You dont have javascript enabled! Please enable it! ABU 201 - 300 - Abu Anglican Communion 201 to 300

Abu Anglican Communion 201 to 300 (Igbo Hymn)

Search Contents

ABU 201 – 300 

Abu 201 – 300. Igbo Hymn known as Abu or Ekpere Na Abu (Ancient and Modern) is one of the Anglican Communion heritages. It is composed and compiled for spiritual worship in the church and for personal devotion. We have made it easier here. You can now surf for your Anglican Igbo hymn from 1 to 400.

This page is a continuation of Abu Igbo Anglican Communion. Check the link below if the Abu number you are looking for is not found here.

What Abu Number are you Searching for? Check the Table of Content and Click on the Number.

ABU 201 – 300 TABLE OF CONTENT

Click here for your:

Abu 1 to 50

ABU 51 to 100

ABU 101 to 150

ABU 151 to 200

ABU 201 to 300


ABU 301 to 400

Abu 201- Apughm iwezuga Gi.

I could not do without Thee.

Verse 1

Apughm iwezuga Gi,

Enyi ndi fur’efu!

I ji obara gbatam

N’oke onu-ahia;

Ezi’omumue-I, ngbahara-I,

N’obara-Gi gabu

Olil’anyam na nkasim,

Otutọm n’agugom.

 

Verse 2

Apughm iwezuga Gi,

Guzọ nani n’onwem;

Enweghm ike n’idi-nma,

M’obu amam-ihe;

Ma Gi, Onye-nzọputam,

Bu ihe nile nkem;

Ike nim’adigh-ike

Diri ndi dabere I!

 

Verse 3

Apughm iwezuga Gi!

Enyi ozo amagh

Ochicho di ngbu nk’obi,

Ikwuputa nkpa-ya.

Ony’ozo apugh iba

N’ebe-nzuko nk’obim,

Nye ya ndaju na nkasi,

Onye-nwem, m’obugh Gi!

Verse 4

Apughm iwezuga Gi,

Aro nagabiga;

Ọ digh anya mgbe ‘gefe

Miri nk’onwu nanim.

Ma I gagh-agbanarim:

M’ebili maghari,

Amawom n’I gano nsọm,

Nagwam, si, “Ọ bu Mu!” Amen.

 

Abu 202- Jisus, Onye-nwem, Chinekem.

Jesus, my Lord, my God my All.

Verse 1

Jisus, Onye-nwem, Chinekem,

Nur’olum mgbe m’kpokuru Gi;

Si n’eb’obibi-Gi n’elu

Wukwasim aku amara-I.

Onye-nwem, Gi ka m’ganeto,

Mem ka m’hu Gi n’anya kari!

Verse 2

Jisus, achoghm Gi n’oge mbu,

Ahughm Gi n’anya k’I si cho!

M’gesi ana to ude-Gi,

Ima-nma n’ebube Aha-I?

Onye-nwem, Gi ka m’ganeto,

Mem ka m’hu Gi n’anya kari!

Verse 3

Jisus, gini di nim’obim,

Na I ji hum n’anya otu a?

Onu I nyerem di ukwu

Ka’echiche n’olil’anya.

Onye-nwem, Gi ka m’ganeto,

Mem ka m’hu Gi n’anya kari!

Verse 4

Jisus, Gi ka m’ganabuku,

Ọ bu Gi nwe obim n’uchem;

Arum n’ihem nile bu nke-I;

Onye-nzọputam, Gi bu nkem!

Onye-nwem, Gi ka m’ganeto,

Mem ka m’hu Gi n’anya kari! Amen.


 

Abu 203- Anuwom banyere ngọzi.

Lord, I hear of showers of blessing.

Verse 1

Anuwom banyere ngọzi

Nk’I nenye ora n’efu;

Miri-ngọzi netute ndu-

Biko, kwe k’o zokwasim,

Zokwasim!

Verse 2

Agabigalam, Nn’amara!

N’ezie nmehie di n’obim;

I pur’irapum, ma kama

K’ebere-gi biakwasim,

Biakwasim!

Verse 3

Onye-nwem, agabigalam!

Ka m’jide, ma Hu I n’anya;

Anamacho amara-GI,

N’obibia-Gi kpom oku,

Kpom oku!

Verse 4

Agabigalam, Mọ d’ike!

Gi nagwo ndi kpur’isi;

Ony’ama olu nke Jisus,

Wer’ike-Gi gwam okwu,

Gwam okwu!

Verse 5

Ihu-n’anya nenwegh ngbanwe!

Obara di ok’onu!

Amara di n’ebe nile!

Nimem, biko, bulie ha,

Bulie ha! Amen.

Abu 204- Jisus, echiche banyere I.

Jesus, the very though of Thee.

Verse 1

Jisus, echiche banyere I

Nenye utọ n’obi;

Ma ihu iru-I ka utọ,

N’iz’ike na nsọ Gi.

Verse 2

Ọ nwegh onu nke pur’iko,

Echiche amagh kwa,

Aha kariri nke-I n’utọ,

Onye-nzọput’uwa!

Verse 3

Olil’anya ndi nakwa njọ!

Onu ndi di nwayọ!

Ndi dar’ada nenwe nzota,

Ndi nacho I nwe ngọzi.

Verse 4

Ma ndi chotara Ya? madu

Apugh ikowa ya!

Ihu-n’anya-Ya, ih’o bu

Nani ndi-Ya mara.

Verse 5

Jisus, nani onu nke-ayi!

I gabu ugw’olu;

Bur’inya-isi-ayi ugbu a,

Na mgbe ebigh-ebi! Amen.


ITO N’AMARA

Abu 205- Chuku, nyocham, nwa omumem.

Search me, O God, my actions try.

Verse 1

Chuku, nyocham, nwa omumem,

Ka ndum puta ihe

K’o si di n’anya-nnyocha-Gi:

Me ka m’h’uzọm nile.

Verse 2

Nyocha uchem, mata obim,

Nani Gi mazuru;

Me k’ih’omimi nke di ya

Puta ihe n’irum.

Verse 3

K’ihe nwuba n’ebe-nzuzọ,

Ebe agu njọ di;

Met’ako-nuchem k’o we so

Nmehie nile oyi.

Verse 4

Nyo echichem, bu is’iyi

Nke omumem nile;

Im’ulo ebe ih’ure

Nabu eze n’obi.

Verse 5

K’anya-I, nke di k’oku-nnucha,

Nyocha ebe nile,

M’we da n’iru Gi n’ikp’azu

Site n’amara-Gi.

Verse 6

Otu a ka m’gamazu ihe

M’mara nwanti ugbu a-

Na nani Chuku nime Kraist

Bu ok’ihu-n’anya! Amen.

ISO KRAIST

Abu 206- Umu nke Eze igwé.

Children of the Heavenly King.

Verse 1

Umu nke Eze igwé,

Dik’unu naga, buanu,

Neto Onye-nzọputa;

Uzo-Ya di ebube.

Verse 2

Ayi nalakuru Chuku

N’uzọ nke nn’ayi-ha gara;

Ugbu a ha nwere onu,

Ayi gesoro n’onu-ha.

Verse 3

Umu Chuku, tienu nkpu!

Unu gano n’och’eze

Nk’edoziri n’eb’ahu:

Al’eze n’ugw’ol’unu!

Verse 4

Umu ihe, weli’anya,

Lenu obodo Zaion,

Ulo ebigh-ebi-ayi,

Ebe ayi gahu Jisus.

Verse 5

Umu-nna, atul’egwu,

Guzọ nsọ igwé n’onu!

Jisus Kraist, Ọkpara Nna,

Si, “Unu naga n’iru!”

Verse 6

Chineke, ayi kwer’ila,

Were onu rap’uwa;

Nani bur’ayi Onye-ndu,

Ayi ganesogide Gi! Amen.


Through the night of doubt and sorrow.

Abu 207- Nime abali nk’ahuhu.

 

Verse 1

Nime abali nk’ahuhu

Nd’ije Chineke naga,

Nabu abu nk’olil’anya,

N’ala ekwere  na nkwa.

Verse 2

N’iru ayi nim’ochichiri

Ihe nedu ayi nenwu;

Nwa’nne nejid’aka nwa-nne,

Nazo ije n’ob’ike.

Verse 3

Ihe nk’iru Chuku b’otu,

Namukwasi ndi-nkeYa,

Nachupu egwu na ngbachi,

Nenye ihe n’uzọ-ayi.

Verse 4

Nzube nk’ije-ayi bu otu,

N’okwukwe nadigh agwu,

N’olil’anya nanu oku

Nke Chineke natute.

Verse 5

Abu nk’igwé madu nabu

Dika nke si n’ot’obi;

Otu agha, n’ih’ize-ndu,

Otu ije rue Chuku.

Verse 6

Otu inuri-onu di

N’al’ebigh-ebi ahu,

Ebe Nna nke kachas’ike

Nabu eze mgbe nile.

Verse 7

Naga n’iru, ndi no n’ije,

K’obe bur’inye’aka-ayi;

Bur’ihere-ya lua ogu,

Ayi gez’ike na ndo-ya.

Verse 8

Mgbe oke nbilite di nsọ,

Ili gemeghe oghe,

Onyinyo

nile gagbasa

Ngbachi na ndogbu gagwu. Amen.

 

Lead us, heavenly Father, lead us.

Abu 208- Nna nk’igwé, biko, nedu ayi

Verse 1

Nna nk’igwé, biko, nedu ayi

Gaf’osimiri nk’uwa;

N`echebe, nedu, nazu ayi,

Nani I nenyer’ayi aka;

M’o buru na Chuku bu Nn’ayi,

Ayi nenwe ngọzi nile.

Verse 2

Jisus, gbaghara nmehie-ayi,

I mar’adigh-ike-ayi;

Gi bur’ayi uzọ bia n’uwa,

I huru ahuhu-ya;

Nani Gi n’ike-ogwugwu

Gabigara nim’ohia.

Verse 3

Mọ Nsọ, si n’elu ridata,

Mejue ayi n’onu nk’igwé;

K’ihu-n’anya ju obi-ayi,

N’obi-utọ mgbe nile.

Nchebe, ngbahara n’odudu!

M’ayi nwe ha, ayi nwe udo! Amen.


Guide me, O Thou great Jehova.

Abu 209- Nedum, Gi Jehova uku.

 

Verse 1

Nedum, Gi Jehova uku

Ony’ije n’ozara nka;

Ike adighm, Gi di ike,

Wer’aka-I dike jidem!

Nri nke igwé

Nazum rue mgb’afo gejum!

Verse 2

Meghe is’iyi di ọcha

Miri-ngwopu si eru;

K’igw’oji n’ogidi-oku

Dugidem n’ijem nile.

Onye-nzota,

Bur’ikem n’otam mgbe dum!

Verse 3

Mgbe m’gazo ukwu na Jodan

Chupu egwu nke m’natu;

Ka m’gafe onwu n’oku-mo,

Rue ala Kenan n’udo.

Ab’otuto

M’gabuku I mgb’ebigh-ebi! Amen.

Lead, kindly light, amid the encircling gloom.

Abu 210- Ihe ọma, nedum nim’ohichi.

Verse 1

Ihe ọma, nedum nim’ohichi

Durum naga.

Chi ejiwo, ulo nkem di anya;

Durum naga.

Jide ukwum; Arioghm ka m’hu ihe

Di n’iiru; otu nzo-ukwu gezu.

Verse 2

Adighm otu a na mbu, arioghm I, si,

Durum naga.

Iroputa n’onwem dim nma; m’ugbu a

Durum naga.

Ih’efu nk’uwa nka torom utọ,

Nganga jur’obim: Echetala ha!

Verse 3

Otu ike-Gi si nagozim, ya

Gedugidem,

Gafe ohia, miri, n’ozara, rue

Mgbe chi gabo.

N’ututu m’gahu ndi m’huru n’anya

Na mgbe gar’aga, ha we lanarim.

Verse 4

N’uzọ nkpa di warara, Gi onwe-I

Gabigara,

Jisus, durum n’okwukwe nke nwata,

Lakuru Nnam.

Ka m’zur’ike, m’ogu nk’uwa gwusia,

Nime ihe nke ndun ebigh-ebi. Amen.

Jesus, still lead on.

Abu 211- Jisos, dugide.

Verse 1

Jisos, dugide

Rue mgb’ayi gezike;

Ma uzọ gba ochichiri,

Ayi geso ghar’itu egwu;

Wer’aka-I dur’ayi

Rue ala nke Nn’ayi.

Verse 2

Ma uzọ jo njọ

M’ony’iro no nsọ,

Ekwela k’egwu jide ayi,

Ekwel’ayi rap’olil’anya;

Site n’ahuhu

Ayi gala n’ulo.

Verse 3

Mgb’ayi nacho nkasi

N’oke ihe-ngbu,

Mgb’onwunwa ohu nesogbu,

Me ka ntach’obi zue oke;

Gosi ayi ala

Eb’akwa nadigh.

Verse 4

Mgb’ih’utọ nk’uwa

Puru n’anya-ayi,

Mgbe ayi si n’onwu hu igwé,

Mgb’agbaputar’ayi na nmhehie,

Si n’ulo ọma-I

Kpor’ayi nye Chuku.

Verse 5

Jisos, dugide

Rue mgb’ayi gez’ike;

Onye-ndu nk’igwé, nedu ayi

Nakasi, neyer’ayi aka;

Rue mgb’ayi geguzọ

Nim’ala nke Nn’ayi. Amen.

“Take up thy cross,” the Saviour said.

Abu 212- “Bulie obe-i,” Jisos siri,

Verse 1

“Bulie obe-i,” Jisos siri,

“Ma i nacho, k’I som n’azu;

Ju onwe-gi, rapu uwa,

N’obi um’ala nesokwam.”

Verse 2

Bulie obe-I; atul’egwu

N’aro-ya ganyigbu mo-gi;

Ike-Ya gakwagide gi,

Nye obi-i n’aka-gi ike.

