You dont have javascript enabled! Please enable it! Abu Anglican (Igbo Hymn) 51 - 100 - 9JAINFORMED

Abu Anglican (Igbo Hymn) 51 – 100

Search Contents

What Abu Number are you searching for? Check it inside the “Table of Content” and click on it.

Abu 51 to 100 Table of Content:

Igbo hymn known as Abu or Ekpere Na Abu (Ancient and Modern) is one of the Anglican Communion heritages. It is composed and compiled for spiritual worship in the church and for personal devotion. We have made it easier here. You can now surf for your Anglican Igbo hymn from 1 to 400.

Click here for your:

Abu 1 to 50

ABU 51 to 100

ABU 101 to 150

ABU 151 to 200

ABU 201 to 300

ABU 301 to 400

ASCENSIONTIDE
Hail the day that sees Him rise.

 Abu 51- Kel’ubọchi nrigo-Ya.

Verse 1
Kel’ubọchi nrigo-Ya Haleluya!
Anapuru Ya n’any’ayi; Haleluya!
N’uwa nka k’Ọ bi nw’oge, Haleluya!
We rigo kwa n’igw’ozo. Haleluya!
Verse 2
Onu-agha neche Ya, Haleluya!
Meghe on’uzọ igwé; Haleluya!
K’Eze ebube bata! Haleluya!
Ọ meriw’onwu na njọ. Haleluya!
Verse 3
N’el’igwé k’Ọ rigoro, Haleluya!
Ma Ọ hur’uwa n’anya; Haleluya!
Ọ no n’oche-eze-Ya, Haleluya!
M’Ọ nakpo madu ndi-Ya. Haleluya!
Verse 3
N’el’igwé k’Ọ rigoro, Haleluya!
Ma Ọ hur’uwa n’anya; Haleluya!
Ọ no n’oche-eze-Ya, Haleluya!
M’Ọ nakpo madu ndi-Ya. Haleluya!
Verse 4
Le! Ọ chilie aka-Ya, Haleluya!
Gosi apa-ntu di ha; Haleluya!
Ge nti! nuru olu-Ya, Haleluya!
K’Ọ nagozi Nzuko-Ya. Haleluya!
Verse 5
Ayi na Gi gano n’igwé, Haleluya!
Doro Gi nabu eze; Haleluya!
Nahu iru-Gi mgbe dum, Haleluya!
Chota onu-ayi na Gi. Haleluya! Amen.
Christ the King is risen, Today.

 Abu 52- Kraist Ez’ayi biliri ta:

Verse 1
Kraist Ez’ayi biliri ta: Haleluya!
Ka madu na m’ozi si Haleluya!
Kwesienu abu ike; Haleluya!
igwé na ala, kwenu. Haleluya!
Verse 2
Ọ lusiwo olu-Ya; Haleluya!
Ọ luwo ogu, merie; Haleluya!
Anwu nk’ezi-omume; Haleluya!
Ọ gagh-anwu kwa ozo. Haleluya!
Verse 3
Ndi-nche neche nche n’efu; Haleluya!
Kraist etiw’uzọ ili; Haleluya!
Onwu ejidegh kwa Ya! Haleluya!
Kraist emeghewo igwé. Haleluya!
Verse 4
Eze-ayi di ndu ozo; Haleluya!
Onwu, ole ike-gi? Haleluya!
Ọ nwuru, k’ayi we di ndu; Haleluya!
IIi, ole nmeri-gi? Haleluya!
Verse 5
K’ayi rigokuru Ez’ayi, Haleluya!
Neso Ya, bu Isi-ayi; Haleluya!
Ayi geyi Ya, we bilie; Haleluya!
Nadi ndu nmeri nk’obe. Haleluya!
Verse 6
To Eze igwé n’uwa, Haleluya!
K’ihe nile neto Gi; Haleluya!
Onye-nmeri, ayi neto I, Haleluya!
To Gi, Nbilite-n’onwu. Haleluya! Amen.



The Head that was once crowned with thorns.

 Abu 53-Isi nke kpururi ogwu.

Verse 1
Isi nke kpururi ogwu
Nekpu otuto ta;
Okpu-eze di bube
Jisus Dinkpa kpuru.
Verse 2
Oche nke kachasi elu
Bu oke-Ya n’ezie;
Eze nd’eze. Onye’nw’ora,
Ihe ebigh-ebi.
Verse 3
Onu ndi nile bi n’igwé,
N’onu ndi bi n’uwa,
Ndi mara ihu-n’anya-Ya,
Ndi kwere n’aha-Ya.
Verse 4
Ha kere oke n’ihere,
Na ngọzi nke obe;
Aha-ha di mgb’ebigh-ebi,
Onu-ha bu nk’igwé.
Verse 5
Ha nahu ahuhu n’uwa,
Ha b’eze n’el’igwé;
Imar’ihu-n’anhya-Ya bu
Uru na onu-ha.
Verse 6
Onwu ihere Ọ nwuru
Nenye ndi nke-Ya ndu;
Obe-Ya bu olil’anya
Na otuto nke-ha. Amen.
Hail, Thou once despised Jesus!

 Abu 54- Ekele! Eze Galili.

Verse 1
Ekele! Eze Galili,
Onye eledar’anya!
Jisus, Gi huru ahuhu,
Nye ayi nzọputa n’efu;
Ekele! Onye-nzọputa,
Onye nwuru n’ihi ayi;
N’olu-Gi ka ayi nwer’udo,
Ayi nwere ndu n’aha-Gi.
Verse 2
Nw’aturu Chuku rotara
K’Ọ buru nmehie-ayi dum;
Site n’ihu-n’anya ukwu
K’I ji kpuchi nmehie-ayi;
Ndi-Gi nile nwe ngbahara
Site n’ik’obara-Gi;
On’uz’ama nk’igwé meghe,
Ayi na Chuku di n’udo.
Verse 3
Jisus, ekele diri Gi
N’och’ebub’ebigh-ebi!
Usu nile nke di n’igwé
Naspur’I n’iru NNa-
N’ebe I narioro ndi-njọ,
Nedozir’ayi onodu,
Narior’ayi mgbe ebigh-ebi,
Rue mgbe ayi genw’otuto.
Verse 4
Gin we nsọpuru na ike,
Gin we kwa ngọzi nile;
Otutọ mgbe ebigh-ebi
Kwesiri ka ayi nye Gi!
Unu ndi-m’ozi nye aka,
Wer’abu ọma nile,
Nako olu ọma Jisus,
Neto Kraist Immanuel! Amen.
ASCENSIONTIDE
 
The golden gates are lifted up.

 Abu 55- Anebuli on’uz’ama

Verse 1
Anebuli on’uz’ama,
On’uzọ gher’oghe;
Ez’ebube agabawo
Inonyere nna-Ya.
Verse 2
Kraist, I bur’ayi uzọ rigo
Idozir’ayi ebe,
K’ayi we no n’eb’I no ugbu a,
Hu kwa iru Chuku.
Verse 3
Ih’otuto nenwu mgbe dum
N’uzọ-ayi nim’uwa;
Ihe di n’azu igw’oji
Nke zoro Gi n’any’ayi.
Verse 4
Bulite obi-ayi elu,
Nye ayi amara-Gi;
Ayi nwaghari n’uwa nka,
M’abu-ayi di n’igwé.
Verse 5
Ka eb’I no, n’aka-nri Nna,
Olil’any’ayi gadi;
Nogide nime ayi, k’ayi we
Nogide kwa nime I. Amen.



ADVENT
Lo! He comes with clouds descending.

