;

M’amu-kwa-ra Gi dika ogebye;

Ulo nke anu

K’eb’obibi-Gi di.

 

Verse 3

Kpakpando putara,

Nke kor’akuku-Gi

Gwa ndi mar’ihe n’amuru Eze;

Ha si n’ulo-ha

Bia kpo isi ala.

 

Verse 4

Ndi-nche no n’ozara

Neche aturu-ha,

Ha huru ihe-Gi nenwusa ha;

M’ozi ziri ha

Ozi-oma nk’udo.

 

Verse 5

Ha jere Betlehem

Otu agwara ha;

Ha nyere Chineke, Nna, otuto

N’ihi amara

Nke O mere madu.

 

Verse 6

Usu nke ndi-m’ozi,

Mhb’amuru Gi, Eze,

Bur’abu otuto nye Chineke:

“Otuto n’elu,

Udo di n’el’uwa.”

 

Verse 7

Kraist, Onye-ndumodu,

Ta k’ayi nekele Gi

Na I ji ihu-n’anya bia n’uwa:

Chukwu bu Dike,

Onye-isi udo.

 

Verse 8

Jisus, ayi neto Gi,

Nwa, Ony’amuru ta,

Neto Gi, Eze nk’uwa n’el’igwe;

K’ayi soro ndi nso

Na’yo mgb’ebigh-ebi. Amen


 

                                                                 

Abu 371- Baba, baba, Ihe’oma 

 

Verse 1

Baba, baba,    Ihe’oma,

Nne, nne, nne, nne,   Ih’oma,

Ge kwa nti ka m’gwa gi    Ih’oma,

Ihe mere n’uwa,    na mgb’ochie,

Di kw’iju-anya,   Ih’oma.

 

Chorus

Chinek’ukwu

Kel’Ez’ayi, kel’Ez’ayi, kel’Ez’ayi.

Ony’bube,

Kel’Ez’ayi, kel’Ez’ayi, kel’Ez’ayi.

Nna ukwu,

Kel’Ez’ayi, kel’Ez’ayi, kel’Ez’ayi.

Onye-ndum-odu,

Kel’Ez’ayi, kel’Ez’ayi, kel’Ez’ayi.

 

Verse 2

Ndi-nch’aturu,    Ih’oma,

No n’ozara,    Ih’oma,

N’abali ahu,    Ih’oma,

Ha we le anya,    Ih’oma,

M’ozi ridata,    Ih’oma,

 

Verse 3

O we si ha,   Ih’oma,

Atul’egwu,    Ih’oma,

Ozi ahu bu,    Ih’oma,

N’amur’Eze-ayi,   Ih’oma. Amen.


 

 

DEATH OF JESUS

 

Abu 372- Jisus biara ka O gbaput’ayi

Verse 1

Jisus biara ka O gbaput’ayi;

Ufodu madu we kpo Y’asi,

Nihi na O neme ez’ihe;

Ha we kpogbue Ya n’el’osisi.

 

Chorus

O no n’elu obe,

Bu ezi Onye-nw’ayi,

Nahu ok’ahuhu.

 

Verse 2

Onu apugh ikwu ahuhu

Na ihe-nwuta di ich’iche

Nke Kraist Onye-nw’ayi nagidere,

K’O we topum n’agbu Ekwensu.

 

 

Verse 3

Le Jisus kO no n’el’osisi!

Ihe-ihere di ich’iche

Nke ndi ajo madu mere Ya;

Onye-nw’ayi nwere natchi-obi.

 

Verse 4

Le apa-ntu anya n’aka-Ya,

N’ube ha mara Ya n’akuku!

Ha nyere Ya manya gbar’uka:

Jisus nagidere ihe dum.

 

Verse 5

Jisus rioro Chukwu aririo

K’O gbahara ndi kpogburu Ya,

Ebe h’amagh ihe ha neme.

I huwo ihu-n’anya Jisus?

 

Abu 373- Enyim, bia, nu akuko

 

Verse 1

Enyim, bia, nu akuko

Nke ihu-n’anya uku.

 

Chorus

Jisus nwuru, O nwuru,

N’ihim, gi, na madu dum.

 

 

Verse 2

Madu nile bu ndi-njo

N’anya Chineke di nso.

 

Verse 3

Jisus, Okpara nke Nna,

Huru ayi n’anya ri-nne.

 

Verse 4

Jisus biara n’uwa nka

K’O we zoputa ndi-njo.

