You dont have javascript enabled! Please enable it! Anglican Church Igbo Confirmation Catechism - 9JAINFORMED

Anglican Church Igbo Confirmation Catechism

Anglican Church Igbo Confirmation Catechism

Here is Anglican Church Igbo Confirmation Catechism. Catechism Igbo Nke Confirmation na Anglican Communion. Catechism for Confirmation Class preparatory in the Anglican Church.

“Catechism bu ihe ozizi na aziza mmadu o bula nwesiri i muta tutu e mee ya Confirmation n’ Anglican church. lhe oziza nke mmadu o bula gamuta tutu a kpota ya ka Bishop bikwasi ya aka n’isi”.

Anglican Church Igbo Confirmation Catechism

CATECHISM IGBO

Anglican Church Igbo Confirmation Catechism

Ajuju:      Gini bu aha -gi?

Aziza:       Aha m bu N. ma obu M.

 

Ajuju:       Onye nyere gi aha nka?

Aziza:     Ndi bu Nnam na Nnem nime Chineke na Baptism nkem; nke emerem ihe di n ‘aru Kraist, na nwa nke                 Chineke, na onye-nketa ala-eze nke elu-igw nime ya.


 

Ajuju:        Gini ka ndi bu Nna gi na Nne gi n’ime Chineke mere gi mgbe ahu?

Aziza:  Ha kwere nkwa ato n’aham, kwesie ha ike. Mbu, na agamaju ekwensu na olu-ya nile, na npako nile na ihe efu nke uwa ojoo nka, na agu nmehie nile di n’anu-aru.

Nke-abua, na agamekwe Ihe nile di n’Okwukwe nke ndi Kraist.

Nke-ato, na agamedebe ochicho nSo nke Chineke na Iwu-Ya nile, nakpaghari nime ha ubochi niIe nke ndum.

 

Ajuju. I cheghi na o bu oIu-gi ikwe na ime otu ha kwetara gi nkwa?

Aziza: E, o bu oIum ezie; site n’inye-aka Chineke agameme otu a. EkeIekwam Nna-ayi nke eIu-igwen’obim nile, na o kpowom bia n’onodu nzoputa nka, site na Jisus Kraist, bu Onye-nzoputa-ayi. Anamekpe-kwa-ra Chineke inyem amara-Ya, ka m’we nogide n’otu ihe ahu rue ogwugwu ndum.



Onye-ajuju:    Gua Ihe di n’Okwukwe-gi?

Aziza:

Ekwem na Chineke, bu Nna, Nke puru ime ihe nile, Onye kere elu-igwe na uwa.

Ekwem na Jisus Kraist, nani otu Okpara-Ya, bu Onye-nwe-ayi, Onye aturu ime site n’ike Muo Nso. Nwa-agbogho namaghi nwoke, bu Meri, muru Ya, O huru ahuhu n’ ubochi Pontios Pailet, Akpogidere Ya n’obe, 0 nwua. elie Ya, 0 ridara n’aIa-muo; N’ubochi nke-ato’ O si-kwa-ra na ndi nwuru anwu biIie ozo, 0 rigoro n’elu-igwe, 0 nanodu n’aka-nri Chineke, bu Nna, Nke puru ime ihe nile: N’ebe ahu ka O ga-esi bia ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu.

Ekwem na Muo Nso ; Na Nzuko Katolik nke di nso, Na nmeko nke N di Nso, Na ngbaghara nmehie; na Nbilite-n’onwu nke aru, Na ndu ebigh-ebi. Amen.

 

Ajuju:            Gini bu isi ihe i mutara n’Ihe ndia di n’Okwukwe-gi?

Aziza:         Mbu, a mutaram ikwe na Chineke, bu Nna, Onye keworom, na uwa nile.

                   Nke abua: ikwe na Chineke, bu Okpara, Onye gbaputaworo m na madu nile. 

                   Nke-ato, lkwe na Chmeke, bu Muo Nso, Onye nedom Nso, na ndi nile Chineke rotara.



 

Ajuju:      I kwuru na Ndi bu Nna-gi na Nne-gi ,nime Chineke kwetara Gi nkwa, na i gedebe Iwu Chineke nile.                               Gwam, ha di ole?

Aziza:           Iri.

 

Ajuju:         Gini ka ha bu?

Aziza:         

Otu ihe ahu nke Chineke kwuru n’Isi nkeom nke Opupu, si, Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n’ala ljipt. n’ulo ndi-oru, puta.

  1. Gi enwela chi ozo tiyerem.
  2. Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, ma-obu oyiyi nke udi o bula nke di n’elu-igwe n’elu, ma-obu nke di n’uwa n’okpuru ya, ma-obu nke di na miri n’okpuru uwa: gi akpola isi ala nye ha, efe-kwa-Ia ha ofufe n’ihi na Mu onwem, bu Jehova Chineke gi, bu Chineke ekworo, newere ajo omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke ato,  letakwa nke-ano, nke ndi nakpom asi; ma anamemere nnu umu-umu abua na ogu iri ebere, bu nke ndi nahum n’anya, nedebe kwa ihe nile M’nyere n’iwu.