 Abu 56- Le! Ọ si n’igwé narida.

Verse 1
Le! Ọ si n’igwé narida,
Ony’egburu n’ihi’ayi;
OPtutu ndi nsọ neso Ya
Nabu abu nke nmeri;
Haleluya!
Chuku abia ib’Eze.
Verse 2
Any anile gahu kwa Ya
N’ebube-Ya di ukwu;
Ndi nke kpapuru Ya, re Ya,
Kpogide Ya n’osisi,
Geji kwa
Hu ezi Mesaia-ha.
Verse 3
Ihe-ama nke onwu-Ya
Di kwa n’aru ọma-Ya;
Nka nakpatara ndi nke-Ya
Onu di mgb’ebigh-ebi;
Anya gini
K’ayi ji le apa-ntu-Ya!
Verse 4
Ngbaputa, nk’eler’anya-ya,
Aputawo n’ebube;
Ndi nsọ-Ya, ndi uwa juru,
Geje zute Ya n’elu;
Haleluya!
Ubochi Chinek’abia.
Verse 5
Amen! k’ora madu to Gi,
N’elu oche-eze-Gi;
Were ike na ebub,
Nara ala-eze-Gi;
Biko, bia ngwa,
Chinek’ebigh-ebi, bia! Amen.
Ye servants of the Lord.

 Abu 57- Ndi-ozi Onye-nw’ayi.

Verse 1
Ndi-ozi Onye-nw’ayi,
Onye na olu-ya,
Necheta okwu Ọ kwuru,
Neche n’on’uzọ-Ya.
Verse 2
K’oku-unu nenwu,
Dozienu ya nk’ọma:
Kenu ih’okike n’ukwu,
Aha-Ya di egwu.
Verse 3
“Chenu nche! “b’iwu Nn’ayi;
Ọ no kwa nsọ ugbu a;
Le ih’ama obibia-Ya,
Ka unu jikere.
Verse 4
Ony’agahu na nche
Genwe ezi onu!
Ọ geji onu hu Jisus,
Agasopuru ya.
Verse 5
Kraist geji aka-Ya
We dozie oriri,
Welite ony’ozi ahu
N’iru ndi-m’ozi-Ya. Amen.
Hark the glad sound! the Saviour comes.

Abu 58- Nu uda onu! Ọ nabia.

Verse 1
Nu uda onu! Ọ nabia,
Bu Onye-nzọputa;
K’obi-ayi bur’och’eze-Ya,
K’olu-ayi bua abu.
Verse 2
Ọ nabia izọputa ndi
Ekwensu ker’agbu;
N’iru Ya uzọ emeghe,
Agbu dum atopu.
Verse 3
Ọ nabia ikpocha obi
N’ochichiri nmehie:
K’Ọ tinye ihe el’igwé
N’anya onye-isi.
Verse 4
Ọ nabia ikasai obi,
Igwo ndi dara mba;
Iwer’aku-Ya m’ogbenye
K’Ọ gho ogaranya.
Verse 5
Eze udo, Hosanna-ayi
K’ayi geji kele Gi;
Uda-aha-I, di ayi utọ,
Gada n’igwé nile. Amen.



Christ is coming! let creation.

 Abu 59- Kraist nabia! K’ih’eker’eke.

Verse 1
Kraist nabia! K’ih’eker’eke
Ghara is’ude ozo;
K’ayi wer’okwukwe sir’ike
Nele anya-Ya mgbe dum!
Kraist nabia kwa!
Bia, Ez’udo di ngọzi.
Verse 2
Ugbu a anako akuku
Nke obe-Gi di ilu;
Ma agahu otuto-Gi
Mgb’I gabia ibu Eze.
Kraisty nabia kwa!
Ka obi nile nuria.
Verse 3
K’olil’anya nka di ngọzi
Me k’ayi bua ab’otuto;
K’ayi welie olu-ayi elu,
Neto Eze nke nabia.
Kraist nabia kwa!
Bia, Jisus, biko bia ngwa! Amen.
Jesus, my Saviour, to Bethlehem came.

 Abu 60- Onye-nzọputam biara Betlehem.

Verse 1
Onye-nzọputam biara Betlehem,
Amuru Ya n’ulo anumanu;
Ọ bu ih’ebube-Onye-ngọzi!
Ọ bu mu k’Ọ nacho.
Kọrọs:-
Mu k’Ọ nacho! nacho!
Mu k’Ọ nacho! nacho!
Ọ bu ih’ebube-Onye ngọzi!
Ọ bu mu k’Ọ nacho.
Verse 2
N’obe ka Jisus, Onye-nzọputam,
Kwur’ugwom dum, gbaputa nkpur’obim;
Ọ bu ih’ebube-Onye-ngọzi!
Nwuru onwu n’ihim.
Mu k’Ọ nwuru! nwuru
Mu k’Ọ nwuru! nwuru!
Ọ bu ih’ebube-Onye-ngọzi!
Nwuru onwu n’ihim.
Verse 3
Onye-nzọputam di k’Ọ din a mbu;
Mgbe m’rapuru uzọ nefughari-obim,
Nakpom oku! nakpom!
Mu k’Ọ nakpo! nakpo!
Mu k’Ọ nakpo! nakpo!
Ọ ji nwayọ nario nkpuru-obim,
Nakpom oku! nakpom!
Verse 4
Onye-nzọputam gesi n’elu bia-
Nkwa di utọ k’aro nagabiga!
Agamahu Ya k’Ọ naridata.
Mgb’Ọ gabia iwerem!
Ọ gabi iwerem!
Ọ gabi iwerem!
Agamahu Ya k’Ọ naridata,
Mgb’Ọ gabia iwerem! Amen.
ADVENT
When Jesus comes to reward His servants.

Abu 61- Ma Jisus bia ile ndi-Ya olu.

Verse 1
Ma Jisus bia ile ndi-Ya olu,
N’ehihie m’ob’abali,
Ọ gahu ayi ezi ndi-Ya na nche,
Jide oku-ayi nenwu?
Kọrọs:-
Ayi gasi n’ayi ejikere, nwannem,
Iba n’ulo nk’eligwé?
Ọ gahu mu na gi k’ayi neche nche,
Neche, neche mgbe Ez’ayi gabia?
Verse 2
Ma o buru na isi-ututu,
Ka Ọ gakpo mu na gi,
Ka ayi gosi Ya olu ayi luru,
Ọ gasi, “I mere nk’oma?”
Verse 3
A mezuru ihe Ọ si ayi me,
Neme otu ik’ayi ra?
Ma obi-ayi adigh-am’ayi ikpe,
Ayi gez’ike n’otuto.
Verse 4
Ngozi diri ndi Ọ gahu na nche,
Ha geket’ebube-Ya:
M’Ọ bia n’ututu m’obu n’abali,
Ọ gahu k’ayi neche nche? Amen.
TRINITY
Our blest Redeemer, ere He breathed.

 Abu 62- Tutu Jisus ala n’igwé.

Verse 1
Tutu Jisus ala n’igwé,
Orapuru ndi-Ya
Onye-ndu, bu Onye-nkasi,
K’Ọ biyere’ayi.
Verse 2
Ọ biara n’oyiyi nduru,
Nke gbasara nku-Ya;
Iwus’udo n’ihu-n’anya
N’elu uwa.
Verse 3
Ọ ji ire oku ndu bia,
Izi ndi-Ya ihe;
N’ike nka anahugh anya
Dik’ifufe.
Verse 4
Ọ biara inye ayi ike,
Ony’obia amara;
Obi o bula kwere Ya
Bu ulo-Ya.
Verse 5
Olu nwayọ-Ya k’ayi nanu
Dik’ifuf’anyasi;
Nanapu ayi nmehie n’egwu,
K’ayi chet’igwé.
Verse 6
Ezi omume nk’ayi nwere,
Nmeri njọ o bula,
Echiche ọma nile bu
Nani nke-Ya.
Verse 7
Mọ nk’idi-ọcha n’amara,
Le ayi’ebere;
Me k’obi-ayi buru ulo-I,
Nke kwesiri I. Amen.