Verse 3

Bulie obe-i; ekwekwala

K’ihere na nganga jide i;

Onye-nwe-i buru obe, we nwua,

K’Ọ zọput’obi-gi n’onwu.

Verse 4

Bulie obe-i, wer’ike-ya

Megide ih’ize-ndu dum;

Ọ gedu i rue ulo ka nma,

Nye g’ike k’I merie ili.

Verse 5

Bulie obe-i, neso Jisos,

Nebu ya rue mgb’onwu gabia;

Nani onye nebuli’obe

Gekpu okp’eze nk’otuto.

Teach my Thy way, O Lord.

Abu 213- Chuku, zim uzọ-Gi.

Verse 1

Chuku, zim uzọ-Gi,

Zim uzọ-Gi!

Biko, nyerem aka,

Zim uzọ-Gi!

Ka m’site n’okwukwe

Neje ije nk’ọma;

Wer’ihè-Gi nedum,

Zim uzọ-Gi!

Verse 2

Mgbe m’nwe obi abua,

Zim uzọ-Gi!

Mgbe alulu nakwu,

Zim uzọ-Gi!

Mua nime igw’oji,

Nim’olu, n’ihe-ngbu;

Dozien uzọm nk’ọma,

Zim uzọ-Gi!

Verse 3

Mgbe nile m’nadi ndu,

Zim uzọ-Gi!

N’ebe nile m’gano,

Ziom uzọ-Gi!

Rue mgbe oso gagwu,

Rue mgbe ije gebi,

M’we kpur’okpu-eze

Zim uzọ-Gi! Amen.



Savior, lead me let I stray.

Abu 214- Jisos, nedum n’uzọ ndu.

Verse 1

Jisos, nedum n’uzọ ndu,

Ka m’we ghara ikpafu

Anom n’udo n’akuku-I,

Ka m’biri n’ihu-n’anya-I.

Kọrọs:-

Nedum, nedum,

Jisos, ka m’ghar’ikpafu;

N’ogologo ndum nile,

Onye-nwem nedum nwayọ.

Verse 2

Gi, Ebe-ngbaba nk’obim!

Mgb’ifufe nefes’ike,

Anom n’udo m’I no nsọ,

Gi bu ntukwasi-obim.

Verse 3

Nedum, k’ebili-miri

Nke ndum we gabigasia;

Agameru al’ihe

Eb’anya-miri nadigh. Amen.

 

Courage, brother! Do not stumble.

Abu 215- Jis’ike! asula ngongo.

Verse 1

Jis’ike! asula ngongo

M’uzọ-gi gba ochichi;

Ihe di gedu ndi nwayọ:

Tukwasi Chuku obi!

Verse 2

Ma uzọ jo njọ, di egwu,

Nsọtu-ya di kwa anya,

Zonye; n’ike, n’adigh-ike,

Tukwasi Chuku obi!

Verse 3

K’Izuzu ojo la n’iyi,

N’ihe nat’ujo ihe!

Ma i nada, m’i nemeri,

Tukwasi Chuku obi!

Verse 4

Mad’ufodu gakpo i asi,

Ndi’ozo geleda i anya

Rapu ha, le anya n’elu,

Tukwasi Chuku obi!

Verse 5

Iwu nfe, n’ezi odudu,

Udo, n’ike nim’obi,

Kpakpando neny;ihe n’uzọ:

Tukwasi Chuku obi!

Verse 6

Jis’ike! asula ngongo

M’uzọ-gi gba ochichi;

Ihe di gedu ndi nwayọ:

Tukwasi Chuku obi! Amen.

 

Down in the valley with my Saviour I would go.

Abu 216- Ka m’so Onye-nwem rida na ndagwurugwu.

Verse 1

Ka m’so Onye-nwem rida na ndagwurugwu,

Ebe miri nke mara nma neru eru;

M’gesogide Jisus n’eb’o bula Ọ nedum,

Nazoso Ya rue mgbe m’gekpu okp’eze.

Kọrọs:-

Neso! neso! ka m’sogide Jisus!

Ebe dum Ọ nedum ka m’ganeso Ya!

Neso! neso! ka m’sogiode Jisus!

Ebe nile Ọ nedum ka m’geso Ya.

Verse 2

Ka m’so Onye-nwem rida na ndagwurugwu,

Ebe miri joro njọ, n’ok’ifufe di;

Ebe aka-Ya nedum apughm itu egwu:

Mgagh-at’ujo ih’ize-ndu m’Ọ no nsọ.

Verse 3

Nime ndagwurugwu m’obu n’elu ugwu,

Nkpur’obim gano nsọ Onye-nzọtam mgbe dum;

Ọ ganedum n’udo n’uzọ nk’Ọ zoro ukwu,

Rue n’ebe ha nezuko n’el’igwé-Ya. Amen.

 

Blest are the humble souls that see.

Abu 217- Ngozi dir’obi ndi nahu.

Verse 1

Ngozi dir’obi ndi nahu

Ogbenye n’adigh-ike-ha;

Ha nwer’aku nke amara,

N’okpu-eze nk’onu n’igwé.

Verse 2

Ngozi diri ndi’obi-ntiwa,

Ndi ner’uju n’ihi nmehie;

Obara Kraist di nsọ neru,

Ih’ogwugwu nk’oria-ha dum.

Verse 3

Ngozi diri ndi-amara,

Nk’agu ezi’omume nagu;

Ha geri nri nke nenye ndu,

Miri nke ndu ka ha ganu.

Verse 4

Ngozi diri ndi di ọcha,

Ndi puru na nmeru nke njọ;

Ha geji ok’onu nahu

Chineke nke dizu ọcha.

Verse 5

Ngozi diri ndi-ahuhu,

Ndi no na ngbu n’ihi Jisus;

Ha ganuri nimOnye-nw’ayi,

Otutọ gab’ugw’olu-ha. Amen.

 

When upon life’ billows you are tempest tossed.

Abu 218- Mgb’ebili-miri nke ndu namaghari i.

Verse 1

Mgb’ebili-miri nke ndu namaghari i,

Mgb’i neche n’ihe nile emebiwo;

Guk’otuto ngọzi-gi n’otu n’otu,

Olu Chineke luru geju i anya!

Kọrọs:-

Guko ngọzi-gi n’otu n’otu,

Guko, k’i hu olu Chineke!

Guko ngọzi, kpo ha ot’otu;

Olu Chineke luru geju i anya!

Verse 2

Ọ di mgbe ibu-obi nanyigbu gi?

Ob’enyere i k’i buru, o di aro?

Guk’ọtutu ngọzi-i, ich’uche gala,

I ganabu abu ka ubọchi ra!

Verse 3

Mgbe i huru aku n’ala ndi ozo,

Cheta n’ekwere i aku nk’igwé na nkwa;

Guko ngọzi-i; ego apugh izuta

Ugw’olu-gi n’ulo-gi nke di n’igwé.

Verse 4

Otu a n’etiti ogu nke uwa nka,

Ike agwula gi, Chineke b’eze!

Guk’otuto ngọzi-i; ndi-m’ozi no nsọ,

Ha ganyere i aka mgb’ije gagwu. Amen.


 

Fade, fade each earthly joy.

Abu 219- K’utọ uwa nefe.

Verse 1

K’utọ uwa nefe,

Jisus bu nkem!

Ma m’rapu ndim n’uwa,

Jisus bu nkem!

Ohia b’ochichiri,

Iz’ik’adigh n’uwa,

Nani Kraist gagozi;

Jisus bu nkem!

Verse 2

Arafula obim,

Jisus bu nkem!

Ka m’nogide n’ebe a,

Jisus bu nkem!

ihe nke bu aja,

Ihe nala n’iyi,

Sinu n’obim puta!

Jisus bu nkem!

Verse 3

Lanu, nro abali:

Jisus bu nkem!

Furu mgbe chi nabo:

Jisus bu nkem!

Ih’obim nwaworo

Adigh-ejum afo,

Jisus egbowo nkpa:

Jisus bu nkem!

Verse 4

Gi onwu, la ugbu a:

Jisus bu nkem!

Ndu ebigh-ebi, bia:

Jisus bu nkem!

M’gekele iz’ike,

Na ndi m’huru n’anya,

Na Onye-nzọputam:

Jisus bu nkem! Amen.

 

O brother man, fold to thy heart thy brother.

Abu 220- Nwa-madu, makua nwa-nna-gi n’obi-gi.

Verse 1

Nwa-madu, makua nwa-nna-gi n’obi-gi!

Udo Chuku di n’ebere di;

Ihurit’onw’ayi n’anya bu iwu-Ya;

Obu-ọma bu abu n’ekpere.

Verse 2

Onye Kraist huru n’anya kwuru n’ezie:-

Ikpo-isi-ala nk’Ọ nagozi

Neke onya, weghachi’ obi fur’efu,

Nazu nwa-ngbei na nwanyi di-ya nwuru.

Verse 3

Were nzo-ukwu di nsọ so ih’atu

Nk’Onye olu-nsọ-Ya bu ime nma;

Otu a k’uwa nile gadi k’ulo Nn’ayi:

Ndu nk’ihu-n’anya b’abu ekele!

Verse 4

Agatopu nkporo nile mgbe ahu,

Uzu-aghara nk’og’uwa gagwu;

Ihu-n’anya gazonyu oku iwe,

We kua osisi nk’udo na ntu-ya. Amen.

 

Soldiers of Christ, arise.

Abu 221- Ony’ogu Kraist, bilie.

Verse 1

Ony’ogu Kraist, bilie

Yiri ih’agha-gi;

D’ike n’ike Chuku nenye

Site n’Ọkpara-Ya

Verse 2

D’ike nim’Onye-nw’ayi,

Nim’ike uku-Ya;

Onye tukwasiri Y’obi

Gabu onye-nmeri

Verse 3

Guzọ kwa n’ike-Ya

Yikwas’ike-Ya dum;

Chilie ih’agha nke Chuku

Guzọgide nd’iro.

Verse 4

K’ih’agha-gi di ọcha

Neche ya nche mgbe dum;

Naga n’iru Ony’isi-gi,

Nekpe kwa ekpere.

Verse 5

Si n’ike ba n’ike,

Lus’Ekwensu ogu;

Zoda ike ochichiri,

Buru onye-nmeri.

Verse 6

Mgb’i mesir’ihe dum

Mgbe ogu-gi gagwu,

I gemeri nani na Kraist,

Zue oke n’ikp’azu. Amen.

 

Onward, Christian soldiers.

Abu 222- Gaba, ndi-agha Kraist.

Verse 1

Gaba, ndi-agha Kraist,

Dika n’ije ogu;

Obe Jisus buru

Naga n’ir’unu.

Kraist b’Ony’isi agha

Megide nd’iro;

Gaba n’ogbo-agha,

Legide Y’anya!

Kọrọs:-

Gaba, ndi-agha Kraist,

Dika n’ije’ogu;

Obe Jisus buru

Naga n’ir’unu.

Verse 2

N’ih’ama nke nmeri

Ekwensu nada;

Gaba, ndi-agha Kraist,

Ganu na nmeri!

Ala-mo me nkpatu

N’iti-nkpu onu;

Welie olu-unu,

K’abu da uda!

Verse 3

Nzuko Chuku yiri

Usu ndi-agha;

Ayi neso nzo-ukwu.

Nke ndi nsọ Zoro.

Ayi enwegh nkewa:

Otu olil’anya,

Ot’ihu-n’anya!

Verse 4

Och’eze gebibi,

Al’eze gada;

Ma Nzuko nke Jisus

Geguzọs’ike.

On’uzọ nke onwu

Aghagh-aka Ya;

Nkwa nkw Kraist diri ayi,

Ọ gemezu ya!

Verse 5

Gaba, madu nile,

Soro n’usu-ayi;

K’olu-ayi jik’onu

N’abu nke nmeri,

Otutọ nsọpuru,

Diri Kraist, b’Eze;

Ndi no n’uwa, n’igwé,

Nabu nkamgbe nile dum!

 

Who is on the Lord side.

Abu 223- Onye diri Jisus.

Verse 1

Onye diri Jisus,

Onye gef’Eze?

Onye genye aka

Kpota ndi ozo?

Onye garap’uwa,

Che nd’iro iru?

Onye diri Jisus

N’yere Y’ozi?

Kọrọs:-

Site n’olu’ebere,

N’amara-I di nsọ,

Ayi nadiri Jisus:

Jisus, ayi bu nke-I!

Verse 2

Ọ bugh n’ih’otuto

M’ob’okpu-eze,

K’ayi ji bata n’agha,

Nab’abu ogu;

Ma n’ihu-n’anya

Ọ ji nwuru ayi:

Onye Jisus kporo

Aghagh iso Ya.

Site n’ihu-n’anya,

N’amara-I di nsọ,

Ayi nadiri Jisus;

Jisus, ayi bu nke-I!

Verse 3

JIsus, o bugh ego

I ji gbaput’ayi,

Kama obara-ndu,

Ibu okp’eze-I.

Were ngọzi mejue

Ndi nabiakute I;

Gi mere k’ayi kwere,

Me k’ayi pua n’oru.

Site na ngbputa-I,

N’amara-I di nsọ,

Ayi nadiri Jisus:

Jisus, ayi bu nke-I!

Verse 4

Ogu gesi ike,

Nd’iro geri nne,

Ma h’apugh imeri

Ndi-agha nk’Eze.

Nmeri di n’okpuru

Okoloto-Ya;

Ayi aghagh imeri

N’ezi-okwu-Ya.

Onu k’ayi ji bilie;

N’amara-I di nsọ,

Ayi nadiri Jisus:

Jisus, ayi bu nke-I!

Verse 5

Ibu ndi-agha-Ya

K’aroputar’ayi,

Ndi Ony’isi agha

Tukwasir’obi;

K’ike ghar’igwu ayi

N’ilu-ogu-Ya;

Ayi ganu olu-Ya,

Ayi geme dinkpa!

