You dont have javascript enabled! Please enable it! Venite, Benedictus, Te deum, Jubilate Deo in Igbo - 9JAINFORMED

Venite, Benedictus, Te deum, Jubilate Deo in Igbo

Search Contents

The four popular Anglican Canticles. They are: Venite, Benedictus, Te deum, Jubilate deo; all in Igbo Language. These are special kind of prayer that are sung during the church service. They serve differently purposes. Here are the Venite, Benedictus, Te deum, Jubilate Deo in Igbo. See also: 2024 CON Anglican Bible Study – Study 11 to 25

VENITE In Igbo. Abù Ọma 95.

Bianu, ka ayi tikue Jehóva | nkpu | ọńu: ka ayi tikusie oke nkume nke nzọpu|ta-ayi nkpu | ọńu | ike.
Ka ayi were ekele bi’á | n’iru | Ya: ka ayi were abù ọma tikúsie | Ya nkpu | ọńu | ike.
N’ihi na Chineke uku ká Je|hóva | bu: Ọ bu kwa Eze úku | nāchi | chi nile.
Onye ebe nile nke michasiri emi nké uwa di | n’aka|-Ya: ebe dichasi elu nké ugwu | nile | bu kwa | nke Ya.
Onye nwere oke osimiri, Yá onwe-ya | me-kwa-ra | ya: ọ bu kwa aka-Ya kpúru | ala | akọ|rọ.
Batanu, ka ayi kpọ isi ala rúru | kwa | ala: ka ayi bue ikpere n’ala n’iru Jehóva | Onye | meworo | ayi.
N’ihi na Ya onwe-ya bú Chi|neke|-avi : ayi onwe-ayi bu kwa ndi Ọ nāzu dika aturu, buru kwa igwe átu|ru nke | aka|-Ya.
Ta, ọ buru na unu ege nti olu-Ya, unu emela ká obi-unu | sie i|ke: dika na Meriba, dika n’ubọchi | Masa | n’ọza|ra,
Mbe nná-unu|-ha nwa|ram : nwaputam í|he, hu | kwa | ọlum.
Ọgu arọ abua ka M’nāsọ ọbọ ahu ó|yi, M’we | si: Ndi nke nākpafu n’obi-ha ka ha bu, ha onwe-ha amagh | kwa | uzọm | nile,
N’ihi ya ańurum fyi | n’iwem, lsi: Ha agagh-abá | n’izu|-ikem | ma-ọli.
Otuto diri Nná, | na Ọkpa|ra: ná | — — | Mọ — | Nsọ;
Otu ọ diri na mbu, ọ di ubu a, ọ gādigi|de o|tu a: we rue n’úwa | ebigh-e|bi, A|men.

Emesia, Abù Ọma gēso n’usoro dilea esi ka ha. N’ọgwugwu nke Abù Ọma ọ bula n’ogologo arọ nile, na n’ọgwugwu nke Benedicite na Benedictus na Magnificat na Nunc dimittis ka agāgu,

    Otuto diri Nna, na Ọkpara: na Mọ Nsọ;
Otú ọ diri na mbu, ọ di ubu a, ọ gādigide otú a: we rue n’uwa ebigh-ebi. Amen.

Venite, Benedictus, Te deum, Jubilate Deo in Igbo

TE DEUM LAUDAMUS in Igbo.

Chineke, ayí | nēto | Gi: a yi kwere na Gí | bu O|nye-nwe-jayi.
Elu-uwa dúm nā|sọpuru | Gi: Nná | nke mbe | ebigh-e|bi.
Gi ka ndi-mọ-ozi níle | nākpọ|ku: Elu-igwe na Íke | nile | di ha | nime.
Gi ka Cherubim ná | Sera|fim : na | kpọ —|ku mbe | dum.
Nsọ, | Nsọ, | Nsọ: Jehova Chineke nké usu | nile | nke ndi|-agha.
Elu-igwe na úwa | juputa|ra: n’Ébube | nke o|tuto|-Gi.
Usu Ndi-ozi-Gi nke dí | otu|to: né | — — |to — | Gi.
Nmekọ ọma ahu, bú ndi|-amuma|-Gi: né|— —|to — | Gi.
Usu ndi-agha, bu ndi-ama-I ndi yíri | uwe ọ | cha: né|— —|to — | Gi.
Nzukọ nsọ Kraist nke di n’elu | uwa | nile: kwé| — —|re— | Gi.
Chí|neke | Nna: Ó|nye di | ebu|be.
Ọkpara-Gi, Nke | múru | nani | Ya: Nke di nsọpuru | na e|zi-o|kwu.
Mọ |— Nsọ | kwa: Ọ|nye-nka|si-o|bi.
Gi bu Éze nke | otu|to : Gí | — — | — — | Kraist.
Gi bu Ọkpara | ebigh-e|bi: nké | — — | — — | Nna.
Mbe I mere Onwe-i madu ka I we zọ|puta | madu: I leligh áfọ | Nwa — | a —|bọghọ.
Mbe I merisiri ihe-ọbuba | nke ọ|nwu: I meghere Ala-eze nke Elu-igwe nyé | ndi-o|kwukwe | dum.
Gi nọduru n’aka-nrí | Chine|ke: n’ọ|tuto | nke — | Nna.
Ayi kwere ná | I gā|bia: ka I búru | Onye |-ikpe|-ayi.
Ya mere ayi nēkpere Gi, yere ndi-órù-|Gi a|ka: ndi I ji ọbara-Gi di óke | ọnu | bapu|ta,
Me ka agukọta ha ná Ndi | Nsọ nke | Gi: n’ó|tuto| ebigh-e|bi.
Onye-nwe-ayi, zọpu|ta ndi | nke I: gọzi | kwa i|he-nke|ta-I.
Búru | eze- | ha: buli kwa há | elu | ebigh-e|bi.
Kwa- | ubọch|i: ayí | nē —|buli | Gi;
Ayi nāsọpuru Ahá-Gi | mbe ni|le: wē rue | n’uwa | ebigh-e|bi,
Onye-nwe-ayi, wédata | Onwe-|Gi: ka I debe ayi ta ká ayi | ghara | ime|hie,
Onye-nwe-ayi, mére ayi | ebe|re: mé|re ayi | ebe|re.
Onye-nwe-ayi, ka ebere-Gí | dakwasi | ayi: ebe ntukwasi-ọbi|-ayi — | di na | Gi.
Onye-nwe-ayi, ọ bu Gi ka m’tukwási|ri o|bi: ekwéla | ka i|here | mem.