Holy Spirit, faithful Guide!

 Abu 63- Mọ Nsọ, ezi Onye-ndu.

Verse 1
Mọ Nsọ, ezi Onye-ndu!
Nano nsọ onye nke Kraist;
Wer’aka I dur’ayi nwayọ,
Nd’ije n’ala bu ohia;
Nd’ike gwuru naṅuri,
Nanu ol’utọ nke-Gi
Si, “Onye fur’uzọ, bia,
Sorom, agamedula I!”
Verse 2
Eyi kasi nma no nsọ
Iyer’ayi aka mgbe dum;
Arapukwal’ayi n’egwu,
Naso isi n’ochichi.
Mgbe ok’ifufe nefe,
Ike n’olil’any’agwu,
Si, “Onye fur’uzọ, bia,
Sorum, agamedula I!”
Verse 3
Mgb’iboch’olu-ayi gagwu,
Mgbe ayi neche iz’ike,
Mgbe ekpere na igwé,
Nani ha fọduru ayi:
Mgb’ayi gaf’osimir’onwu,
Natukwasi Kraist Obi,
Si, “Onye fur’uzọ, bia,
Sorum, agamedula I!” Amen.
Gracious Spirit, dwell with me!

 Abu 64- Mọ nk’amara, biyerem!

Verse 1
Mọ nk’amara, biyerem!
Agameju n’amara,
Gosi kwa ndu-Gi nimem
Site n’okwu iye-aka;
Nekwur’Onye-nzọputam
N’idi nwayọ na ike.
Verse 2
Mọ nk’ez’okwu, biyerem!
M’gabu ony’ezi-okwu,
Wer’amam-ihe di nma
Mọ ka ndu-I puta nimem;
Ka m’wer’omume nwa-nne
Ko idi-nma nk’Onye-nwem.
Verse 3
Mọ di nwayọ, biyerem!
Agamadi kwa nwayọ;
Mechibido obi nkem
N’ajo oge onwunwa;
M’anwu wa meghere ya,
We gos’ihu-n’anya-Ya.
Verse 4
Mọ di ike, biyerem!
Agamab’onye d’ike;
Ka m’we bur’onye-nmeri
Ka m’we bur’onye-nmeri
Mgbe nd’ozo aghagh ida;
Site n’olil’any’ike
Naga n’iru mgbe nile.
Verse 5
Mọ nke di nsọ, biyerem!.
Mu onwem gadi kwa nsọ;
Si nime nmehie puta,
Chob-ihe di nma nile,
K’ihe o bula m’gabu,
M’genye Onye nyerem Gi. Amen
Breathe on me, Breathe of God.

 Abu 65- Kuyem ume, Chuku.

Verse 1
Kuyem ume, Chuku:
Mejuem na ndu ohu,
Ka m’we hu ihè-Gi n’anya,
Neme kwa uche-Gi.
Verse 2
Kuyem ume, Chuku,
Rue mgb’obim di ọcha,
M’we nacho ihe I nacho,
Nogide nime Ya.
Verse 3
Kuyem ume, Chuku,
Rue mgbe m’gabu nke-Gi;
Anu-arum nka we nenwu
Ka ihe nk’el’igwé.
Verse 4
Kuyem ume, Chuku,
Ka m’ghar’inwu anwu,
Ma soro I di ndu zur’oke
Nke mgb’ebigh-ebi-Gi Amen.

 

Spirit divine, attend our prayers.

 Abu 66- Mọ Nsọ, noyer’ekpere nk’ayi.

Verse 1
Mọ Nsọ, noyer’ekpere nk’ayi.
Me ulo nka ulo-I;
Ridata n’ike amara-I,
Bia, Mọ Nsọ uku, bia!
Verse 2
Bia dik’ihe, we gosi ayi
N’ayi kwesir’ebere:
K’I duru ayi ba n’uzọ ndu
Nd’ez’omume naga.
Verse 3
Bia k’oku, nucha obi-ayi,
Dik’oku nchu-aja;
K’obi-ayi dum buru aja
Nye Onye-ngbaput-ayi.
Verse 4
Bia dik’igirigi, gozie
Mgbe nka edoro nsọ;
K’ozara nuria n’I puru
Ime k’o mia nkpuru.
Verse 5
Bia dika nduru, gbasa nku-I
Nk’ihu-n’anya n’udo;
Gozie nzuko-Gi n’uwa nka,
Dika nke di n’igwé.
Verse 6
Bia dik’ok’ifufe nye ayi
Onyiny’amara-Gi;
Ka ndi nile nwayi muru
Hu otuto iru I.
Verse 7
Mọ Nsọ, noyer’ekpere nk’ayi,
Me uwa nka ulo-I;
Ridata n’ike amara-I,
Bia, Mọ Nsọ uku, bia!. Amen.



Come to our dark nature’s night.

 Abu 67- Were ihe-I di ngọzi.

Verse 1
Were ihe-I di ngọzi
Bia nim’ochichiri-ayi,
Mọ Nsọ di ebigh-ebi,
Chuk’Onye-nkasi.
Verse 2
Ayi di njọ—Gi sacha ayi;
Nim’oria—–nye ayi ike-I;
Ayi fur-efu—Gi chot’ayi;
Chuk’Onye-nkasi.
Verse 3
Obi-ayi bu ogbeye;
Si n’ihwe nye ayi onu,
Okwukwe n’ihu-n’anya,
Chuk’Onye-nkasi.
Verse 4
K’udo-I da k’igirigi,
Weda aj’ochicho nk’ayi,
Gosi ayi ihe nke Kraist,
Chuk’Onye-nkasi.
Verse 5
Obia di nsọ, di nwayọ,
K’obi-ayi bur’ulo-nsọ-I
Ebe I gachi k’Eze,
Chuk’Onye-nkasi.
Verse 6
Narior’ayi nim’obi-ayi,
Nas’ude nke ananugh,
Nario nkpa-ayi anekwugh,
Chuk’Onye-nkasi.
Verse 7
Nakpo “Abba, Nna” nim’ayi,
Ih’ama onu nk’igwé
Na nke ndu ebigh-ebi,
Chuk’Onye-nkasi.
Verse 8
Chor’ayi omimi Chuku,
Buru ayi n’uzọ ihe,
Me ka k’ayi rigorue n’ulo-I,
Chuk’Onye-nkasi. Amen.
Gracious Spirit, Holy Ghost.

 Abu 68- Mọ Nsọ, Ony’obi-ọma.