 

Verse 5

Madu kporo Ya asi,

O bu ezie n’O di nma.

 

Verse 6

Akpogburu Ya n’obe

N’ihi ayi, bu ndi-nmehie.

 

Verse 7

Jisus Kraist di no ike

Izoputa gi onwe-i.

 

Verse 8

Nwa-nnem nwoke, nwa-nnem nwayi,

Biko, kwere Ya ugbu a. Amen.


 

Abu 374- Ubochi nk’ir’uju

 

Verse 1

Ubochi nk’ir’uju!

Jisus no n’el’obe

Nahu ok’ahuhu

N’ihi ayi ndi-nmehie.

 

Verse 2

Nelegide Y’anya,

Bu Onye nenwegh njo!

O natachi obi

N’ihi ayi ndi’nmehie.

 

Verse 3

O bu nmehie madu

K’O nebupu n’obe;

O kwer’inwu anwu

N’ihi ayi ndi-nmehie.

 

Verse 4

Amara Ya ube,

Nemegh ih’o bula;

M’emere ihe ndia

N’ihi ayi ndi-nmehie.

 

Verse 5

Biko, kwere na Ya,

B’Onye nwuru n’obe!

O ji ebere nwua

N’ihi ayi ndi-nmehie. Amen.

 

 

CHRIST RESURRECTION

Abu 375- ALELUYA! ALELUYA! ALELUYA!

 

Verse 1

ALELUYA! ALELUYA! ALELUYA!

K’ayi nuria onu n’ezie ta;

Kraist esiwo n’onwu bilie,

Wetar’uwa ngbahara njo:

Aleluya!

 

Verse 2

Kraist b’Onye mbu nke biliri,

O meriri onwu n’ili;

K’ayi ghar’itu egwu ozo:

Aleluya!

 

Verse 3

Ike onwu agwuwo ta,

Ili adigh ire ozo;

Otuto diri Eze-ayi!

Aleluya!

 

Verse 4

Kraist, Onye-oma, di ndu ta,

Onye-nzoput’ayi biliri;

K’ayi nuria onu nime nka:

Aleluya!

 

Verse 5

Uboch’ato k’O no n’ili,

We si n’onwu bilie ozo,

Nye-Ya ike nblilite:

Aleluya!

 

Verse 6

Nmehie enwegh ike ozo,

Ike nk’Ekwensu adawo;

Tobenu O-meri-onwu:

Aleluya!

 

Verse 7

Otuto, n’ebube, n’ike,

Diri Kraist, Ony’ayi neto ta;

Kraist, Onye-nmeri, bu Eze:

Aleluya!  Amen.


 

 

ADVENT

Abu 376- N’uboch’analegh anya-Ya

 

Verse 1

N’uboch’analegh anya-Ya,

Ka Jisus Onye-nw’ayi gabia;

O digh ony’o bula mara

Mgbe Jisus Onye-nw’ayi gabi.

 

Chorus

Dika ony’ori si abia n’abali

Ka Jisus Onye-nw’ayi gabia;

N’oge dikari nta, n’otu ntabi’anya

Ka Jisus Onye-nw’ayi gabia.

 

Verse 2

Dik’amuma mgbe o gburu,

Ka Jisus Onye-nw’ayi gabia;

Mgbe-njikere agagh-adi

Mgbe Jisus Onye-nw’ayi gabia.

 

Verse 3

Ndi b’ozu geb’uzo bilie,

Mgbe Jisus Onye-nw’ayi gabia;

Ayi ganu opi Chineke,

Mgbe Jisus, Onye-nw’ayi gabia.

 

Verse 4

Umu hineke, niche nche

Mgbe Jisus Onye-nw’ayi gabi;

K’ayi nile zute Ya n’elu,

Mgbe Jisus Onye-nw’ayi gabia. Amen.

 

HOLY BIBLE

Abu 377- Nna, meghe obi-ayi

 

Verse 1

Nna, meghe obi-ayi

Inu okwu nke-Gi;

Ka site n’ime ya

ayi we bur-umu-Gi.

 

Verse 2

Wepu adigh-ike

Nke netufu okwu-I;

Tinye Mo Nso nke-Gi

Nim’obi-ayi nile.

 

Verse 3

Me k’ayi debe okwu

Nke ayi ganu ugbu a;

Chup’ajo ony’ahu

Nke narafu ndi-Gi.

 

Verse 4

Zitere ayi Mo Nso,

K’O nezi ayi kari

Ime uche nke-Gi

N’ikwere Ozi’oma. Amen.