3·  Gi eburula aha Jehova, bu Chineke-gi, ime ihe efu: n’ihi na Jehova agagh-agu onye neburu aha-Ya ime ihe efu n’onye ikpe namagh.



4· Cheta ubochi-izu-ike, ido ya nso. Ubochi isi ka i gaIu oIu, je ozi-gi nile : ma ubochi nke-asa bu ubuchi-izu-ike nke Jehova, bu Chineke-gi, nwere: I gagh-eje ozi o bula n’ime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na oru-gi nwoke, na oru gi nwayi, na anu-ulo-gi, na obia-gi nke no n’ime onu uzo ama-gi o bula: n’ihi na n’ubochi isii ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oke osimiri, na ihe nile nke di nime ha, O we zuru ike n’ubochi nke-asaa: n’ihi nka ka Jehova goziri uboChi-izu-ike, do kwa ya nso.

5. Sopuru nna-gi na nne-gi: ka uhQchi-gi we di anya n’elu ala ahu nke Jehova, bu Chineke-gi, nenye gi.

  1. Gi egbula madu.
  2. Gi akwaIa iko.
  3. Gi ezula ori.
  4. Gi agbala ama ugha megide madu-ibe-gi.
  5. Gi enwela anya-uku n’ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n’ebe nwunye madu-ibe-gi no, ma o bu n’ebe oru ya nwoke no, ma-obu n’ebe oru ya nwayi no, ma-obu n’ebe ehi-ya di, ma-obu n’ebe inyinya-ibu-ya di, ma o bu n’ebe ihe o bula di nke madu-ibe-gi nwere.



Ajuju:          Gini bu isi ihe i mutara n’iwu ndia?

Aziza:           Amutaram ihe abua: olum n’ebe Chineke no na olum n’ebe madu-ibem no.

 

Anglican Church Igbo Confirmation Catechism

Ajuju:            Gini bu oIu-gi n’ebe Chineke no?

Aziza:           Olum n’ebe Chineke no bu ikwere na Ya, na itu egwu Ya, na iwere obim dum, werekwa uchem dum, werekwa nkpuru-obim dum, werekwa ikem dum hu Ya n’anya; ikpere Ya, na ikele Ya, na itukwasi Ya obim nile, na ikpoku Ya, na isopuru Aha nso Ya na Okwu-Ya, na ife ya ofufe n’ezie ubochi nile nke ndum.

 

Ajuju:      Gini bu oIu-gi n’ebe madu-ibe-gi no?

Aziza:       Olum n’ebe madu-ibem no bu ihu ya n’anya dika onwem, na ime madu nile otu m’nacho ka ha mem; Ihu nnam na nnem n’anya, na iSopuru ha, na iyere ha aka: I souru Eze na ndi nile aroputara ichi achi n’ okpuru ya, na inu okwu-ha: lrube isi nye ndi nile nachim, na ndi nezim ihe, na ndi nazu obim na ndi-nwem:- Idebe onwem n’obi di ume-a1a na nsopuru n’ebe ndi nile kam no:

Ighara imeru obula aru, ma o bu n’okwu ma obu n’omume: Ibu onye nekwu ezi-okwu na onye neme ihe ziri ezi n’ibi-obim nile: Ighara idebe iwe ma-obu Ikpo-asi n’obim: Idebe akam ka ha ghara itutu ihe ma-obu izu ori, na idebe irem ka o ghara lkwu ajo okwu ,na okwu-ugha na nkwuto: Idebe arum ka o neme ihe n’oke, nwee anya-udo, ghara imeru onwe ya: Ighara inwe anya-uku n’ebe ihe ndi ozo di ma-obu icho ha n’obi; kama imuta ilu olu n’ezie ka m’wee nweta ihe  mgeji biri, na ilu olu rurum n’onodu ndu ahu, nke o ga-ato Chineke uto ikpom ka m’bata n’ime ya. 

 

Onye-Ajuju:     Ezi nwam, mara nka na I pughi ime ihe ndia n’onwe-gi, ma-obu ikpaghari n’iwu niilee nke Chineke na ife Ya ofufe, ma I nwegh amara nke nani Ya  na-enye; nke i naghagh imuta irio n’aka Ya mgbe nile site n’ijisi ike n’ekpere. Ya mere, ka m nuru na i puru igu Ekpere nke Onye-nwe-anyi.

Aziza:        Nna-ayi, Nke bi n’elu-igwe,. Ka Aha-GI di nso. Ka aIa-eze-Gi bia. Ka emee ihe I na-acho, dika (esi eme ya) n’elu-igwe, (ka emekwa ya) otu ahu n’uwa. Nye ayi nri ta nke gezuru ayi n’ubochi ta: gbaghara ayi ihe ojo nile ayi mere, Otu ayi onwe~ayi si gbaghara ndi mere ayi ihe ojo, e dubala ayi n’me onwunwa ; Ma doputa ayi n aka ajo Ihe: Amen.