Verse 1
Mọ Nsọ, Ony’obi-ọma,
Nim’onyinye amara-I,
I zir’ayi k’ayi cho kari
Ihu-n’any’igwé.
Verse 2
Okwukwe nebup’ugwu,
Omuma-ihe nile,
Abagh n’ihe m’ayi enwegh
Ihu-n’any’igwé.
Verse 3
Inw’onwu n’ih’olu-Gi,
Iwer’ego ny’ogbeye,
B’efu m’ihu-n’any’adigh;
Ny’ayi ihu-n’anya.
Verse 4
Ihu-n’anya neme nma,
Natach’obi, di nwayọ;
Ọ kari onwu n’ike;
Ny’ayi ihu-n’anya.
Verse 5
Ibu-amuma gagwu,
Ihe-omuma gafe;
Ma ihu-n’anya gadi
Ny’ayi ihu-n’anya.
Verse 6
Ageloda okwukwe,
Olil’anya nwe nmezu;
M’ihu-n’anya ganenwu;
Ny’ayi ihu-n’anya.
Verse 7
Okwukwe, n’olil’anya,
N’ihu-n’anya nogide;
Ma nke kasi n’ato ndia
Bu ihu-n’anya. Amen.
Come Holy Spirit, heavenly Dove.

 Abu 69- Bia, Mọ Nsọ, Nduru nke igwé.

Verse 1
Bia, Mọ Nsọ, Nduru nke igwé
N’ike ndu-Gi nile;
Muye oku ihu-n’anya
N’obi-ayi jur’oyi.
Verse 2
Ayi nabu abu-ayi n’efu.
Ike nbili adigh;
Otutọ-ayi naju oyi,
Ekpere nanyi ayi.
Verse 3
Chineke, ayi gadigide
N’ume-ngwu di out a?
Ihu-n’any’ayi ajuk’oyi
Ma nke-I ekpok’oku!
Verse 4
Bia, Mọ Nsọ, Nduru nke igwé,
N’ike ndu-Gi nile;
Musa oku ihu-n’anya-I
Nke gafunwu nke-ayi. Amen.
Breath of God, breathe on us now.

Abu 70- Mọ Nsọ, kuye ume-Gi.

 Verse 1
Mọ Nsọ, kuye ume-Gi,
Dube ayi mgb’ayi nekp’ekpere;
Is’iyi nke ndu ohu-ayi,
Ez’ihe nk’ubochi ohu
Verse 2
Onye-nw’ayi, I noyere ayi,
M’adigh-amazu k’I si bia;
Na nsọ k’ayi gahu olu-Gi,
Mọ-Gi gabekwu n’obi-ayi.
Verse 3
Kraist b’onu-nekwur’ayi n’elu,
Gi b’Onye nario nime ayi;
Biko, kpeputa ez’okwu,
Zaghachi okwu nmehie dum.
Verse 4
A! Obim nenwegh okwukwe!
Mu mar-uzọ, mar’Onye-ndum;
Gbagharam, Eyim, Chineke,
N’ọtutu oge m’fur’efu.
Verse 5
Noyerem mgb’ey’ozo nadigh
Gamata ihe-ngbu nk’obim;
Mgb’ih’egwu di, k’amata Gi
N’aha ka nma—Onye-nkasi! Amen.



TRINITY
 
Holy Spirit, hear us.

 Abu 71- Mọ Nsọ, nur’olu-ayi.

Verse 1
Mọ Nsọ, nur’olu-ayi
Mgb”ayi nabu abu;
Kunye ume nsọ-Gi
N’ ab’otuto-ayi.
Verse 2
Mọ Nsọ, Nonyere ayi
Mgb’ayi nekp’ekpere;
Bia nsọ kari, zi ayi
Ihe ayi gekwu.
Verse 3
Mọ Nsọ, musa ihe
N’akwukw’ayi nagu
K’ayi we hu nime ya
Ihe nk’ayi nacho.
Verse 4
Mọ Nsọ, nye ayi nile
Obi um’ala;
Me k’ayi di ka Jisus
N’obi-ọma ya.
Verse 5
Mọ Nsọ, me ka olu
Nk’ayi nalu di nfe;
Ekwela ka nzuzu
mebie egwu-ayi.
Verse 6
Mọ Nsọ, kwa-ubọchi
Nyere ayi aka
Imeri ih’ojo
N’ime ih’ọma. Amen.
GENERAL HYMN (SERMON)
 
O Word of God incarnate.

 Abu 72- Okwu nke ghoro madu.

Verse 1
Okwu nke ghoro madu,
Amam-ihe nk’igwé,
Ez’okwu nenwegh ngbanwe,
Ih’ayi n’ochichiri;
Ayi to Gi n’ihi ihe
Si n’Okwu nsọ-I puta;
Oku diri ukwu-ayi,
Nenwu mgb’ebigh-ebi.
Verse 2
Nzuko nka Kraist natara
Okwu Chuku ahu;
o bulir-ihe ahu
K’Ọ mukwasi uwa.
Ọ bu igbe nke aku
Juru n’Ezi-owu;
Obu ezi onyinyo
Nke Kraist, bu Okwu Ndu.
Verse 3
Ọ di ka okoloto
N’iru nd’agha Chuku;
Ọ bu oku nagb’ama
N’ochichiri uwa;
Ob’ihe nego’uzọ
N’osimiri ndu nka,
Nime ihe ize-ndu ,
Dur’ayi biakute Kraist.
Verse 4
Jisus me ka Nzuko-Gi
Di k’oku nenwu’enwu,
Nke gegosi mba nile
Ihe-I k’o di na mbu;
Zi ndi-ije-Gi nile
Ka ha soro Ihe a
Rue mgb’ochichiri gebi,
Ha hu iru-I n’onu. Amen.
Lord Thy word abideth.

 Abu 73- Chineke, okwu-I di.

Verse 1
Chineke, okwu-I di
Iduzi ukwu-ayi;
Onye kwer’okwu ya
Nwere ihe n’onu.
Verse 2
Mgbe nd’iro no nso ayi,
Okwu-I nagb’ayi ume:
Okwu nkasi-obi,
Ozi nke nzọputa.
Verse 3
Mgb’ochichi nagbachi
Igw’oji kpuchie ayi,
Ihe-ya nedu ayi,
Necheber’ayi uzọ.
Verse 4
Onye mara onu,
Pur’iguko aku,
Nke okwu-Gi nenye
Obi di um’ala?
Verse 5
Okw’ebere, nenye
Ndi di ndu amara;
Nke okwu-Gi nenye
Ndi nanwu nkas’obi !
Verse 6
Chuku, kwe k’ayi chota
Ihe-nmuta nsọ-ya;
K’ayi pu kwa Gi n’anya,
Nakpa nsọ I mgbe nile. Amen
Holy Bible, book divine.

 Abu 74- Akwukwo Nsọ Chineke.

Verse 1
Akwukwo Nsọ Chineke,
Gi B’akum di ok’onu;
Nkem, igwam ebe m’si bia;
Nkem, izi kwam ihe m’bu.
Verse 2
Nkem, ibam nba ma m’kpafue,
Gosi kwa ihu-n’anya;
Nkem k’I bu idu ukwum,
Mam ikpe, kpeputakwam.
Verse 3
Nkem, ikasim n’ahuhu,
Ma Mọ Nsọ weta ngọzi;
Nkem, igosi okwukwe
Madu ji meri onwu.
Verse 4
Nkem, ikow’onu nabia,
Ihe, ndu, m’onwu gasia;
Akwukwo nsọ Chineke,
Gi b’akum di ok’onu! Amen



Break Thou the bread of life.

