You dont have javascript enabled! Please enable it! Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn) - 9JAINFORMED

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Search Contents

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Igbo hymn, also known as Abu or Ekpere Na Abu (Ancient and Modern) is one of the Anglican Communion heritages. It is composed and compiled for spiritual worship in the church and for personal devotion. We have made it easier here. You can now surf for your Abu Anglican Communion Igbo hymn from 1 to 400.

For the purpose of convenience and for easy surfing, we split Abu Anglican Communion. This is number 151 to 200.

What Abu Number are you searching for? Check it inside the “Table of Content” and click on it.

Abu 151 to 200 “Table of Content”:

 

Click here for your:

Abu 1 to 50

ABU 51 to 100

ABU 101 to 150

ABU 151 to 200

ABU 201 to 300

ABU 301 to 400

Click  Here for Your Anglican Communion Bible Study Outline 2021:

2021 Anglican Bible Study Outline | Church of Nigeria

 

Abu 151— Chukwu, mgb’obim nech’echiche

When all Thy mercies, Ọ my God.

 

verse 1

Chuku, mgb’obim nech’echiche

Ebere-Gi nile,

Otutọ-ya n’ebube-ya

N’ebulite obim

 

verse 2

Nkasi anapugh’iguta

Ka nchebe nro-I nyere,

Tutu obi nwatam mara

Ebe ha si puta.

 

verse 3

Mgb’oria nyerem nsọgbu n’aru,

I bu Onye gworom;

Mgbe m’no na njọ n’ahuhu, Gi

Wer’amara tutem.

 

verse 4

Mgbe nile m’nadi ndu n’uwa,

Idi-nma-I ka m’geso;

Mgbe m’nwuru, la n’uwa ozo,

M’gabu ab’otuto.

 

verse 5

Na ndu ebigh-ebi n’igwé

M’gekele Gi n’abu;

M’ebigh-ebi agagh-ezu

Itozu otuto-I. Amen.


 

Abu 152- Too Chuku Abraham.

The God of Abraham praise.

 

Verse 1

To Chuku Abraham,

Bu Eze n’el’igwé,

Onye si na mgb’ebigh-ebi,

Nn’ihu-n’anya:

Chuku, ABUM di’uku,

Nk’uwa n’igwé neto:

Ka m’rub’isi gozie Aha-I

Di nsọ mgbe dum.

 

Verse 2

To Chuku Abraham,

Onye nyere iwu,

M’we si n’aja bilie ch’onu

N’aka-nri-Ya.

Ajum ih’uwa dum,

Ike n’amam-ihe;

Nani ya bu okem n’otam,

Ulo-elum.

 

Verse 3

Adaberem n’iyi

Ọ ji Onwe-Ya nua;

Agamewere nku ugo

Rigo n’igwé.

M’gahu iru nsọ-Ya

Neto kw ike-Ya,

Bua abu nye amara-Ya

Rue mgbe nile.

 

Verse 4

Ma ike uwa gwu,

Oku-mo megidem,

N’ala Kenan ka m’ga ije

Dik’Ọ si kwu;

Gafe osimiri,

Nele Jisus anya,

Si n’ozara nekpo oku

Naga n’iru.

 

Verse 5

Kal’ọma ka m’nahu,

Nk’udo n’iju-afo;

Ala nk’inwe-onwem di nsọ,

Na iz’ike.

Manu-anu neru,

Manu ba-kwa-r’uba;

Osisi-ndu neto mgbe dum

Nim’ebere.

 

Verse 6

Ez’ayi bi n’eb’ahu,

Ony’ezi’omume-ayi,

Nemeri uwa na nmehie,

Eze udo.

N’ugwu nsọ nke Zaion

K’al’eze-Ya di kwa;

Ya na ndi nsọ-Ya nim’ihe

Nabu eze.

 

Verse 7

Ọ nedebe ndi-Ya,

Chebe ha na nsọYa,

Neyikwasi uwe ọcha

Nwuny’ohu-Ya,

Iyi nke onu nsọ,

obi’utọ nke di ndu,

Nkpuru ọma nke Paradais,

K’Ọ nenye ha.

 

Verse 8

Chuku nke bi n’elu

Ka ndi-m’ozi neto,

Nasi “Nsọ! Nsọ! Nsọ!

Eze d’ike!”

“Onye nori, no kwa,

Ọ gano mgbe nile;

Chineke, Nna, ABUM di’uku,

Ayi nefe Gi!”

 

Verse 9

N’ir’Onye-nzọputa

Nd’agbaputara no,

Neti nkpu n’amara nke-Ya,

Ohu mgbe dum.

Ọ gos’ihu-n’anya,

Obi-ha kpo oku,

Olu-ha dazue n’uwa dum,

“Nwa-aturu!”

 

Verse 10

Usu nmeri nile

Neto Ya, “Ekele!

Nna na Ọkpara na Ma Nsọ!”

Mgb’ebigh-ebi.

“Ekele, Chinekem!”

Ka m’so n’abu nk’igwé;

“Ike, n’ebube, n’otuto

Bu nke-I mgbe dum!” Amen.

 

Abu 153- Too Chineke, b’Eze-ayi;

Praise, Ọ praise our God and King.

 

Verse 1

To Chineke, b’Eze-ayi;

Buanu abu otuto.

 

Kọrọs:-

N’ihi na ebere-Ya

Nadiru mgb’ebigh-ebi.

 

Verse 2

To Ya na Ya ker’anwu

K’o nag’ije-ya mgbe dum.

 

Verse 3

Ọ ker’onwa nke neti,

Nenye ihe n’abali.

 

Verse 4

To Ya, Ya zoro miri,

K’o me ji n’ubi ru mba.

 

Verse 5

Ya siri ala ubi

K’o nami nkpuru n’uba.

 

Verse 6

To Ya n’iwe ih’ubi,

Ọ mejuwo oba-ayi.

 

Verse 7

To Ya n’ihi nri ka nma,

Ihe-mbe ndu nk’el’igwé.

 

Verse 8

Otutọ dir’Eze-ayi,

K’uwa nile neto Ya;

Tobe Atọ-nim’Otu,

Nna, n’Ọkpara, na Mọ Nsọ. Amen.


 

Abu 154- Otutọ diri Chuku n’ih’Ọ luru.

To God be the glory, great things He hath done.

 

verse 1

Otutọ diri Chuku n’ih’Ọ luru!

Ọ hur’uwa n’anya, nye Ọkpara-Ya,

Nke togboro ndu-Ya ikpuchi nmehie,

Mehepu uzọ ndu k’ora we bata.

 

Kọrọs:-

To Chuku! To Chuku! K’uwa nur’olu-Ya!

To Chuku! To Chuku! Ka madu dum nuria1

Biko, biakute Nna site na Jisos;

Nye Ya otuto n’ok’ihe Ọ luru!

 

verse 2

Ezi ngbaputa nk’eji obara go!

Onye kwere ka nkwa Chineke diri,

Onye kachasi njọ nke kwere n’ezie,

Jisos gagbaghara nmehie-ya ugbua.

 

verse 3

Ok’ihe Ọ zir’ayi, ok’ih’Ọ luru,

Ok’onu k’ayi nwere site na Jisos;

M’ayi ganaṅuri onu nke kachasi,

Neti nkpu n’ebube mgbe ayi gahu Ya. Amen.

 

Abu 155- To Jisos, Onye ngbaputa nke di ngọzi.

Praise Him! praise Him! Jesus, our blessed Redeemer!

 

Verse 1

To Jisos, Onye ngbaputa nke di ngọzi!

K’uwa nabu ok’ihu-n’anya-Ya;

Kele Ya, nd’isi-m-ozi nke bi n’otuto,

K’ike na nsọpuru dir’Aha-Ya!

Jisos geche umu-Ya dik’aturu,

Kw’ubọchi k’Ọ neku ha n’aka-Ya.

 

Kọrọs:-

To Ya! To Ya! nekwu na Ya bu Okaka.