 

Abu 378- N’ulo-Gi, Chineke

Verse 1

N’ulo-Gi, Chineke,

Nodu nso ayi;

N’ebe ayi zukoro,

Nodu nso ayi.

Me k’ayi kwuputa njo

Nim’okwu, n’echiche,

N’omume-ayi nile:

Nodu nso ayi.

 

Verse 2

Nye ayi k’ayi nuwe nu

Okwu-nso-Gi;

Nye ayi obi-nghota

N’Okwu-nso-Gi.

Ka Testament abua

Buru ogwu  d’ire

N’isachapu njo-ayi:

B’Okwu-nso-Gi.

 

Verse 3

K’ayi were obi-ayi

To aha Gi;

Egbugbere-onu

Agagh-ezu.

K’Ab’Om’ayi nagu,

N’abu nke ayi nabu,

Ka ha dum negosi

Otuto-Gi.

 

Verse 4

Ayi geji ekele

Biarue nso Gi;

Nime ekpere-ayi

Biarue nso ayi!

Chineke, ekwela

Ka ihe o bula

Gbochie ony’o bula

N’ibia nso Gi.

 

Verse 5

Mgb’ayi lara n’ulo-ayi,

K’nefe Gi;

N’okwu na n’omume,

K’ayi nefe Gi.

Ka ndu-ayi n’uwa nka

Di otu I sic ho,

K’ayi we rue n’el’igwe,

Fe Gi mgbe dum. Amen.

 

Abu 379- Chineke, me k’okwu-Gi

 

Verse 1

Chineke, me k’okwu-Gi,

Nk’aghara n’obi-ayi,

We pue, mi kwa nkpur’oma

Nke ndu ebigh-ebi;

Ka mgb’ayi galata n’igwe,

K’I kele ayi”Ndewo!”

Ayi we biye-kwa-ra Gi

Dika ezi ndi-Gi..

 

Chorus

K’ayi bua Aleluya,

K’ayi kele Chineke,

N’ihi ih’oma nile nke O

mere ayi!

K’ayi tobe Chineke

N’ihi okw’oma-Ya,

Nke O nyere madu k’ayi we

rie, di kwa ndu.

 

Verse 2

Ekwela ka Ekwensu

Tuturie okwu-Gi,

Nk’agahr’ugbu a n’obi-ayi,

Nke ndu ebigh-ebi;

Mo Nso, bu Ony’ozizi

Ih’omimi Chukwu,

Biko, deb’okwu-nso nka

Nime obi nke-ayi.

 

Verse 3

Chukwu, ayi efesiwo

Ofufe-auyi nke ta,

We jiker’ila n’ulo,

N’etiti ndi’ulo-ayi;

Biko, bur’Onye-ndu-ayi

N’ilus’Ekwensu ogu:

Ndi o ji me ih’olu

D’ike, ba kwa uba.

 

Verse 4

Chineke, biko, nara

Ofufe-ayi nke ta;

Gbaghar’ih’ojo nile

Ayi mere n’ulo-Gi;

Biko, gozie ayi n’ebea,

Gozie madu nile;

Gozie ndi b’umu-nne-ayi,

Ndi no n’ulo niche. Amen.


Abu 380- Mo so nke ihu-n’anya

 

Verse 1

Mo so nke ihu-n’anya,

Onye si n’el’igwe bia

K’I we nye ndi otu-Gi

Onyinye nke di ngozi:

Biko, bia n’ebe a ozo,

Ebe, umu-I nezuko.

 

Verse 2

Site na Baptism nke-ha,

N’ubochi nile rue ta,

Gi bu ezi onue-ndu,

Ony’ike nadigh-agwu;

Site ta we rue n’onwu

I ganabu Enyi-ha.

 

Verse 3

Nye ha ihe ka ha hu,

Nye kwa ndu n’ezi-okwu;

Doputa ha n’onwunwa,

Ka ha ju njo kw’ubochi;

Nye ntach’obi n’okwukwe,

N’ikp’azu nye okp’eze! Amen.

 

Abu 381- Chineke nke ebere

Verse 1

Chineke nke ebere,

Buru olu umu-Gi;

Ka iru-Gi mukwasi

Obi nke ndi-Gi nile.

 

Verse 2

Biko, me k’ayi necheta

Na Kraist biara n’ihi ayi,

K’O we sachapu njo-ayi,

K’ayi na Gi we di n’udo.