 Abu 75- Nyawaram achicha

Verse 1
Nyawaram achicha
Nke ndu, Chuku,
Dika I si ke nri
N’uso miri.
M’nacho Gi, Onye-nwem,
N’Akwukwo nsọ;
Agu Gi nagu mom,
Okwu di ndu.
Verse 2
Gi bu nri nenye ndu,
Gi Onye-nwem;
Ezi-okwu nsọ-Gi
Nazọputam.
Nyem ka m’rie we di ndu
oro I n’elu;
Zim ka m’hu ez’okwu-I
N’anya, Jisus.
Verse 3
Biko, Nna, Ziterem
 Mọ Nsọ-I ugbu a,
K’Ọ met’aka n’anyam
Ka m’huw’uzọ.
Gosim ih’ezoro
Nime Okwu-I
Ka m’hu k’Akwukwo nsọ
Kpughere Gi.
Verse 4
Gozie Okw’om’ahu
N’ebe mu no,
K’I si we gozie nri
Na galili.
Ino n’ otru gebi,
Ogba tijie;
Agamahu udo,
G’ihem nile!   Amen.
Thy presence, gracious Lord, afford.

 Abu 76- Bia n’etiti ayi Chineke.

Verse 1
Bia n’etiti ayi Chineke;
Jiker’ayi inu okwu-Gi,
Do nti ayi n’inu olu-Gi,
Nye ayi okwukwe k’ayi we nu.
Kọrọs:-
Gozie ndi nejere I ozi ,
Me k’Ozi ọma-Gi gbasa.
Verse 2
Wepuru ayi uche abua,
tukwasi obi-ayi n’elu;
nye anyi nri sitere n’igwé,
Me k’afo nri nke ndu ju ayi.
Verse 3
Wer’ike nke Mọ Nsọ nke-Gi,
kua okwu nke-Gi n’obi-ayi,
K’ayi wer’okwukwe na egwu
Neme otu ayi nur’ugbu a.
Verse 4
Nna, gosi ayi Opkara-Gi,
Me k’ayi mar’ihe I nacho;
Weputa ike-Gi n’ihe,
Dusi ayi n’ala otuto.  Amen.
Speak, Lord, in the stillness.

Abu 77- Kwue, mgb’oge dajuru.

Verse 1
Kwue, mgb’oge dajuru,
Mgbe m’no niche gi;
Me k’obim nana nti,
Neche okwu-Gi.
Verse 2
Kwue, Ọ Nna di ngọzi,
N’oge a dajuru;
ka m’ hu iru-Gi, Nna,
Mara ike-Gi.
Verse 3
N’ih’okwunk’I nekwu,
“Ha bu ndu” n’ezie;
Nrui nk’igwé nenye ndu,
Zuba mom ugbu a !
Verse 4
Ihe dum m’erapuru,
Enweghkwam onwem;
Onu ka m’ji nye Gi,
Ihe nile nkem.
Verse 5
Kwue, Nna, n’oru-I nanu !
Agbala nkiti;
Nkpur’obim neche Gi,
Okwu nenye ndu!
Verse 6
Mejuem n’amam-ihe
Nk’uch’ebube-Gi;
K’ih’utọ I nacho
Zur’oke nimem.
Verse 7
Dika “alab oma”
Nke nasu miri
Nesi isi ọma,
Ka m’ no n’iru Gi!
Sing them over again to me.

 Abu 78- Bu-kwa-ram abu ndia ozo.

Verse 1
Bu-kwa-ram abu ndia ozo,
Okw’ebube nke Ndu !
Ka m’hu kari nma-ha ra,
Okw’ebube nke Ndu !
Okwu nke ndu di nma,
Zim okwukwe n’olu !
Kọrọs:-
Okwu ọma! d’itu-n’anya !
Okw’ebube nke Ndu !
Verse 2
Kraist, Onye-ngọzi, neny’ayi dum
Okw’ebube nke Ndu !
Ndi-njọ, genu nti oku’ahu,
Okw’ebube nke ndu !
Enyer’ora n’efu,
Nakpo ayi bia n’ igwé !
Verse 3
Ol’utọ nk’Ozi’ọma nakpo,
Okw’ebube nke ndu !
Neny’ora ngbahara n’udo,
 Okw’ebube nke Ndu !
Kraist, Onye-nzọputa,
Do ayi nsọ mgbe nile !   Amen.



The Spirit breathes upon the word.

 Abu 79- Mọ Nsọ kekunye okw’ume.

Verse 1
Mọ Nsọ kekunye okw’ume,
Ezi’okwu we puta;
Ozizi na nkwa nenye ayi
Ihe nedo anyi no.
Verse 2
Ututọ, dika nke anwu,
Neme k’okwu nsọ nwue
Nenye ogbo nile ihe:
Ihe-ya zur’ezu.
Verse 3
Aka nyere ya nenye kwa
Ihe n’oku nk’obi;
Ezi’okwu-ya nawaliri
Ndi-mba: o gagh-ada.
Verse 4
K’ekele diri gi mgbe dum
N’ ihi’okwu di otu a,
Neme k’ihe nk’igwé nwuba
Nim’uwa nk’ochichi.
Verse 5
Ọ nato obim ijeso
Onye m’huru n’anya,
Rue mgb’otuto genwukwasim
N’al’eze nk’el’igwé.   Amen
GENERAL HYMN (SERMON)
Lamp of our feet.

Abu 80- Oriona diri ukwu-ayi.

Verse 1
Oriona diri ukwu-ayi,
Negosi ayi uzọ;
Is’iyi nk’esi n’amara
Nk’el’igwé nye nd’ije.
Verse 2
Nri nke nazu nkpur’obi-ayi,
Ezi nri si n’elu;
 Ihe-ndu, ebe ayi nagu
Banyere el’igwé.
Verse 3
Ogidi-oku n’abali,
igw’oji n’ehihie;
Mgbe ifufe nefegid’ayi.
Ebe-ngbaba d’ike.
Verse 4
Okwu Chuku ebigh-ebi,
Uche Ọkpara-ya;
I nedu nzo-ukwu n’uwa,
Nezi uzọ nk’igwé.
Verse 5
Chuku, kwe k’ayi muta nk’ọma
Amam-ihe nke ya;
natughari ozizi-ya
N’okwukwe nke nwata.    Amen.
GENERAL HYMN
 
The Church’s one foundation.

 Abu 81- Nzuko-Kraist nw’otu nt’ala.

Verse 1
Nzuko-Kraist nw’otu nt’ala-
Jisus b’Onye-nwe-ya;
Ọ ji miri na okwu
Ke ya okik’ohu;
Ọ si n’igwé bia cho ya
Ibu nwunye-nsọ-ya;
Oji obara gba ya,
We nwua n’ihi ndu-ya.
Verse 2
Nroputa nke mba nile,
Ọ b’otu nim’uwa;
Isi okwu nzọputa-ya
Otu Nn’ot’okwukwe;
Nagozi otu aha,
Neri otu nri-nsọ,
Nagbasa’otolil’anya,
Eyikwas’amara.
Verse 3
Itu-n’anya na nleda
K’eji hu nmegbu-ya;
Nkewa n’ozizi-ugha
Nzikpagbu ya n’ezie.
Ma ndi nsọ neche kwa nche,
Akwa-ha–:Ole mgbe?”;
Anyasi nke ikw’akwa
Gagho utut’onu.
Verse 4
Nim’ahuhu na ndogbu,
N’uzu nke agah-ya,
Ọ niche nmezu nile
Nk’udo ebigh-ebi;
Rue mgbe ohu otuto
K’eji gozianya-ya;
Nzuko ukwu gemeri
Nwe kwa iz’ike-ya.
Verse 5
N’uwa ya na Nna b’otu,
Chukw’Atọ nim’otu;
Neso kwa ndi nez’ike
Na nnweko di utọ.
Ndi nsọ ndi no kwa no’onu !
Jisus, ny’anyi amara
K’ayi yiri ha, ndi nwayọ,
We binyere I n’elu ! Amen
Jesus with Thy church abide.