To Ya! To Ya! n’abu onu mgbe dum.

 

Verse 2

To Jisus, Onye-ngbaputa nke di ngọzi!

Ọ nwuru n’ihi nmehie-ayi nile;

Ya bu nkume nzọputa ebigh-ebi-ayi,

Kele Jisos, Onye akpogburu!

Nye Y’otuto, Onye hur’ayi ahuhu;

Ihu-n’anya nke nenwegh ih’atu!

 

Verse 3

To Jisos, Onye-ngbaputa nke di ngọzi!

Hosanna nakpotu nim’el’igwé.

Jisos Kraist gabu eze mgbe ebigh-ebi:

Me Ya Eze, ndi nzuko-Ya nile!

Ọ nabia dik’Onye-nmeri n’el’uwa,

Ike n’otuto diri Onye-nw’ayi! Amen.


 

Abu 156- Tob’Eze nke ni n’otuto n’elu.

Ọ worship the King.

 

Verse 1

Tob’Eze nke ni n’otuto n’elu,

Bua abu nk’ike n’ihu-n’anya-Ya:

Ota n’Inye-ak’ayi, Ony’ochie k’Ọ bu,

Onye bin’ebube, nkeyir’otuto!

 

Verse 2

Ko amara-Ya, bu kwa ike-Ya,

Uwe-Ya b’ihe, ulo-Ya b’igwé;

Ugb’ala iwe-Ya nwer’igw’oji,

Uz’ochichiri-Ya di nim’ifufe.

 

Verse 3

Chuku, ike-Gi ker’uwa mgb’ochie,

N’ih’ebube dum di kwa nimw ya;

I ji ezi’ukpuru we kwagide ya,

Osimiri k’I ji yibe ya k’uwe.

 

Verse 4

Nchebe-Gi nile, onye pur’iko?

Ume ayi neku, ihe nke nenwu!

Ọ sitere n’ugwu rudata n’ala,

Wusa igirigi na mir’ozuzuo.

 

Verse 5

Umu nke aja, ndi nadigh ike,

Ayi dabere Gi, na I kwesiri!

Eber’obi-nro-Gi di mgb’ebigh-ebi,

Eyi, Ony’okike, n’Onye-ngbaput’ayi!

 

Verse 6

Ihu-n’any’ukwu! Ike kachasi!

Ebe ndi-m’ozi neto Gi n’elu,

Ayi ndi bi nim’uwa, n’ezi nsọpuru,

Geji olu nwayọ nabu otuto-I! Amen.

 

Abu 157- Ka m’nw’obi agbaputara.

Ọ for a heart to praise my God

 

Verse 1

Ka m’nw’obi agbaputara

Na njọ ito Chuku!

Obi efesar’obara

Nk’awusirim n’efu.

 

Verse 2

Obi nwayọ, di um’ala,

Och’eze nk’Onye-nwem;

Eb’o bu nani Kraist nekwu

Nani Ya bu Eze.

 

Verse 3

Obi-ncheghari, nekwere,

Nke di kw’ọcha n’ezie;

Nke ndu n’onwu enwegh ike

Ikewapu na Gi.

 

Verse 4

Obi nk’echich’ohu juru

N’ihu-n’anya di nsọ;

Nke zur’oke, di’ọcha, di nma

Dika nke-I, Onye-nwem.

 

Verse 5

Ony’amara, kenyem udi-I,

Si n’elu ridata;

De aha ohu-Gi n’obim,

Aha’ihu-n’anya. Amen.

 

Abu 158- Otutọ na nsọpuru,

All glory, laud and honour.

 

Verse 1

Otutọ na nsọpuru

Dir’Onye-ngbaputa,

Onye nk’umu ntakiri

Tikuru “Hosanna!”

 

Verse 2

Gi bu Eze nke Isreal,

Gi nwa Eze Devid,

Nke nabia n’aha Chuku,

Eze nke di ngọzi!

 

Verse 3

igwé usu ndi-m’ozi

Neto Gi n’el’igwé.

Madu n’ih’eker’eke

Naza ha n’el’uwa.

 

Verse 4

Ora nile ndi-Hibru

Ji igu ga n’iru !;

Ekpere n’otuto-ayi

N’iru I k’ayi wetara.

 

Verse 5

Ha bur’I ab’otuto

Tutu mgb’ahuhu-Gi;

Ugbu a k’I no n’el’igwé

Ayi nabu ab’utọ.

 

Verse 6

Otutọ-ha toro Gi,

Nara ekpere-ayi:

Gi nk’ez’ihe dum nato,

Eze, Ony’amara! Amen.


 

Abu 159- Ihu-n’anya nke kachasi.

Love Dive, all loves excelling.

 

Verse 1

Ihu-n’anya nke kachasi,

Onu nk’igwé bia n’uwa!

K’eb’obibi-Gi di nim’ayi,

Kpube ebere-Gi dum!

 

Verse 2

Jisus, I juru n’omiko,

Gi bu ez’ihu-n’anya;

Were nzọputa-Gi let’ayi,

Ba n’obi natu egwu.

 

Verse 3

Bia, Onye-nzọputa d’ike,

K’ayi nile nar’amara-I;

Bia na mberede, we ghara

Irapu obi’ayi ozo!

 

Verse 4

Ayi ganagozi I mgbe nile ,

Nefe Gi dika nd’igwé;

Nekpe, neto Gi, naṅuri

N’ihu-n’anya-I zur’oke.

 

Verse 5

Kezue  okike ohu-Gi,

K’ayi di’ọcha nenwegh ntupo;

K’ayi hu oke nzọputa-Gi,

Zu kwa oke nime Gi.

 

Verse 6

K’eji otuto nenwogh’ayi,

Rue mgb’ayi ganodu n’igwé,

Togb’okpu-ez’ayi n’iru Gi,

Neto Gi n’ihu-n’anya.

 

Amen.

 

Abu 160- Nuri onu nim’Onye-nw’ayi.

Be glad in the Lord, and rejoice.

 

Verse 1

Nuri onu nim’Onye-nw’ayi,

Unu ndi obi-ha di nma;

Unu ndi rota-kwa-ra Ya

Si nwuta na ir’uju la!

 

Kọrọs:-

Nuria! Nuria!

Nuria onu nim’Onye-nw’ayi.

Nuria! Nuria!

Nuria onu nim’Onye-nw’ayi.

 

Verse 2

Nuria n’ihi n’Ọ bu Eze,

Nachi n’uwa na n’el’igwé;

Ọ ji okwu-Ya ke ihe,

Ọ b’Onye-ngbaputa d’ike.

 

Verse 3

N’ezie o fọduru nwanti

Ka nd’iro-unu nwe nmeri;

Ma ndi-agha Chuku zor’ezo

Kariri ndi nemegide.

 

Verse 4

Ma ehihie gba ochichi,

Abali kpuch’iru-igwé,

K’uche ghara iche unu,

Tukwasi obi na Chuku!

 

Verse 5

Nuri onu nim’Onye-nw’ayi,

Weren’ubo, n’olu, n’obi

Netonu Ya n’ibu abu,

K’aleluya nada uda! Amen.


 

Abu 161- Agamet’Onye-ngbputam.

I will sing of my Redeemer.

 

Verse 1

Agamet’Onye-ngbputam

N’ihu-n’anya Ọ jirim;

N’obe k’Ọ huru ahuhu

Ka m’pua n’obubu-onu.

 

Kọrọs:-

Biko, to Onye-ngbaputam!

Obara-Ya k’Ọ ji gbam!

N’obe k’Ọ kwusiri ugwom,

Me ka m’pua n’oru nmehiem.

 

Verse 2

M’gako akuko ebube,

Otu Ọ gbaputaram

N’ihu-n’anya n’ebere-Ya,

Mgbe m’fur’efu n’oke njom.