Jisus, I gedeb’ayi

N’amara-I di nsọ!

Ayi gadiri Jisus:

Jisus, nke-I mgbe dum! Amen.

 

Stand up, stand up for Jesus.

Abu 224- Guzọ, guzọro Jisus.

Verse 1

Guzọ, guzọro Jisus,

Ndi-agha nke obe!

Bulie okoloto-Ya,

K’o ghar’ihu iyi.

Si na nmeri rue nmeri

Ọ gedu ndi’agha-Ya;

K’Ọ we kpochapu nd’iro,

Gho Ony’isi n’ezie.

Verse 2

Guzọ, guzọro Jisus!

Nuru uda opi,

Pua n’ok’ogu n’ubọchi

Nke otuto-Ya nka.

Unu ndi-dike, so Ya

Imegide nd’iro;

Ebe ih’ize-ndu di

K’ike-unu puta!

Verse 3

Guzọ, guzọro Jisus,

Nani n’ike nke-Ya!

Atukwasila obi

N’ike nk’anu-aru.

Yir’ih’agha Chineke,

Neche nche n’ekpere;

Eb’olu di m’ob’egwu,

Aghala ino ya!

Verse 4

Guzọ, guzọro Jisus!

Ogu gadi nw’oge;

Ta k’uzu-agha natu,

Echi b’abu nmeri

Onye nemeri emeri

Genwe okpu nke ndu;

Ọ gesso Ez’otuto

Bur’ez’ebigh-ebi! Amen.



Abu 225- Ndi Chineke, bilie.

Verse 1

Ndi Chineke, bilie!

Rapu ih’efu dum,

Were obi, n’ike, n’ume,

Nef’Eze ndi-eze.

Verse 2

Ndi Chineke, bilie,

Al’eze-Ya n’odu;

Weta uboch’ihu-n’anya,

Chup’abali nke njọ.

Verse 3

Ndi Chineke, bilie!

Nzukob Kraist nechere;

Olu-Ya dikari ukwu:

Bilie, me k’Ọ d’ike!

Verse 4

Bulite obe Kraist!

Soro nzo-ukwu-Ya;

Dik’umu-nne Nwa nke madu,

Ndi Chineke, bilie! Amen.

 

Christian seek not yet repose

Abu 226-  Onye Kraist achol’ura,

Verse 1

Onye Kraist achol’ura,

Nur’olu Onye-nzota-I;

I no n’etiti nd’iro:

“Che nche, kpe.”

Verse 2

Nd’isi na nd’ike na njọ

Nachiko ndi-agha-ha,

Nechere mgb’I nogh na nche:

“Che nche, kpe.”

Verse 3

Ke ihe-agha-i nk’igwé,

Neyi ya oge nile;

Ekwensu niche anwu:

“Che nche, kpe.”

Verse 4

Get nti olu ndi-nmeri;

Ha nele ayi n’ogu-ayi;

Ha ji otu olu si,

“Che nche, kpe.”

Verse 5

Nke kasi, nur’olu Kraist,

Onye I huru n’anya;

Zobe okwu-Ya n’obi-i:

“Che nche, kpe.”

Verse 6

Che, dika na nani ya

Genye i nmeri n’ogu-gi;

Kpe, k’ezidat’iye’aka:

“Che nche, kpe.” Amen.

 

God is thy fortress     

Abu 227- Chineke bu Ota-i.

Verse 1

Chineke bu Ota-i,

N’oke ugw’olu-gi;

Ike-Ya akawo:

Ike-i di nime Ya.

Kọrọs:-

Ọ bu Chuku nasi,

Gi atula egwu!

QWelie isi-i, nuria

N’Onye-nwe-i, Kraist Jisus.

Verse 2

Gi atula egwu!

Ọ nuwo akwa-gi;

Miri nke okwu-Ya

Gatute nkpur’obi-i.

Verse 3

Gi atula egwu!

Ọ ganonyere gi

Inyere gi aka;

Ọ geme k’i d’ike.

Verse 4

Ndi-Ya, atul’egwu!

Onye-nw’unu nabia

K’Ọ kpughe otuto,

Kur’unu la n’igwé. Amen.

Lord thy grace.

Abu 228- Wer’amara-Gi nonyer’ayi.

Verse 1

Wer’amara-Gi nonyer’ayi,

Onye-nw’ayi, mgbe nile,

K’ayi ghar’inye njọ onodu,

Ghar’inye Gi nwuta.

Verse 2

Were okwu-Gi nonyer’ayi,

Ony’ayi huru n’anya;

Ny’ebere n’inye’aka ebe a,

K’ayi binyere I n’igwé.

Verse 3

Wer’ir’utọ-Gi nonyer’ayi,

Ihe namur’ora;

K’ezi okwu-Gi cheb’uzọ-ayi,

K’ayi ghar’ida n’ala.

Verse 4

Were ngọzi-Gi nonyer’ayi,

Eze nenye udo;

K’amara n’ike ju mo-ayi,

K’okwukwe ba uba.

Verse 5

Dik’Ota ukwu nonyer’ayi,

Ony’isi ndi-agha;

K’uwa ghara imeri ayi,

K’ayi ghar’igbalaga.

Verse 6

Wer’ ihu-n’anya-I nonyer’ayi,

Bur’Onye-nzọput’ayi;

N’oge nkpa k’ayi mat’inye-aka-I,

Natukwasi I obi. Amen.

 

Abu 229- Abala n’onwunwa: nka gabu nmehie.

Verse 1

Abala n’onwunwa: nka gabu nmehie;

Nmeri o bula neweta nke-ozo;

Lua ogu ka nwoke, merie agu-njọ;

Nele anya: Ọ gedubiga i.

Kọrọs:-

Rio Kraist k’Ọ nonyere gi,

Gba gi ume, chebe gi;

Ọ genyere gi aka,

Ọ gedubiga gi.

Verse 2

Zere ajo enyi, n’okwu joro njọ;

Sopur’aha nke Nna, ekwulula ya;

Nwe obi ọma, uche n’ezi-okwu,

Nele Jisus anya: Ọ gedubiga i.

Verse 3

Onye-nmeri ka Nna geny’ok[pu-eze;

Site n’okwukwe ayi genwe nmeri;

Onye-nzọput’ayi genye ayi ik’ohu;

Nele Jisus anya: Ọ gedubiga i. Amen.

 

Abu 230- Egwu natu gi n’ony’iro gemeri.

Verse 1

Egwu natu gi n’ony’iro gemeri?

Ochichiri gbachiri nime, n’ezi?

Meghe ngbachi window, meghepu uzọ,

K’ihe ngọzi nwubata.

Kọrọs:-

K’ihe ngọzi nwubata!

K’ihe ngọzi nwubata!

Meghe ngbachi window, meghepu uzọ,

K’ihe ngọzi nwubata!

Verse 2

Okwukwe-i n’uzọ nke Kraist naju oyi?

Chineke no n’elu azagh ekpere-i?

Meghe ngbachi window, meghepu uzọ,

K’ihe ngọzi nwubata.

Verse 3

I geji onu naga n’uzọ nk’igwé?

Narap’ochichiri, nebi nim’ihe?

Meghe ngbachi window, meghepu uzọ,

K’ihe ngọzi nwubata. Amen.

 

Rejoice in the Lord.

 

 Abu 231- Nuria n’Onye-nw’ayi! k’ebere-ya

Verse 1

Nuria n’Onye-nw’ayi! k’ebere-ya tute!

Ọ topur’agbu ndi-oru;

Ọ gbaputar’ayi: gini k’ayi gat’ujo

Mgbe Jisus bur’ayi ihe dum?

Kọrọs:-

Ma Chuku dir’ayi, ma Chuku dir’ayi,

Ma Chuku dir’ayi, onye ge megid’ayi?

Ọ b’onye?

Onye gemegid’ayi, megid’ayi?

Verse 2

D’ike n’Onye-nw-ayi! naṅuri n’ike-Ya,

Neme Okwu-Ya kw’ubọchi;

Mgb’ike njọ nabia, no s’ike n’ezi’okwu:

Ọ gab’Onye-nkwagide-ayi.

Verse 3

Kwere Okwu-Ya-nkwa-Ya nile b’ezie;

Nime Kraist ha bu “e n’amen”;

M’uwa gabiga, ha gadi mgbe nile,

Edewo ya otut’ugbo.

Verse 4

Kwe k’Ọ chebe gi! nogide nime Ya!

Nk’ahu bu ndu ebigh-ebi;

Ipunara Ya obi nenwegh ike-

Ọ digh onye pur’ime ya! Amen.



Abu 232- B’uzọ cho, o bugh ih’uwa.

Verse 1

B’uzọ cho, o bugh ih’uwa,

Onu n’aku nke nagafe;

M’ihu-n’anya nenwegh atu,

Chonu nka!

Verse 2

Achota otuto uwa,

Ochichio nke nabagh n’ihe;

Kama, cho nkpa obi,

Chonu nka!

Verse 3

Chi ngọzi n’udo Chineke-

Inwe ndia b’inwe ihe dum!

Bia, nekwuputa njọ-unu;

Chonu Ya!

Verse 4

Chonu Ya, k’Ọ gbahar’unu,

Me unu ndi-nketa igwé;

Werenu ndu-unu nye Ya:

Chonu nka!

Verse 5

Cho k’unu di ọcha na nsọ

Dika Ya, n’obi um’ala;

Tinye nd’unu n’olu nke-Ya:

Chonu nka!

Verse 6

Ch’obibia nke al’eze-Ya;

Chonu k’azọputa madu-

K’akpobata ha nye Jisus:

Chonu nka!

Verse 7

Chonu nka, nanwa nkwa ike-Ya;

Ọ d’ike, negbo nkpa nile;

Ih’igwé-nadabere Ya-

Chonu ha! Amen.

 

Abu 233- Wer’ike-i dum gba ngba ọma.

Verse 1

Wer’ike-i dum gba ngba ọma;

Kraist bu ezi-okwu-i n’ike-i;

Jide ndu, o gab’onu-gi

N’okpu-eze-i ebigh-ebi.

Verse 2

Gba os’ọma n’amara-Ya;

Welie anya-I, cho iru-Ya;

Ndu, n’uzọ-Ya, di n’iru gi;

Kraist b’uzọ-gi, n’ugw’olu-gi.

Verse 3

Rapu nchegbu, dabere Ya:

Ebere-Ya negbo nkpa-gi;

Tukwasi Ya obi-i, we hu

Na Kraist bu ndu, n’ihu-n’anya.

Verse 4

Atula egwu, Ọ no nsọ;

Ọ nwegh ngbanwe, n’i di Ya nkpa;

Kwere nani na i gahu

Na Kraist buru g’ihe nile. Amen.

GENERAL HYMN

 

Abu 234- Jisus! o gabu n’ihere-I.

Verse 1

Jisus! o gabu n’ihere-I

Pur’ime onye-njọ nk’uwa?

Gi, onye ndi-m’ozi neto,

Nk’ebube-Ya nenwu mgbe dum?

Verse 2

Ihere Jisus mem? Enyim

Nke nenyem olil’any’igwé?

E-e! iherem gabu nka,

N’adighm asopur’aha-Ya!

Verse 3

Ihere Jisus mem? Ehe,

Ma m’nwegh njọ nacho nsachapu!

M’obu akwa, n’egwu, na nkpa,

M’obi nacho nzọputa!

Verse 4

Rue og’ahu inya isim

Gabu n’Onye-nzọtam nwurum!

Ka nka buru ebube nkem,

N’iherem emegh Onye-nwem! Amen.

 

Abu 235- Ihere Onye-nwem emeghm.

Verse 1

Ihere Onye-nwem emeghm,

M’obu nkwuputa-Ya;

Ka m’jide nsọpur’okwu-Ya,

N’otuto nk’obe-Ya.

Verse 2

Jisus, Chinekem! aha-Ya

Bu ntukwasi-obim;

Ọ kwegh k’ihere me obim,

K’olile-anyam fue.

Verse 3

Nkwa-Ya d’ike k’och’eze-Ya;

Ọ gechebe nk’ọma

Ihe nke m’nyere n’aka-Ya,

We rue mgbe ikp’azu.

Verse 4

N’og’ahu Ọ gekwuputa

Aham n’iru Nna-Ya;

Nime Jerusalem ohu,

Nye obim onodu. Amen.

 

Abu 236- Umu, je kwuputa Jisus.

Verse 1

Umu, je kwuputa Jisus,

K’Ọ si nwu izọput’ayi;

K’Ọ sin ye ihe-ngbaputa

Iji topu ayi na njọ.

Kọrọs:-

E, ayi geje kwusa Jisus,

Onye di ọcha, di nwayọ, bu Jisus;

E, ayi geje kwusa Jisus,

Nke nwuru n’ihi ayi.

Verse 2

Kwusa ndu-Ya di um’ala,

Kowa olu ọma-Ya;

Kwusa ozizi-Ya di nsọ,

N’oku utọ nk’Ọ nakpo.

Verse 3

Ko akuko di ebube

K’Ọ si nwu na Kalvari;

Akpogburi n’ihi njọ-ayi

Eze nke ndu n’otuto.

Verse 4

Kosara umu-nne-unu,

N’ibe, n’enyi-unu dum;

Umu, gwarita onw’unu:

Jisus hur’ayi dum n’anya! Amen.

 

Abu 237- Gab’olu! gab’olu! ayi bu ndi Chineke.

Verse 1

Gab’olu! gab’olu! ayi bu ndi Chineke;

K’ayi sor’uzọ nke Onye-nw’ayi zoro ukwu.

Ndum-odu-Ya gabu ihe nagb’ayi ume;

K’ayi jis’ike n’ilu nk’Ọ si ayi lua!

Kọrọs:-

Nal’olu! . . . nal’olu!

Nal’olu! . . . nal’olu!

Nel’anya! . . . neche nche!

Nal’olu rue mgbe Kraist gabia!