Abu 82- Jisus, nonyere Nzuko-I.

Verse 1
Jisus, nonyere Nzuko-I,
Bur’Eze-Ya n’Onye-ndu,
N’uwa nka nim’onwunwa:
Biko nur’olu-ayi.



Verse 2
Makua ya n’ihu-n’anya,
Zegidere ya nd’iro,
Gugua ya nim’ahuhu:
Biko nur’olu-ayi.
Verse 3
Me k’ozizi na ndu-ya
Di nma, nye ya ntaach’obi,
K’o tukwas’obi na nkwa-I
Biko nur’olu-ayi.
Verse 4
Nonyere ya mgbe nile
K’o ze njehie, k’o nacho
Otutọ-I mgb-ebigh-ebi:
Biko nur’olu-ayi.
Verse 5
Me k’olu-ya da s’ike,
Nekwu n’ikpe-Gi di nsọ,
Kwuput’Onye-nzọputa:
Biko nur’olu-ayi.
Verse 6
Topu agbu-ya nile,
Me k’ekworo dem kwusi,
Nye udo nk’elu-igwé:
Biko nur’olu-ayi.
Verse 7
K’o bur’otu n’ozizi,
Otu nim’ihu-n’anya,
Neme k’ora kwere Gi:
Biko nur’olu-ayi.
Verse 8
K’o chota ndi fur’efu,
Dur’ogbenyens nd’isi,
Gwo ndi etiwar’obi:
Biko nur’olu-ayi.
Verse 9
K’oku nk’ezi-okwu-ya
Nenwuwa, nenye ihe
Nime ochichiri-njọ:
Biko nur’olu-ayi.
Verse 10
Ekwel’obi-ya j’oyi,
Me ka ndi-nche-ya d’ike,
Gbara ndi nke-I ogige:
Biko nur’olu-ayi.
Verse 11
Ka nd’uko-ya,zua ndi nke-I,
Ndi-nche-aturu nke-Gi
Jiker’idur’umu-Gi:
Biko nur’olu-ayi.
Verse 12
Sachapu njọ-ya nile,
Tinyua ujo o natu,
Wet’onu nmeri-ya ngwa:
Biko, nur’olu-ayi.
Verse 13
K’o nwe otuto nile,
Di ọcha pua na nmehie.
K’o kwesi ibiakute I:
Biko nur’olu-ayi.
Verse 14
Me k’o keta onu-Gi
N’eb’ahu I doziri,
K’onwe ngoz’ebigh-ebi:
Biko nur’olu-ayi.
Verse 15
K’amar’Onye-nzọputa,
Na ihu-n’anya nke Nna,
Na nnweko Mọ Nsọ Nonye:
Biko nur’olu-ayi.     Amen.
Thy kingdom come, Ọ God.

Abu 83- K’ala-eze-Gi bia.

Verse 1
K’ala-eze-Gi bia
Kraist, malite ichi;
Were nkpa-n’aka-Gi
Tiwa ike nke njọ.
Verse 2
Ole udo-nke-Gi?
Ole ihu-n’anya?
Ole mgbe ikp’asi
Gebi, dika n’igwé?
Verse 3
Ole mgb’ekwere nkwa
N’agha agah-adi,
Agu njọ na nmegbu
Gagbapu n’iru Gi?
Verse 4
Nna, ayi nario I bilie,
Wer’ik’ukwu-Gi bia;
Tute anya-ncheayi,
Nkenele anya Gi.
Verse 5
Madu neled’aha-I
Anu negbu ndi nke-I;
Olu njọ negosi
Na ihu-n’any’adigh. Amen
Jesus shall reign where’er the sun.

 Abu 84- Jisus gachi n’ebe nile.

Verse 1
Jisus gachi n’ebe nile
Anyanwu naga ije-ya;
Al’eze-Ya ganagbasa
Rue mgbe onwa nagagh-adi.
Verse 2
Agekpere Ya ekpere,
Kpube Ya okpu ọtutu;
Aha-Ya di k’isi utọ
Nk’aja ekpere ututu.
Verse 3
Ndi nasu asusu nile
Gabu ihu-n’anya nke-Ya;
Ol’umu-nta ganekwusa
Ngozi-ha n’elu aha-Ya.



Verse 4
Ngozi nadi n’ al’eze-Ya;
Ndi-nkporo nwere nmeghepu,
Nd’ike gwuru nezu ike,
Anagozi ndi nkpa nakpa.
Verse 5
K’ora nile bilie weta
Ihe isopur’Eze-ayi;
Ndi-ozi ji abu rida,
Ndi bi n’uwa zanu,   Amen.
Thou whose Almighty word.

 Abu 85- Chineke, okwu-Gi.

Verse 1
Chineke, okwu-Gi
K’ochichiri nuru
We gbalaga.
Biko, nur’olu-ayi,
N’ebe nile n’uwa
Ozi-ọma-I akerugh,
Me k’ihe di !
Verse 2
Jisus, I wetara
Na nku ngbaputa-Gi
Ndu n’ih’uzọ;
Nagwo nd’oria n’obi,
Nasagh’anya nd’isi;
N’aru madu nile
Mek’ihe di!
Verse 3
Mọ Nsọ nk’ihu-n’anya,
Nduru nsọ nenye ndu
Nefe s’ike;
Neru n’elu miri,
Neb’oku amara,
N’ochichiri nk’uwa
Me k’ihe di !
Verse 4
Atọ nke di ngọzi,
Triniti d’otuto,
Juputara
N’amam-ihe n’ike,
N’ihu-n’anya nile;
Eb’uwa soturu
Me k’ihe di. Amen
Revive Thy work, O Lord.

 Abu 86- Nn’ani, tute olu-Gi

Verse 1
Nn’ani, tute olu-Gi,
Setipu ak-Gi;
Me ka ndi-Gi nuru olu I
Nakpote ndi nwuru.
Verse 2
Nn’ayi, tute olu Gi,
K’ayi nefe Gi n’ebe a.
Biko, ridata, Nn’amara,
Bia gozie ayi ugbu a !
Verse 3
Nn’ayi, tute olu-Gi,
Ka nri ndu nagu ayi;
K’akpiri miri ndu nakpo
Nkpur’obi-ayi mgbe dum.
Verse 4
Nn’ayi, tute olu-Gi,
Welite aha-Gi;
Me k’ihu-n’any’ayi di oku
Site na Mọ Nsọ-Gi.
Verse 5
Nn’ayi, tute olu-Gi,
Nye Okwu-Gi ike;
Kwe k’ewe’okwukwe di ndu
Nur’Ozi-ọma-Gi.
Verse 6
Nn’ayi, tute olu-Gi,
Zosa ayi miri ndu;
Otutọ-ya gabu nke-Gi,
Ngozi gabu nke-ayi.   Amen.
Zion’s King shall reign victorious.

Abu 87- Eze Zaion gachi na nmeri.

Verse 1
Eze Zaion gachi na nmeri,
Uwa dum gekwere Ya;
Al’eze-Ya di otuto,
Ọ gachi mgb’ebigh-ebi.
Verse 2
Mba ezonariri Chuku
Gahu ihe otuto;
Abali gagho ehihie,
igwé nuria n’ihu ya.
Verse 3
Nd’Israel gbasara ger’uju
Cho Chuku, Onye-nwe-ha,
Le Y’anya, Ony’amapuru,
Tikue Ony’akpogburu.
Verse 4
Ez’uku, setipu aka-I,
Kwagide ol’otuto-I;
Wetara mba dum inye-aka,
Zo ha, ha gefebe Gi !   Amen.
Hail to the Lord’s Anointed.