 

Verse 3

Agamet’Onye-ngbaputam,

Nako ike nmeri-Ya;

Otu Ọ si me k’ayi meri

Nmehie, n’onwu, n’oku-mo.

 

Verse 4

Agamet’Onye-ngbaputam,

N’ihu-n’anya-Ya n’igwé;

Ọ gbatawom n’onwu, nyem ndu,

Ka m’biyere Ya mgbe dum.

Amen.

 

Abu 162- Ọ dim ka’nabu mgbe nile.

I feel like singing all the time.

 

Verse 1

Ọ dim ka’nabu mgbe nile,

Emewo k’akwam bie;

N’ihi na Jisus bu Enyim,

Ka m’fe Ya kw’ubọchi!

 

Kọrọs:-

Ka m’to Ya, to Ya, to Ya

Mgbe nile!

To Ya, to Ya, ka m’to Ya

Mgbe nile!

 

Verse 2

Mgbe m’huru Onye-nwem n’obe,

Akpogburu n’ihim,

Akwaram akwa; ma ugbu a

Anameto mgbe dum.

 

Verse 3

Mgbe onwunwa nanwa obim

Ka m’ si “Jisus bu nkem!”

Anya-miri gagbam n’ezie,

M’anameto mgbe dum.

 

Verse 4

Akuko Nw’aturu Chuku

Were inu-gi ko,

Ka ndi’ozo wer’abu onu

Naga, neto mgbe dum. Amen.

 

Abu 163- Ka ndi nile bi n’el’uwa.

Trom all that dwell below the skies.

 

Verse 1

Ka ndi nile bi n’el’uwa

Nye Ony’okike otuto; Aleluya!

K’asusu dum na’ala nile

Bua  aha Onye-ngbaputa, Aleluya.

 

Verse 2

Nna,ebere-I di mgbe nile,

Ezi’okwu-I di ebigh-ebi; Aleluya!

Otutọ-I geru nsọt’uwa,

Rue mgbe anwu nagagh-adi. Aleluya! Amen.


 

Abu 163- Ka ndi nile bi n’el’uwa.

 

Trom all that dwell below the skies.

 

Verse 1

Ka ndi nile bi n’el’uwa

Nye Ony’okike otuto; Aleluya!

K’asusu dum na’ala nile

Bua  aha Onye-ngbaputa, Aleluya.

 

Verse 2

Nna,ebere-I di mgbe nile,

Ezi’okwu-I di ebigh-ebi; Aleluya!

Otutọ-I geru nsọt’uwa,

Rue mgbe anwu nagagh-adi. Aleluya! Amen.

 

Abu 164- K’ayi wer’abu onu soro.

Come, let us join our cheerful songs.

 

Verse 1

K’ayi wer’abu onu soro

Ndi-m’ozi n’och’eze;

Apugh iguta onu-ha,

Ma onu-ha b’otu.

 

Verse 2

Ha si “Nw’aturu kwesiri

K’ebulie Ya elu”;

Ayi naza, si “Ọ kwesiri

N’ihi n’Ọ nwuru ayi!”

 

Verse 3

Jisus kwesiri k’Ọ nara

Nsọpuru n’ike nsọ;

Ngozi ka nke ayi pur’inye

Diri I mgbe dum, Ez’ayi!

 

Verse 4

Okike nile nejiko

Igozi aha nsọ;

Nk’Onye nanodu n’och’eze,

Na ito Nw’aturu. Amen.

 

Abu 165- Mgbe chi boro n’igwé.

When morning glids the skies.

 

Verse 1

Mgbe chi boro n’igwé

Obim teta neti,

K’aneto Jisus Kraist!

Nim’ekpere n’olu

Ka m’jekuru Jisus:

K’aneto Jisus Kraist!

 

Verse 2

Mgb’atan ulo-Chuku

Nada n’elu n’ala,

K’aneto Jisus Kraist!

Ge nti! n;iho nabu,

K’o ji onu nada:

K’aneto Jisus Kraist!

 

Verse 3

Mgb’ura nekwegh itu,

Nkpur’obim nas’ude.

K’aneto Jisus Kraist!

Mgb’echiche-njọ nabia,

Nka gedebe obim:

K’aneto Jisus Kraist!

 

Verse 4

Mgbe nwuta jur’obim,

Ebe a m’nahu nkasi:

K’aneto Jisus Kraist!

Mgb’onu nk’uwa nagwu,

Nka ganagbam ume:

K’aneto Jisus Kraist!

 

Verse 5

N’ebigh-ebi nk’igwé

Abu nka kachasi:

K’aneto Jisus Kraist:

K’ala n’osimiri

Si n’ebe dum naza:

K’aneto Jisus Kraist!

 

Verse 6

Mgbe nile m’nadi ndu.

Nka gabu abu nsọm:

K’aneto Jisus Kraist!

Abu nka kasi nma

OTUTO

K’agabu n’ogbo dum:

K’aneto Jisus Kraist! Amen.

 

 

Abu 166 – Sopuru Chineke n’ima-nma nk’idi-nso!

Verse 1

O worhip the Lord in the beauty of holiness

Kpo isi ala, kwu’otuto-Ya;

Ol’edo nk’ina-nti, n’uda nk’idi-nwayo,

Che n’iru ya; Onye-nw’anyi b’Aha-Ya.

 

Verse 2

Were ibu-nchebu-gi togbo n’ukwu-Ya.

O geburu gi ya n’el’obi-Ya,

Kaie obi-I n’ihe-ngbu, za ekpere-gi

Nedu nzo-ukwu-gi k’o si to Ya.

 

Verse 3

Newebat’aku-ogbeye I gakpo nke-i

Atul’egwu iba n’ogige-Ya;

Ima-nma nk’ezi’okwu, n’ihu-n’anya di nro:

Ndi bu onyinye iche n’iru Ya.

 

Verse4

M’anyi wer’ima-jijiji n’egwu weta ha

O ganata ha n’ihi Ahia Ya

O genye onu n onodu anya-mmiri

Nye kw’olil anya na ntukwasi obi.

 

Verse 5

Sopuru Chineke n’ima-nma nk’idi-no!

Kpo isi ala, kwu’otuto-Ya:

Ol edo nk’ina-nti, n’uda nk’idi-nwayo

Che n’iru Ya: Onye-nw’anyi b’Aha-Ya

Amen.


 

Abu 167- To Chineke, Ony’okike, Eze nk’uwa nile.

Praise to the Lord.

 

Verse 1

To Chineke, Ony’okike, Eze nk’uwa nile;

Obim, to Ya, n’ihi na Ya bu ndu na nzọputa-i;

Ndi nke nanu,

Ndikom na ndinyom bia nsọ,

Wer’obi’utọ sopuru Ya.

 

Verse 2

To Chineke, Nke nechebe gi, gozi kw’olu-gi;

Obi’ọma n’ebere-Ya nechere gi kw’ubọchi;

Tule y’ozo,

Ihe Ọ puru ime

M’Ọ hu gi n’anya dik’Eyi.

 

Verse 3

To Chineke, Nke ji ebube nach’ihe nile;

Negbochiri i  ihe’ize-ndu, natute obi-gi;

I kalugh kwa

K’esi me ochiho-gi

N’ihe nk’Ọ bur’uzọ dozi?

 

Verse 4

To Chineke, Onye, mgb’ochichi na njọ bar’uba,

Mgbe ndi nemeb’iwu nacho imeri ndi-ọma,

Nezisi’ihe,

Nacho ogwu abali,

Nemere ndi-Ya ebere.

 

Verse 5

To Chineke! k’ihe nile nimem sopuru Ya!

K’ihe dum nek’ume wer’otuto bia n’iru Ya!

K’Amen nada

N’onu ndi nsọ-Ya ozo:

K’ayi to Ya n’onu mgbe nile. Amen.

 

 

Abu 168- Chinekem, ekelem Gi, Onye ker’uwa.

My God, I thank Thee.