 

Verse 3

Zitere ayi Mo Nso-Gi

Ime k’obi ayi di oku,

K’ayi we necheta mgbe dum

Ihu-n’anya ukwu-Gi.

 

Verse 4

Mgbe obi-ayi gakpafu

N’uzo nk’ezi-omume,

Biko, were amara-I

Nedughachi ayi n’udo. Amen.


Abu 382- Chukwu, nyere ayi aka

Verse 1

Chukwu, nyere ayi aka

K’ayi nwe ihu-n’anya;

Nime ndu-ayi n’uwa nka

K’ayi nwe ihu-n’anya.

Mgbe madu nesogbu ayi,

Nacho k’ayi rapu Gi,

Cheta n’ihe nakp’ayi bu

K’ayi nwe ihu-n’anya.

 

Verse 2

Ayi g’edebe iwu-Gi

Mgb’ayi nwer’ihu-n’anya;

Okpu-eze gabu nk’ayi

Mgb’ayi nwer’ihu-n’anya.

Na nhuj’anya n’onwunwa

N’ize-ndu na nkpagbu,

Ayi gad’ike mgbe nile

Mgb’ayi nwer’ihu-n’anya.

 

Verse 3

Mo Nso, biko, duru ayi

Rue n’al’eze nk’igwe;

K’ayi je ije-ayi n’udo

Rue n’al’eze nk’igwe.

K’ihu-n’any’ayi di oku

Nk’ayi geji ga n’uzo;

Otu a k’ayi gananuri

Rue n’al’eze nk’igwe. Amen.


 

 

Abu 383- Chineke, biko, chebe

Verse 1

Chineke, biko, chebe

Ndi nk-Gi oge nile:

Ozizi di ich’iche

Juputar’uwa ugbu a.

 

Verse 2

Kpobata madu nile,

Ndi kpafuru n’ezi’okwu-I;

K’ochicho nk’anu-aru

Ghara imeri nke-Gi.

 

Verse 3

Ndi nacho uzo-I n’ezie,

Nye ha amara nke-Gi,

Ka ha ghota ezi’okwu-I,

We neme uche-nso-Gi.

 

Verse 4

Nye ndi-ozi-Gi nile,

Ihu-n’anya-Gi n’uba,

Ka umu-aturu-Gi

We nana nti n’olu-ha.

 

Verse 5

K’omiko-Gi di ukwu

Gboro ndi-Gi nkpa nile;

Ka olu-ebere-Gi

Newetar’ayi ok’uru. Amen.

 

 

FOLLOWING CHRIST

Abu 384- Ayi nacho ihu Jisus

Verse 1

Ayi nacho ihu Jisus,

Nk’amuru n’ul’anu,

K’O si wedat’Onwe-ya:

Onye-nwe ndi-eze.

K’ayi hu Ya, k’ayi hu Ya,

K’ayi hu Ya n’ul’anu,

Soro  Ya wedat’onw’ayi,

K’O we dub’ayi n’igwe.

 

Verse 2

Ayi nacho ihu Jisus,

K’O neto n’amara

N’amam-ihe kwa n’ebe

Chukwu na madu no.

K’ayi hu Ya, k’ayi hu Ya,

K’ayi hu Ya k’O neto,

Soro Ya to n’amara,

K’O we dub’ayi n’igwe.

 

Verse 3

Ayi nacho ihu Jisus,

K’O nagwo ndi-oria,

K’O negos’ihu-n’anya

N’ebe madu dum no.

K’ayi hu Ya, k’ayi hu Ya,

Hu ihu-n’anya-Ya;

K’ayi negos’ihu-n’anya

N’ebe madu dum no.

 

Verse 4

Ayi nacho ihu Jisus,

Ya na ndi-ozi-Ya,

Ka ha nekwusa Ozi

Nk’al’eze Chineke.

K’ayi hu ah, k’ayi hu ha

Nekwusa Ozi’oma,

K’ayi we sonye n’oyu-ha,

K’al’eze-Ya we bia.

 

Verse  5

Ayi nacho ihu Jisus,

K’O no n’elu obe,

K’ayi nwua n’ebe nmehie di,

Di ndu n’ezi omume.

K’ayi hu Ya, k’ayi hu Ya,

K’ayi hu Ya n’el’obe,

Soro Ya bilie n’onwu,

Soro Ya la n’igwe. Amen.


