You dont have javascript enabled! Please enable it! 2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December) -

2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

Search Contents

This the 2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December). Refer here for the complete English version 2022 Anglican Bible study Outline.

Study 36, September 4, 2022 –  IHE OMUMU NKE IRI ATO NA ISII

Sonde nke iri na-abuo ka Triniti Gasiri    September 4, 2022.

ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenwanyi Chineke na ochi ichi nke udo.

NKEBI ISIOKWU: Ntuzi aka nkwado nke ndi otu Kraist nye onye ziri ezi na Ezi ochichi (3)

ISIOKWU: Iwe ezi nghota nke ime mmuo na kwa nke ogugu isi.

EBE AGAAGU: Dan 1:17-20

EBUM N’ OBI IHE OMUMU A

  1. Ka arutu aka mkpa o di ka ndi otu Kraist nwee nghota bu igba n’ ebe ogbasara “okwe ndoro ndoro ochichi, omenaala ka ndi isi ebi, nakwa akuko ihe mere mgbe gara aga ya na iwe ezi nghota nke okwu Chineke”

ii. Ka akparita uka otu ndi nke Kraist g’ esi j iri ezi nghota ha nwere n’ okwu Chineke, nakwa nghota ha nwere maka ihe mere n’oge gara agana nke n’eme ugbu a wee nweta ezi mgbanwe nye ememe nakwa onodu ojo ndi otu ndoro ndoro ochichi tiny ere obodo anyi n’ime ya.

OKWU NKOWA: Ebe anyi guru taa na akowara anyi na Daniel na ndi enyi ya mutara nke oma asusu na ukpuru omume ndi ha bi n’etiti ha. Nkea mere ha ji nwe luo olu ha nke oma ma guzosie ike n’okwukwe ha n’ irabe isi nye Chineke ha. N’uzo di otu a ka ha j iri nwere amamiihe di nko nwe gbanwe otutu ajo ukpuru ibi ndu na ajo usoro ochichi nke obodo ha bi n’ime ya onwe ghoo obodo di mma. O di nkpa nke ukwu ka ndi nke Kraist niile nwe nghota di otu a nye okwu Chineke, nyekwa akuko maka ndoro ndoro ochichi,na ukpuru omume obodo di iche iche nakwa akuko ihe mere mgbe ochie na nke n’eme ugbu a na ihe ndi ozo ka ha wee nwe ike izisa ozi oma nke oma n’ala anyi.

Ezi nghota na nhazi di otua ga eny ere nzuko Kraist aka izuputa ndi dika Daniel n’ogbo anyi taa bu ndi g’eme ka uche Chineke buru ihe a g’eme n’obodo anyi niile n’agbanyeghi asusu na ukpuru ibi ndu nke obodo obula. Dan 4:1-4

 

IHE OMUME

  • Weputa ufodu uru di iche iche anyi n’enweta site n’inwe ezi nghota nke akuko ihe mere mgbe ochie, akuko okwe ndoro ndoro ochichi, ukpuru ibi ndu nke obodo ufodu nakwa akuko ihe n’eme ugbuabu nke nyere Daniel nan di enyi ya ike irita obodo Babilon n’uru. Dan 1:17-20; 9:1-4.
  • Siten’ebendiaDan9:l-4,22-23;Esta4:ll;5:1-3;8:3-8,Neh 1:1 -4; 2:1 -6 kparitauka otu inwe ezi nghota nke okwu Chineke, na akuko ihe mere mgbe ochie na nke n’eme ugbua g’esi nyere ndi nke Chineke aka iweta ezi mgbanwe nye onodu di iche iche n’ala anyi buNaijiria.
  • Kedu ihe nmuta nzuko Kraist kwesiri imuta na nwaputa di iche iche nke ndi nke Chineke n’ihe omumu a bu nke nwere ike iweta nhazi na mgbanwe puru iche n’obodo any? Nwere 2Pita 1:5
    kparita uka maka nkea.
  • InwereikeirutuakanzoukwuabuoModekaizoro Esta4:l-2,12-14? Kedu ihe egwu nakwa ihe nkwudosi ike di n’ebe ndia niile anyi guru?

OKWU NCHIKOTA: Obu ihe ana-apughi igbagha agbaghanandi otu Kraist niile kwesiri inwe ezi amamihe nke muo nke g’enyere anyi aka inogide sike ma merie onodu di iche iche n’uwa taa. Inwe ezi nghota na nhazi nke muo, akuko okwe ndoro ndoro ochichi, akuko ihe mere mgbe ochie nakwa nghota nye akwukwo iwu na-achi obodo anyi na ihe ndi ozo nezie bara nnukwu uru ma o buru na okpukpe nke ndi otu Kraist ga amitamkpuru.

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: Ezi ihe omuma na enye ike.

AMAOKWUIBU N’UCHE: Dan 1:17

 

 

2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

IHE OMUMU NKE IRI ATO NA ASAA – Study 37 September 11, 2022

Sonde nke iri na ato ka Tri                                                Study 37 September 11, 2022.

ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi Chineke na Ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Ntuzi aka nkwado nke nzuko Kraist nye ezi mmadu na ezi ochichi (4) ISIOKWU: Iwuli Obodo Elu Dika Ulo EBEAGAAGU:Jenl8:18-19

EBUM N’OBI IHE OMUMU A

  1. Ka akunyesieie n’ime anyi mkpa odi ikunye mkpuru oma ma zuo umuanyi n;uzo nke Chineke.
  2. Ka anyi lemie anya nke oma ma o bu ezie na anyi n’ejikere ndi n’eto eto nke oma maka ibu ndi ndu obodo anyi n’odi n’iru.

OKWU NKOWA: “Anesite n’ulo maramma wee puo n’ama”. Nke a bu eziokwu n’enweghi ngbagha. Obodo obula a n’atu anya na ha g’enwe ndi ndu n’atu egwu Chineke, bu obodo nwere ezinaulo ,ulo nzuko Kraist uloakwukwo nke otu Kraist guzobere bu ebe a na akuzi ukpuru omume itu egwu Chineke. Nke a bu ntuzi aka nkwado nke Chineke. Nke a bu ntuzi aka nkwado nke Chineke nyere ndi otu Kraist niile ebe obula ha no, ma ha no n’ uloakwukwo, ma ha no n’ ulo nzuko otu Kraist, ma o bukwa n’ ezinaulo ha, ma o bu n’ etiti ndi nenweghi nne na nna. N’ hi oke nleda anya nke eledara ebe ndia niile di nkpa mere e ji nwe oke oghom na nlaghachi azu n’ ebe ogbasatara nmubanye nke ukpuru ibi ndu ziri ezi nke ndi otu Kraistdika akwukwo nso si nye ntuzi aka. Ihe nke a nwetara bu na imilikiti mmadu bu ndi lara azu nwe daruo ala bu ihe anyi n’ahu n’akuko obibi ndu niile nke obodo anyi.

IHE OMUME

  • Gini bu ntuzi aka nke Chineke nye ndi oru nke Kraist dika odi na Jenl8:18-19;Deut4:9-10;Ilu22:6?
  • Kparita uka out kpachapu anya n’idebe ntuziaka nke Chineke di na Jen 18:18-19,Deut4:9-10;Ilu22:6;2Tim 1:5-7 g’esinyere aka iwuli obodo anyi elu dika ulo maburakwa ebe ndu ikwa iko n’uzo di iche iche nagaghi achi.

3 Kpoputasia ukpuru omume di iche iche di n’ ezinulo ufodu nke ndi otu Kraist taa bu nke kwesiri ka arutu aka ma gbanwe ya, omume dika ike-ekike di iche iche, enweghi nkwanye nye ndi okenye, nakwa ekwesighi ntukwasi obi ma o buru ezie na anyi choro ka azulite ezinulo anyi maka odi n’iru nke obodo.

4 NwereIlu22:6; 1 Sam 1:22; Esta2:7,10;2Tim 1:5-7 wee kowa out anyi g’esi kwadoo umu anyi nke oma maka ibu ndi ndu nke obodo a n’odi n’iru.

OKWU NCHIKOTA: Ije ozi nke izulite umuntakiri akwusighi na n’iziga ha n’ulo akwukwo di nma. O bukwa oke n’olu anyi ihu na-azuru ha nke oma na ndu nke ime muo ha bu nke g’enye aka ime ka ha buru ndi ndu n’atu egwu Chineke n’odi n’iru. O buru na anyi ga-enwe ntukwasi obi na ndi ndu anyi n’ogbo di n’iru ga-abu ndi n’atu egwu Chineke.

