You dont have javascript enabled! Please enable it! TEDEUM LAUDAMUS in Igbo - Tedeum - 9JAINFORMED

TEDEUM LAUDAMUS in Igbo – Tedeum

TEDEUM LAUDAMUS in Igbo

Tedeum Laudamus is one of the Anglican Communion heritages. It is a praise chant done in morning worship or any serious service in the Communion. It has the English version. However, we are going to update the TEDEUM LAUDAMUS in Igbo first because our readers have requested it.



 

TEDEUM LAUDAMUS in Igbo

Chineke, ayí | nēto | Gi: a yi kwere na Gí | bu O|nye-nwe-jayi.
Elu-uwa dúm nā|sọpuru | Gi: Nná | nke mbe | ebigh-e|bi.
Gi ka ndi-mọ-ozi níle | nākpọ|ku: Elu-igwe na Íke | nile | di ha | nime.
Gi ka Cherubim ná | Sera|fim : na | kpọ —|ku mbe | dum.



Nsọ, | Nsọ, | Nsọ: Jehova Chineke nké usu | nile | nke ndi|-agha.
Elu-igwe na úwa | juputa|ra: n’Ébube | nke o|tuto|-Gi.
Usu Ndi-ozi-Gi nke dí | otu|to: né | — — |to — | Gi.
Nmekọ ọma ahu, bú ndi|-amuma|-Gi: né|— —|to — | Gi.
Usu ndi-agha, bu ndi-ama-I ndi yíri | uwe ọ | cha: né|— —|to — | Gi.
Nzukọ nsọ Kraist nke di n’elu | uwa | nile: kwé| — —|re— | Gi.
Chí|neke | Nna: Ó|nye di | ebu|be.

Ọkpara-Gi, Nke | múru | nani | Ya: Nke di nsọpuru | na e|zi-o|kwu.
Mọ |— Nsọ | kwa: Ọ|nye-nka|si-o|bi.
Gi bu Éze nke | otu|to : Gí | — — | — — | Kraist.
Gi bu Ọkpara | ebigh-e|bi: nké | — — | — — | Nna.



Mbe I mere Onwe-i madu ka I we zọ|puta | madu: I leligh áfọ | Nwa — | a —|bọghọ.
Mbe I merisiri ihe-ọbuba | nke ọ|nwu: I meghere Ala-eze nke Elu-igwe nyé | ndi-o|kwukwe | dum.
Gi nọduru n’aka-nrí | Chine|ke: n’ọ|tuto | nke — | Nna.
Ayi kwere ná | I gā|bia: ka I búru | Onye |-ikpe|-ayi.

Ya mere ayi nēkpere Gi, yere ndi-órù-|Gi a|ka: ndi I ji ọbara-Gi di óke | ọnu | bapu|ta,
Me ka agukọta ha ná Ndi | Nsọ nke | Gi: n’ó|tuto| ebigh-e|bi.
Onye-nwe-ayi, zọpu|ta ndi | nke I: gọzi | kwa i|he-nke|ta-I.
Búru | eze- | ha: buli kwa há | elu | ebigh-e|bi.
Kwa- | ubọch|i: ayí | nē —|buli | Gi;
Ayi nāsọpuru Ahá-Gi | mbe ni|le: wē rue | n’uwa | ebigh-e|bi,
Onye-nwe-ayi, wédata | Onwe-|Gi: ka I debe ayi ta ká ayi | ghara | ime|hie,
Onye-nwe-ayi, mére ayi | ebe|re: mé|re ayi | ebe|re.

Onye-nwe-ayi, ka ebere-Gí | dakwasi | ayi: ebe ntukwasi-ọbi|-ayi — | di na | Gi.
Onye-nwe-ayi, ọ bu Gi ka m’tukwási|ri o|bi: ekwéla | ka i|here | mem.



TEDEUM LAUDAMUS in Igbo

 

Apostles’ Creed in Igbo

Ekwem na Chineke, bú Nna, Nke puru ime ihe nile, Onye kere elu-igwe na uwa.

Ekwem na Jisus Kraist nání otù Okpara-Ya, bú Onye-nwe-ayi, Onye aturu ime site n’ike Mọ Nsọ; Nwa-abọghọ nāmagh nwoke, bú Meri, muru Ya, Ọ huru ahuhu n’ubọchi Pọntiọs Pailet, Akpọgidere Ya n’obe, Ọ nwua, elie Ya, Ọ ridara n’ala-mọ; N’ubọchi nke-atọ O si-kwa-ra na ndi nwuru anwu bilie ọzọ, Ọ rigoro n’elu-igwe, Ọ nānọdu n’aka-nri Chineke, bú Nna, Nke puru ime ihe nile: N’ebe ahu ka O gēsi bia ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu.

Ekwem na Mọ Nsọ; Na Nzukọ Katolik nke di nsọ; Na nmekọ nke Ndi Nsọ; Na Nbaghara nmehie; Na Nbilite-n’ọnwu nke aru, Na ndu ebigh-ebi. Amen.