 

Abu 385- Ayi aghagh igabiga

Verse 1

Ayi aghagh igabiga

Otutu nkpagbu n’uwa,

We ba n’al’eze Chukwu,

Nke bu nani ezi’udo.

 

Verse 2

K’ayi zitu ibu nile,

Chupu njo ndi n’aru-ayi,

K’ayi gbaba oso nke ndu,

Nk’edebere n’iru ayi.

 

Verse 3

K’ayi soro nahuj’anya

Dik’ezi ony’ogu Kraist,

Nke bu onye zur’oke

Nim’ahuhu di ukwu.

 

Verse 4

Mgbe ayi husir’ahuhu,

O foduru nwa oge,

Onye kpor’ayi, bu Chukwu,

Geme ayi ndi zur’oke.

 

Verse 5

Udo diri umu-nn’ayi,

Ihu-n’anya, n’okwukwe,

Site n’aka Chineke,

N’Okpara-Ya, Jisus Kraist. Amen

 

Abu 386- Eguzowom n’on’uz’obi

Verse 1

Eguzowom n’on’uz’obi,

Eguzowom n’on’uz’ obi,

Onye obula nke ge meghe uzo,

Agamabakute Ya.

 

Verse 2

Onye ahu nemeri,

Onye ka M’genye

Nkpuru si n’osisi nke ndu ka o rie,

Bu nke di na Paradais.

 

Verse 3

Onye ahu nemeri,

Onye ahu nemeri,

Aghagh-emejo ya site n’aj’onwu,

Bu onwu nk’abua ahu.

 

Verse 4

Onye ahu nemeri,

Agenye y’aha ohu,

Nke o digh ony’obula matara ya,

M’obugh onye nara ya.

 

Verse 5

Onye ahu nemeri

Geyi uwe di ocha;

Aha-ya ka M’gekwuputa n’iru Nnam,

Na n’iru ndi-m’ozi-Ya.

 

Verse 6

Onye ahu nemeri,

Onye ahu nemeri,

Agamekwe, k’o nonyerem n’och’ezem,

Dika Mu nonyere Nnam. Amen.

 

Abu 387- Jisus, Eze neme udo

Verse 1

Jisus, Eze neme udo,

Nke negbochi njo-ayi nile,

O bu Gi k’ayi nakpoku ta:

Nuru aririo ayi nario.

 

Verse 2

N’ubochi nile gar’aga,

N’ihi ekwegh-ekwe nke-ayi,

Ayi rapuru is ouzo-I:

Kraist, agbakutal’ayi azu.

 

Verse 3

Ndi nile zukoro n’ebe a

Wetara anya-miri-ha,

Nacho k’I kasie ha obi:

Onye-nw’ayi, nanonyere ha.

 

Verse 4

Nonyere ayi nim’olu-ayi;

N’ebe o bula nk’ayi gano

Kwe k’ayi nile necheta Gi,

Onye mazuru ihe dum.

 

Verse 5

Nn’ayi, gozie ayi nile n’ebe a,

Nye ayi Mo Nso Nke gedu ayi

Iwere Ozi-Oma-Gi

Zi ndi nke nakanugh okwu-I.

 

Verse 6

K’okwu nile nke onu-ayi,

Na ntughar’uche nk’obi-ayi,

Bur’ihe di uto n’iru-I,

N’oge nka we rue mgbe nile. Amen.


 

 

PRAYER

Abu 388- Nka bu oge ekpere

Verse 1

Nka bụ oge ekpere,

Ayi biar’igbu ikpere,

Ayi nile bu ndi-nmehie;

Nuru olu-ayi.

 

Verse 2

Mgb’ochie nmehien di uto,

Obi-ayi di aghugho,

Ihe nile joro njo:

Nuru olu-ayi.

 

Verse 3

Ma ugbu a ayi dum nanu

Olu ukwu Kraist luru,

K’O si cho ndi fur’efu:

Nur olu-ayi.

 

Verse 4

Site n’Okwu O kwuru,

N’ihi Okpara O bu,

N’ihi onwu nk’O nwuru:

Nuru olun ayi.

 

Verse 5

Kwa’ubochi k’ayi nanwa

Irap’uzo Ekwensu,

K’ayi so Kraist na okwu-Ya:

Nuru  olu-ayi.

 

Verse 6

Ayi zubere ez’ihe,

Ma ih’ojo k’ayi neme;

Biko, mer’ayi ebere:

Nuru olu-ayi.