OKWU NKE NTUGHARIUCHE: Inwe nmuta bu igba nke nwuli elu ezi akparamagwa koro n’ime ya, ya na odi n’iru dara ada bu nwanne na nwanne.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ilu 22:6

 

 

2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

Study 38 September 18 2022 – IHE OMUMU NKE IRI ATO NA ASATO

Sonde nke iri na-ano ka Triniti Gasiri

ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi Chineke na Ochichi nke udo.

NKEBI ISIOKWU: Ike nke nkwado nke otu Kraist nye onye ezi mmadu na ezi ochichi (5)

ISIOKWU: Ezi omumaatu akparamagwa mmadu n’onodu ije ozi ya.

EBE AGAAGU: Jen39:7-10

EBUM N’OBI IHE OMUMU A

  1. Ka echetara anyi dika ndi otu Kraist, na anyi nwere ezi akparamagwa nke kwesiri ka anyi chekwaa nke oma karisia mgbe anyi no n’okwa di eludi iche iche.
  2. Ka akuzierie anyi ukpuru ibi ndu ezi omume onye nke Kraist n’uno olu anyi di iche iche.

iii Ka anyi kpoputa akparamagwa ufodu nke nwere ike ikwatu oganiru obodo karia ime ka obodo gaa n’iru.

OKWU NKOWA: N’agbanyeghi ebe obula mmadu si puta, ma o bu asusu, akara akpukpo aru ya, ogogo nke aguma akwukwo ya, ma o bu ihe nimadu kwenyere na ya, ihe ndia niile abughi ihe a ga e ji choputa ezi akparamagwa nke mmadu nwere. O bu omume ziri ezi di n’ime mmadu bu akparamagwa ya. O bu ihe mejuputara akparamagwa mmadu bu ihe na-akowa na mmadu ahu bu ezi onye n’eso uzo nke Kraist. Akara ndu ezi omume nke dika nweda n’ala, ijide onwe, inwe omiko, obi ebere, idi uchu n’olu mgbe mile, ihunaanya, nakwa nrubeisi na nkwanye ugwu bu ezi omume juputara na ndu Jisos Kraist nke kwesiri ichikwa na ndu ndi niile n’eso uzo nke Kraist. O di nkpa nke ukwu ka ndi otu Kraist na mgbe niile na n’ebe niile nakwa n’onodu niile n’egosiputa ndu ezi akparamagwa ha nwere ka ewee site n’ezi omume ha nwuli obodo anyi elu dika ulo.

IHE OMUME

1 Site n’ebe anyi guru taa, kowa “okwa” nakwa akara ezi omume nke Josef.

 

  • Guo Jen 39: 7-9; Esta 2:21-23; Dan 1:8, kpoputa ufodu akara ezi omume bu igba nke Daniel nan di otu ya gosiputa bu nke ndi otu Kraist n’okwu di iche iche kwesiri ighomi maka mbuli elu nke obodo anyi taa.
  • Kedu ka akara ezi omume ndia bu, inweda onwe n’ala, inwe omiko na obi ebere, inwe ndidi, ijikwata onwe, idi uchu n’olu, ikwesi nsopuru, ihunaanya na irube isi g’esi nyere ndi ndu aka ka ha nwee luche olu ha nke oma n’obodo anyi? Nwere Neh 1:1-4,7; Neh 6:15 nakwa Luk 3:10-16 wee kparita uka maka nke a.
  • Kpoputa omume ufodu j ogburu onwe ya nwere ike idoghachi ndi nke Kraist azu n’igosiputa ezi akparamagwa maka iwuli obodo elu Deut 27:25; Ilu 15:27; Ndi Gal 1:10; Ndi Efesos 6:5-7.

OKWU NCHIKOTA: Ndi otu Kraist niile kwesiri ka ha mara nke oma na n’ogogo, ma o bu olu di iche iche nke ha na-alu na ha bu ndi nnochite anya nke Kraist na nzuko ya. O bu site na ngosiputa ezi akparamagwa ha nye ndi ndu na ndi na-achi achi g’enyere ndi ndu aka iluputa olu g’eme ka obodo ga n’iru n’eto eto.

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: Ebe obula ma o bu ihe obula okwu onu n’enweghi ike iga ma o bu kwuo, akaparamagwa bu ihe ga-aga ma o bu kwuo ya.

AMAOKWUIBU N’UCHE: Jen 39:9



2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

Study 39 September 25 2022 – IHE OMUMU NKE IRI ATO NA ITEGHETE

Sonde nke iri na ise ka Triniti Gasiri                          Septemba 25, 2022

ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi Chineke na Ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Ike nke nkwado nke ndi otu Kraist nye ezi onye na ezi ochichi (6)

ISIOKWU: Oke NaOlu Diri Ndi Ana-achi Achi

EBE AGAAGU: Matu 17:24-27

EBUMN’OBI IHE OMUME A

  1. Ka anyi mara oke na olu diri ndi ana-achi achi dika ometutara omume ndi otu Kraist, nakwa;
  2. Ka egosiputa ihe nmekpa aru nke omume ogbasaghi m ufodu ndi ana-achi n’eme n’ewetara okwukwe onye nke Kraist.

OKWU NKOWA: Dika ndi nke Chineke, anyi bu obia n’elu uwa n’ihi na o bu Eze anyi Jisos Kraist ka nrube isi diri. Otu osi na di, ebe anyi ka bi n’uwa, anyi niile n’otu n’otu ka nwekwara olu anyi kwesiri ilu dika ndi anaachi achi ime ka obodo anyi na-aga n’iru n’agbanyeghi ebe obula anyi hutara onwe anyi. Onye nweanyi Jisos Kraist edebegoro anyi nzoukwu ilere anya ma n’okwu ma n’omume bu oke n’olu diri anyi dika ndi a naachi achi. Jisos kraist kwuru ugwo utu isi nke Ya, ma nyekwa ndumodu ka anyi n’eme otua. Ozokwa onye ozi pita nyekara ndumodu ka madu obula ghara ita ahuhu dika onye n’emebi iwu.

 



IHE OMUME

  1. Kedu ka i g’esi kowa oke n’olu diri ndi ana-achi achi dika odi n’ebe anyi guru taa? Lekwuo anya na Mk 12:13-17
  • Dika ndi otu Kraist, gini bu ihe nmuta anyi ga eweputa n’ ebe ndia Matiul7:24-27;NdiRoml3:l-7-lpita4:15?
  • Kpoputa ma kparita uka banyere ufodu uzo di iche iche ndi otu Kraist na ndi na ndi isi ochichi kwesiri iluko olu onu maka iweta odi nma, udo naoganirunke obodo anyi? Ndi Rom 13:17-10,1 pita4:14-17
  • Kpoputa ihe ojoo omume ndi n’enwetara onye otu Kraist obula na kwa ndi otu Kraist nile; omume dika, ida iwu okporo uzo, inye na mara aka azu, iji akwukwo ikikere nke ndi nwuru anwu nakwa nke adigboroja n’ aru olu n! uno olu, iji mkpisi ode ezuru ego n’ ulo olu, I no n’ otu nzuzo; izu ori ule akwukwo, ime magomago ndorondoro ochichi na ihe ndi ozo nyiri ya. Odi nke obula metutara gi? Gini kwa ka I g’eme ugbua imara ihe akwukwo kwuru banyere ihe ndia nile.

 



OKWU NCHIKOTA: Dika ndi otu Kraist, anyi ekwesighi ibu ndi aga awude dika ndi dara iwu n’ achi obodo, ma obu dika ndi n’akwado ndi na-ada iwu n’ uzo obula ma obu ime omume dika ogwumagala. Dika ndi otu Kraist, chetakwa na anyi bu “Ihe” na “Nnu” nk’uwa. Ilu olu diri anyi dika ndi ezi ndi ana achi achi g’eme ka ezi akparamagwa anyi chakee dika owa ma si otua nwetakwa oga n’ iru na ito eto nke obodo anyi

OKWU NKE NTUGHARIUCHE: Onye nke Kraist obula choro ibi n’ ulo eji ugegbe luo, ekwesighi itu nkume.

AMAOKWU IBU N’UCHE: I pita 4:15

 



2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

Study 40 October 2, 2022 – IHE OMUMU NKE IRI ANO

Sonde nke iri na isii ka Tirinti Gasiri         Oktoba 2, 2022

ISIOKWU NCHIKOTA Onyenweanyi Chineke na ochichi nke udo.