 

Verse 1

Chinekem, ekelem Gi, Onye ker’uwa,

Nke juru n’ebube n’onu, n’ihe na nma;

Otut’ihekwesir’otuto di n’ebe a.

 

Verse 2

Ekelem Gi n’I mere k’onu ba uba;

Ihe nke di nwayọ gbar’ayi gburugburu;

N’ebe gbakar’ochichi ihu-n’anya di.

Verse 3

Ekelem Gi kari, n’onu nwere nwuta;

Oge nile nwer’onyinyo, ogwu nadi;

K’on’uwa buru ihe-ndu, o bugh nkporo.

 

Verse 4

I mara, Nna,k’obi-ayi si we jid’uwa;

I we nye ayi onu di nro nke nwere nku,

Ime k’ayi hu ihe ka nsọ nenwu n’elu.

 

Verse 5

Ekelem Gi, n’ihe kasi nma akabiagh;

Egboro nkp’ayi, m’ayi nel’anya ihe nke ka:-

Udo dik’omimi nk’ayi nahugh n’oge mbu.

 

Verse 6

Ekelem Gi na nkpur’obi-ayi nwe ngọzi;

Ma h’agagh-achota iz’ike zur’oke

Rue mgbe ha gadabere n’obi nke Jisus. Amen.

 

 

Abu 169- Mejue ndum n’akuku-ya dum.

Will Thou my life, Ọ Lord, my God.

 

Verse 1

Mejue ndum n’akuku-ya dum

N’otuto, Chinekem,

K’arum nile we kwuputa

Odidi-Gi, n’uzọ-I.

 

OTUTO

 

 

Verse 2

Ọ bugh nani ire n’obi

Ito Gi ka m’nario;

Kama, ndu nk’akuku-ya dum

Juru n’otuto-Gi.

 

Verse 3

Otutọ, n’ihe-kw’ubọchi,

Nbata n’opupu-ya;

Otutọ n’olu, n’omume

Nke dikariri nta.

 

Verse 4

Mejue ndum nile n’otuto,

Ka m’we kwuputa Gi

N’ihu-n’anya, o bu ezie

Na m’bu ony’ogbenye.

 

Verse 5

Otu a ka’I ganata n’akam

Otutọ kwesiri I;

M’we malite n’uwa abu

Nke di ohu mgbe dum.

 

Verse 6

Ehihie n’abali nile

Gabu oge di nsọ;

M’gesoro Gi nweko ihe

Na nzo-ukwum nile. Amen.

NCHEGHARỊ

 

 

Abu 170- Otu m’di-nenwegh agugo.

Just as T am, without one plea.

 

Verse 1

Otu m’di-nenwegh agugo

M’obugh nani obara-Gi;

Obu Gi sim biakute Gi-

Nw’at’ru Chuku, abiam!

 

Verse 2

Otu m’di-o digh nke m’neche

Ka m’wepu nmehie di n’obim;

Obara-I gasachapu ya-

Nw’at’ru Chuku, abiam!

 

Verse 3

Otu m’di- anatugharim,

Obim nechegbu onwe-ya,

Ogu n’egwu nime, n’ezi!-

Nw’at’ru Chuku, abiam!

 

Verse 4

Otu m’di-Ogbeny’onu-ntu,

Anamacho aku nk’igwé;

I puru igbo nkpam nile-

Nw’at’ru Chuku, abiam!

 

Verse 5

Otu m’di-I gekwe naram,

Gbaharam, sachapu nmehiem,

N’ihi n’ekwerem nkwa nke-Gi-

Nw’at’ru Chuku abiam!

 

Verse 6

Otu m’di- ihu-n’anya-Gi

Ebupuwon ndachi nile;

Ugbu a ka m’nabu nani nke-I-

Nw’at’ru Chuku abiam!

 

Verse 7

Otu m’di-ka m’mara nk’ọma

Omimi ihu-n’anya-Gi,

N’ebe a nw’oge, na n’el’igwé-

Nw’at’ru Chuku abiam! Amen.


 

Abu 171- Jisus, na mgb’ebere-I nka.

Lord, in Thy mercy’s day.

 

Verse 1

Jisus, na mgb’ebere-I nka,

Tutu o gabiga,

Ayi gbu ikpere nario.

 

Verse 2

Jisus nye ayi ncheghari,

Mehue obi-ayi n’egwu,

Tutu mgbe ikpe abia.

 

Verse 3

Jisus, wukwas’ayi Mọ-Gi,

Eb’ayi dara n’ukwu-Gi,

Tutu mgb’ebere agwu.

 

Verse 4

N’ihi ibu-obi-Gi,

N’ihi akwa-ekpere-I,

N’ihi nkwere-onwu Gi,

 

Verse 5

N’ihi akwa di ilu

Nk’I kwara Jerusalem,

Ekwel’ayi gbanari Gi.

 

Verse 6

Ony’ikpe madu nile,

Mgb’ayi gahu iru n’iru,

Zob’ayi n’okpuru nku-Gi.

 

Verse 7

Ọ bu n’ihu-n’anya-Gi

K’ayi nadabere mgbe dum,

N’igwé k’ayi gamazu ya! Amen.

 

 

Abu 172- Onye-nw’ayi, nechetam.

Lord Jesus, think on me.

 

Verse 1

Onye-nw’ayi, nechetam,

Sachapu nmehie nkem;

zọputam n’agu-njọ uwa,

Me k’obim di ọcha.

 

Verse 2

Onye-nw’ayi, nechetam,

Nchekasi nakpagbum;

Ka m’buru ezi oru-Gi,

Mara iz’ike-Gi.

 

Verse 3

Onye-nw’ayi, nechetam,

Ekwela ka m’kpafue;

Nim’ochichiri n’ich’uche

Gosim uzọ igwé.

 

Verse 4

Onye-nw’ayi, nechetam,

Mgb’ahuhu riri nne,

Mgbe ony’iro nemegidem,

Onye-nzọtam, no nsọm.

 

Verse 5

Onye-nw’ayi, nechetam,

K’o gabu mgbe m’nwuru,

Ka m’hu ihe nk’ebigh-ebi,

Ket’oke n’onu-Gi.

 

Verse 6

Onye-nw’ayi, nechetam,

Ka m’we bua n’el’igwé,

Neto Gi na Nna na Mọ Nsọ

N’abu nke otuto. Amen.

 

 

Abu 173- Mu, di njọ, nacho ngọzi.

Sinful, sighing to be blest.

 

Verse 1

Mu, di njọ, nachọ ngọzi,

Nachọ ka m’puta n’oru,

Nechere izu-ike:

Chuku, merem ebere.

 

Verse 2

Enweghm ezi agugọ,

Nmehie di n’ọlum nile,

Nani nkpam ka m’nebute:

Chuku, merem ebere.

 

Verse 3

Obi-ntiwa n’ihere

Ekweghm iweli anyam,

Ma Gi mar’ude m’nasu:

Chuku, merem ebere.

 

Verse 4

Site n’obi-nmehie nka

Ka  m’gbakuru nani Gi;

Abugh nkem, kama nke-Gi:

Chuku, merem ebere.

 

Verse 5

Onye nọ ns’och’eze-Gi

Ka m’tukwasiri obim;

Enweghm iye’aka ọzọ:

Chuku, merem ebere.

 

Verse 6

Ya ganekwurum ọnum;

Ya gasughari okwum;

Ya bu nkem, na n’ihi Ya,

Chuku, merem ebere.

Amen.

 

 

Abu 174- Onye-nwem, Gi ka m’kpokuru.

Jesus, my Lord, to

 

Verse 1

Onye-nwem, Gi ka m’kpokuru,

Aghagm inwu m’I nyeghm aka;

Werute nzọputa-Gi nsọ,

Werem otu m’si di!

 

Kọrọs:-

Werem otu m’si di,

Werem otu m’si di!

Jisus nwurum! bi aririom;

Werem otu m’si di!

