You dont have javascript enabled! Please enable it! VENITE in Igbo - Abù Ọma 95 - 9JAINFORMED RELIGION

VENITE in Igbo – Abù Ọma 95

VENITE in Igbo – Abù Ọma 95

We have just published Tedeum Ladaumus in Igbo. So, we thought it wise to publish other popular chants in the Anglican Communion like Jubilati Duo, Benedictus, and Venite. Here is Venite in Igbo.



 

VENITE. Abù Ọma 95.

Bianu, ka ayi tikue Jehóva | nkpu | ọńu: ka ayi tikusie oke nkume nke nzọpu|ta-ayi nkpu | ọńu | ike.

Ka ayi were ekele bi’á | n’iru | Ya: ka ayi were abù ọma tikúsie | Ya nkpu | ọńu | ike.



N’ihi na Chineke uku ká Je|hóva | bu: Ọ bu kwa Eze úku | nāchi | chi nile.
Onye ebe nile nke michasiri emi nké uwa di | n’aka|-Ya: ebe dichasi elu nké ugwu | nile | bu kwa | nke Ya.
Onye nwere oke osimiri, Yá onwe-ya | me-kwa-ra | ya: ọ bu kwa aka-Ya kpúru | ala | akọ|rọ.

Batanu, ka ayi kpọ isi ala rúru | kwa | ala: ka ayi bue ikpere n’ala n’iru Jehóva | Onye | meworo | ayi.
N’ihi na Ya onwe-ya bú Chi|neke|-avi : ayi onwe-ayi bu kwa ndi Ọ nāzu dika aturu, buru kwa igwe átu|ru nke | aka|-Ya.

Ta, ọ buru na unu ege nti olu-Ya, unu emela ká obi-unu | sie i|ke: dika na Meriba, dika n’ubọchi | Masa | n’ọza|ra,
Mbe nná-unu|-ha nwa|ram : nwaputam í|he, hu | kwa | ọlum.
Ọgu arọ abua ka M’nāsọ ọbọ ahu ó|yi, M’we | si: Ndi nke nākpafu n’obi-ha ka ha bu, ha onwe-ha amagh | kwa | uzọm | nile,
N’ihi ya ańurum iyi | n’iwem, si: Ha agagh-abá | n’izu|-ikem | ma-ọli.



 

Otuto diri Nná, | na Ọkpa|ra: ná | — — | Mọ — | Nsọ;
Otu ọ diri na mbu, ọ di ubu a, ọ gādigi|de o|tu a: we rue n’úwa | ebigh-e|bi, A|men.

 


Emesia, Abù Ọma gēso n’usoro dilea esi ka ha. N’ọgwugwu nke Abù Ọma ọ bula n’ogologo arọ nile, na n’ọgwugwu nke Benedicite na Benedictus na Magnificat na Nunc dimittis ka agāgu,

Otuto diri Nna, na Ọkpara: na Mọ Nsọ;
Otú ọ diri na mbu, ọ di ubu a, ọ gādigide otú a: we rue n’uwa ebigh-ebi. Amen.