NKEBI ISIOKWU: Ihe n egosi ochichi

(i)Isiokwu N’ weda onwe N’ ala

EBE N AGAAGU: 2 Ihe Emere 34:26-33

EBUM N’ OBI IHE OMUMUA

  1. Ka akuziere anyi na ndi ndu nk’uwa bu nani ndi egwuzobere site na ntuzi aka nke Chineke di ukwu onye nke puru ime ihe nile.
  2. Ka akuziere anyi na nweda onwe n’ ala n’ okpuru itu egwu nke Chineke bu ihe n’ egosi akara ezi omume nakwa ochichi ziri ezi.

 



OKWU NKOWA: Madu inwe akara njirimara di elu di iche iche nke ndua aputaghi na onye di otu a kachasi ndi ozo uku ma obu baa uru. Madu nwere ike ito ogologo ma obu buo ibu karia ka odi na mbu. Ufodu ndi na na achi achi n’ obodo anyi taa na eche na obu site nani na nmeri ha nwetara na ntuli aka ndorodoro ochichi ka ha g’esi nweta ihe aturu anya na – aka ha maka iweta ezi ochichi na oga n’ iru nye ndi ha na-achi.

I nwe egwu Chineke na nweda onwe n’ ala nakwa unwe obi ige nti ndumodu na ntuzi aka nke Chineke nke puru ime Ihe nile bu, nani uzo aga esi nweta udo, idi n’ otu nakwa ezi ochichi N’ ime otutu ndi eze chiri ochichi n’ oge gara aga n’ ime akwukwo Nso, ma n’ ugwu ma na ndida, obu nani ochichi nke Eze Josia chiri, bu nke kachasi nma. N’ otu aka ahu, Eze Nineve bukwa eze ozo chiri ezi ochichi, Jona 3:6-10, n’ ihi na ogere nti ma nabata kwa ozi Chineke ziri ya site n’ aka onye amuma Huida na Jona. Eze na ndi o na- achi chegharikwara ma mbere ndi amuma isi, bu nke nwetara ha nbuli elu na ogan’ iru.

 



IHE OMUME

  1. Site n’ okwu nkowa na n’ ebe anyi guru taa, – kowa ka nweda onwe n’ ala like onye ochichi g’esi nweta udo, onu nye ndi o na achi nakwa n’ obodo yanile? Lee anyanaEsta 8:3-8; 4:1115-16, Jona3:10
  2. Kedu ihe ighotara na-ahiri okwu bu” Na raadu nwere aku n1 uba, burakwa onye ana-anu aha ya, o putaghi na onyeahu kariri ndi ozo ukwu kama, idi ukwu nke-mmadu bu nani n’ onwe ya” Nwere Jon 3:5- 9 na Jon 3:28 kparita uka maka okwu a.
  3. Guo matiu 3:13-15 ma kowa ihe nmuta ndi nke kraist kwesiri inwe site na akparamagwa Josia bu ezee na-achi Nineve nakwa Jon Baptist nakwa Jisos kraist
  • Kedu ka ndi ndu na ndi na- achi ugbua n’ ogogo di iche iche si emeso okwu Chineke na ndumodu nke Chineke n’ obodo anyi taa? Matiu 14:3-4

 



OKWU NCHIKOTA Nganga, na n buli onwe elu bu ihe juputara n1 ime ndu otutu ndi ndu na ndi ana-achi n1 obodo, na ime ulo uka ma obu n’ ebe ozo di iche iche. Josia bu onye kpebiri n’ ime obi ya na ya onwe ya ga efe nani Chineke nke Nna ya ochie bu David ka oga-efe ofufe. Site na mgbe di otua ka ochichi nke Eze Josia jiri buru nke kachasi mma karia ochichi ndi eze ndi ozo n1 obodo Izrel nile ma n’ ugwu ma ndida.

OKWU NKE NTUGHARIUCHE: Ezi n’ weda onwe n’ ala abughi iji nwanyo na- aga n’ okporo uzo ma obu iche echiche na I pere npe ka ma oputara madu ihuta onwe ya mgbe nile dika onye na-abughi ihe obula ma enwe zuga Chineke”

AMAOKWU IBU N’ UCHE Jemes 4:6 “ya mere Chineke n’ edo onwe ya n’ usoro iniegide ndi npako, ma ndi di umeala n’ obi ka O na enyeAmara

 

 



2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

 

Study 41 October 9, 2022 – IHE OMUMU NKE IRIANO NA OTU

Sonde nke iri na – asaa ka Tirinity Gasiri                    Oktoba 9,2022

ISIOKWU NCHIKOTA: Onye nweanyi Chineke na ochichi nke udo.

NKEBI ISIOKWU: IHE N’ EGOSI OCHICHI ZIRIEZI (2)

ISIOKWU Ihunanya

EBEAGAAGU: 1 Sam 30:1-20

EBU M N’ OBI IHE OMUMUA:

  1. Ka akowaputa olu ihunanya n’ alu na ndu ndi na- achi ezi ochichi 2.Ka ekpughepu ihe ojoo nke akparamagwa nke enweghi ihunanya.

 



OKWU NKOWA: Ebe anyi guru taa gosiri anyi ihe ihunanaya nke David nwere luputara nye ndi agha kariri puku Nari isii n’ onu ogugu, ya na obodo Ziklag nile n1 ihi ndoro nagha adoro ezi n’ ulo Devid, nakwa ebe ndi ona-achi. Ebe anyi guru kowakwara omume n’ enweghi ihunanaya nke ndi Amelek mere site n’ igbahapu ndi agha ha_ bu ndi emeruru aru n’ agha. Otutu mba di iche iche taa na-ata nnukwu ahuhu n’ ihi enweghi ezi onodu nchekwa, itoro ma obu gbuo madu n’ uzo, di nakwa ike ojoo ndi “Boko Haram” na ndiomekome n’akpa n’ obodo di iche iche.

Ihe ndia nile n’ erne nke ndi enweghi ezi nrnetuta akon’uche nke ndi na-achi achi n’ ebe ndi ana- achi no n’ ihi ihe ngbu ha. Okwu Chineke kwuru na Ilu 16:12 ” na ihe am n’ anya Jehova ka ndi eze n’ erne ajo omume bu; n’ ihi na obu n’ ezi omume ka eguzobere oche eze nile.” Ihe omumu nke taa g’ enyere anyi aka imara nkpa odi ka ndi na achi nwee ihunanya n’ ebe ndi ha na achi.

 



IHE OMUME

  1. Tulee udi akparamagwa Devid kpara na I Sam 30:3-4, ma kowa ihunanaya onwere n’ ebe ndi nke ya no. Nwere ya tuny ere omume ndi na-achi ochichi ugbu a. Enwere ike ihuta ndi ndu nke n’ enwe obi etiwara etiwa nye ndi ha n’ edu?

2. Kedu ka akparamagwa nke ihunanya n’ adighi n’ ime ya na ndu ndi na achi jiri buru ogbatuhie na ihe ima n’ onya nye ndi ha na-achi? ISam 30:13-16 Nwere ya tuny ere onodu enweghi udo nakwa igbu madu nke ndi omekome na ndi “Boko Haram” di n’ obodo anyi bu nke n’ egosiputa enweghi ihunanaya.

  1. Kedu ka ihunanaya g’ esi bum ezi akparamagwa eji ewuli mba elu? 2Sam 8:14-18; Ipita4:8-10
  2. Daniel bu onye ndu n’ ala nabughi nke aka ya. Kedu ihe ighotara na akparamagwa ya nye ndi o n’ edu? Dan 9:1-3, 16-19 Nwere akaramagwa ya tunyere omume ufodu ndi ndu n’ ulo olu di iche iche n ogbo anyi taa.

 



OKWU NCHIKOTA: Uzo di mfe eji amara onye ochichi nke bu ajo madubu site n’ egosi putaghi nmetuta onwere banyere ihe ngbu nke ndi o nachi nwere. Otu odi, ezi onye ndu bu onye n agba si mbo ike maka odi mma ndi o na —achi

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: Chineke bu ihunanaya. Ya mere ezi ndi ochichi aghaghi ichi ochichi n’ ihunanaya.

AMAOKWU IBU N UCHE: Ilu 16:12 “Ihe aru na anya Jehova ka ajo omume nke ndi eze bu, n’ihi na obu n’ ezi omume ka eguzobere oche -eze obula.