 

Verse 2

Ike adigh, ikpe maram,

Ma I wusirim obara-I,

I pur’imem ka I si cho;

Werem otu m’si di!

 

Verse 3

Apughm ijikere onwem,

Ezi nzubem ka m’mebiri,

Ma zọputam n’ihi-I;

Werem otu m’ si di!

 

Verse 4

Onye-nzọtam, lem n’ukwu-Gi,

Mesom ka osi di Gi nma,

Malite olu-I, lusia ya;

Werem otu m’ si di! Amen.

 

 

Abu 175- Nna, esetirim Gi akam.

Father, I stretch my hands to Thee.

 

Verse 1

Nna, esetirim Gi akam,

Amaghm onye ozo;

I wezuga Onwe-I n’arum,

Ol’ebe ka m’geje?

 

Kọrọs:-

Ekwerewom, ekwerewom,

Jisus nwuru n’ihim;

Obara-Ya di ok’onu

Ka m’geji pua na njọ.

 

Verse 2

Le ahuhu Jisus huru

Tutu amuam n’uwa!

Le, ihe-ngbu Ọ ji zotam

N’onwu ebigh-ebi!

 

Verse 3

Jisus, o buru na m’gekwe,

M’gamata ike-Gi;

I gegborom ihe nile

Na mgbe ebere nka.

 

Verse 4

Gi, Onye nenye okwukwe,

Ka m’welie anyam le!

Nyem onyinye ahu ugbu a,

K’obim ghara inwu. Amen.


 

 

Abu 176- Agabigalam, Onye-nwem.

Pass me not, Ọ gentle Saviour.

 

Verse 1

Agabigalam, Onye-nwem,

Nuru akwa nkem;

Mgb’I nakpo ndi ozo oku,

Agabigalam!

 

Kọrọs:-

Jisos, Jisos, nuru akwa nkem,

Mgb’I nakpo ndi ozo oku,

Agabigalam!

 

Verse 2

Ka m’chota n’och-ebere-Gi

Iye’aka utọ;

Nada n’ukwu-I na ncheghari,

Me ka m’kwes’ike.

 

Verse 3

Natukwas’obi n’olu-Gi

Ka m’nacho iru-I;

Gwo onya n’obi-ntiwa nkem,

zọpum n’amara-I.

 

Verse 4

Is’iyi nke nkasi-obim,

I kariri ndu!

Onye ka m’nwe n’uwa, n’igwé,

M’obugh nani Gi. Amen

 

 

Abu 177- Jisos Onye nwayọ.

Jesu, meek and gentle

 

Verse 1

Jisos Onye nwayọ

Nwa nke Chineke

Nur’akwa umu-Gi,

Onye-nzọputa

 

Verse 2

Gbaghara nmehie-ayi,

Topu ayi n’agbu,

Tikpo arusi dum

Nke nejide ayi.

 

Verse 3

Me k’ayi pua n’oru njọ,

K’ayi hu Gi n’anya

Dor’ayi, Jisos di nsọ,

Rue n’ebe-I n’elu.

 

Verse 4

Onye-ndu n’ije-ayi,

Gi bur’ayi uzọ

Si n’ochichi nk’uwa

Rue n’ihe igwé.

 

Verse 5

Jisos, Onye nwayọ,

Nwa nke Chineke,

Nur’akwa umu-Gi,

Onye nzọputa.

Amen.

 

 

Abu 178- Akw’apugh izọputam.

Weeping will not save me.

 

Verse 1

Akw’apugh izọputam!

Anya-miri jum iru,

Ọ pugh iwepu egwum

M’obu isachapu njom:

Akw’apugh izọpum!

 

Kọrọs:-

Jisus kwara, nwua n’ihim;

Ọ hur’ahuhu n’obe;

Ọ necher’igbaputam;

Nani Ya gazọpum!

 

Verse 2

Olu’apugh izọpum!

Ih’ọma m’puru ime,

Echiche ọma nile,

Apugh inyem obi’ohu:

Olu’apugh izọpum!

 

Verse 3

Necher’apugh izọpum!

Anom n’ikpe-omuma,

M’anu olu ebere,

Agamanwu ma m’neche:

Ncher’apugh izọpum!

 

Verse 4

Okwukwe gazọpum!

Ka m’tukwasi Kraist obi,

Kwere olu Ọ luru;

Nna, dum ka m’gbakuru Ya:

Okwukwe gazọpum! Amen.

 

 

Abu 179- Onye-nzọtam, nur’akwam.

Loving Saviour, hear my cry.

 

Verse 1

Onye-nzọtam, nur’akwam,

Nur’akwam, nur’akwam;

Ọ bu Gi ka m’gbakuru

Si n’obe-I zọputam.

Emehiewom, m’I nwuwo,

I nwuwo, I nwuwo;

Kwe ka m’zoro n’ebere-I,

Si n’obe-I zọputam.

 

Kọrọs:-

Eze Jisus werem,

M’gagh-emewuta Gi;

Onye-ngbaputa nkem,

Si n’obe-I zọputam.

 

Verse 2

M’nala n’iyi! M’gekpere I,

Gekpere I gekpere I;

Gi bu ezi Uzo Ndu,

Si n’obe-I zọputam.

I nyer’amara-I n’efu,

Nye n’efu, nye n’efu;

Jisus, merem ebere,

Si n’obe-I zọputzm.

 

Verse 3

Sachapum nim’obara-I,

Obara-I, obara-I,

Tunyem n’ebe o neru,

Si n’obe-I zọputam.

Okwukwe genye udo,

Nye udo, nye udo;

N’okwukwe ka m’gejide I,

Si n’obe-I zọputam. Amen.


 

NCHEGHARỊ

Abu 180- Ndi nagabiga

All ye that pass by

 

Verse 1

Ndi nagabiga,

Biarue nsọ Jisus:

Ọ bugh unu ihe na Jisus nwuru?

Ihe-ngbaputa,

Udo n’ihe-mbe!

Bia, hu m’o di ihe-ngbu dika nke Ya.

 

Verse 2

Ọ nwuru, kpuchie

njọ nabugh nke-Ya,

Ọ kwuw’ugwo-unu, luar’unu olu.

Unu ganata

Udo nko’Ọ nyere,I nyer’amara-I n’efu,

Onye rior’aririo: Nnam, gbaghara ha!

 

Verse 3

Ọ kpere n’obe

N’ihi mu na gi:

Anur’ekpere, onye-njọ pua n’oru.

Abum onye-njọ,

Nadabere Ya,

Nacho ngbaghara Chuku apugh iju.

 

Verse 4

M’nario ngbaghara:

Abum onye-njọ

Natukwasi obi n’aha nke Jisus

Amara m’nwere

Ka Ọ gbatara:

Nna, I matara n’Ọ nwuru n’onodum.

 

Amen.

 

 

OKWUKWE

 

Abu 181- Chuku, Inye’ak’ayi na mgb’ochie.

O God, our help in ages past.

 

Verse 1

Chuku, Inye’ak’ayi na mgb’ochie,

Olil’any’ayi ugbu a,

Ebe izonar’ifufe,

N’Ulo ebigh-ebi!

 

Verse 2

N’okpuru ndo och’eze-Gi

Ka ndi nsọ-I bi n’udo;

Nani aka-Gi ezuwo,

Ulo-elu d’ike!

 

Verse 3

Mgb’edobegh ugwu n’usoro,

Tutu oke uwa,

Gi buri Chuku mgbe nile,

Gabu kwa n’ogbo dum.

 

Verse 4

Ọtutu aro n’anya-Gi

Di k’otu anyasi;

Di nkpunkpu ka nche ikp’azu

Tutu anwu awa.

 

Verse 5

Oge nebupu umu-ya

K’iyi neru eru;

H’aga, echezo ha, ka nro

Furu ka chi nabo.

 

Verse 6

Chuku, inye’ak’ayi na mgb’ochie,

Olil’any’ayi ugbu a;

Bur’Onye-nche-ayi ka ndu ra,

N’Ulo ebigh-ebi! Amen.