 

Verse 7

Nedu ayi nim’uwa nka,

Ka mgbe ayi nile gala,

K’ayi rue ulo-I n’udo, Nna:

Nuru olu-ayi. Amen.


 

EVANGELISM

Abu 389- Umu-nnam, unu bia ge nti

Verse 1

Umu-nnam, unu bia ge nti

N’ozi-oma, ozi Chukwu,

Nke ayi nile zukoro ta

Ikwusa ya n’akuku dum.

 

Verse 2

Ndinyom, unu nile bia kwa,

Ozi ahu di-kwa-r’unu;

O digh onye gagonari

Ez’ihu-n’anya nke Chukwu.

 

Verse 3

Umu-nta, obi obi-oma,

Jisus nwer’ozi nye unu:

Nwat’O bula nwer’olu-ya,

Olu ihu-n’anya nke ya.

 

Verse 4

Ozi nka bu IHU-N’ANYA,

Nke Jisus ji nario ayi dum.

Gini ka unu nechere?

Jisus nacho izop’unu. Amen.

 

Abu 390- N’ihi na Chukwu hur’uwa n’anya

 

Verse 1

N’ihi na Chukwu hur’uwa n’anya,

K’O ji we nye otu Okpara-Ya

Nke O mutara, n’ihi ayi nile;

K’onye o bula nke kwere na Ya

We ghara ila n’iyi, kama ya

K’onye ahu nwe ndu ebigh-ebi.

 

Chorus

Chineke-ayi bu ihu-n’anya:

K’ayi nahurita onw’ayi n’anya;

Chineke-ayi bu ihu-n’anya:

K’ayi nogide kwa n’ihu-n’anya.

 

Verse 2

Chineke bu uzo hu ayi n’anya;

O bugh ayi huru Chineke n’anya,

Ma Ya onwe-ya huru Chineke n’anya,

Zie Okpara-Ya k’O buru aja

Ijuru Ya obi n’ihi njo-ayi,

Na n’ihi nmehie nke uwa nile. Amen.


 

Abu 391- Onye gewer’onwe-ya nye Chineke

 

Verse 1

Onye gewer’onwe-ya nye Chineke?

Jisus nacho ndi geje

Gebur’okwu nke ndu gwa ora madu:

Nwa-nnem, zam ma I geje?

 

Chorus

Okwu nke ndu!

Neburu okwu nke ndu.

Anah’unu k’oriona nim’uwa,

Neburu okwu nke ndu.

 

Verse 2

Eji onu-ahia we gbata unu,

Unu enwegh onw’unu:

Onye-nwe-i

nakpo I k’I rap’ihe nile

Soro Ya nalu olu.

 

Verse 3

Unu bu ndi ji Chineke ok’ugwo,

Ji kwa madu-ib’unu;

Kwue m’unu gesso Nw’aturu, bu Jisus,

N’ebo bula O neje? Amen.

 

 

 

CHILDREN

 

Abu 392- Nnam. nuru ekperem 

 

Verse 1

Nnam. nuru ekperem

Tutu m’zuru ike;

O bum, nwa-nta nke-Gi,

Biko, nyem ngozi nke-I.

 

Verse 2

Gbahara njom nile,

Kwe ka m’raru ura

N’udo n’abali nka,

We rue mgbe chi gabo.

 

Verse 3

Nyerem aka mgbe dum

Ka m’nahu Gi n’anya,

Ka m’neme kwa uche-I

Kari ka m’si eme.

 

Verse 4

Nnam, lekwasim anya

Tutu m’zuru ike;

O bum, nwa-nta nke-Gi,

Biko, nyem ngozi nke-I. Amen.

 

Abu 393- Gini k’umu-nta genye

 

Verse 1

Gini k’umu-nta genye

Onye-nw’ayi Kraist Jisus ta,

N’ihi ebere-Ya dum,

N’ihi ngozi O nenye?

Ihu-n’anya di ukwu!

Ebere di ok’onu!

Ha genye Ya obi-ha,

O geme ka ha di’ocha;

Ha genye Ya onyinye

O bula nke ha nwere.

 

Verse 2

Gini k’umu-nta geme,

N’inye Jisus onyinye,

Onye nke nechebe ha,

Onye nke nenye ha nri?

Ebube nke di ukwu

Amara di ok’onu,

K’O ji nagozi ha dum.

Gini k’umu-nta geme?

Ha geto Ya otuto

N’ihi n’O nenye udo.

 

Verse 3

Gini k’umu nta geji

Aka-ha n’ukwu-ha me?