Verse 2

Gab’olu! gab’olu! k’anenye ndi’agu nri,

K’edur’ony’ike gwuru ga na miri ndu;

Inya-isi-ayi gabu n’obe nke Jisus,

M’ayi nekwusa, si na “nzọputa b’onyinye!”

Verse 3

Gab’olu! gab’olu! olu diri ora;

Al’eze nk’ochichiri na nmehie gada.

Agebulite Aha Jehova elu;

N’ok’olu k’agabu: “Nzọputa b’onyinye!”

Verse 4

Gab’olu! gab’olu! n’ike nke Onye-nw’ayi;

Okp’eze n’uwe ọcha gab’ugw’olu-ayi.

Mgb’ayi na ndi-nzuko Kraist nile gebikota,

Ayi gesso ha neti, “Nzọputa b’onyine!” Amen.

 

Abu 238- Tukwasi Chuku-i obi.

Verse 1

Tukwasi Chuku-i obi!

Ga n’iru! ga n’iru!

Jidesie nkwa-Ya ike,

Ga n’iru!

Ajula aha nsọ-Ya,

Ma o weta ihere;

Nagbasa ude nke-Ya,

Ga n’iru!

Verse 2

Ọ kpotawo gi n’olu?

Ga n’iru! ga n’iru!

Jere Ya ozi ugbu a,

Ga n’iru!

Nefe Ya n’ihu-n’anya,

Nadabere’ike ya

Neguzọsike mgbe dum,

Ga n’iru!

Verse 3

Ọ nyewo i nkpuru ọma?

Ga n’iru! ga n’iru!

Kua, i gaghota ozo;

Ga n’iru!

Je n’on’uzọ Onye-nwe-i,

Nechere Ya n’eb’ahu;

Ọ ganu, za ekpere-i;

Ga n’iru!

Verse 4

Ọ siwo n’olu ebie?

Ga n’iru! ga n’iru!

Wer’egwu nsọ nefe Ya,

Ga n’iru!

Kraist bu oke-i na ike-i,

Ọ bu Nr’igwé n’uzọ-gi,

Ọ geduba i n’otuto:

Ga n’iru!

Verse 5

Na nwa mgbe ntakiri nka,

Ga n’iru! ga n’iru!

N’uzọ-i nile kwere Ya,

Ga n’iru!

K’uche-Ya di nime gi;

K’ochicho-Ya nato gi;

Nime ndu n’ipu-n’oru,

Ga n’iru? Amen.

 

Abu 239- Nagafe dika kpakpando ututu.

Verse 1

Nagafe dika kpakpando ututu,

Nk’ihe-ha furu mgb’anyanwu wara;

Otu a k’ayi gesi n’ol’uwa nka la;

Nani n’olu-ayi k’ageji chet’ayi.

Kọrọs:-

Nani n’olu-ayi, nani n’olu-ayi,

Nani n’olu-ayi k’ageji chet’ayi.

Otu a k’ayi gesi n’ol’uwa nka la;

Nani n’olu-ayi k’ageji chet’ayi.

Verse 2

Agacho ayi ma nd’ozo ganochi ayi.

Naghoro nkpuru n’ubi ayi kuru?

E, ma ndi naku nkpuru gagwu n’olu:

Ihe-ncheta-ha gabu olu-ha.

Verse 3

Nani ezi-okwu ayi kwuru mgb’ayi di ndu,

Nani nkpuru ayi kuru n’uwa nka:

Ndia gadigide mgb’echefusiri ayi:

Nkpuru-owuwe-ubi, n’olu-ayi.

Verse 4

Mgbe Jisus gaguko ndi nke-Ya onu,

Mgb’ayi gekpu okpu-eze nk’ok’onu;

Mgb’ahu k’agecheta ezi nd’oru-Ya,

Ha nile, site n’olu ha luru. Amen.

 

Abu 240- Jisus si k’ayi wer’ez’ihe nenwu.

Verse 1

Jisus si k’ayi wer’ez’ihe nenwu,

Dik’oriona nenwu nim’abali.

N’uwa ochichi nka ayi aghagh inwu,

Gi no n’akuku-gi, mu no na nkem!

Verse 2

Jisus si k’ayi bur’uzọ nwuru Ya;

Ọ nahu, mata kwa, m’oku-ayi nanyu.

Ọ si n’igwé nele, k’Ọ hu ayi nenwu:

Gi no n’akuku-gi, mu no na nkem!

Verse 3

Jisus si k’ayi nenwu gburugburu;

Ochicho d’ich’iche nagba n’uwa nka-

njọ, na nkpa, n’ahuhu; ayi aghagh inwu,

Gi no n’akuku-gi, mu na nkem! Amen.

 

True- hearted, whole-hearted.

Abu 241- Ndi kwesiri ntukwas’obi mbge nile,

Verse 1

Eze! ayi gabu site n’amara-I;

N’okpur’okoloto-I ebulir’elu,

N’ike-Gi ayi galuru Gi ogu.

Kọrọs:-

Tienu nkpu agha, ekpuchila onu!

Abu onu nk’obi-ayi ji nuria:

Ndi kwesiri ntukwas’obi mgbe nile,

Eze! ayi gabu site n’amara-I!

Verse 2

Ndi kwesiri ntukwas’obi mgbe nile!

Ayi gerub’isi nye Ez’otuto;

Ijis’ike n’ihu-n’anya, n’ina-nti,

Ayi geji ok’onu weta ugbu a!

Verse 3

Ndi kwesiri ntukwas’obi mgbe nile!

Onye nzọputa, i mar’adigh’ike-ayi;

Obi-anyi juru n’aghuho na nmehie

Sachapu ha n’ihi otuto-Gi.

Verse 4

Ndi kwesiri ntukwas’obi mgbe nile!

Kraist, nani Gi gabu Eze n’ike!

Nuche-anyi, Gi genwe nmeri-

Ha bu nani nke-Gi mgb’ebigh-ebi.

Amen.



Abu 242- Ahurum Jisos n’anya.

Verse 1

Ahurum Jisos n’anya,

Enweghm onwem ozo!

Ọ bu Onye-ngbaputam;

Ọ kwur’ugwo n’isim.

Verse 2

M’gagh-arapu ife Ya,

Ọ di’uro, di ngọzi;

Na mgbe ike-ogwugwu

Ọ nenye iz’ike.

Verse 3

Ọ wusir’obara-Ya,

K’Ọ gbaputam n’oru,

N’itopu agbu nile

Nke njọ, n’inwe-onwem.

Verse 4

Ọ rotaram ka m’fe Ya,

Nyem ike ka m’rota

Inwe-onwem di ngọzi,

Nke m’nagagh-atufu.

Verse 5

Achoghm ife nna abua,

Nani Ya ka m’gefe!

Bu Onye hurum n’anya,

Nye onwe-Ya n’ihim.

Verse 6

Na nsọpuru na n’onu

Abum gabu mgbe dum:

Ahurum Jisos n’anya,

Enweghm onwem ozo! Amen.

 

I love, I love my Master

Abu 243 – Ahurum Jisus n’anya,

Verse 1

Ahurum Jisus n’anya,

Enweghim onwem ozo!

O bu Onye-nbaputam;

O kwur’ugwo n’isim.

Verse 2

M’gagh-arapu ife Ya,

O di’uro, di ngozi;

Na mbe ike-ogwugwu

O nenyeiz’ike.

Verse 3

O wuir’obara-Ya

K’O gbaputam n’oru,

N’itopu agbu nile

Nke njo, n’inwe-onwem.

Verse 4

O rotaram ka m’ fe Ya.

Nyem ike ka m’rota

Inwe-onwem di ngozi,

Nke m’nagagh-atufu.

Verse 5

Achoghm ife nna abua,

Nani Ya ka m’gefe!

Bu Onye hurum n’anya,

Nye onwe-Ya n’ihim.

Verse 6

Na nopuru na n’onu

Abum gabu mbe dum:

Ahurum Jisus n’anya,

Enweghm onwem ozo!

Amen.

 

Abu 244- Nna, Nke si n’ulo-aku-Gi.

Verse 1

Nna, Nke si n’ulo-aku-Gi

Nawukwasi ayi onynye,

Nye ayi ike k’ayi we were

Onyinye-Gi n’uz’ọma.

Verse 2

K’oge iz’ike di ọcha,

K’ayi jide onw’ayi namgb’onu;

K’ayi nwe aku n’uzọ di nsọ,

Aru n’obi zur’oke.

Verse 3

Wepu, na mba nka na mba dum,

Ihe nakpata odida;

Tinyua oku nke onwunwa;

Chughachi nd’iro-I azu.

Verse 4

Nonyer’ayi, neny’ayi ike-Gi,

K’ayi wer’ike nadigh-anwu

Lugide nd’iro nke madu,

Guzọs’ike nim’ogu.

Verse 5

Ochi-agha-ayi mgbe nile,

Nedu ayi k’ayi nalus’ike;

Ka Nzuko-Gi zọput’uwa;

Ny’ayi ike n’amam-ihe.

Verse 6

Nna, Nke choro we choput’ayi;

Ọkpara, Nke hur’ayi n’anya;

Mọ Nsọ, Nke bi nim’obi-ayi;

Atọ nim’otu, nuru. Amen.

PRAYER

 

Prayer I the soul’s sincere desire.

Abu 245 – Ekpere b’ochicho obi,

 

Verse 1

Ekpere b’ochicho obi,

Nk’ekwuru, m’ob’ekwugh;

Nkpatu nk’oku zoro eze

Nke nenwu nim’obi

Verse 2

Ekpere b’ibu I’ude,

Nwusi nk’anya-miri,

Iweli-anya elu, mgbe

Nani Chukwu no nso.

Verse 3

Ekpepre bu okwu ka nfe

Nk’onu nwata nekwu;

O bu olu ka no neru

Chineke n’el’igwe.

Verse 4

Ekpere bu ike nke ndu

Nk’onye-Kraist nek’ume;

Aririo-ya n’on’uz’onwu,

O ji ya ba n’igwe.

Verse 5

Ekpere b’akwa nk’onye-njo

Narap’uz’ojo-Ya;

Ndi-m’ozi ji onu nabu,

Si, “O nekp’ekpere!”

Verse 6

Gi, Onye negos’ayi Chuku;

Uzo, Ezi’okwu,k Ndu!

I gara n’uzo ekpere:

Zi ayi ikp’ekpere!

Amen.


Approach, my soul, the mercy eat.

Abu 246 – Obim, bia nso och’ebere

Verse 1

Obim, bia nso och’ebere

Ebe Jisus naza;

Were nwayo da n’ukwu-Ya,

O gagh-achupi gi.

Verse 2

Nkwa-Gi bu nani ngopu nkem,

Okwukwe ka m’ji bia;

I nakpo obi di aro:

Otu a, Jisus, ka m’di.

Verse 3

Ibu nmehie nanyi obim,

Ekwensu nemebum;

Agha n’ezi, egwu nime,

Achorom iz’ike.

Verse 4

Buru otam, n’ebe-nzuzom,

Ka m’gbaba na ndo-Gi,

We gwa onye nekpegidem

Na Gi nwuru n’ihim.

Verse 5

Ihu-n’anya! Nwur’anwu,

Bur’obe n’ihere,

K’onye ikpe mara, dikam,

Rio n’Aha amara-I!

Amen.

 

Come, my soul, thy suit prepare

Abu 247 – Obim, Jiker’aririo-I,

Verse 1

Obim, Jiker’aririo-I,

Jius naza ekpere;

O bu Ya nasi gi kpe,

O gagh’akpochi nti-Ya.

Verse 2

Gi nabiakute Eze,

Bute aririo n’uba;

N’ih’amara n’ike-Ya

Mad’apugh iriobia.

Verse 3

Ibu arom ka m’ji bia;

Kraist, wepu ibu njo nka;

K’obara-I nk’awusiri

Sachapum n’ikp’omuma.

Verse 4

Achorom izu-ike;

Jisus, were nkpur’obim

Nk’I ji obara-Gi gba:

Nani I abu Eze-ya.

Verse 5

Mgbe m’bu ony’ije n’ebe a,

K’ihu-n’anya-I nyem onu;

Dika Onye-ndum n’Eyim

Nedum rue mgb’ijem gagwu.

Amen.

 

Abu 248- Anya di nke ura natugh.

Verse 1

Anya di nke ura natugh

N’abali o bula;

Nti di kwa nke nadigh-echi

Mgb’anyanwu dasiri.

Verse 2

Aka di nke ikenagwugh

Mgb’ike madu gwuru;

Ihu-n’anya nadigide

Mgbe nk’uwa jur’oyi.

Verse 3

Any’ahu nele ndi-m’ozi,

Aka nejid’igwé;

Ihu-n’anya nwer’och’eze,

Nti nanu abu nsọ.

Verse 4

Ike di nke madu geji

Mgb’ike uwa b’efu;

Ọ geru nti, n’anya, n’aka,

Na ihu-n’any’ahu.

Verse 5

Ik’ahu b’ekpere; nke si

Na Kraist rue och’eze,

 

Abu 249- Jisus bu eyi-ayi.

Verse 1

Jisus bu eyi-ayi,

Nebu njọ n’ahuhu-ayi!

Igwa chineke ihe dum

N’ekpere bu ok’uru!

Ayi neetuf’udo nke-uke,

Nebu, ihe-ngbu n’efu,

Nihi n’ayi agwagh Chineke

Ihe Nile n’ekpere.

Verse 2

Ayi nwere nosogbu n’onwunwa?

Ihe-nwuta di nsọ ayi?

K’obi-ayi ghari’ilo, miri;

Gwa Chineke n’ekpere!

Ayi gahu Eyi dika nka,

Nke nebu ihe-ngbu ayi?

Jisus maradigh-ike-ayi:

Gwa Chineke n’ekpere!

Verse 3

Ayi bu madu nenwegh ike,

Ndi ok’ibu nanyigbu?