 



2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

Study 42, October 16, 2022 – IHE OMUMU NKE IRI ANO NA ABUO

Sonde nke iri na-asato ka Tiriniti Gasiri                            Oktoba 16,2022

ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenwanyi Chinke na ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: The N’ egosi Ezi ochichi (3)

Isiokwu: ikpe ziri Ezi

EBE AGAAGU: 1 Ndi Ezi 3:16-28

EBUM N’ OBI IHE OMUMUA

1 .Ka achoputa ihe Akwukwo Nso kwuru maka onodu ikpe ziri ezi 2.Ka akowaputa oghom di n’ ochichi mbenukwu nye ndi ana-achi- achi.

 



NKOWA OKWU: “Equity” putara akara omume ikpeziri ezi nke ile madu anya n’ iru na adighi n’ ime ya. obu ihe igba anya mmiri na ogbo anyi no n’ inie ya taa bu ogbo juputara na nmegbu di iche iche n’ ihi agburu ma obu ebe onye si puta dika osi metuta, ikpe ziri ezi nyere madu n1 okwa ochichi di elu, ike oke akunuba di iche iche na inye ndi a na-achi achi nchekwa.

Obu nani ndi ogbenye na ndi onodu ha di ala n’ obodo bu ndi ana emekpa nnukwu ara karia otu odi, ebe anyi guru taa gosiri anyi ufodu ndi chiri ochichi N’akwukwo Nso bu ndi chiri ezu ochichi nke ikpe nkwumoto di n’ime ya. Apuru ihuta ndi ndu n’uwa taa bu ndi nwere ike inabata nrube isi na nweda onwe n’ala nke onye mba ozo karia nganga na nnupu isi nke eze nwanyi obodo ahu? Anyi nwekwara ike ihuta taa cnye ochichi nke nwere ike ihoro ma kpee ikpe ziri ezi nye onye nche dika ezigbo enyi? Ihe omume ga’eme ka anyi nwe ihe nke eziokwu.

 



IHE OMUME

l.Gini bu “Equity” n’uche gi? Kedu ka I g’esi kowa ya site n’ebe anyi gurutaa?

  1. Ka anyi nyocha Esta 6:10 nkeoma ma kowa nkwughachi ezi omume ziri ezi nke Eze Ahasueros kwughachiri Modekai bu nke megudere Ihunanya Eze nwere n’ebe Haman no. nwere Haman dika onye no n’onodu Osote Govano nakwa Modekai dika onye n’eche nche n’ebe Govano bi wee tunyere ufodu ikpe di iche iche ndi ndu anyi n’ekpe n’obodo anyi taa.
  2. Nyochaputa nkeoma akparamagwa nke Pita na Ndi Gal. 2:11-13 na kwuo uche gi banyere nnukwu Ikpa oke di taa na-agburu di iche iche n’obodo anyi

4a. N’obodo ebe obu nani otu agburu bu ihe a na enye okwa di elu kpoputa ma kowa onodo Esta bu Ezenwanyi adotara n’agha dika onye tozuru inochi onodu Ezenwanyi Vasiti bu onye amuru n’obodo ahu.

4b. Kedu ka inwe onu na onye n’etozughi etozu no n’okwa di elu karia onye tozuru etozu ji akwada ogan’iru nke obodo?

OKWU NCHIKOTA: N’ilegara anya na nmegbu di iche iche, ahuhu, onodu enweghi Ikpeziri ezi, inapu madu ikikere onwere ikwuokwu na iga ije, na iji ndi uwe agha na ndi uweoji ala ndu ndi ogbenye n’iyi, enweghi onodu ahuike na nmegbu a n’emegbu ndi otu Kraist, na onodu tigbuo zogbuo juputara n’obodo anyi taa, na onodu ojo ndi ozo na’agba anya nmiri bu nke kwesiri ka elebere anya ka udo na nwere onwe, ike ziri ezi nakwa ihunanya wee di n’obodo anyi. O bu nani n’ebe Chineke no ka olilanya anyi di n’ihi na obu nani yapuru iguzobe onye ezi omume n’ochichi bu onye nwere obi umeala ma n’ekpekwa ikpe ziri ezi.

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: Ezi olu na ikpe, ikpe ziri ezi mgbe obula, opuru ibu ihe ngbakwasi ukwu ga n’edu gi ma oburu na akpolite gi n’okwa di elu nke ochichi?

AMAOKWU IBU N’UCHE Ndi Eze 3:25

 

2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

Study 43 October 23, 2022 – IHE OMUMU NKE IRIANO NA ATO

Sonde nke iri na iteghete ka Trinity Gasiri                                              Oktoba, 23,2022

ISIOKWU NCHIKOTA: Onye Nweany i Chineke na Ochichi nke udo.

NKEBI ISIOKWU: Ihe n’egosi Ezi Ochichi (4)

ISIOKWU: Inwe Nmetuta nye Onodu Nke mmadu.

EBE AGAAGU: Dan. 6:14-27

EBUM N’OBI IHE OMUMU A:

i.  Ka akowa inwe nmetuta nye odou nke madu dika akara ezi omunie di nkpan’ime ndu onye Chineke roputara ichi ochichi

ii. Ka akowaputa urn inwe nmetuta bara nye ndi na achi ochichi nakwa na ndi a na-achi. Ezi olu na ikpe ikpe ziri ezi mgbe obula apuru ibu ihe ngbakwasi ukwu ga n’edu gi ma oburu na akpolite gi n’okwa di elu nke ochichi?

OKWU NKOWA: Uzo ochichi ka mma bu ndi na-achi igosiputa mgbe nile onodu nmetuta ha nwere nye ndi ha na-achi n’ime nsogbu ha nile. Okwua bu “empathy” putara madu inwe nghota na nmetuta nye onodu madu ibe ya. Na akuku nke ozo, O putara madu igosiputa, nwute onwere ma obu ino onodu ka aga-asi na obu ya onwe ya ka ihe dakwasiri. Obu na Eze Darios gosiputara nwute onwere n’ihi onodu Daniel. Nkea mere ojiri bulie n’isi ututu wee gaa n’onu olulu odum ebe atugbunyere Daniel wee jua maka odi nma ya. N’otu aka ahu, Jisos gosiputa-kwara onodu di otua site n’ibe akwa nke ukwu n’ulo enyi Ya bu Lazaros. Anyi nwere ike ichota omume di otua n’ebe ndi na-achi anyi taa n’obodo anyi no?



IHE OMUME?

  1. Site n’ebe anyi guru, taa kowa okwua bu “inye nmetuta obi ebere” Nwere ya tinyere Ndi Rom. 12:15

Nkpokota akara ezi onye ochichi bu omume ya nile nke gosiputara n’ezi nwute onwere nye onodu ojoo nile nke ndi ona-achi” Nwere Dan. 6:14, 18-20; Jon 11:35-36 kparita uka maka nkea. Kedu ka nid na achi ochichi g’esi gosiputa onwe ha n’onodu ndi nsogbu dakwasiri
n’obodo ebe ndi ndu ha na aga Ala bekee maka aru ike ha, ma obu ziga nani umu ha Ala bekee maka Agumaakwukwo puru iche ma obu n’egosi enweghi nmetuta n’ihi ghafu obara nke ndi a na-achi.

  1. Kowa o nyiri akparamagwa inwe nmetuta nke Eze Darios kapara dika nke nyiri akparamagwainwe nmetuta nke Eze Darios kapra dika nke nyiri akapra magwa nke Jisos na ndi neso uzo ya dika odi na matiu 14:14-15
  2. Kedu ka ndi na-achi ochi ochi taa si egosiputa onodu inwe nmetuta we nwere n’ebe ndi ha na-achi no Matt. 7:12, Luke 6:35, Lk 10:25-37, Ndi Rom. 15:1.

 



OKWU NCHIKOTA: Obu nani mgbe anyi nwere ndi ndu ma obu ndi

na-achi ochichi g’ejiri anya mmiri ha gosiputa ezi nwute ha nwere banyere nghafu obara umu mmadu; nani mgbe anyi nwere ezi ndi ochichi ga edozighari ulo ogwu ahuike nile mebiri emebi n’ala anyi; Nani mgbe enwere ndi a ezi ochichi mara na igba abuboru joro njo n’ebe ulo ukwu na ahu maka agumakwukwo umu ha; Nana mgbe anyi nwere ndi ezi ochichi bu ndi mara ka osi joo njo nke uku madu ida ada mberede n’ime uno ulo penshion; obu nani mgbe onodu ojoo ndia nile bu ihe agbanwere ka umu madu geji nwee onu na obi uto. Anyi na-ario ka Chineke onye puru ime ihe nine, ka o mee ka ndi nile na-achi anyi buru ndi n’enwe ezi nmetuta nye onodu di iche iche nke ndi ha na-achi na aha Jisos Amin.