Onu-ha gekwu gini

Igosi ihu-n’anya?

Ha ganagu Bible Nso,

Ha ganeso kwa uzo

Kraist Jisus, Onye-nwe-ha,

Nakpoku aha nke-ya;

Ka ha bia so Jisus ta:

Ha geso Ya la n’igwe. Amen.


 

THANKSGIVING

 

Abụ 394. Chukwu dị nsọ, ayị ekele I

‘I kpubewoo arọ nke ezi ihe Gị okpu eze; Ụzọ Gị niile na-atasasịkwa abụba.’’ Abụ Ọma 65.11.

 

Verse 1

Chukwu dị nsọ, anyị ekele I

Ka I si we nagb’ayị ume,

Nye kwa’ayi arụ ike na nka

Ayị ji lụ ọlụ ubi ayị.

 

  1. Anyị nekelekwasị Gị, Nna,

N’ihi ike nk’I nyere anyị

Iwe owuwe ih’ubi,

N’ọṅụ, n’udo, n’arụ-ike.

 

  1. Ugbu a bụ oge oriri,

Obi’ụtọ k’anyị ji zukọta

Ịrịọ Gị k’I nọnyere anyị

N’it’egwu, n’oriri, n’ọṅụ.

  1. Otuto niile dịrị Nna,

Dị-kwa-r’Ọkpara Ya dị nsọ,

Na Mọ Nsọ, ezi Onye-ndu,

We rue n’ụwa ebigh-ebi.  Amen.

 

Abu 395- Ekelem Gi, Nnam, Chinekem

 

Verse 1

Ekelem Gi, Nnam, Chinekem,

Otutu ihe K’I nyerem,

Abum nwa nke-Gi, lekwasim,

Nara ekelem Onye-nwem.

Obim nanu onu nk’ukwu,

Nabukuru Gi n’ezi’abu.

Ahuwom ubi na nkpuru-ya, na nri k’o bu,

Imewo.

Ahuwom akwukwo nepu ohu, uto k’obu,

O di nma.

Ahuwom nnunu n’anumanu, n’azu-ndu kwa,

I kere ha.

Ahekere na ji, Manu n’akidi, Nkwu na oji,

Osisi nile na nkpuru ha nami kw’aro,

Neto Gi, Ony’oma, Ony’ebube!

 

Verse 2

Nd’uzu nakpu ogwuji,

Ih’ozo aneji n’olu ubi,

Umu-nwayi nakp’ute na nkata,

Osisi ka ndi-nka nalu kwa,

Ndi nagbaso ihe ndi-beke,

Nma k’olu di n’anya-Gi.

I huwo ihe Chukwu kere, n’otuto k’o bu?

To aha-Ya.

I huwo nmeso oma-Ya, n’o di ukwu?

Gozie Ya.

I huwo n’amara-Ya di ebigh-ebi?

Cheta nka.

O nyer’ayi umu, Imu-nn’ayi n’eyi,

N’ihu-n’anya-ha,

Gozienu Chukwu n’ebe nile O nachi,

Chinekem, Onye-nwem, Nonyerem!


 

Abu 396- Ta k’ayi nile nanuri

Verse 1

Ta k’ayi nile nanuri,

Ayi nenwe ih’oriri;

Ayi nekele Chukwu-ayi

N’ihi olu O lur’ayi.

Bianu, sor’ayi kele Ya:

Ya ker’el’igwe n’ala,

Nye kwa ayi miri n’anwu,

K’ayi rie ihe yi luru.

 

Verse 2

Ayi neso iwu ukwu

Chineke nyere ndi-Ju,

Ka ha nile neweta,

Tutu er’ih’o bula,

Nkpuru mbu nke mara nma,

Che ya n’iru Chukwu-ha,

K’o buru ih’ekele

Nye Gi, Onye nyer’enye.

 

Verse 3

Chukwu, ayi ekele Gi,

O bugh nani n’ihi nri,

M’ayi necheta onyinye

Kariri ndu-ayi nile:

Jisus, Onye-nzoput’ayi,

Onye nwuru n’ihi ayi:

Ya k’ayi Ji nario Gi, Nna,

K’ayi fe Gi ka ezi nwa. Amen.



THE SICK

Abu 397- Kraist, Onye nenyer’ayi aka

Verse 1

Kraist, Onye nenyer’ayi aka Ichoput’otutu ihe

Ije me ka ndu-ayi di nma:

Na nti n’olu ekpere-ayi.