 

Abu 182- Jisus, Enyi nke obim.

Jesus, Lover of my soul.

 

Verse 1

Jisus, Enyi nke obim,

Ka m’gbaba n’okpuru Gi,

Mgb’osimiri nebili,

Mgb’ifufe nefes’ike.

 

Onye-nzọputam, zobem

K’ifufe ndu a gabiga;

Duum ga n’ala udo,

Biko, nara nkpur’obim.

 

Verse 2

Enweghm ebe-ngbab’ozo,

Obim koro n’aru-Gi;

Biko, arapukwalam,

Kwagidem, kasiem obi.

 

Gi bu ntukwasi-obim,

Nani I nenyerem aka;

Biko, were udo nku-Gi

Kpuchie isi-oto nkem.

 

Verse 3

Ihe nile nke m’nacho,

Kraist ahuzuwom na Gi;

Palitem, kasiem obi,

Gwo oriam, du ony’isi.

 

Aha-Gi bu aha nsọ,

Ejurum n’aj’omume;

Aghugho di nim’obim,

I juru n’ezi-okwu.

 

Verse 4

Amara-Gi di ukwu,

Ọ gekpuchi njom nile;

Me ka miri-ogwugwo

Sacham, debe kwam ọcha.

 

Gi bu is’iyi nke ndu,

Ka m’nara miri n’efu;

Suputa nime obim

Rue na ndu ebigh-ebi. Amen.



OKWUKWE

Abu 183- Okwukwem di na Gi,

My faith looks up to Thee.

 

Verse 1

Okwukwem di na Gi,

Nw’aturu Kalvari,

Onye-nzọtam.

Nur’aririom uhbu a,

Wepu nmehie nile;

Site n’ubuchi ta

Ka m’buru nke-I.

 

Verse 2

K’amara-Gi nenye

Obim ike ohu

Nanu oku.

Eb’I nwuru n’ihim,

K’Ihu-n’anyam buru

Oku di nsọ nere

Mgb’ebigh-ebi.

 

Verse 3

Mgbe m’nawa ohia ndu

N’etiti ahuhu,

Bur’Onye-ndum.

Chupu ochichiri,

Hichap’anya-miri,

Ekwela ka mkpafue

N’uzọ nke-Gi.

 

Verse 4

Mgbe ndum ka nro gagwu,

Mgb’osimri onwu

Geruchikwam;

Jisus, k’ihu-n’anya-I

Chupu egwum nile;

Buruem n’elu n’udo,

Onye-nzọtam. Amen.

 

 

Abu 184 – Site n’ihu-n’anya Jisus

Through the love of God our Saviour

 

Verse 1

Site n’ihu-n’anya Jisus

Ọ gadi nma,

Ebere-Ya enwegh ngbanwe,

Ọ diwo nma.

 

Obara-Ya di ok”onu,

Amara-Ya zuru oke,

Aka nechebe ayi d’ike:

Ọ gadi nma.

 

Verse 2

M’ayi nagafe nim’ahuhu,

Ọ gadi nma;

Nzọputa nke-ayi zur’ezu;

Ọ diwo nma;

 

Ayi kwere Chuku, nwe onu;

Nime Kraist k’ayi gami nkpuru;

Mọ Nsọ nedu ayi n’idi-nsọ;

Ọ gadi nma.

 

Verse 3

Ayi nel’anya echi ọma,

Ọ gadi nma;

Okwukwe nabu n’ahuhu,

Ọ diwo nma;

 

Ayi daber’ihu-n’anya Nna;

Jisus negboro ayi nkpa dum;

Ayi di ndu m’obu ayi nwuru

Ọ gadi nma. Amen.

 

 

Abu 185- Natukwasi Ya obi-I

Trust on, trust on, believer!

 

Verse 1

Natukwasi Ya obi-I,

Ma, ogu nan’odu;

I gabu onye-nmeri,

Chuku galuru gi.

 

Kọrọs:-

Kwere! kwere!

M’abali gb’ochichi!

Kwere! kwere!

Chi-obubo di nsọ.

 

Verse 2

Natukwasi Ya obi-I,

Ok’onwunwa di nsọ;

N’elu miri ize-ndu

Ọ ganya ugbo-gi.

 

Verse 3

Chuku pur’izọputa ayi,

Ọ bu ezi Enyi:

Natukwasi Ya obi-i

We rue n’ikp’azu ndu. Amen.

 

 

Abu 185- Natukwasi Ya obi-I

Trust on, trust on, believer!

 

Verse 1

Natukwasi Ya obi-I,

Ma, ogu nan’odu;

I gabu onye-nmeri,

Chuku galuru gi.

 

Kọrọs:-

Kwere! kwere!

M’abali gb’ochichi!

Kwere! kwere!

Chi-obubo di nsọ.

 

Verse 2

Natukwasi Ya obi-I,

Ok’onwunwa di nsọ;

N’elu miri ize-ndu

Ọ ganya ugbo-gi.

 

Verse 3

Chuku pur’izọputa ayi,

Ọ bu ezi Enyi:

Natukwasi Ya obi-i

We rue n’ikp’azu ndu. Amen.

 

 

Abu 186- Chuku, ka m’so uzọ-I.

Thy way, not mine, O Lord.

 

Verse 1

Chuku, ka m’so uzọ-I,

K’ochichiri-ya ra;

Wer’aka-Gi duziem,

Roputaram uzọ.

 

Verse 2

Ọ di nma m’o di njọ,

Ọ gakachsi nma;

Ọ gbago, zir’ezi,

Ọ gedu n’iz’ike.

 

Verse 3

M’gagh-ator’onodum,

M’nwe ike m’gagh-ekwe;

Chineke, rotaram,

Ka m’nagazi nk’ọma.

 

Verse 4

Al’eze nke m’nacho

Bu nke-Gi; ya mere

K’uzọ-ya buru nke-I,

Ka m’ghara ikpafu.

 

Verse 5

Wer’ikom mejue ya

N’onu m’obu n’uju;

Otu o di gi nma

Rotaram njọ na nma.

 

Verse 6

Rotaram ndi-enyim,

Oriam, n’aru-ikem;

Rotaram ich’uchem,

Akum m’ob’ogbenyem.

 

Verse 7

Nroputa abugh nkem,

N’ih’ukwu, n’ihe nta;

Bur’Onye-ndum, n’Ikem,

Uchem, n’Ihem nile. Amen.


 

 

Abu 187- Jisus, Ka m’kwere Gi, tukwasi I obim,

Jesus, I will trust Thee.

 

Verse 1

Anom m’ikpo’omuma, I gagbaputam;

Ọ digh onye di ka Gi n’igwé, n’uwa:

Gi nwuru ndi-nmehie, Gi nwuru n’ihim!

 

Verse 2

Jisus, ka m’kwere Gi, Aha nk’ok’onu

Nke mo-ozi kwuru n’omumu nsọ-Gi;

Edere Ya n’elu obe-Gi mgbe dum:

Ndi-njọ gua, sopuru, nekwer’Aha-Ya.

 

Verse 3

Jisus, ka m’kwere Gi, necheta ndu-Gi

Juru n’ihu-n’anya ubọchi-Gi  dum;

Ndi-nmehie no nsọ Gi, ndi-ekpenta bia-

M’amara-Gi ka ha nile natara.

 

Verse 4

Jisus, ka m’kwere Gi, n’Akwukwo Nsọ-Gi

Olu ebere-Gi ka m’nanu mgbe dum;

Mgbe Mọ Nsọ-I nez’ihe, o nadim utọ-

Nani ka m’nana nti, nano n’ukwu-Gi.

 

Verse 5

Jisus, ka m’kwere Gi, ghar’itu egwu:

I gagh-achupu onye nabiakute I;

Obara-I di ok’onu, nkwa-I neguzọ:

Ndia bu nzọput’obim, Gi bu Chinekem!