OKWU NKE NTUGHARIUCHE: Nkpokota akara ezi onye ochichi bu omume ya nile nke ogosiputara n’ezi nwute onwere banyere onodu ojoo nile nke ndi ona-achi no n’ime ya.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ndi Rom 12:15 N’esonu ndi na-aghuri n’ighuri oghu, n’esonu ndi na akwa akwa n’ikwa akwa”

 

2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

 Study 44 October 30, 2022 – IHE OMUMU NKE IRI ANO NA ANO

Sonde nke oru ka Triniti Gasiri                                         Oktoba 30,2022

Isiokwu Nchikota: Onyenweanyi Chineke na Ochichi nke udo.

NKEBI ISIOKWU: Ihe negosi ezi ochichi (5)

ISIOKWU: Akara omume N’egosi Nsopuru Na Izu oke

EBE AGAAGU JOB 2:1 -10

EBUM N’OBI IHE OMUMU A:

i    ka akowa inwe akara omume Nsopuru na izuoke dika odi na akwukwo nso.

ii.  Ka akowaputa ya nkeoma bu ogogo di iche iche ndi ndu si egosiputa akara omume izu oke na nsopuru na nwere.

iii. Ka akuziere anyi udiri akara izu oke na nsopuru ndi nke Krais naghaghi ime n’onodu ha dika ndi ndu.

OKWU NKOWA: Nkpuru okwu a bu “Integriti” putara “Inwe akara ikwu ezi okwu na ukpuru siri ike nkeobibi ndu nke imemmo. Enwere ike kowa ya dika usoro obibi ndu ziri ezi nke madu, bu nke n’egosi nrubeisi zuruoke”. N’ebe anyi guru taa, Job gosiputara ogogo nke izuoke n’omumue ya nye Chineke site n’egeghi nti ndumodu n’ezighi ezi nke nwunye ya nyere ya. obu ihe ngbawa obi taa, na me ihere, na otutu ndi ochiochi n’obodo anyi taa bu ndi na-adighi emezu nkwa ha kwere mgbe ha na-achu ntoa nroputa ganye na ha achisia ochichi. Obu ihe igba anya mmiri inu na ndi na achi anyi ga-amaputa ego burn ibu kwa aro nye onodu agumaakwukwo, na odinma ahu ike nke ndi ana achi achi nakwa idozi uno olu naluputa akurungwa eji enyere ndu aka, emesia “agwo” ma obu “oke” elo ego ndia nile. Ihe omumu taa g’ eleba anya n’ihe ndia nile.

IHE OMUME

  • Kowa okwu abu “integrity” dika odi na Job. 2:3, Kedu ka I gesi kowa onodu ikwudosi ike na mmuo nke Job gosiputara Job2:9-10?
  • Kowaputa nkeoma onodu ikwudosi ike na mmuo dika Pol nyere Taitos ndumodu na Taitos 2:7-8
  • Nwere ISam. 17:25 tunyere ISam. 18:17-19 nwe tulee onodu ikwudosi ike na mmo nke Eze Sol, kpoputa ufodu nkwa eme-eme nke ndi ndu anyi n’ogogo ochichi di iche iche n’ekwe taa.

4 Gini kwesiri ibu ihe ngbado ukwu nke ndi nke Kraist nye ndi ndu ha ma obu ndi no n’okwa ochichi di elu? Ilu 28:6; Matiu 5:37; Olu Ndi ozi5:29’Kolosi3:17.

OKWU NCHIKOTA Chineke anyi adighi ekwe nkwa ma ghara imezu nkwa ya nye ndi nke ya. Ya onwe ya n’ele anya ihu ndi ochichi na atu egwu ya, ndi ochichi dika obi ya choro n’ogogo di iche iche mana na nzuko Kraist, ma na obodo, ma n’ulo akwukwo, na n’ebe ndi ozo. Mba obula ma obu obodo obula choro, onu, udo, oganiru nakwa ito eto nke akunuba ha, ga enwe ndi ndu nke natu egwu Chinekem ndi akara omume ha zura oke, ma nwekwa nsopuru.

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: Ndi ndu ma obu ndi ochichi obula n’ekwu okwu ugha nye ndi ha na achi na-akwatu akara ezi omume na ugwu na nsopuru ha nwere.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ilu 28:6 “O dinma ibu ogbenye nke n’eje ije n’uzuoke nke ezi omume ya, karia ibu onye nzuzu nke gbagoro agbago n’okwu nile nke onu ya”

 

2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

Study 45, November 6 2022 – IHE OMUMU NKE IRI ANO NA ISE (45)

Sonde nke mb u Tutu Advent Erue               Novemba 6,2022

ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi Chineke na ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Ihe n’egosi Ezi ochiochi (5)

ISIOKWU: UDO

EBE AGAAGU: Ndi Eze 4:20-24

EBUM N’OBI IHE OMUMU A:

  1. Ka emetusia aka ihe nile di nkpa maka mbikorita nke udo na obodo anyi taa.
  2. Ka akuzie nke oma ihe ngbado ukwu nk’udo nye mba uwa dika odi n’ usoro obibi ndunke Kraist.

OKWU NKOWA: Okwu a bu “udo” putara inwe onodu ngbakasi aru na tigbuo na zogbuo na adighi n’ime ya. O putakwara, onodu ndaju nke na adi n’ebe ogu, na agha ma obu nkwali maka agha na-adighi. N’onodu di otua, madu nile nkebikorita onu n’onodu nwere onwe na izu oke nke udo. Ochichi nke Eze Solomon bu ezi ihe Ima-atu bu igba na akwukwo nso, bu nke gosiputara nkeoma na ndi ochiochi obula puru ichi ochichi nke udo n’obodo obula ha na-achi. Otu odi, enwere ufodu akoro ngwa n’enweta ochichi nke udo. Na aka nke ozo, enwekwara otutu ihe nenweta ochichi nchigbu na nke nghafu obara ndiana achi. Gini bu ihe ndian’eme ka enwe ochichi udo taa Azi zaya 2:1 -4; IPita 3:10-11.

IHEOMUME

  1. Kowaputasia izuoke ochichi nke Solomon dika osi metuta, nchekwa ndu ndi ana-achi, ikesa okwa di elu, onodu di elu nakwa aku n’uba obodo nye ndi o na-achi INdi Eze 4:1 -20. Kowa ka omume Solomon mere jiri buru isi sekpu nti nwetara ochichi nke udo ya.
  • Nwere ezi nghota guo INdi Eze 3:11-13. Ma kowaputa nto n’ala Solomon nwere nke nwetara ochichi udo. Site na nchoputa gi, kedu ihe ichere bu ezi ntonala maka mbikorita n’otu n’ochichi obula, ma nwere ya tuneyre ihe n’eme bi ochichi nke udo n’obodo.
  • Kedu ka igesi kowa “udo” nke mba uwa? Kpoputa akuku mba uwa di iche iche ebe agha na ogu din a ihe kpatara agha na ogu ndia. Nwere Aizay a 2:3 kparita uka maka nkea.
  1. Kedu ka ezi omuma Chineke g’esi buru ezi ngwa olu iweta udo na nbikorita n’otu? Ilu 16:7; Aizaya 2:3; Jon 14:27; Ndi Rom 8:31; Pita 3:10-11.

OKWU NCHIKOTA: N’ihi na Ekwensu ka bu onye isi nkuwa, (Nkpughe 12:9) O ga na-aga n’iru n’ime ka udo ghara idi n’uwa nile site n’ikpesu agha n’uzo di iche iche. O bu nani ezi ndi nke Kraist Jisos bu ndi natu egwu Chineke nke puru ime ihe nile bu ndi n’ebi n’udo ma gaa n’iru n’eme ihe g’enweta udo n’uwa. Dika ndi otu Kraist, anyi nwere ihe ima-aka n’iru inogidesike mgbe nile n’ime ihe na akwalite udo na gburu gburu ebe anyi no,

OKWU NKE NTUGHARl UCHE: N’ebe Ekwesu no, obu agha, ma n’ebe Kraist no, obu udo”

AM AOKWUIBU NUCHE: Aizaya 2:4

2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

Study 46 November 13, 2022 – IHE OMUMU NKE IRI ANO NA ISII (46)

Sonde nke abuo tutu Advent Erue                                    November 13, 2022

ISIOKWU NCHIKOTAOnye nweanyi Chineke na ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Ochichi ebighebi nke anyi na Chineke (1)

ISIOKWU: Nlegara Anya Onu ebighebi nke ndi Otu Kraist

EBE AGAAGU: Eklesiastik 1:1-18

EBUMN’OBI IHE OMUMU A

  1. Ka anyi nyocha ma kowa na uwa nile bu ihe efu ii .Ka anyi kowa n’uba, nkpa odi, inwe ntukwasi uche n’ihe di elu, obughi na nkwakoba aku n’uba nke uwa.