Jisus bu ebe-ngbaba-ayi

Gwa chineke n’ekpere!

Nd’eyi-gi arapuwo gi?

Gwa Chineke n’ekpere!

Ọ gekuru gi n’aka-ya,

I genwe nkasi-obi.

 

Abu 250- Guzọ n’etiti ayi.

Verse 1

Guzọ n’etiti ayi,

Jisus, n’ike-Gi!

Ka mgbe ekpere nka

Bur’oge di nsọ.

Verse 2

Kunye ume Mọ Nsọ-I

Nim’obi nile;

Si egwu na nwuta

Pua n’obi-ayi dum.

Verse 3

Ayi gej’ije-oku

Naga n’uzọ-ayi,

Nechere nmalite

Nke mgb’ebigh-ebi. Amen.


Lord, teach us to pray.

Abu 251- Jisus, zi ayi ik’ekpere.

Verse 1

Jisus, zi ayi ik’ekpere

N’egwu na nsọpuru;

M’ayi bu ntu n’aja n’iru Gi,

Ayi aghagh ibia nsọ.

Verse 2

Mgb’ayi nekpegh ayi nala n’iyi:

Nye ayi ike ekpere!

M’ayi jikere ibiakute I,

Jisus, zut’ayi n’uzọ.

Verse 3

Nye nwuta nsọ n’ihi nmehie,

Nye obi um’ala,

N’ochicho sir’ike inu

Olu-Gi, we di ndu.

Verse 4

Okwukwe n’Aja nke nani

Ya our’ikpuchi njọ;

K’ayi wer’any’ayi, n’olil’any’ayi

Le nani Kraist mgbe dum.

Verse 5

K’ayi were ntach’obi neche,

M’ebere-Gi n’odu;

Nye obi nada mb’ayi ike

Itukwasi I obi.

Verse 6

Nye ndia, k’ewe me uche-Gi;

Site n’ike-Gi dum,

K’ayi si n’Ọkpara na Mọ Nsọ

Kpere Gi k’I si cho! Amen.

Showers of blessing

Abu 252- Miri-ozuzuo nke ngọzi.

Verse 1

“Miri-ozuzuo nke ngọzi!”

Nka bu nkwa ihu-n’anya;

Onye-nzọputa no n’elu

Gezite oge ntute.

Kọrọs:-

Ozuzọ ngọzi,

Ngozi ukwu di ayi nkpa;

Ebere natuwasa ayi:

Ngozi ukwu k’ayi nario.

Verse 2

“Miri-ozuzọ nke ngọzi!”

Ntute-obi nke ngọzi!”

Ntute-obi nke di nma;

N’ugwu na n’ebe di ala,

Uda ọtutu miri.

Verse 3

“Miri-ozuzọ nke ngọzi!”

Jisus,  k’o zokwasi ayi!

Nye ayi ntute-obi ugbu a;

Bia, sopuru okwu-Gi!

Verse 4

“Miri-ozuzọ nke ngọzi!”

Me k’o zo ubọchi ta,

Mgb’ayi nekwuputa nye Chuku,

Mgbe ayi nakpoku Jisus! Amen.

 

Abu 253- Dibia ku no nsọ ugbu a.

Verse 1

Dibia ku no nsọ ugbu a,

Jisus, Onye-ebere;

Okwu-Ya nakasi obi;

Nurunu olu Jisus!

Kọrọs:-

Abu ndi-m’ozi nabu,

Di kw’utọ n’onu madu,

Aha nke kachasi nma;

Jisus, Onye-ngọzi!

Verse 2

Agbaharawo njọ-i nile:

Nuru olu nke Jisus!

Naga n’uzọ igwé n’udo,

Soro Jisus bur’eze.

Verse 3

Otutọ diri Nw’aturu!

Ugbu a ekwem na Jisus;

Ahurum Onye-nwem n’anya,

Aha nke Jisus natom.

Verse 4

Aha-ya nachupu egwum,

Nani Aha nke Jisus;

Ọ nato obim mgbe m’nanu

Aha-ngọzi nke Jisus.

Verse 5

Umu-nna, sorom tobe Ya,

Tobenu Aha Jisus!

Ndinyom, welienu ol’unu,

Gozienu Aha Jisus!

Verse 6

Un’umu-ntakiri nile,

Ndi huru Jisus n’anya,

Gaza oku amara nka,

Ijere Jisus ozi.

Verse 7

Mgbe ayi garigoro n’igwé

Ayi gahu Jisus n’elu;

Ayi gano nsọ och’eze-Ya,

Neto aha nke Jisus! Amen.

 

Nearer home

 

Abu 254- Na nsọ ulo ka mmadu bi n’ochichi.

Verse 1

Na nsọ ulo ka madu bi n’ọchichi,

Ọtutu ndi nke namagh Jisus Kraist.

Onye geje izisa Ozi Ọma.

Nenwegh nchegbu, nele Jisus anya?

Kọrọs:-

Enyesiwom ike nile!

Enyesiwom ike nile!

Jebenu n’ebe dum, zienu Ozi ọma,

Mu na unu no mgbe nile.

Verse 2

Le, uzọ emeghere nario bia:

Ndi-agha Kraist, ngwa k’ayi ba ha nime!

Ndi Kraist tetanus! k’ayi nile we yiri

Zis’Ozi ọma, topu agbu njọ.

Verse 3

“Unu ganwu?” olu Chineke nakpo;

“Unu gabwu?” k’ayi gaju n’aha-Ya.

Jisus nwuru k’Ọ zọput’ayi n’aj’onwu:

Ganu, zis’Ozi ndu na nzọputa!

Verse 4

K’oge bia ngwa mgbe mba dum gabu abu,

Nasi “Otutọ diri Chineke!”

Mgbe ha ganuri onu nke ngbaputa,

Tie nkpu, “Haleluya, Jisus b’Eze!” Amen.

 

Abu 255- Ayi nuru olu onu:

Verse 1

Ayi nuru olu onu:

Jisus nazọputa!

Gbasa onu nka n’uwa:

Jisus nazọputa!

Zisa ozi n’ala dum,

Rig’ugwu, gafe miri,

Gaba!-Ọ b’iwu Ez’ayi:

Jisus nazọputa!

Verse 2

Bufe ya n’osimiri:

Jisus nazọputa!

Gwa ndi-njọ n’ebe nile:

Jisus nazọputa!

Agw’etuiti, buanu ya;

Miri, weghachi uda;

K’uwa nuria n’ihi nka:

Jisus nazọputa!

Verse 3

Nabu nime og’uwa:

Jisus nazọputa!

Site n’onwu na ndu-Ya,

Jisus nazọputa!

Bua ya na nwayọ n’ahuhu

Mgb’obi nacho ebere;

Abu nke nemer’ili:

Jisus nazọputa!

Verse 4

Ny’ifufe olu ike:

Jisus nazọputa!

Ka mba nile naṅuri:

Jisus nazọputa!

Tie nkpu nzota zur’ezu

N’ebe uwa soturu;

Abu-nmeri-ayi bu nka:

Jisus nazọputa! Amen.


Abu 256- Ndi bi n’ebe di anya nakpo oku.

Verse Ndi bi n’ebe di anya nakpo oku:

“ Zit’ihe, . . .zit’ihe! ”

igwé madu di ndi agazọputa:

“ Zit’ihe, . . . zit’ihe! ”

Kọrọs:-

Zit’ihe . . . ozi’ọma di ngọzi!

K’o mukwasi eben dum!

Zit’ihe . . . ozi’ọma di ngọzi!

K’o namu ebigh-ebi!

Verse 2

Ayi nur’oku si n’ebe di anya bia;

“ Zit’ihe, . . . zit’ihe! ”

Onyiny’ayi k’ayi gatogbo n’iru obe:

“ Zit’ihe, . . . zit’ihe! ”

Verse 3

K’amara nke Jisus diri ora dum:

“ Zit’ihe, . . . zit’ihe! “

K’anahu udi nke Kraist n’ebe nile:

” Zit’ihe, . . . zit’ihe! “

Verse 4

Ike agwu’l’ayi n’olu ihu-n’anya:

“ Zit’ihe, . . . zit’ihe! “

N’ichoputa madu ndi gabu ndi-Ya:

“ Zit’ihe, . . . zit’ihe! “ Amen.

“Whosoever heareth!” shout, hout the sound! Abu 257 – “Onye nke nuru!” tisie nkpu nka ike!

“Onye nke nuru!” tisie nkpu nka ike!

Zisa ozi di ngozi n’uwa nile;

Gbasa ozi n’eb’o bula nadu no:

“Onye nke kwere, k’o bia!”

Koro:- “Onye nke kwere,” “onye nke kwere!”

Zisa ozi gafe ugwuna ndida;

Na nk’ihu-n’anya nakpo ndi fur’efu:

“Onye nke kwere, k’o bia!”

Onye nke nabia, ya anola odu;

Uzo gher’oghe, ugbu a, banu nime!

Jius bu Uzo, n’Ezi-okwu, na Ndu:

“Onye nke kwere, k’o bia!

“Onye nke kwere!” nkwa neguzos’ike;

“Onye nke kwere!” bun du ebigh-ebi:

“Onye nke kwere, k’o bia!”

Amen.

 

Abu 257-“Onye nke nuru!” tisie nkpu nka ike

“Whosoever heareth!” shout, shout the sound.

Verse 1
“Onye nke nuru!” tisie nkpu nka ike!
Zisa ozi di ngọzi n’uwa nile;
Gbasa ozi n’eb’o bula nadu no:
“ Onye nke kwere, k’o bia! “

Chorus
“ Onye nke kwere,” “onye nke
kwere! “
Zisa ozi gafe ugwu na ndida;
Na nk’ihu-n’anya nakpo ndi
fur’efu:
“ Onye nke kwere, k’o bia! “

Verse 2
Onye nke nabia, ya anola odu;
Uzo gher’oghe, ugbu a, banu nime!
Jisus bu Uzo, n’Ezi-okwu, na ndu:
“ Onye nke kwere, k’ o bia!

Verse 3
“ Onye nke kwere!” nkwa neguzọs’ike;
“ Onye nke kwere!” gadigide mgbe dum;
“ Onye nke kwere!” bu ndu ebigh-ebi:
“ Onye nke kwere, k’o bia!” Amen.

Abu 258- I jekuru Jisus n’ih’ike nsacha.

Verse 1

I jekuru Jisus n’ih’ike nsacha?

Asawoi n’obara Nw’aturu?

I natukwasi obi n’amara-Ya?

Asawo i n’obara Nw’aturu?

Kọrọs:-

Asawo i . . .n’obara . . .

N’obara nke nasacha obi?

Uwe-gi di ọcha, ha nenwu ka nzu?

Asawo i n’obara Nw’aturu?

Verse 2

I nakpa nsọ Onye-nzọputa mgbe dum?

Asawo i n’obara Nw’aturu?

I nezu ike n’Onye akpogburu?

Asawo i n’obara Nw’aturu?

Verse 3

Mgbe Jisus gabia, uwe-gi ganenwu

Nk’ọma nim’obara Nw’aturu?

Obi-gi jiker’iba n’ulo Nw’aturu?

Asawo i n’obara Nw’aturu?

Verse 4

Wezuga uwe-i nke nmehie meruru,

Kwe k’asa i n’obara Nw’aturu!

Is’iyi netru n’ihi nkpur’obi-njọ;

Kwe k’asa i n’obara Nw’aturu! Amen.

 

Abu 259- Onye-nzọputa! Ọ nwuru n’ihim.

Verse 1

Onye-nzọputa! Ọ nwuru n’ihim!

Ọ mewo ka m’si n’amam-ikpe pua;

“Onye kwere n’Ọkpara,” k’Ọ kwuru,

“Nwe ndu ebigh-ebi.”

Kọrọs:-

“N’ezie, n’ezie, agwam unu si”;

“N’ezie, n’ezie,” o bu Ozi’ọma!

“Onye kwere n’Ọkpara,”-o b’ezie!

“Nwe ndu ebigh-ebi!

Verse 2

Nmehie nkem nile dakwasiri Ya;

Ugwo nile ka m’ji k’Ọ kwusiri;

Ndi kwere na Ya, k’Onye-nw’ayi siri,

“Nwe ndu ebigh-ebi.”

Verse 3

Abum ogbenye, ma m’dabere Ya;

Onye-nmehie, ma n’kwere okwu-Ya;

Le, Ozi ọma! umu Chuku dum

“Nwe ndu ebigh-ebi.”

Verse 4

Ekwesighm, m’agaghm-enwe obi abua;

Ọ gagh-achupu onye nke nabia;

“Onye kwere”-zisa Ozi ọma!-

“nwe ndu ebigh-ebi.” Amen.

 

Come to Jesus . . . . just now

Abu 260- Bia nsọ Jisus—- ugbu a

1    Bia nsọ Jisus    .    .    .    .    ugbu a.

2     Biakute Ya  .    .    .    .    .   ugbu a.

3     Ọ gazọpu i   .    .    .    .    .   ugbu a.

4     Gbakute Ya .    .    .    .    .   ugbu a.

5     Kpokue Jisus    .    .    .    .    ugbu a.

6     Jisus no nsọ .    .    .    .    .    ugbu a.

7     Ọ nakpo gi   .    .    .    .    .   ugbu a.

8     I b’ony’ojo   .    .    .    .    .   ugbu a.

9     Kwere na Ya     .    .    .    .   ugbu a.

10    Jisus, zọpum .   .    .    .    .   ugbu a.

11   Ọ gaza gi   .       .     .    .    .  ugbu a.

12   Ajula Ya   .        .     .    .    .  ugbu a.

13   Nekpere Ya   .   .     .    .     . ugbu a.

14   Jisus b’Enyi-i    .    .    .      . ugbu a.

15   Jisus b’Eze-i     .     .     .     . ugbu a.

16   Ọ kwerewo   .   .     .    .      . ugbu a.