Amen.

 

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu 188- Gi atula egwu.

Give to the winds thy fears.

 

Verse 1

Gi atula egwu;

Nel’anya Chineke,

Ọ nuwo is’ude-I n’akwa-i

Ọ gebul’isi gi,

 

Verse 2

Nime nsọgbu nk’uwa

Ọ nakwara I uzọ;

Chere mgbe-Ya abali nka

Gebi n’uboch’onu.

 

Verse 3

Ọ nachi ihe dum,

Ha nanu olu-Ya;

Olu-Ya nile bu ngọzi,

Uzo-Ya bu ihe.

 

Verse 4

Ọ setia aka-Ya,

Gini ngegbochi Ya?

MgbỌ galuru ndi-Ya ogu,

Onye gemegide?

 

Verse 5

Wer’ihe dum ny’Eze,

K’Ọ naroputara i!

Ọ geju i anya, i gasi,

K’ike aka-Ya ra!

 

Verse 6

I gahu n’izu-Ya

Kariri uche-gi,

Mgb’Ọ luzuru ọlu ahu

Nk’i turu egwu ya.

 

Verse 7

Gi mara obi-ayi,

Hur’adigh-ike-ayi;

Newelite aka-nkuda,

Gba ikpere ume!

 

Verse 8

Kwe k’ayi, na ndu n’ọnwu,

Kwusa eziókwu-Gi

Nagbasa ihu-n’anya-Gi,

Na nchebe-Gi nile.

Amen.

 

Abu 189- Ekesiworom dum nile.

Father, I know that all my life.

 

Verse 1

Ekesiworom dum nile!

Nna, nka ka m’matara;

Ngbanwe dum nke naghagh ibia,

Atughkwam egwu ha;

Nyem obi um’ala ugbu a,

Nk’ihe-ya nato Gi.

 

Verse 2

Nyem ihu-n’anya nwer’uche,

Site n’amam-ihe;

Ka m’wer’ochi onu naga,

Hicha kw’anya-miri;

Na nkpur’obi nke no n’udo

Ikasi ndi ozo.

 

Verse 3

Achokwaghm uche nke nadigh-

Enwe izu-ike;

Nke nacho ime ih’ukwu,

N’imat’ihe-nzuzọ.

Mesom dika nwatakiri,

Nedum n’uzọ m’naga.

 

Verse 4

N’eb’o bula m’gano n’uwa,

N’onodu o bula,

Aghaghm isoro ndi ozo

Nwe nmeko nke obi;

Lu-kwa-ra Ya, Onye n’nefe,

Olu nk’ihu-n’anya.

 

Verse 5

Nyem ike ubọchi nile,

Nk’I nenye ora dum;

N’uche iji di ndu n’uwa,

Ma nodu n’akuku-I;

Ọ zuworom ino nwayọ,

Nenye Gi otuto.

 

Verse 6

Ije-ozi si n’ochicho-I

Adigh ekem agbu;

Obim namuta ezi’okwu

Nke natop’umu-Gi:

Na ndu nk’iju onwem aju

Bu ndu inwer’onwem! Amen.


 

Abu 190- Ezi udo, nim’ajo uwa nka?

Peace, perfect peace, in this dark world of sin.

 

Verse 1

Ezi udo, nim’ajo uwa nka?

Obara Jisus neny’udo n’obi.

 

Verse 2

Ezi udo, mgbe olu nanyigbu?

Ime uche Jisus bu iz’ike.

 

Verse 3

Ezi udo, n’etiti ahuhu?

N’akuku Jisus nani nkasi di.

 

Verse 4

Ezi udo, mgbe ndi-ayi nanogh nsọ?

N’aka Jisus ayi na ha n’udo.

 

Verse 5

Ezi udo, ma ayi amagh ochi?

Ayi mara Jisus: Ọ no n’och’eze.

 

Verse 6

Ezi udo, ma onwu no nsọ ayi?

Jisus emeriwo ike onwu.

 

Verse 7

Ọ diwo nma, og’uwa nke gebi;

Jisus gakpo ayi la n’udo nk’igwé. Amen.

 

 

Abu 191- Mgb’udo, dik’osimiri, neru n’uzọm.

When peace, like a river attendeth my way.

 

Verse 1

Mgb’udo, dik’osimiri, neru n’uzọm,

Mgbe nsọgbu biara k’ebili;

N’onodum o bula I mewom ka m’si,

“Ọ di nma, o diri obim nma.”

 

Kọrọs:-

Ọ di nma . . . o di nma;

Ọ di nma, o diri obim nma.

 

Verse 2

Ekwensu gesogbu, onwunwa gabi;

Ka m’tukwasi obim na nka:

Na Kraist amatawo na ike adighm,

We wusi obara-Ya n’ihim.

 

Verse 3

Nmehiem-echiche nka nanyem ok’onu?

Nmehiem-ha nile, ka ha ra,

Di n’obe Jisus, ebughkwam ha ozo:

To Chuku! to Chuku, nkpur’obim!

 

Verse 4

N’ebe m’no idi ndu bu Kraist mgbe nile!

Ọ buru na onwu abia,

Ọ gagh-ewutam; n’onwu dika na ndu,

I genye nkpur’obim Udo-Gi.

 

Verse 5

Jisus, o b’obibia-G k’ayi nechere;

Ili agagh-ab’ulo-ayi:

Opi nke mo-ozi! olu nke Chuku!

Olil’anya, n’iz’ike obim! Amen.


 

Abu 192- Ọ gabu na m’gerit’uru.

And can it be that I should gain.

Verse 1

Ọ gabu na m’gerit’uru

N’obara Onye-nzọputam?

Ọ nwurruum; onye mere

 

K’Ọ nwe ihe-ngbu, ga n’onwu!

Ihu-n’anya! o gadi’ana

Na Gi, Chinekem, ganwurum?

 

Verse 2

Ih’omimi! Okpar’anwua!

Onye gamata nzube-Ya?

N’efu ka ndi-m’ozi nanwa

 

Itu omim’ihu-n’anya.

Ebere! K’uwa sopuru!

Ndi-m’ozi, ajula ozo!

 

Verse 3

Ọ rapuru och’eze Nna-

Amara-ya nenwegh nsọtu-

Ọ mer’onwe-Ya ih’efu,

 

Gba obara n’ihi ndi-njọ.

Ebere! enyere n’efu;

Chinekem, o choputaram!

 

Verse 4

N’oge mbu mom eker’agbu

Togboro na njọ n’ochichi;

Ihe-I nwubara, m’we teta;

 

Ulo-nkporo juru n’ihe;

Nkporom dapuru, m’nwer’onwem,

Ebilirim, pua, soro Gi.

 

Verse 5

Atughm egwu ikp-omuma;

Jisos, n’ihe-Ya dum, bu nkem!

Adim ndu nime Ya: Isim;

 

Ezi’omume din so b’uwem.

N’ob’ike m’biarue ns’och’eze,

Nat’okpu-eze n’aka Kraist. Amen

 

OKWUKWE

Abu 193- Chinekem, Nnam, me ka m’d’ike.

My God, my Father, make me strong.

 

Verse 1

Chinekem, Nnam, me ka m’d’ike,

Mgbe olu nke ndu sir’ike,

Ikele ya n’abu-nmeri:-

K’eme uche-I!

 

Verse 2

Dopu n’anyam ihe-nkpuchi

Ka m’hu, eb’ik’uwa nada,

N’ihu-n’anya-Gi gemeri:

K’eme uche-I!

 

Verse 3

N’obi di um’ala m’gahu

Inwe-onwem n’ije-ozi,

Nekp’ekpere nim’olu dum:

K’eme uche-I!

 

Verse 4

M’geme ihe kachas’ike;

Ikp’oku n’inye’aka bu nke-I;

Uche-Gi gedozi uzọ;

K’eme uche-I!