OKWU NKOWA: Dika onye oka okwu kwuni “ihe efu” putara efurefu nke ihe igbambo nile nke madu n’uwa nkea. Ihe efu nile nke iche na iweta aku n’uba, aguma akwukwo bu igba, okwa di elu n’uwa, na-aha ukwu di elu n’uwa, na-aha uku di iche iche bu ihe na-avuturu anyi aka dika ndi otu Kraist na uwaa abughi ebe obibi anyi kama n’eluigwe bu ebe anyi na Chineke g’ebi n’onu ebighebi. Obu ihe aru na madu bu ogaranya n’uwaa? Ajuju a na okwu ndi ozo di nkpa ka anyi ga atule n’ihe omumu nke taa.

IHEOMUME

1 Kowa Eld. 1:1-18 nkeoma ma kowa otu uwa nile jiri buru ihe efu. Obu ihe aru madu ikpata aku n’uba na iweta onodu di nman’uwa? Guo Deut.8:18

  • Ginile n’olu nke uwan”? bu “Onye ebighebi” dika odi na Nkpughe 7:16-17 nakwa Nkpughe21:4? Gini bu ihe di iche na “onuebighebi” na “ndogbunile n’olu nke uwa”?
  • Kedu ka ig’esi kowa onodu enweghi nlegara anya n’onu ebighebi nke di n’etiti ndi out Kraist n’ogbo anyi taa? Kwa nkea site okwu Chukwu nke imue nani aku n’uba bu nke anyi na-ahu taa Ndi Rom. 8:5; 16:17- 18; Filipai3:17-19
  • Site n’ebe ndia: Matiu 6:19-20; 19:16-24 Kowa ihehere ndi otu Kraist g’eji tukwasi uche ha n’iwe onu ebighebi karia itukwasi uche n’ihe nk’uwa.

 

OKWU NCHIKOTA: Dika ndi otu Kraist anyi kwesiri inwe nghota na ihe nile di n’uwa a bu nani ihe efu. Nkea g’eme ka anyi rapu ikpado aku na itukwasi uche n’ihe di n’uwa kama, ka anyi tukwasi uche ma kpadowere onwe anyi aku n’eluigwe, bu ebe anyi na Chineke g’enwe onu na udo ebighebi.

 

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: Uwa nkea abughi nkem. Eluigwe bu ebe obibi nkem.

 

AMAOKWUIBU N’UCHE: Ndi Filipai 3:20 N’ihi na ebe obibi anyi di n’eluigwe, ebe anyi n’echesi ike maka nzoputa nke onye nwanyi Jisos Kraist”.

2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

Study 47, November 20, 2022 – IHE OMUMU NKE IRI ANO NA ASAA

Sonde tutu Advent Erue                                                  Novemba 20,2022

ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi na Ochichi Nke Udo.

NKEBI ISIOKWU: Ochichi Ebighebi nke anyi na Chineke (2)

ISIOKWU: Ikpogide onwe N’obe Na Nchekwa onwe nkeoma.

EBEAGAAGU: NdiRom. 6:1-9

EBUM N’OBI IHE OMUMU A:

  1. Ka akowa ihe ikpogide onwe n’obe putara
  2. Ka akowa ihe di iche n’etiti ibi ndu na anu aru na ibi ndu n’ime Kraist

iii.Ka ekpughe uru di na ikpogide onwe n’obe nye ochichi ebighebi anyi na Chineke

OKWU NKOWA: N’ime ka ochichi ebighebi nke anyi na Chineke guzosie ike, ndi otu Kraist kwere ekwe aghahi ime ka ochicho nke anu aru ha nwuo pii. “Ikpogide onwe n’obe” putara inye aru anyi ezi nchekwa pua n’usoro obibi ndu nmehie, Obu usoro ibi ndu nke odighi onye ozo na asi gi si n’ihe ojoo nwezuga onwegi. Igeji onwe gi huta ndpronagha nke nmehie dooro anu ana nwere onwe di ebube bu nke di ni ibi ndu dika Kraist sicho (Ndi Gal 2:20).

IHEQMUME:

  1. Kedu ka igesi kowa “ikpogide onwe n’obe” dika odi na Ndi Rom. 6:6- 8; 12-13?
  • Dika odi na Ndi Rom. 6:3-4, Kedu kaigesi kowa Baptizim nke ndiotu Kraist nye onye nekweghi ekwe?
  • Kedu ihe “Ndu ohuu n’ime Kraist” putara dika odi na Ndi Gal. 2:20; Taitos 2; 13-14 na 1 Pita 4:1-4, kowa ihe di iche di netiti “ibi ndu n’ime Kraist” na “ibi ndu na-anu aru” Ndi Gal. 5:24
  • Kedu uru “ikpogide onwe” bara nye ochichi ebighebi nke anyi, na Chineke? Nkpughe 21:7-8; 22:14-15

OKWU NCHIKOTA: Dika ndi Otu Kraist, anyi kwesiri iriosi Amara Chineke Ike ya na Ike nke eji ebi ndu megide usoro obibi ndu dika anu anu si cho site n’inyefe onwe anyi kpam kpam ni ibi ndu ezi omume n’ime Kraist Jisos. Nkea g’eme ka.nyi ga n’iru ihu nkpa odi anyi na Chineke ichi ochichi ebighebi.

 

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: Nyefe onwe na aka nmehie Sa na-agbu ebighebi, mana nyefe onwe n’ime Jisos Kraist n’eduba na nwere onwe ebighebi.

 

AMAOKWU IBU N’UCHE Ndi Rom. 6:6 Ma mara nkea, na alpogMekowo aru madu ochie anyi na Kraist n’obe kaenwemee kaaru nke fmehie^na-achighara idi ire ozoka anyl wee ghara ibu oru nke nmehie ozo”.

 

2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

Study 48 November 27, 2022 – IHE OMUMU NKE IRI ANO NA ASATO

Sonde nke akporo Advent Sonde                            Novemba 27,2022

ISIOKWU NCHIKOTA Onyenweanyi Chineke na ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Ochichi ebighebi nke anyi na Chineke (3)

ISIOKWU: Olu nke ibu onye n’eso uzo

EBE AGAAGU Matiu 28:18-20

EBUM N;OBI IHE OMUMU A:

  1. Ka akowara anyi ihe “Ibu onye n’eso uzo” putara n’ime Akwukwo Nso.

ii Ka akparita uka banyere onodo ibu onye n’eso uzo nke kwesiri ntukwasiobi

iii.Ka akpoputa ihe oghom din a apughi onye n’eso uzo.

OKWU NKOWA: Anyi n’ekele Chineke n’ihi uka nke akporo “Uka Advent” nke bu nmalite usoro okpukpe nke ndi otu Kraist. Oge Avent bu mgbe anyi atughari uche nke uku ma obibia nke ugbo abuo nke Kraist bu nke o ga ano n’ime yak pee uwa nile ikpe na si otu a nmalite ichi ochichi ebighebi ya dika Eze ndi Eze nile, na Onyenwenu Kachasi ndi nwenu nile. Ochichi ya agaghi adi ka ochich nke ndi uwa n’ihi na “N’ubochi ochichi y anile ka og’eme eziomume ya ka omubaa nkeoma; udo ya nke ya ga-abakwa uba dika owa na adigide?. (Abuoma 72:7 KJV) ya mere dika anyi n’ejikere izute Chineke maka ochichi ebighebi nke anyi na Chineke ga-achi, obu ihe di oke nkpa ka anyi mee ka ala eze Chineke mubanye na nkpuru obi site n’ilu onye ezi onye nke n’eso uzo. Okpukpo oku ije ozi di uku nke Onyenweanyi Jisos Kraist kporo ndi nile kwene na-aha ya bu ka ha nile gaa n’uwa ime ka otutu madu buru ndi n’eso uzo ya.