 Abu 88- Onye etere manu.

Verse 1
Onye etere manu,
Ọkpara nsọ Devid!
Ekele, na mgb’akara
K’Ọ malite ichi
Ọ biar’iwepu nmegbu
K’Ọ kpochapu kwa nmehie,
B’Eze n’ez’omume.
Verse 2
Dik’igirigi ngọzi
K’Ọ biara n’el’uwa;
Onu na ihu-n’anya
Nepute n’uzọ-Ya.
Udo ka agekwusa
N’iru Ya n’el’ugwu;
Ez’omume geru kwa
Dik’iju n’uwa dum.
Verse 3
Ọ ji omiko leta
Ndi anemekpu’au,
Nyere nd’ogbenye aka,
Gba nd’ike gwur’ume;
Is’ude-ha gho abu,
Abali gho ihe;
Mọ-ha nk’amara ikpe,
Di’ok’onu n’anya-Ya.



Verse 4
Nd’eze gad a n’iru Ya,
Weta ih’onyinye;
Mba nile ganefe Ya,
Nako otuto-Ya;
Mgbe dum k’agekpere Ya,
Neme nkwa kw’ubọchi;
Al’eze-Ya bar’uba,
Al’ez’ebigh-ebi.
Verse 5
Ọ ganodu n’och’eze
Nemeri nd’iro dum;
Otutọ-Ya nagbasa,
Ngozi-Ya dir’ora.
Ogbugba-ndu-Ya nadi
We rue mgb’ebigh-ebi;
Aha-Ya wnwegh ngbanwe,
Aha ihu-n’anya.   Amen.
Father, Let Thy Kingdom come.

Abu 89- Nna k’ala-eze-Gi bia.

Verse 1
Nna k’ala-eze-Gi bia,
K’Ọ nabia n’ike di ndu;
Kwue okwu ikp’azu-Gi,
Webata oge nmeri.
Verse 2
Dik’o biara na mgb’ochie
Nim’al’obi nke madu,
Mgbe ndi ọma nwuru Gi-
Chineke, k’o bia ozo !
Verse 3
Wep’och’eze nk’ Ekwensu,
Kpop’arusi n’obe-ha;
Chiba chichi ka nma,
Kpube okpu-eze-Gi.
Verse 4
Otut’aro gar’aga
K’I zir’anyi ekpere nka;
Any anile neche nche
Ihu ihè-Gi nenwu.
Verse 5
Ka chi nke Chineke bo !
Obi-anyi we nuria’onu;
obi’utọ n’abu di, nsọ
Gekele obubo-ya.
Verse 6
K’Och’eze na mba nile
Buru ndi Chineke nwe;
Nim’obi nke madu dum,
Nna, k’ala-eze-Gi bia !   Amen.
God in heaven, hear our singing.

 Abu 90- Chuku nk’igwé, nur’abu-ayi

Verse 1
Chuku nk’igwé, nur’abu-ayi,
Anyi bu nani umu-nta;
Biko, Nna, ayi biakute Gi
Nebut’aririo uku.
Verse 2
Anyi nario I k’al’eze-Gi bia,
K’uwa zur’ike na Gi;
Ka ndi mara I, na ndi kwere I
Hui Gi n’anya, neto Gi.
Verse 3
K’akuko utọ nke onu
Nke ihu-n’anya Jisus,
Bur’abu otuto n’uwa,
Yie nke ndi-m’ozi n’igwé.
Verse 4
Zite ike nke Mọ Nsọ-Gi,
Kpota nd’uwa n’iru Gi;
N’ihi n’al’eze bu nke-Gi,
N’ike n’otuto mgbe dum.   Amen.
For all the saints, who from their labours rest.

 Abu 91- N’ihi ndi nsọ, nez’ike n’olu.

Verse 1
N’ihi ndi nsọ, nez’ike n’olu,
Ndi ji okwukwe kwusa Gi n’uwa,
K’aha-Gi, Jisus, bur’aha ngọzi.
Aleluya !
Verse 2
Gi b’ebe-ngbaba, nkume, n’ike-ha;
Gi b’Ochi-agha n’agha-ha nile;
Gi nim’chichiri b’ez’ihe-ha.
Aleluya !
Verse 3
Ka ndi-agha ọma-Gi, ndi d’ike,
Lua ogu-ha ka ndi nsọ nke mgb’ochie,
Soro ha nweta okpu nke nmeri.
Aleluya !
Verse 4
Nriko di ngọzi, nnweko nke di nsọ !
Anyi nalu ogu, ha no n’otuto;
M’ayi b’otu nime Gi, ayi dum bu nke-I.
Aleluya !
Verse 5
M’agha d’ufu, ogu alugide,
Nti nanu abu nmeri nk’el’igwé,
Obi nwe ik’ozo, aka d’ike.
Aleluya !



Verse 6
Anyanwu nenwu s’ike n’anyasi,
Nd’ogu ndi kwesiri gez’ike ngwa;
Ngozi nk’udo nke Paradis d’utọ.
Aleluya !
Verse 7
M’ubọchi otuto ka nma gabo;
Ndi nsọ gebili n’uwe nmeri-ha,
Eze nk’otuto naga n’uzọ-Ya !
Aleluya !
Verse 8
Site n’ala, n’ osimiri nile,
Usu agutagh-onu nezuko,
Naburu Nna, n’Ọkpara, na Mọ Nsọ.
Aleluya ! Amen.
 
 O Lord of life, where’er they be.

Abu 92- Onye-nwe-ndu, eb’o bula.

Verse 1
Onye-nwe-ndu, eb’o bula
Ha no n’ebigh-ebi nke-Gi,
Ndi-ayi nwuru nadiri Gi.
Haleluya !
Verse 2
Gi nw’obi dum, n’ebe nile,
Ha nez’ike n’okpuru Gi,
Ha keta otu nchebe-Gi.
Haleluya !
Verse 3
Okwu-I b’ezie, uzọ-I di nma;
“Ntu lara ntu”, m’ayi bukari
Abunke ntukwasi-obi.
Haleluya !
Verse 4
Ndi nwuru na Gi no n’onu,
Egwu agagh-atu h’ozo;
N’onwu na ndu, ha nwe ngọzi.
Haleluya ! Amen.
This is the day the Lord hath made.

 Abu 93- Nka b’ubọchi Chuku doro.

Verse 1
Nka b’ubọchi Chuku doro,
Ọ kpo y’oge nke-Ya;
K’igwé n’ala nuria n’otu,
Neto Ya n’och’eze.
Verse 2
Ta k”o si n’onwu bilite,
Ik’Ekwensu ada;
Ta ka ndi nsọ to nmeri-Ya,
Nekwusa ike-Ya.
Verse 3
Hosanna diri Eze-ayi,
Ọkpara nsọ Devid!
Yer’ayi aka, si n’oche-Gi
Wetar’ayi nzọputa.
Verse 4
Ngozi diri Ony’ahu ji
Ozi nk’amara bia;
Nke nabia n’aha Chineke
K’Ọ zọputa ndi-njọ.
Verse 5
Hosanna ! otuto kasi
Nzuko nk’uwa genye;
Elu-igwé, eb’Ọ nachi,
Geto Ya kari nka.     Amen.
This is the day of light.

 Abu 94- Ta b’ubọchi ihe.