17   Ọ di ike   .   .    .     .   .       .  ugbu a.

18   Ọ gasacha i   .   .    .      .     . ugbu a.

19   Ọ geme i nma   .    .     .      . ugbu a.

20   Ọ ganedu i   .   .     .     .      . ugbu a.

21   Ọ geny’udo    .     .      .       . ugbu a.

22   Ọ gawo gi   .   .     .     .       . ugbu a.

23   Ọ gagwo gi   .   .   .    .        . ugbu a.

24   Ọ geny’aka   .   .   .     .       . ugbu a.

25   Ọ gechebe i   .   .    . ugbu a.

26   Nekele Ya     .   .    . ugbu a.

27   Sopuru Ya   .   .   . ugbu a.

28   Biko, to Ya   .   .  .  ugbu a.

 

Sinners Jesus will receive.

Abu 261- Jisus gewere ndi’njọ!

Verse 1

Jisus gewere ndi’njọ!

Kwusa okw’amara nka

Gwa ndi rapur’uzọ ndu,

Na ndi nile dar’ada!

Kọrọs:-

Bukwasi . . . ab’ọma nka:

Kraist newere ndi ojo;

Kwusa Ozi Oman ka;

Kraist newere ndi ojo!

Verse 2

Bia, Ọ genye i iz’ike;

Tukwasi obi na Ya.

Ọ nacho ndi kasi njọ;

Kraist newere ndi ojo.

Verse 3

Obim amaghkwam ikpe,

Asapuwo njom nile;

Onye mere ka m’di’ọcha

Akwusiwo ugwom dum.

Verse 4

Kraist newere ndi njọ,

Mu onwem na nmehiem dum;

Enweghkwam ntupo ozo,

M’gesoro Ya ba n’igwé. Amen.

 

Come, every soul by sin oppressed

Abu 262- Bia, nkpur’obi njọ nanyigbu

 

Verse 1

Bia, nkpur’obi njọ nanyigbu,

Chuku di ebere;

Ọ ghagh inye gi iz’ike

M’i tukwasi Y’obi.

Kọrọs:-

Tukwasi Ya, tukwasi Ya

Obi-gi ugbu a!

Ọ gazọpu i, Ọ gazọpu i,

zọputa i ugbu a.

Verse 2

Jisus wusir’obara-Ya

K’Ọ nye  ngọzi n’uju;

Bianye onwe-i n’obara-Ya

Nasacha dika ncha.

Verse 3

Jisus bu Ezi-okwu, n’Uzo

Neduba i n’iz’ike;

Kwere na Ya, anol’odu,

I geju na ngọzi.

Verse 4

Bia, soro nzuko nka di nsọ

N’ijeru n’otuto,

Ibi n’al’eze el’igwé

Eb’onu di mgbe dum. Amen.

 

Come to the Saviour, make no delay!

Abu 263- Biakute Jisus, anol’odu

 

Verse 1

Biakute Jisus, anol’odu!

N’akwukwo-Ya k’Ọ zir’ayi uzọ;

Ta k’Ọ neguzọ n’etiti ayi,

Ji nawyo nasi “Bia!”

Kọrọs:-

Nzuko nka gabu nani onu,

Mgb’obi-ayi gapu n’ike nke

njọ.

Jisus, n’ulo ebigh-ebi-ayi,

Ayi na Gi gezuko!

Verse 2

“Kwerenu k’umu-nta biakutem!”

K’obi nile nuria n’okwu-Ya;

K’Ọ buru Onye ayi rotara;

Anol’odu ibia!

Verse 3

Chetanu n’Ọ nanonyer’ayi ta;

Na nti ihe Ọ nenyer’ayi n’iwu;

Nurunu olu nwayọ-Ya si,

“Umum, unu gabia?” Amen.

 

Who came down from heaven to earth?

Abu 264- Onye biara n’uwa nka.

Verse 1

Onye biara n’uwa nka?

Kraist, Onye-nzọput’ayi!

Amuru ka Nw’ogbenye?

Kraist, Onye-nzọput’ayi!

Kọrọs:-

Kwesienu abu ike-

Ọ wetar’ayi nzọputa;

Ọ nwegh onye yiri Ya,

Kraist, Onye-nzọput’ayi!

Verse 2

Onye nori n’el’obe?

Kraist, Onye-nzọput’ayi!

K’Ọ gbaputa mu na gi?

Kraist, Onye-nzọput’ayi!

Verse 3

Onye kwer’igbahara?

Kraist, Onye-nzọput’ayi!

Onye si, “Kwere, di ndu?”

Kraist, Onye-nzọput’ayi!

Verse 4

Onye bu Eze n’igwé?

Kraist, Onye-nzọput’ayi!

Onye k’ayi gahu n’anya?

Kraist, Onye-nzọput’ayi!

Verse 5

Onye gesi n’igwé bia?

Kraist, Onye-nzọput’ayi!

Kpo ndi-Ya ba n’otuto?

Kraist, Onye-nzọput’ayi! Amen.

 

 

The whole world was lost in the darkness of sin

Abu 265- Uwa nile furu n’ochichi nke njọ

Verse 1

Uwa nile furu n’ochichi nke njọ:

Ihe nke uwa bu Jisus!

Otutọ-Ya nenwubata dik’anwu;

Ihe nke uwa bu Jisus!

Kọrọs:-

Biakute ihe. Ọ diri gi;

Ihe-ahu enwukwasiwom;

Mbu m’kpur’isi, m’nah’uzọ ugbu a!

Ihe nke uwa bu Jisus!

Verse 2

Ayi ndi no na Jisus enwegh ochichi:

Ihe nke uwa bu Jisus!

Ayi naga n’ihe mgb’ayi neso Onye-ndu:

Ihe nke uwa bu Jisus!

Verse 3

Ndi bi n’ochichiri, ndi njọ kpur’isi:

Ihe nke uwa bu Jisus!

Nur’olu-Ya, sapu njọ, k’ihe we bia:

Ihe nke uwa bu Jisus!

Verse 4

Nkpa ihe anyanwu adigh n’el’igwé:

Ihe nke igwé bu Jisus!

Nw’aturu bu ihe n’obodo Chuku:

Ihe nke igwé bu Jisus! Amen.

 

 

A ruler once came to Jesus by night.

Abu 266- Ony’isi jekuru Jisus n’abali.

 

Verse 1

Ony’isi jekuru Jisus n’abali

K’o jua Ya uzọ nke nzọputa n’ihe;

Ony’ozizi-ayi zara ya nk’ọma, si,

“Aghagh im’un’ozo!”

Kọrọs:-

“Aghagh im’unozo!

Aghagh im’un’ozo!

N’ezie, n’ezie, agwawom i, si,

Aghagh im’un’ozo.”

Verse 2

Umu madu, nanu nti n’okwu ahu

Nke Jisus, bu Onye-nw’ayi, kwusir’ike;

Ekwela k’ozi’ọma nka buru n’efu:

“Aghagh im’un’ozo!”

Verse 3

Unu ndi nacho iba n’iz’ike nka,

Soro ndi agbaputara bua abu,

M’asi n’unu genwe ndu ebigh-ebi,

“Aghagh im’un’ozo!”

Verse 4

Onye i huru n’anya, Nk’obi-i nacho,

No nechere gi n’on’uzọ el’igwé;

Ge nti n’olu ido-aka-na-nti nka:

“Aghagh im’un’ozo!” Amen.

 

Have you any room for Jesus

Abu 267- Onodu gadiri Jisus

Verse 1

Onodu gadiri Jisus,

Onye buru ibu-njọ-i?

K’Ọ naku, nario k’Ọ bata,

Onye-njọ, i gekwe Ya?

Kọrọs:-

Onodu dir’Ez’otuto!

Ngwa, k’i n anti okwu-Ya!

Kwaghepu on’uzọ obi-i!

Si Ya bata mgb’efe di!

Verse 2

Onodu dir’egwu n’olu,

Ma Kraist, Ony’akpogburu-

N’obi nk’Ọ nwuru n’ihi ya,

Ọ nwegh ebe Ọ gaba!

Verse 3

I nwer’oge i genye Ya?

Biko, le ugbu a b’oge

Ananara madu nk’ọma-

Echi i gakpo n’efu!

Verse 4

Nye Jisus onodu n’oge!

Uboch’amara nefe;

Obi-i gaju oyi n’onwu,

Jisus Kraist ewe riobie!

 

What can wash away my stain?

Abu 268- Gini gasachapu njom?

Verse 1

Gini gasachapu njom?

Nani obara nke Jisus!

Gini geme ka m’nwe ndu?

Nani Obara nke Jisus!

Kọrọs:-

Obara nke Jisus

Bu ihe ok’onu!

Nani ya gasacham,

Nani obara nke Jisus!

Verse 2

Nka bu ihe-nsacham nkem:

Nani obara nke Jisus!

Ngbaharam di nime nka:

Nani Obara nke Jisus!

Verse 3

Ọ digh nkpuchi-nmehie di:

Nani obara nke Jisus!

Olu omam bu n’efu:

Nani obara nke Jisus!

Verse 4

Nka bu ezi-omumem:

Nani obara nke Jisus!

Ntukwasi-obim n’udom:

Nani obara nke Jisus! Amen.


There’s a stranger at the door.

Abu 269- Ony’obia no n’on’uzọ:

Verse 1

Ony’obia no n’on’uzọ:

K’Ọ bata!

Ọ nabia site na mbu:

K’Ọ bata!

K’Ọ bata tutu Ọ la,

K’Onye Nsọ ahu bata,

Jisus Kraist, Ọkpara Nna:

K’Ọ bata!

Verse 2

Meghe obi-gi nye Ya:

K’Ọ bata!

Ọ gala mgb’i nechere:

K’Ọ bata!

K’Ọ bata: Ọ bu Enyi-i,

Ọ galuru gi ogu,

Ọ gechebe i mgbe nile:

K’Ọ bata!

Verse 3

Ge nti olu-Yaa ugbu a!

K’Ọ bata!

K’Ọ bur’Ony’i rotara:

K’Ọ bata!

Ọ neguzọ n’on’uzọ,

Ọ genye gi onu-Ya;

I ganeto Aha-Ya:

K’Ọ bata!

Verse 4

Kpobata Obia nk’igwé:

K’Ọ bata!

Ọ gemere i oriri:

K’Ọ bata!

Ọ gagbahara njọ-gi;

Mgbe ndu-i n’uwa nka gagwu

Ọ gekurui la n’igwé:

K’Ọ bata! Amen.



Hark, my soul! It is the Lord

Abu 270- Obim! nu, Ọ bu Jisus

Verse1

Obim! nu, Ọ bu Jisus;

Nu olu Onye-nwe-gi!

Jisus nekwu, nasi gi,

Onye-njọ, i hum n’anya?

Verse 2

Atopurum gi n’agbu,

Agwopurum onya-gi;

Mgb’ i nakpafu, M’chotara i,

Me k’ochichi-i gho ihe.

Verse 3

Nwanyi puru ichezo

Nw’afo-ya nke muru?

Ik kwe o gechezo,

Ma agamecheta gi.

Verse 4

Ihu-n’anyam di mgbe dum,

Ọ kasi ihe n’elu,

Ọ kasi ihe n’ogbu,

Ọ d’ike kari onwu.

Verse 5

I gahu otuto nkem

Mgb’olu amara gagwu;

I gesom no n’och’ezem:

Onye-njọ, i hum n’anyua?

Verse 6

Jisus, ihe m’nakwa bu

N’ihu-n’anyam jur’oyi;

M’anamasopuru Gi;

Me ka m’hu I n’anya kari! Amen.

 

Art thou weary, art thou languished?

Abu 271- Ike gwuru i, i dar mba

Verse 1

Ike gwuru i, i dar mba,

Ibu nanyigbu i?

Otu Onye si”Biakutem,

Zur’ike!”

Verse 2

Ọ di akara n’aru-Ya

M’geji mara Ya?

Apa di n’aka n’ukwu-Ya,

N’akuku!

Verse 3

Ọ di okpu, dika nk’eze,

Ọ kpuru n’isi?

E, Ọ nekpu okpu n’ezie,

Ma nk’ogwu!

Verse 4

Ma m’chota Ya, ma m’soro Ya,

Gini gab’uru?

Otutọ olu-n’ahuhu,

N’ikw’akwa!

Verse 5

Ma m’jis’ike sogide Ya,

Gini n’ikp’azu?

Luzue olu, meri’ahuhu,

Rue igwé!

Verse 6

M’rio Ya k’Ọ naram n’onwe-Ya,

Ọ gajum aju?

E-e, rue mgbe uwa n’igwé

Gwusiri!

Verse 7

Ma m’chota Ya sogide Ya,

Ọ gagozikwam?

di nsọ na ndi-ozi nile

Naza, E! Amen.


I heard the voice of Jesus say.

Abu 272- Anurom olu Jisus si

Verse 1

Anurom olu Jisus si,

“Biakutem, zur’ike;

Gi, onye nke ike gwuru,

Bia, dabere n’obim.”

Ejekurum Jisus ka m’di,

N’ik’ogwugwu na nkpa;

Ahurum ebe iz’ike,

Ọ nyewom obi’utọ.

Verse 2

Anurum olu Jisus si,

”Le, n’efu ka m”nenye

Miri ndu-Onye o guru

Ruru, nua, we di ndu.”

Abiakuterem Jisus, nua

Miri nke ndu ahu;

Nkpur’obim nwe ume ohu,

M’we di ndu nime Ya.

Verse 3

Anurum olu Jisus si

“Abum ihe nk’uwa:

Lem anya, chi gaboro gi,

Ubochi-i ganenwu.”

Elerem Jisus anya, hu

Na Ya bu Anyanwum;

N’ihe ndu ahu m’ganga

Rue mgbe ijem gagwu. Amen.

 

Come, ye sinners, poor and wretched.