 

Verse 2

Mgbe I no nime uwa nka, I nyere ndu n’aru-ike:

Ndi kpuru isi nah’uzo,

Ndi-ngwuro nag’ije nk’oma.

 

Verse 3

Biko, nye ndi-dibia ike, Ka ha wenagwo nriria dum,

Ka umu-Gi we no n’onu,

Ha we nenye Gi otuto.

 

Verse 4

Ma mgbe ha nad’ike n’aru, Biko, ka mo-ha di kw’ike;

ha we buru ndi zur’oke,

We lakute I mgbe ndu gagwu.

 

Verse 5

Kasie nd’oria nile obi Mgbe olil’anya gwusiri;

Nye ha okwukwe sir’ike

Mgbe ike ndu nka gwuru ha. Amen.

TRAVELLERS

 

Abu 398- Tutu ayi ejikere ije nke-ayi 

Verse 1

Tutu ayi ejikere ije nke-ayi,

Ayi mara na Gi b’onye gedu ayi;

N’oge ayi garapu, biko, duru ayi:

Nani Gi k’ayi natukwasi obi.

 

Verse 2

O buru n’ayi ewere ukwu neje,

Biko, chupur’ayi ndi ajo madu;

Ekwela k’ajo anu zu ayi n’uzo:

Ayi nario Gi k’I nuru olu-ayi.

 

Verse 3

O buru n’ayi ewere moto neje,

Biko, bur’Onye gedu ayi n’uzo;

Ekwela Ekwensu meru ayi aru:

Nonyere onye nke nanya moto.

 

Verse 4

Nime ugbo-miri, nedugide ayi

Tinyua ebili dum di na miri;

Mechie onu ajo anu di na ya:

Gi Onye mere k’ebili dajua.

 

Verse 5

N’ebe o bula  ayi no, nechebe ayi:

Onye gazoput’ayi m’obugh nani I?

Gi bu Onye-inye’aka nke umu Gi:

Biko, nedebe umu-Gi n’udo. Amen.


 

CHORUS

 

Abụ 399- Agamenye ụnụ obi ọhụụ

Verse 1

Agamenye unu obi ohu,

Agamenye unu obi ohu,

Agamenye unu obi ohu,

Tinye kwa mo ohu nime unu.

 

Verse 2

M’gewezuga obi nkume-unu,

M’gewezuga obi nkume-unu,

M’gewezuga obi nkume-unu,

Nye unu obi nke anu-aru.

 

Verse 3

Agametinye Mom nime unu,

Agametinye Mom nime unu,

Agametinye Mom nime unu,

Unu we debe ikpem, neme ha. Amen.


 

 

SONG BY NIGER DIOCESAN WOMEN’S GUILD

Abụ 400- Chineke, ayi nario Gi K’I nye ndi-otu-ayi  ngozi

 

Verse 1

Chineke, ayị narịọ Gị K’I nye ndị-otu-ayị ngọzi;

Do ndụ-ayi nile nso, mejue obi-ayị n’ihụ-n’anya,

K’ayi buru ndi nwunye, ndikwesiri ntukwas’obi:

Chineke, ayi nario Gi k’I nonyere ndi-otu-ayi.

 

Verse 2

Mgbe ayi nagu Okwu Nso-Gi nye ayi amam ihe-Gi;

Me k’ayi nahu ulo nso-Gi n’oge ekpere n’anya;

Jiker’obi-ayi k’ayi we ba n’al’eze el’igwe-Gi:

Chineke, ayi nario Gi k’I nonyere ndi-otu-ayi.

 

Verse 3

Chineke, ayi nario Gi k’I nye ndi-otu-ayi Mo Nso,

K’ayi buru ndi-ezi-okwu n’omume-ayi n’okwu-ayi;

K’ayi nazu umu I nyere ayi n’uzo nile nke-Gi:

Chineke, ayi nario Gi k’I nonyere ndi-otu-ayi.

 

Verse 4

Me k’ayi buru ndi-oku nakutara Jisus madu;

Nyer’ayi akaigba nd’oria na ndi ner’uju ume;

Ekwela k’okwukwe-ayi na ihu-n’any’ayi ju oyi;

Chineke ayi nario Gi k’I nye ndi-otu-ay ngozi.

Amen.


ABU 301 – 400 

ABU 301 – 400 

ABU 301 – 400 

ABU 301 – 400 

One thought on “Abu Anglican Communion 301 to 400 (Igbo Hymn)

Comments are closed.