 

Verse 5

Ihe nile bu nkem ugbu a;

M’geguzọs’ike nime nkwam,

Ebe o bugh mu, kama Gi:

K’eme uche-I!

 

Verse 6

Olil’anya nelefe njọ;

Okwukwe neti nkpu onu;

Ihu-n’any’agagh imeri:

JK’eme uche-I! Amen.

 

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

ITO N’AMARA

Abu 194- Dik’agu miri si agu.

As pant the hart for cooking streams

 

Verse 1

Dik’agu miri si agu

Nn’ele achur’achu,

Otu a k’obim nacho I, Chuku,

N’amara-I nenye ndu.

 

Verse 2

Akpiri Gi akpowom nku,

Chineke nke di ndu;

Ole mgbe m’gahu iru-Gi,

Ony’ebube di nsọ?

 

Verse 3

Chuku nk’ikem, rue ole mgbe

Ka m’gadi ner’uju,

Dika ony’arapuru nye

N’ochi nk’onye-nkpagbum?

 

Verse 4

Gini negbu gi ngbu, obim?

Nwere olil’anya!

I gabu otuto Chuku-I,

Iyi ndu-gi ngbe dum.


 

Abu 195- Chukum, ka m’no nsọ Gi.

Nearer, my God, to Thee.

 

Verse 1

Chukum, ka m’no nsọ Gi,

Nodu nsọ Gi;

M’o buru kwa obe

Nke bulirim,

Abum nile gabu,

Chukum, ka m’no nsọ Gi,

Nodu nsọ Gi.

 

Verse 2

Ma m’di ka ony’ije

K’anwu dara;

Che isi na nkume,

Nezu ike;

Ma nime nrom nile,

Chukum, ka m’no nsọ Gi,

Nodu nsọ Gi.

 

Verse 3

K’uzọ yi ebube

Neru n’igwé;

Onyinye-Gi nile

Bu amara;

Ndi-m’ozi fem aka,

Chukum, ka m’no nsọ Gi,

Nodu nsọ Gi.

 

Verse 4

K’echichem tobe Gi mgbe m’tetara;

Site n’ihe-nwutam

M’gedo Bet-el;

Nime ahuhu nkem,

Chukum, ka m’nọ nsọ Gi,

Nodu nsọ Gi.

 

Verse 5

Ma m’geji nku ọńu

Felie n’ehi;

Anwu na kpakpando

Ka m’gechefu;

M’abum nile gabu,

Chukum, ka m’nọ nsọ Gi,

Nodu nsọ Gi.

 

Abu 196- Jisus nakpo ayi! n’ebili.

Jesus calls us o’er the tumult.

 

Verse 1

Jisus nakpo ayi! n’ebili

Nke osimiri ndu-ayi,

Olu-Ya nada kw’ubọchi,

Si, “Gi, onye nkem, nesom!”

 

Verse 2

Otu ndi-ozi nuru ya

N’uso miri Galili;

Ha rapuru ihe nile

N’ihi ezi aha-Ya.

 

Verse 3

Jisus nakpo ayi k’ayi rapu

Aku nk’uwa efu nka,

N’arusi dum nejide ayi,

Nasi, “Hukarim n’anya!”

 

Verse 4

Nim’onu, ma nim’ahuhu,

Nim’olu, ma n’iz’ike,

Ọ nakpo ayi, si, “Onye nkem,

Hum n’anya kar’ihe ndia!”

 

Verse 5

Jisus nakpo ayi! n’ebere-I

Me k’ayi nuru olu-Gi,

K’ayi nye obi-ayi n’ozi-Gi,

Hu kwa I n’anya karisia. Amen.


 

Abu 197- Jisos abum nke-I, anuwom olu-I.

I am Thine, O Lord, I have heard Thy voice.

 

Verse 1

Jisos abum nke-I, anuwom olu-I

Ọ korom ihu-n’anya-I

M’anamacho ka m’site n’okwukwe

Nabiaru nsọ Gi kari.

 

Kọrọs:-

Dorom bia nsọ, bia nsọ Gi kari,

N’obe ebe I nwuru;

Dorom bia nsọ kari, dorom Onye-nw’ayi,

N’akuku-Gi di ngọzi

 

Verse 2

Me ka m’di nsọ ka m’nalu olu-Gi,

Site n’amara nsọ-Gi

K’obim wer’olil’anya n’elu,

K’ochicho-Gi buru nkem.

 

Verse 3

Og’ahu juru n’onu zur’oke,

Mgbe m’no n’iru och’eze-I

Mgbe m’kpo is’ala n’ekpera Chukum,

We gwa I okwu dik’Eyim.

 

Verse 3

Omimi ihu-n’anya Gi di kwa

Nke m’napugh’ima n’ebe a;

Oke onu di nke m’napugh inwe,

Rue mgbe m’gez’ike na Gi.

 

 

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu 198- Achorom ka m’yie Jisus.

I want to be like Jesus.

 

Verse 1

Achorom ka m’yie Jisus,

N’obi ume-ala;

Ọ digh aj’okwu o bula

Si n’onu-Ya puta.

 

Verse 2

Achorom ka m’yie Jisus,

N’ekpere mgbe nile;

Nani Ya nano n’el’ugwu

Zute Nna n’eb’ahu.

 

Verse 3

Achorom ka m’yie Jisus,

Ọ digh oge m’huru

N’Ọ rapuru obi’ọma-Ya

Mgbe anesogbu Ya.

 

Verse 4

Achorom ka m’yie Jisus,

Neme nma mgbe nile;

Ka ewe kwue banyerem, si,

“Ọ mere ike-ya!”

 

Verse 5

Achorom ka m’yie Jisus,

Nke gwara ora, si,

“Kwenu k’umu-nta biakutem!”-

Agameje za Ya.

 

Verse 6

Ma eyighm Jisus ma-oli,

K’ony’o bula gahu!

Jisus, ziterem amara-I,

We mem ka m’di ka Gi! Amen.


 

Abu 199- Nkpa-Gi nakpam mgbe dum.

I need Thee every hour.

 

Verse 1

Nkpa-Gi nakpam mgbe dum

Nna nk’amara;

Ọ digh olu ka nke-I

Genyem udo.

 

Kọrọs:-

Nkpa-Gi nakpam, o nakpam,

Ọ nakpam mgbe nile;

Onye-nzọputam, goziem!

Abiakutem Gi.

 

Verse 2

Nkpa-Gi nakpam mgbe dum,

Nanonyerem!

Ike onwunw’ada

Mgbe Gi no nsọ.

 

Verse 3

Nkpa-Gi nakpam mgbe dum,

N’onu, n’ufu;

Me ngwa bia binyerem,

Ndu gadi nma.

 

Verse 4

Nkpa-Gi nakpam mgbe dum,

Zim ochicho-I;

Ka nkwa-Gi nar’uba

Mezue nimem.

 

Verse 5

Nkpa-Gi nakpam mgbe dum,

Onye di Nsọ!

Mem onye-Gi n’ezie,

Nwa di ngọzi! Amen.


 

Abu 200- Ndi di’ọcha nwe ngọzi.

Blest are the pure in heart.

 

Verse 1

Ndi di’ọcha nwe ngọzi,

Ha gahu Chineke:

Ha mara ih’omimi-Ya,

Kraist nebi n’obi-ha.

 

Verse 2

Jisus si n’elu bia

K’Ọ nye ayi ndu n’udo,

We binyere ayi k’ogbenye,

Ih’atu n’Eze-ayi.

 

Verse 3

Obi di um’ala

K’Ọ nenye onwe-Ya;

Ọ roput’obi di ọcha

K’o bur’och’eze-Ya.

 

Verse 4

Ayi nacho iru-Gi,

Nna, nye ayi ngọzi nka:

Obi um’ala, di kw’ọcha,

Ulo-nsọ kwesiri I!

Amen.

Ayi ganesogide Gi! Amen.

 

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

One thought on “Abu Anglican Communion 1 to 400 (Igbo Hymn)

Comments are closed.