 

Abu 273- Bianu, ndi-nmehie fur’efu,

Verse 1

Bianu, ndi-nmehie fur’efu,

Ndi’ogbenye nadigh ike:

Jisus nacho izop’unu,

I juru n’ihu-n’anya.

Ọ di ike,

Ọ kerewo: bianu ta!

Verse 2

Me ngwa, bianu, ndi nkpa nakpa,

Nar’ebere Chineke;

Ezi ncheghari, n’okwukwe,

N’onyiny’amara nile,

Bianu, nara

N’aka Jisus Kraist n’efu!

Verse 3

Ekwela ka ako-n’uche

Me ka unu ghar’ibia;

Nani nkwesi nka k’o nacho,

Bu ka nkpa-Ya nakp’unu;

Nka k’Ọ nenye i,

Ọ bu onyinye Mọ-Ya.

Verse 4

Bianu, unu nd’ike gwuru,

Ndi odida rur’aru;

M’unu chere k’unu di nma

Ọ digh mgbe unu gabia.

Jisus nakpo

Ndi njọ, o bugh ndi ọma!

Verse 5

Le, Onye rigoro n’igwé

Ji obara-Ya nario;

Tukwasi Ya obi-unu,

Atukwasil’ony’ozo.

Nani Jisus.

Verse 6

Ndi nsọ na ndi-m’ozi nile

Neto Nw’aturu Chuku;

N’eb’obibi nile n’igwé

Ude aha-Ya nada.

Haleluya!

Ndi-njọ geto Ya n’uwa! Amen.


Once again the Gospel message.

Abu 274- I nuwo kwa Ozi ọma

Verse 1

I nuwo kwa Ozi ọma

Nke si n’Onye-nzọputa?

I gege ntin’oku ahu,

I gabia, cho Onye-nw’ayi?

Kọrọs:-

Bia n’okwukwe! bia n’okwukwe!

Bia, le Jisus, k’i di ndu!

Bia n’okwukwe! bia n’okwukwe!

Bia, le Jisus, k’i di ndu!

Verse 2

I lawo okochi n’iyi,

I huwo owuwe-nri;

Udu-miri gabigara,

M’i nano na nmehie-gi.

Verse 3

Kraist nechere k’i roroYa;

Tule ya, anol’odu!

Mọ Nsọ nagba ngba nime gi;

Choba Onye-nzọputa!

Verse 4

Echela ma i gekwesi,

M’obu ijiker’onwe-i;

Ọ tukwasi-obi

Genye onyinye Mọ Nsọ.

Verse 5

Wer’ochicho-i nye Chineke,

Dabere na nmeri Kraist;

Nele Jisus anya n’igwé,

Tukwas’obi n’okwu-Ya. Amen.

 

Let the children come!

Abu 275- K’umu-ntakiri bia !

Verse 1

K’umu-ntakiri bia!

Ka ha biakutem!

Gwa ha ihu-n’anyam:

Ha gabiakutem.

Kọrọs:-

K’umu ntakiri bia!

Ka ha biakutem!

Nu ikpo-oku-Ya:

Ka ha biakutem!

Verse 2

K’umu ntakiri bia!

Jide ha n’aka,

Egbochi-kwa-la ha:

Nka bu iwu nkem!

Verse 3

N’ihi ha M’rapuru

Ulo nkem n’igwé;

Anwurum n’ihi ha:

Ugbu a M’nacho ha.

Verse 4

N’umu-ntakiri bia

N’ulo nkem n’elu!

Zi umu-ntakiri

Ezi uzọm ndu! Amen.


Jesus, friend of little children.

Abu 276- Jisus, Eny’umu-ntakiri

Verse 1

Jisus, Eny’umu-ntakiri,

Buru Enyi nkrm!

Jid’akam, debem mgbe nile

Na nsọ Gi.

Verse 2

Zim otu m geto n’ifi-nma

Ubohi nile;

Gi buru nwata, na n’ezie

I mawo!

Verse 3

Nedum na nzo-ukwum nile

M’naga ka nwata;

Ka m’d’ike, nwe amam-ihe

N’ezi-okwu-I.

Verse 4

Arapulam, aju-kwa-lam,

Bur’Enyim mgbe dum;

N’ihi na nkpa-Gi nakpam na

Ndum nile. Amemn.

 

The wise may bring their learning.

Abu 277- Ndi mar’ihe geweta

Verse 1

Ndi mar’ihe geweta

Ihe-nmuta nke-ha;

Ndi nwer’ego aku-ha,

Ndi’ozo weta ike;

Ai geweta kw’aku-ayi

Che n’iru Eze-ayi;

Ayi enwegh ego n’uche:

Gini k’umu genye?

Verse 2

Ayi gewet’ihu-n’anya

N’otuto ekele,

Nkpur’obi nejis’ike

Ije n’uzọ di nsọ;

Ihe ndia gabu aku

Ayi genye Eze-ayi;

Ma ndia gabu aku

Nk’ogbenye geweta.

Verse 3

Ayi geweta olu nta

Nk’ayi nalu kw’ubọchi;

N’ulo, n’egwu, na nmuta,

Nem’ihe gato Ya;

Aku ndia bara uru

Iche n’iru Ez’ayi

Kar’onyinye nenwegh ha!

Ma nwata genye ha! Amen.

 

Jesus loves the little children

Abu 278- Jisus hur’umu-nta n’anya

Verse 1

Jisus hur’umu-nta n’anya,

Mara olu n’egwu-ha;

Nedu ha ime uche-Ya,

Nanu kwa ekpere-ha;

Umu-ntakiri di ngọzi!

Ọ nanu ekpere-ha!

Verse 2

Jisus necheta umu-nta

Abali n’ehihie dum;

Ned’ukwu-ha ka ha neso

Uzo nke amam-ihe;

Uu-ntakiri di ngọzi!

N’uzọ nke amam-ihe!

Verse 3

Ọ gagozi ma ha rio Ya:

Ọ di nwayọ n’ezi’okwu;

Jisus mara ahuhu-Ya:

Ọ buri nwata na mbu;

Umu-ntakiri di ngọzi!

Ọ buri nwata na mbu! Amen.


 

Jesus loves me! This I know

Abu 279- Jisus Kraist hurum n’anya!

Verse 1

Jisus Kraist hurum n’anya!

Bible Nsọ nagwam otu a;

Umu-nta bu ndi nke-Ya;

H’adigh ike’ m’Ọ d’ike.

Kọrọs:-

Ọ hurum n’anya!

Ọ hurum n’anya!

Ọ hurum n’anya!

Bible nagwam otu a.

Verse 2

Jisus Kraist hurum n’anya!

Ọ nwuru k’Ọ megh’igwé;

Ọ gasachapu nmehiem,

Kwe ka nwa-nta-Ya bata.

Verse 3

Jisus Kraist hurum n’anya!

Mgb’ike gwurum na’nririam;

Ọ gesi n’och’eze-Ya

Bia chebem n’ebe m’dina.

Verse 4

Jisus Kraist hurum n’anya!

Ọ gano nsọm n’uzọm dum;

Ma m’hu Ya n’anya n’ezie,

Ọ gakpolagam n’igwé. Amen.

 

Praise Him! praise Him! All ye little children.

Abu 280- To Ya, to Ya, un’umu-nta nile

Verse 1

To Ya, to Ya, un’umu-nta nile:

Ọ bu Ihu-n’anya;

To Ya, to Ya, umu ntanile:

Ọ bu Ihu-n’anya!

Verse 2

Nekele Ya, un’umu-nta nile:

Ọ bu Ihu-n’anya;

Nekele Ya un’umu-nta nile:

Ọ bu Ihu-n’anya!

Verse 3

Hu Ya n’anya, un’umu-nta nile:

Ọ bu Ihu-n’anya;

Hu Ya n’anya un’umu-nta nile:

Ọ bu Ihu-n’anya!

Verse 4

Me Ya Eze, un’umu-nta nile:

Ọ bu Ihu-n’anya;

Me Ya Eze un’umu-nta nile:

Ọ bu Ihu-n’anya! Amen.

 

We are but little children weak.

Abu 281- Ayi b’umu-nta nadigh ike

Verse 1

Ayi b’umu-nta nadigh ike,

Anamugh n’onodu d’elu;

Gini k’ayi gemere Jisus,

Onye di nma, di kwa ukwu?

Verse 2

Kw’ubọchi nwa Kraist o bula

Nwer’olu d’ike o galu;

Ọ gadi ndu n’ihi Jisus,

Ọ galuso nmehie ogu.

Verse 3

Mgbe echiche nganga n’iwe

Nebili nime obi-ayi;

Mgb’okwu ojo di n’ire-ayi,

M’anya-miri onuma di:

Verse 4

K’ayi ghar’iti madu ihe,

K’ayi ghar’ikwu okwu ojo;

K’ayi nye oziza di nwayọ,

We luara Onye-nw’ayi ogu.

Verse 5

Ihu-n’anya na ir’utọ

K’ayi geji webata ihe

N’obi-ọma nim’ulo-ayi:

Ayi geme ha n’ihi Jisus.

Verse 6

Nwat’o bula nadigh ike

Nwer’obe nta-ya o gebu;

Ol’ihu-n’anya n’otuto

Nke o galu n’ihi Jisus. Amen.

 

Little children, praise the Saviour.

Abu 282- Umu-ntakiri, to Jisus

Verse 1

Umu-ntakiri, to Jisus!

Ọ si n’elu le unu.

To ya n’ihi nzọputa-Ya,

N’ihi ihu-n’anya-Ya.

Kọrọs:-

Hosanna kachasi utọ!

Buara aha nke Jisus!

Hosanna kachasi utọ!

Buara aha nke Jisus!

Verse 2

Mgb’Ọ rapur’ulo-Ya n’igwé,

Mgb’Ọ bi n’etiti madu,

Umu-nta toro Ya n’abu,

Ọ toro Ya ezi’utọ.

Verse 3

Mgbe ndi bu nne kur’umu-ha

We gba Ya gburugburu,

Ọ kpobatara ha nk’ọma,

We gozie umu-nta-ha.

Verse 4

Umu-ntakiri, to Jisus!

Enyi nke nadigh-anwu;

Neto Ya we rue mgbe unu

Gezute Ya n’el’igwé. Amen.


 

We are little children.

Abu 283- Ayi b’umu-ntakiri

 

Verse 1

Ayi b’umu-ntakiri,

Ndi di ezi nta,

Ma nkwa Jisus kwere

Diri ayi nile

Kọrọs:-

M’ayi biakute Jisus,

M’ayi bia choYa ta

Ayi gabu ndi-enyi-Ya:

Otu a k’Ọ kwuru.

Verse 2

Ndi-enyi nke Jisus!

Echiche onu!

Le, nkwa di ok’onu

Nk’Okwu-Ya nezi!

Verse 3

Ndi-enyi nke Jisus,

Ndi nejeso Ya;

Aka-Ya ganedu

Nzo-ukwu-ayi dum.

Verse 4

K’ayi hu Jisus n’anya

Mgbe nile nk’ọma;

Ayi geje kwa hu Ya

N’ulo-ayi n’igwé. Amen.

 

Around the throne of God in heaven.

Abu 284- Gburugburu Oche Chuku

Verse 1

Gburugburu Oche Chuku

Otut’umu-nta no;

Ndi agbaharawo njọ,

Usu ọma di nsọ.

Kọrọs:-

Nabu abu nk’otuto.

Verse 2

Uwe ọcha nwnwegh ntupo

Ka ha nile yiri;

Ha bi n’ihe ebigh-ebi,

N’onu nagagh-agwu.

Verse 3

Gini wetara ha n’igwé,

N’ala ọma ahu,

Ebe nile b’udo,

N’onu, n’ihu-n’anya?

Verse 4

Jisus wusir’obara-Ya

K’Ọ sachapu njọ-ha;

Obar’ahu di ok’onu

Mere ka ha nenwu.

Verse 5

N’uwa ha chotara Jisusm,

Ha huru Ya n’anya;

Ugbu a ha nahu iru-Ya,

Nano ns’och’eze-Ya. Amen.

 

Children of Jerusalem.

Abu 285- Umu-nta Jerusalem

Verse 1

Umu-nta Jerusalem

Toro aha nke Jisus;

Umu-ntakiri ugbu a

Soro n’ito aha-Ya.

Kọrọs:-

Ge nti, nu! ol’umu-nta nabu

Si, “Hosanna dir’Ez’ayi!”

Verse 2

K’ahu Onye-nw’ayi n’anya,

K’ayi nagu Okwu nsọ-Ya,

K’ayi naga n’uzọ nk’igwé;

Ekele diri Chuku!

Verse 3

Nne na nna na nd’ozizi,

Ndi okenye n’umu-nta,

Welieol’unu n’otu,

Ka Hosann’ayi rue igwé! Amen.

 

Do you know what makes us happy?

Abu 286 – I mawo isi onu-ayi

Verse 1

I mawo isi onu-ayi,

Mgb’igwé madu ner’uju?

Ayi bu ndi-enyi nta Jisus,

Ya mere k’ayi naṅuri!

Kọrọs:-

Ayi bu ndi’enyi-Ya,

Nahu Ya n’anya;

Ayi bu ndi’enyi Jisus, ndi naṅuri onu;

Ayi bu ndi’enyi-Ya,

Nahu Ya n’anya;

Ayi no n’onu mgbe nile!

Verse 2

Jisus hur’umu-nta n’anya,-

Ọ nagwa ha n’Okwu Ya;

Ot’ubọchi Ọ kuru ha

N’aka-Ya, we gozie ha.

Verse 3

Ayi bu umu-aturu-Ya,

Ọ bu Onye-nche-Ya,

N’obi k’ayi nanu olu-Ya,

Ọ b’ezie n’ayi ahugh Ya. Amen.

 

If I come to Jesus.

Abu 287- Ma m’biakute Jisus

Verse 1

Ma m’biakute Jisus,

Ọ genyem onu;

Ọ genyem obi’utọ

Mgb’obim ner’uju.