 

Ajuju:       Gini ka i nacho n’aka Chineke nime Ekpere nkea?

Aziza:         Anamacho ka Onye-nwe Chineke, bu Nna-ayi nke elu-igwe, Onye nenye ezi ihe niile, ka O ziterem amara nke Ya, mu na madu nile; ka ayi , we nekpere Ya, nefe Ya ofufe, nanu okwu-Ya, otu o kwesiri ka anyi neme. Anamekpe-kwa-ra Chineke, ka o zitere ayi ihe nile nke nakpa ayi n’ihi nkpuru-obi ayi na aru-ayi; ka O me-kwa-ra ayi ebere, gbaghara ayi nmehie-ayi nile; ka O to kwaa Ya izoputa ayi na iruru ayi ogu n’ihe-ize-ndu nile nke muo na nke aru; ka O debe kwa ayi ka ayi ghara idaba n’aka nmehie n’ajo omume nile, na, n’aka onye-iro nke muo ayi na n’aka onwu ebighi-ebi. Atukwasi-kwa-ram obi na O geme ihe ndia n’ebere Ya na obi-oma-Ya, site n’Onye-nwe-ayi Jisus Kralst. Ya mere, a sim, Amen. Ya di otu a.

 

Ajuju:             Sacrament ole ka Kraist kaworo nime Nzuko-Ya?

Aziza:           Nani abua, dika ihe diri ora madu nkpa n’ihi nzoputa, bu Baptism na Nri-anyasi nke Onyenweayi.

 

Ajuju:      Ole isi okwu nka, bu Sacrament, n’uche-gi?

Aziza:       Isi-ya bu ihe-iriba-ama putara ihe nke anya nahu, bu ihe iriba-ama nke amara ime nke muo enyere ayi, nke Kraist onwe-ya kara aka, ka o buru uzo ayi si anara amara ahu ka o buru kwa ihe-ibe iji me ka ayi tukwasi ya obi.



Ajuju:        Akuku ole di nime Sacrament?

Aziza:       Abua; ihe-iriba-ama putara ihe nke anya nahu, na amara ime nke muo.

 

Anglican Church Igbo Confirmation Catechism

Ajuju:       Gini bu ihe-iriba-ama putara ihe, nke anya nahu, ma-obu udi, nime Baptism?

Aziza:      Miri nke  eji eme madu baptism N’aha nke Nna, na nke Okpara, na nke Muo Nso.

 

Ajuju:           Gini bu amara ime nke muo?

Aziza:              Onwu n’ebe nmehie di, na omumu ohuu n’ebe ezi, omume di; n’ihi na ebe amuru ayi nime                                  nmehie Site n’omumu, ebe ayi bu kwa umu nke iwe’ e sitere na nka me ayi umu nke amara.

 

Ajuju:            Gini ka anacho n’aka ndi ageme baptism’

Aziza:             Ncheghari, nke ha ji aju nmehie; na Okwukwe, nke ha ji ekwesi ihe nile ike bu nkwa nke                                       Chineke  kwere ha na Sacrament ahu. ‘


 

Ajuju:                Gini me-kwa-ra aneme Umu-ntakiri baptism, mgbe ha napughi icheghari na ikwere ekwe n’ihi                               nwata ha bu?

Aziza:                N’ihi na ha kwere ha abua na nkwa site n’onu ndi-mbe-ha; bu nkwa nke ha onwe-ha                                              naghaghi imezu mgbe ha toputara madu. . .

 

Ajuju:                N’ihi gini ka akara Sacrament Nri-anyasi nke Onye-nwe-ayi?

Aziza:                N’ihi ichetagide aja ahu, bu onwu Kraist, na uru nile ayi nerita n’onwu ahu.



Ajuju.                Gini bu akuku putara ihe ma obu ihe iriba-ama nke Nri-anyasi nke Onye-nwe-ayi?

Aziza:                Achicha na Manya-vine, nke Onye-nweayi nyeworo iwu ka anara ha.

 

Ajuju:             Gini bu akuku ime, ma-obu ihe anariba ama?

Aziza:              Aru na Obara nke Kraist, nke ndi okwukwe nanara nke oma n’ezie n’iri Nri-anyasi nke Onye-                                  nwe-ayi.

 

Ajuju:             Gini bu uru ayi neketa nime ya?

Aziza:           lnye nkpuru-obi-ayi ume na ituye ha ndu site n’Aru na Obara nke Kraist, dika Achicha na Manya-                       vine si eme aru-ayi.


 

Ajuju:              Gini ka anacho n’aka ndi nabia na Nrianyasi nke Onye-nwe-ayi?

Aziza:              Ka ha le onwe-ha nke-oma, ma ha cheghariri ezie na nmehie-ha gara aga, ma ha nezubesi ike                            idi ndu uhu; ma ha ji okwukwe di ndu kwer~n’ebere Chineke neme ha site na KTaist, ma ha )I                             ekele cheta c;>nwu-Ya; ma ha na madu nile nebi kwa n’ihu-n’anya.

 

THE END