Venite, Benedictus, Te deum, Jubilate Deo in Igbo

BENEDICTUS in Igbo

(Luk. I. 68-79)

    Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bu Onye-nwe-ayi, Chiné|ke nke | Israel: n’ihi na Ọ letawo ndi-Ya, lu-kwa-ra há | ọlu | nbapu|ta,
Ọ weliwo-kwa-ra ayi mpí nke | nzọpu|ta: n’ulo onye nējere Ya | ozi, | bu De|vid,
Dika O kwuru site n’ọnu ndi-ámuma-|Ya di | nsọ: sí|te n’o |ge — | mbu,
Nzọputa n’áka ndi-|iro-|ayi: na n’aka ndi níle | nākpọ | ayi a|si:
Imere nna-ayí-ha | ebe|re: na icheta ọbu|ba- —|ndu nsọ | Ya;
Iyi Ọ ńuru Ábra|ham nna-|ayi: í|kwe—| ye — | ayi,
Ebe adọputaworo ayi n’áka ndi-|iro-|ayi: ka ayi nēkpére | Ya nā|tugh e|gwu,
N’obi ọcha na ézi omume | n’iru | Ya: ú|bọ-chi|-ayi ni|le.
Ọzọ kwa, gi onwe-gi, nwatakiri, agākpọ gi onye-amuma nke Onye kachasi íhe | nile | elu: n’ihi na i gāga n’iru Onye-nwe-ayi idózi | uzọ-|Ya ni|le;
Ime ndi nke Ya ka ha mára | nzọpu|ta: nime nbághara | nmehie | nile | ha,
N’ihi obi ebere nké Chi|neke-|ayi: nke ọwuwa-anyanwu nke sitere ri’élu gē|leta ayi | nime | ya,
Imukwasi ndi nọ n’ọchichiri na ónyinyo | ọnwu ì|he: iduzi ukwu-ayí | ba n’u|zọ u|do.
Otuto diri Nná, | na Ọkpa|ra: ná | — — | Mọ — | Nsọ;
Otu ọ diri na mbu, ọ di ubu a, ọ gādigi|de o|tu a: we rue n’úwa | ebigh-e|bi. A|men.

JUBILATE DEO in Igbo. Abù Ọma 100.

Tikusienu Jehova nkpu ọńu ike, | uwa | nile: werenu ọṅu fè Jehova òfùfè, werenu iti-nkpu ọńu | bia | n’iru | Ya.
Maranu na Jehova, Ya onwe-ya bú | Chine|ke: Ya onwe-ya emewo ayi, ọ bu kwa Ya nwe ayi: ayi bu ndi-Ya, na igwe aturu nké | ọzù|zù-anu- | Ya.
Werenu ekele ba n’ọnu-uzọ-ama-Ya nile, werenu otuto ba n’ógi|ge-Ya | nile: kelenu Ya, gọzi- | kwa-nu|aha- | Ya.
N’ihi na Jehova di nma; rue mbe ebigh-ebi ká e|bere-Ya | di: rue ọbọ nile ka ikwesi-ntukwási- | obi- | Ya di | kwa.
Otuto diri Nná, | na Ọkpa|ra: ná | — — | Mọ — | Nsọ;
Otu ọ diri na mbu, ọ di ubu a, ọ gādfgi|de o|tu a: we rue n’úwa | ebigh-e|bi, A|men.