Kedu ka anyi g’esi mee ka ndi ozo buru ndi n’eso uzo nke Kraist ka enwe mee ka Ala Eze nke Chineke juputa na madu?

IHEOMUME

1 .Kowa okwua bu “ibu onye n’eso uzo” dika o din a Matiu 28:1920; Olu Ndi Ozi 2:41

  • Site nankowadi naLuk 19:1-10; Olu Ndi Ozi 9:26-27, Keduka anyi g’esi mee ka ndi nmehie buru ndi n’eso uzo nke Kraist n’ebe anyi bi? Kpoputa ntarama ahuhu di na nnupu isi ime ka ndi ozo buru ndi n’eso uzo nke Kraist dika odi na Matiu 10:3 3; Mk. 8:3 8; 2tim .2:12?
  • Kedu ihe bu onodu n’egosi ikwesi ntukwasi obi n’ime ka ndi ozo buru ndi n’ eso uzo nke Kraist dika odi na Matiu 16:24; Lk 14:26; Jon 8:31 4.Gini bu ugwu olu di ebighebi nye kwesi ntukwasi obi n’ime ka ndi ozo buru ndi neso uzo nke Kraist? Matt. 10:32; Luk 15:10; Nkpughe 14:3-5

 

OKWU NCHIKOTA Okwu a nke Jisos Kraist kwuru si “Onye obula nke ga-agonarim n’elu uwa, ya ka mu onwein ga-agonari n’iru nnam nke bi n’eluigwe” putara na onye obula nke hapuru igbasa ozioma maka irite nkpuru obi n’uru nye Ala-eze Chineke, onye ahu agaghi esoro n’ochichi ebighebi nke anyi na Chineke. Ya mere, ka anyi bilie ugbua ga me ndi ozo ka ha buru ndi n’ eso uzo nke Kraist.

 

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: Oghu na adi n’eluigwe n’isi otu onye nmehie obula chegharikutere Chineke.

 

AMAOKWU IBU N’UCHE Luk 15:10 “N’otu aka ahu, A sim unu, na oghu na-adi n’iru ndi moo ozi nke chineke n’ebe otu onye nmehie obula chegharikutere Chineke no”.

 

2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

Study 29 December 4, 2022 – IHE OMUMU NKE IRI ANO NA ITEGHETE

Sonde nke abuo n’ime Advent                                          Decemba 4, 2022

ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi Chineke na ochichi nke udo.

NKEBI ISIOKWU: Ochichi ebighebi nke anyi na Chineke

ISIOKWU: Obibi ndu nke ichu Aja

EBEAGAAGULuk, 10:25-37

EBUM N’OBI IHE OMUMU A:

i. Ka akuzie na inye onyinye bu oke n’olu anyi maka inye Ala-Eze ebighebi

ii. Ka akowaputa oghom din a akparamagwa nke n’enweghi ngosiputa ihunanaya Chineke n’etiti ndi nke Kraist.

OKWU NKOWA: Obibi ndu nke ichuaja bu ndu juputara n’inyere ndi ogbenye na ndi uwa na-atu n’onu aka n’ime nkpa ha. Ebe anyi guru taa n’egosi na Chineke nabatara omume inyere ndi ihe n’esirike aka. Anyi hutakwara ahuhu n’esochi ndi nadighi enyere ndi ogbenye aka. Akwkukwo Nso kowaputara nkeoma na anyi n’enwe ndi ogbenye na ndi ihe n’esiri ike mgbe nile. Ilekota ndi di otu a anya nke oma di ezigbo nkpa maka ochichi ebighebi nke anyi na Kraist (Mtt. 25:34-36)

IHE OMUME

  1. Tugharia uche n’ebe anyi guru taa ma kowa nkeoma isi okwu a bu “Obibi ndu nke ichu aja”

2.Kedu ka ndi otu Kraist si egosiputa akparamagwa inyere mmadu ibe ha aka n’ogbo anyi taa (ma oburu na ha n’eme ya?) nwere akuko maka Lazaros na Onye Ogaranya di na Lk. 16:20-21 wee maatu.

  1. Kedu ka ndi otu nzuko nke onweanyi ma obu ogbako anyi taa g’esi luo olu inyere ndi otu anyi bu ogbenye na ndi uwa na am n’onu aka? Guo Deut. 15:7-Una Olu Ndi Ozi 4:32-37.

4.Kedu ntaramahuhu n’echere ndi n’eleli ije ozi nke inyere ndi ogbenye aka anya? Matiu 25:41 -46

 

OKWU NCHIKOTANdi ogbenye na ndi uwa na-atu n’onu ga-anoriri n’etiti anyi mgbe ebighebi. Ikwesi ntukwasi obi anyi n’inyere ndi no na nkpa na ndiogbenye aka dika ike anyi ra g’enwetara anyi iru oma nke Chineke ma mekwaa ka anyi na Chineke chia ochichi ebighebi.

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: Chineke a gaghi agbadata inyere madu aka, kama o nejiri madu dikagi kwara ngwolu ime nkea!!!

 

AMAOKWUIBU N’UCHE Deut. 15:11 “N’ihi na ndi ogbenye agaghi agwu kpam kpam n’ala unu; ya mere m ji nye unu iwu si “Ighaghi igbasapu aka nke uku nye umunne gi, nyekwa ndi ogbenye na ndi no na nkpa n’ala unu nile”.

 

2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

Study 50 December 11, 2022 – IHE OMUMU NKE IRI ISE (50)

Sonde nke ato n’ime Advent         Decemba 11, 2022

ISIOKWU NCHIKOTA:  Onyenweanyi Chineke na ochichi nke udo.

NKEBI ISIOKWU:  Ochichi Ebighebi nke anyi na Chineke (1)

ISIOKWU:  Obibi Ebighebi nke anyi na Chineke (1)

ISIOKWU: Obibi ugwu nke Nkpuru obi

EBE AGAAGU: Ndi Rom. 2:26-29

EBUM N’OBI IHE OMUMU A

i. Kaanyichoputamkpamkpuruobidin’arumadu

ii. Ka akuzie ihe bu obibi ugwu nke nkpuru obi

iii. Ka akowaputa nkpa obibi nkpuru obi ugwu di nye ukpuru obibi ndu ziri ezi nke anyi

OKWU NKOWA Nkpuru obi madu bu isi sekpu nti madu ji adi ndu n’ihi na obu site na nkpuru obi nke madu ka obara si aputa ma gazuo akuku aru n’ile nke mmadu. Dika nkpuru obi ji di nkpa nye aru madu, otu a ka nkpuru obi jikwa di nkpa nye ndu ime mmo anyi dika ndi otu Kraist. Obibi ugwu nke nkpuru obi putara nsacha kpam kpam puo na nmehie na kwa n’echiche ojoo nile ma nwe nwogha nke echiche nke obi na ako n’uche anyi bu nke sitere n’omuma na nnabata Jisos Kraist n’ime ndu anyi. Ndi Rom 12:1-2. Nkea bu ihe a na-atu anya n’aka onye obula ma burukwa iwu na-anyi g’enweriri obibi ugwu nke nkpuru obi ma oburu na anyi na Chineke ga achi ochichi ebighebi.

IHEOMUME

  1. Site n’ebe anyi guru taa, kowa ihe obibi ugwu nke nkpuru obi putara nye onye Juu nakwa ihe obibi nke ime mmo putara dika ndi nke Kraist. Tulee Jer. 4:3-4; Ndi Rom. 12:1-2

2. Enwere ihe dika :obi luruiyi” ma obu “obi di ocha” Mk. 7:20-23; Olu NdiOzi5:3 4; NdiFilipai4:8.

3. Kedu nkpa obibi ugwu nke nkpuru obi anyi din ye ochichi ebighebi nke anyi na Chineke? Abuoma 24:3-5; Matt 5:8; James 4:8; Nkpughe 21:27.

  1. Legara anya n’ahiri okwu a nke anyi na-agu n’ime oge lenti” Dowanu obi unu, adowakwala uwe unu”. Kowa nkebi ahiriokwu a dika odi na Joel2:12-13.

 

OKWU NCHIKOTA: Onye nke Kraist obula nke nwere ezi ebum n;obi iketa alaeze Chineke n’oge ikpeazu, aghaghi igbasi mbo ike ka ebie nkpuru obi ya ugwu nke ime mmoo ka onwe nwee ike isoro n’ochichi ebighebi nke Chineke. Onye ahu agaghi adabere nani na obibi ugwu nke anu aru onwere bu nke negosi akara ogbugba ndu anyi na Chineke nwere bu nke na akwusi akwusi.