Verse 1
Ta b’ubọchi ihe,
Me ka ihe di ta;
Jisus, bia n’ochichiri-ayi,
Chupu ngbachi-ya dum.
Verse 2
Ta b’uboch’iz’ike,
Nye ayi ike ohu;
Nim’uche n’ob’ike gwuru
Tuye ike ndu-Gi.
Verse 3
Ta b’ubọchi udo,
MKejue ayi n’udo-Gi;
Wepu adigh-n’otu nile,
Chupu ise-okwu.
Verse 4
Ta b’uboch’ekpere,
K’uwa n’igwé bia nsọ;
Welie obi-ayi icho Gi,
Bia zute ayi n’ebe a.
Verse 5
Ta b’ubọchi nke-nbu;
Zipu ume ndu-Gi,
Kpote ndi-njọ ka ha to Gi,
Onye-nmeri onwu. Amen.
Pleasant are Thy courts above.

 Abu 95 -Ulo-I n’igwé mara nma.

Verse 1
Ulo-I n’igwé mara nma,
N’al’ihe n’ihu-n’anya;
Ulo-I n’uwa mara nma,
N’ala njọ n’ahuhu nka.



Agu nagu nkpur’obim
Inwe nmeko ndi nsọ-Gi,
Ihu onwunwu iru-I,
N’izu-oke amara-I.
Verse 2
Nnunu nabu ab’onu
N’ebe-ichu-aja-Gi;
Obi onu nez’ike
N’obi Nna nk’elu-igwé !
Dika nduru fur’uzọ
Nahugh ebe-iz’ike,
Ha gala n’ugbo nke-ha,
Nodu n’onu mgbe nile.
Verse 3
Ndi no n’onu neto Gi
Obuna nim’uwa nka;
Miri nasu n’ozara,
Nri si n’igwé nazu ha.
Ha naga n’irun’ike
We rue n’oche-eze-Gi;
Nada n’ukwuGi neto
Onye duru ha n’udo.
Verse 4
Nna, ka m’gbat’ih’ozo nka !
Durum ga n’aj’uwa nka;
Wor’amara-Gi debem,
Nyem onodu n’ulo-Gi.
Anyanwu n’Ota k’I bu,
Dur-obi-nfughari nkem;
Gi nw’otuto n’amara,
Ka ha dirim, Onye-nwem! Amen.
This day, at Thy creating word

 Abu 96- Ubochi ta, n’Okwu nke-Gi

 
Verse 1
Ubochi ta, n’Okwu nke-Gi
Ka ekere uwa n’ihe;
Chineke, mukwasi ayi ta,
Mejue obi-ayi n’ihè-Gi.
Verse 2
Ta ka Jisus, Onye nwuru,
Biliri n’ike nke nmeri;
Jisus, me k’ayi si n’onwu njọ
Soro Gi bilie, di kwa ndu.
Verse 3
Ubochi ta Mọ Nsọ biara
N’ire-oku nke wasara;
No Nsọ, mejue obi-ayi ta
N’amara-Gi ikp-ekpere.
Verse 4
Uboch’amara, ndu, n’ihe !
Nk’iz’ike si n’olunk’uwa !
Oge ns-Gi nk’ihu-n’anya,
Chineke, ayi nyeghachiri I.
Verse 5
Otutọ diri Nna,
N’Ọkpara ahuru n’anya,
Na Mọ Nsọ, Onye ayi neto
Rue mgbe nile ebigh-ebi. Amen.
To Thy temple I repair.

 Abu 97- Agajem ulo-I Chuku.

Verse 1
Agajem ulo-I Chuku,
Ikpo isi-ala natom,
Mgbe m’gexute n’ulo ndo-I
Kraist, n’ir’och’ebere-Ya.
Verse 2
Ya mere k’ayi di n’otu;
Ya mere ka m’gho nwa-Gi.
Abba, Nna, nyem amara
Icho iru-I n’ulo-Gi.
Verse 3
Mgb’anabu ab’otuto-I,
Biko, topu ire nkem;
K’obim wer’onu gozie
Gi, bu ezi-omumem.
Verse 4
Mgbe ndi nsọ nekp’ekpere,
Chukw’ihu-n’anya, nurum !
Nuru, Mọ nke-Gi nario;
Nuru, Jisus nario kwa.
Verse 5
Mgbe ndi-ozi-Gi nezi
Ngbahara n’udo n’aha-I;
Me ka m’site n’olu-ha
Nu Okwu-Gi si n’igwé.
Verse 6
Mgbe m’sin’ulo-Gi lata,
K’obim nekp’oku nimem;
Ma m’ anyasi me ka m’si,
Mu na Chuku akpa ta!
Lord, we come before Thee now.

 Abu 98- Chuku, ayi abia ugbua.

Verse 1
Chuku, ayi abia ugbua,
N’ukwu-I k’ayi gbur-ikpere;
Akpapula aririo,
Ayi garioro Gi n’efu?
Verse 2
Gi k’ayi tukwasir’obi,
Wer’ebere ridata;
Meju’obi-ayi n’amara,
Me k’onu-ayi neto Gi.
Verse 3
N’uzọ nke I doziri
Ayi biara ichota Gi;
Chuku, ezipula ayi,
Ghara inye ayi ngọzi.
Verse 4
Site n’ozi-ọma-Gi
Zite okw’udo n’onu;
Ka Mọ-Gi ny’obi nile
Nzọputa-Gi zur’oke.
Verse 5
Kasie obi ner’uju,
K’oge onu laghachi;
Palie ndi-Gi dar’ada,
Nye ha okwukwe d’ike.



Verse 6
Kwe k’yi nile choputa
Gi, bu Onye-ebere:
Gwo ndi-oria nile nk’ayi
Zilag’ayi n’onu nke-Gi.
Father, again in Jesus name we meet.

Abu 99- Nna, ayi zukot’ozo n’aha Jisus.

Verse 1
Nna, ayi zukot’ozo n’aha Jisus,
Kpo isi ala nye I na ncheghari;
Ayi weli’ozo olu nadigh ike,
Nario ebere, nabu otuto-I.
Verse 2
Ayi gagozi ncheb’ebigh-ebi-Gi,
Nekwuputa olu-Gi kw’ubọchi;
Ejigh ebere-I nekpube ndu-ayi?
Ọ bugh aka-I gbar’ayi gburugburu?
Verse 3
Ewo ! ayi ekwesigh ihu-n’anya-I;
Otutọ mgbe k’ukwu-ayi fur’efu !
M’ugbu a, n’ih’olu-Gi nagb’ayi ume,
Ayi nd-njọ lata n’ulo-Gi ka Nna.
Verse 4
N’ih’Aha nk’ozuzu bi nime Ya,
Site n’ihu-n’anya nke kachasi,
N’Obara nk’awusiri n’ihi njọ,
Meghe uzọ ebere kpobat’ayi !  Amen.
We come, Lord, to Thy feet.

 Abu 100- Chineke, ayi abia.

Verse 1
Chineke, ayi abia
N’ubọchi-I nka di nsọ;
Biakute ayi, k’ayi zukọrọ
Ito n’ikpere Gi.
Verse 2
Gbahara nmehi’ayi dum,
Ziter’ayi Mọ Nsọ-Gi;
Zir’ayi Idiba ndu ahu
Nke nenwegh ogwugwu.
Verse 3
Meju’ayi n’ihu-n’anya,
Gozie nd’ozizi-ayi;
N’iru och’eze-I nk’el’igwé
Ayi nile gezuko. Amen.



4 thoughts on “Abu Anglican (Igbo Hymn) 51 – 100

  1. Pingback: - 9JAINFORMED.COM

Comments are closed.