Kọrọs:-

Ma m’biakute Jisus,

Agamanuri;

Ọ ji nwayọ nakpo

Umu-nta dikam.

Verse 2

Ma m’biakute Jisus,

‘Ọ gakpobatam;

Ọ hu-kwa-ram n’anya,

Buru nmehi nkem.

Verse 3

Ma m’biakute Jisus,

Ọ gejid’akam;

Ọ gedurum nwayọ

Rue n’ala ka nma.

Verse 4

N’igwé mu n’umu-nta

Geyi uw’oha;

Agamahu Jisus

N’al’ahu nk’ihe. Amen.

 

O Lord, our hearts would give Thee praise.

Abu 288- Jisus, obi-ayi geto Gi

Verse 1

Jisus, obi-ayi geto Gi

Tutu ayi agbasa,

N’ihi ubọchi ọma nka,

Jisus, Eny’umu-nta.

Verse 2

Tiny’okwu-I n’obi o bula,

Negbopur’ayi nmehie,

K’ayi we ghara irapu Gi,

Jisus, Eny’umu-nta.

Verse 3

Gozie ulo-ayi, nye aka

K’ayi deb’ubọchi nsọ-I;

K’ayi na Gi nano n’el’igwé,

Jisus, Eny’umu-nta. Amen.

 

Jesus, tender Shepherd, hear me.

 

Abu 289- Jisus, Onye-nchem, nur’olum

Verse 1

Jisus, Onye-nchem, nur’olum,

Gozie nwa-I n’abali ta;

Nodu nsọ nim’ochichiri,

Chebem rue chi-obubo.

Verse 2

Aka-I durum n’ubọchi ta,

Ekelem Gi n’ihi ya;

I nyerem nri, n’uwe, n’ulo:

Na nti ekper’anyasim.

Verse 3

Gbahara nmehie nkem nile,

Gozie ndi m’huru n’anya;

Mgbe m’nwuru kurum la n’igwé

Ibinyere Gi n’onu. Amen.


 

Jesus, high in glory.

Abu 290- Jisus, Nke bi m’elu

Verse 1

Jisus, Nke bi m’elu,

Biko, ge ayi nti;

Mgb’ayi dara n’iru Gi

Nur’ol’umu-nta.

Verse 2

Gi b’Onye Nsọ n’ezie,

Eze nk’el’igwé;

I geruru ge nti

Mgbe ayineto Gi.

Verse 3

Ayi b’umu-ntakiri,

Ayi adigh ike,

Onye-nw’ayi, nedu ayi

N’uzọ nk’el’igwé.

Verse 4

Ekwela k’ayi mehie,

Cheb’ayi kw’ubọchi;

Wepu nmehie-ayi.

Verse 5

Mgbe I gakpo ayi la

N’ulo-ayi n’igwé

Ayi geji onu za,

“Jisus ayi nabia.” Amen.


Lord, teach a little child to pray

Abu 291- Nna, zi nwa-I ikpe ekpere

Verse 1

Nna, zi nwa-I ikpe ekpere,

Nyem okwu kwesiri ka m’kwue;

Abum nwata, adighm ike,

Amataghm otu m’gesi kwu.

Verse 2

Ọtutu mgbe ka m’kpere GI,

Nemechi anya, rub’isi;

Ma le, egwu natum nk’ukwu

N’ejighm obim kpe ekpere.

Verse 3

Chineke, biko, wepurum

Obi-njọ nka n’ihi Jisus;

Nyem obi nk’ekpere nato,

Nke gagu Bible kw’ubọchi.

Verse 4

Gosim otu, n’el’osisi,

Jisus gbar’obara n’ihim;

Me ka m’were onwem nye Ya,

Ka m’kpo njọ asi, zere ya.

Verse 5

Nna, nuru kperem ugbu a,

Debem n’okpuru nchebe-Gi;

Mgbe n’nwuru, biko, wer’obim

La nel’igwé, n’ihi Jisus. Amen.

 

God is always near me.

Abu 292- Chineke nanom nsọ

Verse 1

Chineke nanom nsọ,

Nanu nke m’nekwu;

Ọ masiri echichem,

N’olum, na egwum.

Verse 2

Chineke nanom nsọ

Nime abali;

Ọ nahu n’ochichiri

Dika n’ehihie.

Verse 3

Abum nwatakiri,

M’Ọ nom nsọ mgbe dum;

Ile’anyam, n’okwum, n’obim,

Ọ mazuru ha. Amen.

 

When He cometh, when He cometh.

Abu 293- Mgbe Ọ gabia, mgbe Ogabia

Verse 1

Mgbe Ọ gabia, mgbe Ogabia

Ighuko ndi nke-Ya,

Ndi nile-Ya di ok’onu

Nk’Ọ huru n’anya.

Kọrọs:-

Dika kpakpand’ututu

Ha ganenwu ọcha;

Bu kwaih’eji chon ma

N’okpu-eze-Ya.

Verse 2

Ọ gachikota ndi nke-Ya

Tinye n’al’eze-Ya

Ndi di ọcha, na ndi nenwu,

Nk’Ọ huru n’anya.

Verse 3

Umu-nta, ndi huru Onye-

-nzọputa-ha n’anya,

Bu ndi-Ya, ndi di ok’onu

Nk’Ọ huru n’anya. Amen.


It is a thing most wonderful.

Abu 294- Ọ bu ihe di ebube

Verse 1

Ọ bu ihe di ebube,

Di ebube kari uche,

Na nwa Chuku si n’igwé bia

We nwua n’ihi nwata dikam.

Verse 2

M’amaram n’o bu ezi-okwu;

Ọ ror’onodu ogbenye,

We lua olu, rue uju, nwua,

N’ihi ndi nahugh Ya n’anya.

Verse 3

Amataghm otu Ọ ji hu

Nwata nadigh ike n’anya;

Ihu-n’anya-Ya zur’oke

Eb’Ọ nwuru igbaputam.

Verse 4

Anamech’echiche nk’obe,

Mechi’anya, nacho ka m’cheta

Okpu ogwun na ntu ojo,

Na Kraist akpogburu n’ihim.

Verse 5

M’asi na m’huru onwu-Ya,

Agamahu nani nwanti

Nk’ihu-n’anya ukwu nenwu

Dik’oku n’obi-Ya mgbe dum.

Verse 6

Ọ di ebube imata

Ihu-n’anya-Ya n’ebe m’no;

Ma nkem kariri ebube!

Ọ dig hike, o Juru oyi!

Verse 7

Ma m’nacho ihu Gi n’anya:

Jisus, muy’oku nim’obim,

Ka m’nahu Gi n’anya kari,

Rue mgbe m’gahu Gi k’I si di! Amen.


Jesus, Saviour ever mild.

Abu 295- Jisus, Onye di nwayọ

 

Verse 1

Jisus, Onye di nwayọ:

Nw’agbogho namagh nwoke

Jisus, nur’olu-ayi.

Verse 2

Gi, Onye ndi-nch’aturu

Biakutere ikele,

Negbu ikpere n’iru I:

Jisus, nur’olu-ayi.

Verse 3

Jisus, Nke ndi mar’ihe

Sopururu namgb’ochie,

Neweta ih’ok’onu:

Jisus, nur’olu-ayi.

Verse 4

Site na npako efu,

Site n’iwe n’ekworo,

N’aghugho na okw’ugha:

Jisus, nazọput’ayi.

Verse 5

Site n’obi-ume-ngwu,

N’ilefu-ndi’ozo-anya,

N’agu-njọ n’anya-ukwu:

Jisus, nazọput’ayi.

Verse 6

Site na nnupu-isi,

N’ichouzọnk’onwe-ayi,

N’ichufu ikp’ekpere:

Jisus, nazọput’ayi.

Verse 7

N’ihi ih’atu ndu-Gi,

Na nnagide nk’ihe-ngbu,

K’I wetar’ayi nzọputa:

Jisus, nazọput’ayi.

Verse 8

N’ihi Aha-madu-Gi

Nk’ayi nerubere isi,

Nke ndi-m’ozi neto kwa:

Jisus, nazọput’ayi.

Verse 9

N’ihi ike-nmeri-Gi,

N’otuto-Gi n’el’igwé,

N’ebere-I ebigh-ebi:

Jisus, nazọput’ayi. Amen.


The morning bright with rosy light.

Abu 296- Ihe ọma nke ututu

 

Verse 1

Ihe ọma

Nke ututu

Akpotewom n’ura;

Nna, nani Gi,

N’ihu-n’anya,

Nedebe nwa-nta-Gi.

Verse 2

Ekperem Gi

N’ubọchi ta

K’I burum Onye-nche;

Gbahara njom,

Kwe ka m’nebi,

Jisus, n’akuku-Gi.

Verse 3

Nezu ike

Nime obim,

Mọ Nsọ nke amara;

Ka m’di ka Gi,

M’we jikere

Ihu iru-nsọ-Gi. Amen.


MORNING

 

Jesus, Son of righteousness.

Abu 297- Kraist, Anwu nk’ezi’omume

Verse 1

Kraist, Anwu nk’ezi’omume,

Ihu-n’anya Chineke,

Were ihe ututu

Mukwasi ochichi-ayi;

K’ihè-Gi chupu ngbachi

Nk’abali.

Verse 2

Dik’igirigi nada

N’elu ih’okuku dum,

K’amara n’ike Mọ-Gi

Tunye ndu nim’obi-ayi;

Ka mir’ozuzọ ngọzi

Zokwas’ayi.

Verse 3

Dika oku nk’anyanwu,

K’onwunwu ihu-n’anya-I

Chupu iju-oyi-ayi,

Nye inu-oku-n’obi;

K’ayi wer’onu nefe Gi

Mgbe nile.

Verse 4

Olil’anya n’Onye-ndu!

Arapul’ayi mgb’o bula;

Nedeb’ayi n’akuku-Gi

Rue na ndu ebigh-ebi,

Nagakur’ugwu Zaion,

B’ulo-ayi.

Verse 5

Nedu ayi ubọchi dum

N’uzọ-Gi di warara;

Gafe nsọgbu nk’uwa nka

We rue n’al’ahu ka nma,

Ebe ndi-Gi nez’ike

Na ngọzi. Amen.


Come to me, Lord, when first I wake.

Abu 298- Biakutem, Kraist, mgbe m’tetara

Verse 1

Biakutem, Kraist, mgbe m’tetara,

Mgbe anw’ututu nawata;

K’ezie’echiche batam n’isi

Dik’igirigi si n’igwé.

Verse 2

Biakutem n’oke ehihie,

Ka nsọgbu nile di n’uwa

Ghar’ikpuchi ihe iru-Gi,

We me k’ubochim gbachita.

Verse 3

Biakutem na mgbe anyasi;

Asi na obim kpafuru,

Kpolata ya na, ma mukwasim

Iru-ọma-I ka kpakpando.

Verse 4

Biakutem nime abali

Mgbe ura gefepu n’anyam;

Ka nkpur’obim huiz’ike,

Ka Jon si hu, n’obi Jisus.

Verse 5

Biakutem n’uzọ ndu nile;

Mgbe obim kubiri ume,

Ka m’lakuru I, Onye-nzọtam,

Ka nwa-I nonyere Gi n’igwé. Amen.


Awake, my soul, and with the sun.

Abu 299- Obim, teta, so anyanwu

Verse 1

Obim, teta, so anyanwu

Je ozi-gi nk’ubọchi ta;

Rap’ume-ngwu, bilie n’onu,

Kpe ekpere ututu-gi.

Verse 2

Teta, obim, welie onwe-i

Soro ndi-m’ozi n’olu-ha:

Ndi nabu abu n’abali,

Neto Eze ebigh-ebi.

Verse 3

Nekwu ezi’okwu mgbe nile,

K’ako-n’uche-gi di ọcha;

Anya Chineke nahuzu

Ihe-nzuzọ dum nke ndu-gi.

Verse 4

Ka m’ to Gi, Onye cheberem

We tute ndum mgbe m’no n’ura;

Kwe, mgbe m’gesi n’onwu bilie,

Ka m’keta ndu ebigh-ebi.

Verse 5

Biko, nedum n’ubọchi ta,

N’okwu, n’uche, n’omume nkem;

Ka ike nile di nimem

Jiko n’otu n’ito nani I.

Verse 6

To Chineke, Onye-ngọzi;

To Ya, ihe nile n’uwa;

To Ya, usu nile nk’igwé;

To Nna, n’Ọkpara, na Mọ Nsọ.


My God, is any hour so sweet?

Abu 300- Chukum, o di mgbe di utọ

Verse 1

Chukum, o di mgbe di utọ

Si n’ututu rue anyasi,

Dika nka, nakpom bia n’ukwu-I:

Mgbe ekpere?

Verse 2

Ngozi diri mgb’ututu nka,

Ngozi diri mgbe anyasi,

Mgbe m’ji nku ekpere felie,

We rap’uwa.

Verse 3

Mgb’ahu ihe nenwukwasim

Nke kariri anw’ututu;

Ngozi-Gi, nke nabugh nk’uwa,

Nadakwasim.

Verse 4

Mgb’ahu I nenyem ik’ohu,

Mgb’ahub I nagbahara njom,

We wer’olil’anya nk’igwé

Kasiem obi.

Verse 5

Ọ digh onu puru ikwu

K’I si negbo nkpam n’eb’ahu;

Ike n’ogu, ogwu nauta,

Udo nk’obi.

Verse 6

Ich’uch’agwu! ujo ala!

Obim di k’o no n’el’igwé;

Ehichapur’anya-miri

Nke akwa-njọ.

Verse 7

Nna, rue mgbe m’geru al’onu,

Ọ digh ihe gatom utọ,

Dik’irupuru Gi obim

Nim’ekpere. Amen.

ABU 201 – 300 

ABU 201 – 300 

ABU 201 – 300 

ABU 201 – 300 

One thought on “Abu Anglican Communion 201 to 300 (Igbo Hymn)

Comments are closed.