 

OKWU NKE NTUGHARIUCHE: Ura gini ka o ga-abara gi ma inwe nsacha na obibi ugwu nke anu aru ma inweghi nsacha na obibi ugwu nke mmoo?

 

AMAOKWUIBU N’UCHE Ndi Rom. 12:2 “Ma ekwela ka unu nyie ajo oge a, kama kwee ka agbawo gi site na nwogha nke ako n’uche gi ka iwe mara ihe di Chineke ezi nma nke a na-anara nkeoma bu nke zukwara oke nke dika uche “Chineke si di”

2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

 

 Study 51 December 18, 2022 – IHE OMUMU NKE IRI ISE NA OTU

Sonde nke Ano n’ime Advent      Decemba 18 2022

ISIOKWU NCHIKOTA:  Onyenweanyi Chineke na ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Ochichi ebighiebi nke anyi na Chineke (2)

ISIOKWU: Ihe a na-atu any a n’aka ndi nke Kraist

EBEAGAAGU: INdi Cor. 15:26,54-58

EBUM N’OBI IHE OMUMU A

  1. Ka echetara anyi dika ndi otu nke Kraist na onwu enweghi ike n’ebe
    anyi no ma oburu na anyi nwuo n’ime Kraist.

ii.Ka anyi muta ihe mere ndi otu Kraist na-aghaghi ilegideisi anya n’iru maka ochichi ebighebi nke anyi na Chineke g’achi karia igba nika nika maka inweta otuto na ebube nke uwa na-agabiga.

OKWU NKOWA: Ihe n’enye okwukwe anyi ike dika ndi nke Kraist bu ogogo nke ihe otutu nke nlegara anya anyi na ochichi ebighebi nke anyi na Chineke karia itukwasi uche anyi n’ochichi nk’uwa na-akwusi akwusi. Ngwangwa anyi malitere itukwasi uche na uru na ihe nweta nke uwa, ngwa ngwa ka aronuche anyi na ntukwasi obi pura n’ebe okpu eze ebighebi nke anyi nwere n’eluigwe wee puo. Ndi nke Kraist kwesiri inwe ma na ewulikwa olileanyi ha nwere na ochichi ebighebi nke anyi na Chineke ga achi mgbe nile.

IHEOMUME

l.Tugharia uche n’ebe anyi guru taa ma kowaputa nkeoma ihe bu olileanya ndi nke Kraist n’idi ndu mgbe onwu gasiri

  • Kedu ihe mere ndi nke Kraist g’eji legidesie anya ike na ochichi ebighebi nke ha na Chineke ga-achi karia ilegide na ebube nke uwa na-agabiga? Kowa nkea nkeoma site na IJon. 2:16-17 nakwa Nkpughe21:l-4
  1. Gini ka ana-atu anya na-aka ndi otu Kraist maka ebighebi? INdi Kor. 15:54-58; Nkpughe 7:14-17
  2. Kpoputasia ufodu ufodu ihe n’eme ka ndi nke Kraist na-ada mba n’okwukwe ha n’ime olileanya ha nwere maka ochichi nke ha na Chineke ga-achi ebighebi. Matt. 24:9-12; Nkpughe 2:4; Gini kwesiri ibu ihe ngbodo ukwu anyi dika ndi njem nke eluigwe? INdi kor 15:58; Nkpughe 2:5

 

OKWU NCHIKOTA Naghanyeghi oganiru ma obu akunuba obula anyi kpokobara n’uwa taa, agaghi eji ya tunyere oghu ebighebi di n’eluigwe ebe onwu, nrianria, boko haram, odida, nmegbu nakwa iru uju na-adighi. Obu itunanya di ebube nke anyi na-aghaghi ilesianya ya ike.

 

OKWU NKE NTUGHARI UCHE: N’agbagheghi otu ebube nk’uwa si di, apughi iji ya tunyere ebube nke onu ebighebi n’eluigwe

 

AMAOKWU IBU N’ICHE: Nkpughe 7:16-17 “Aguu agahi agukwa maoli, akpiri agaghi akpokwa ha nku ozo, anyanwu agahi achagbukwa ha ma obu okpomoku obula. N’ihi na nwaturu ahu ga-ano n’etiti oche-eze ahu ga-azu ha, o gedurukwa ha baa n’isi iyi nke miri n’enye ndu. Onyenweanyi Chineke ga-ehichapukwa anya-mmiri obula n’anya ha”.

2022 CON Anglican Bible Study Igbo Outline (Sept to December)

 

Study 52 December 25, 2022 – IHE OMUMU NKE IRI ISE NA ABUO (52)
Ubochi Ekeresimesi,                                                     Decemba 25,2022

ISIOKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi Chineke na ochichi nke udo

NKEBI ISIOKWU: Ochichi ebighebi nke anyi na Chineke (3)

ISIOKWU Oghu ebighebi nke di n’eluigwe ohuu na uwa ohuu

EKEAGAAGU: Nkpughe21:l-7

EBUM N’OBI IHE OMUMU A

  1. Ka akowa oghu ebighebi dika osi metuta eluigwe ohee nauwa ohuu.

i i. Ka ekpughere anyi ndi ntozuru na ndi netozughi inwe onu ebighebi ahu.

iii.Ka anyi kparita uka ihe ga-abu onodu ndi ezi omume nakwa onodu ndiajoomume.

 

OKWU NKOWA: Ekele diri Chineke onye nyere anyi ubochi ekeresimesi ozo. Ekpere anyi bu ka Chineke debe anyi nile ndu ka anyi wee di ndu n’emerube otutu mmemme ekeresimesi di n’iru n’uwa na aha Jisos Kraist bu onyenweanyi. A n’eme ka anyi matakwa na enwere nnukwu ihe di iche n’etiti Ekeresimesi (Christmas) Nke bu emume icheta obibia nke mbu nke Kraist n’ime uwa ya na “Xmas” nke putara na enwepula aha “Kraist” bu onye anyi n’echeta maka omumu ya na-anu aru. Ozokwa, okwu a bu “Bliss” putara “oghu” zuru oke, Nnukwu oghu”; Onodu inwe oghu mgbe nile; Onodu nke ana enweghi ihe ikwa uta obula”. Onodu n’enweghi ihe ngbu obula; onodu anya miri ma obu ikwa akwa obula nadighi; onodu iyi egwu ma obu ihe nenyi egwu ma obu onwu na-adighi”. Nkea ga-abu onodu ebighebi nke ndi nile kwere ekwe rue n’ogwugwu uwa nkea kara nka mgbe Chineke g’esite na mkpebi ikpe nke ya, wee kewapu ndi ajo madu nile na ndi aruruala nile pua n’etiti ndi ezi omume na ndi kwere na Kraist.

IHE OMUME

1 .Kowa n’uju ihe “nnukwu oghu ebighebi” putara site n’ebe anyi guru taa. (Nkpughe21:4): LeeanyanaNkpughe7:13-17

2a. Kedu ndi tozura etozu ha na Chineke inwe nweko nnukwu oghu ebighebi?  Nkpughe      7: 14;  21:7

2b. Kedu ndi n’etozughi ibata n’oghu ebighebi ahu? Nkpughe 21:8

  • Kowa ihe Ighotara bu “ma ndi na-atu ujo” dika odi na nkpughe 21:8. Nwere Matt. 10:28, Jon. 12:42-43 wee zaa ya. kedu ihe mere na ndi na-atu agaghi eketa onu ebighebi?
  • Gini bu odi iche kachasi di n’etiti ochichi nke uwa nakwa ochichi nke Kraist bu onye ga-achi ebighebi? Legara anya naAbuoma 72:7

 

OKWU NCHIKOTA: Onyenweanyi Jisos Kraist biara nani oru mgbe wee nwuo maka nmehie anyi nile. O ga-abiakwa ozo ikpe ndi di ndu ma ndi nwuru anwu ikpe ma mgbe nkea gasin, o ga-achi acm mgbe ebighebi. Ndi eziomume ga-aga n’iru n’ebi ndu zuru oke n’udo.

 

OKWU NKE NTUGHARI UCHE “Gbasie mbo ike iketa oke na nnukwu oghu ebighebi karia inwe oghu na-adi nwa oge.

 

AMAOKWU IBU N’UCHE: Abu oma 72:7 “N’ubochi nke ya nile, ndi ezi omume ga aga n’iru na amubanye; obuna dika owa na-adigide, otua ka ha g’enwe udo n’uba.