You dont have javascript enabled! Please enable it! Abu Anglican Communion (Church Hymnal) 1 - 50 - 9JAINFORMED

Abu Anglican Communion (Church Hymnal) 1 – 50

Search Contents

Look for the Abu Number you want on the Table of Content and Click on it.

Igbo hymn known as Abu or Ekpere Na Abu (Ancient and Modern) is one of the Anglican Communion heritages. It is composed and compiled for spiritual worship in the church and for personal devotion. We have made it easier here. You can now surf for your Anglican Igbo hymn from 1 to 400.

Click here for your:

Abu 1 to 50

ABU 51 to 100

ABU 101 to 150

ABU 151 to 200

ABU 201 to 300

ABU 301 to 400

TABLE OF CONTENTS (AHA ABỤ)

Hymn 1- Nsọ, Nsọ, Nsọ! Chuku-Okike

Hymn  2- Nsọ, Nsọ, Nsọ Chuku

Hymn  3- Nna nk’igwĂ©, Nke hur’ayi n’anya

Hymn  4- Chineke Nna, nk’igwĂ©,

Hymn  5- Chineke Nna zite ngọzi

Hymn  6- Nna di nsọ, nur’olum

Hymn  7- Le, k’obi’ahu gesi di’ọcha
Hymn  8- Chuku ebigh-ebi, Ony’amam-ihe

Hymn  9- Chinekem, I d’itu-n’anya

Hymn  10- Chineke di nma; n’el’igwĂ©

Hymn  11- Chuk’Ony’Okike

Hymn  12- Abu nke ndi-m’ozi nada

Hymn  13- Aha Jisus di ok’utọ

Hymn  14- N’Aha nke Kraist Jisus

Hymn  15- Gi bu Uzo–Ọ bu na Gi
Hymn  16- Jisus, uwem di ebube

Hymn  17- Jisus, Onye biri n’igwé,

Hymn  18- Onye-ngbaputam di kwa ndu

Hymn  19-Ge nti! Ndi-mozi nabu

Hymn  20- Mgbe ndi naz’aturu neche.

Hymn  21- Ndi Kraist, teta, kel’utut’ona nka.

Hymn  22- Bianu, nd’okwukwe.

Hymn  23- Onye no n’ulo anu.

Hymn  24- Dika nd’ochie ji onu

Hymn  25- Abali nsọ, nke di kwa ju.

Hymn  26- Unu ndi-m’ozi nke igwĂ©

Hymn  27- Gi rar’och’eze-I na okpu-eze-I.

Hymn  28- Inu juru obi-ayi ta.

Hymn  29 -Otu mgbe n’obodo Devid.

Hymn  30 -Ezi ndi Kraist, nuria.

Hymn  31- Mgbe m’nele anya n’osisi.

Hymn  32- Ugwu di n’ebe di anya.

Hymn  33- Ayi neto Onye nke nwuru

Hymn  34- Nkume mgbe ebigh-ebi.

Hymn  35- Anwurum n’ihi gi.

Hymn  36- Ge nti! olu ihu-n’anya.

Hymn  37- Obara anu dum

Hymn  38- Ge nti! akuko di ebube.

Hymn  39- Ndu di n’ih’ile Ony’akpogburu anya.

Hymn  40- Ihu-n’anya Jisus jirim.

Hymn  41- Naga! naga dika Eze!

Hymn  42- Kraist Ez’ayi biliri ta.

Hymn  43- Ta Ka Jisus biliri.

Hymn  44- Okwu agwu; ogu ebie.

Hymn  45- Jisus di ndu! gi, onwu.

Hymn  46- “Utu’on’ekele!” ogbo nile si.

Hymn  47 -Haleluya, Ọ biliwo!

Hymn  48- Haleluya! Haleluya!

Hymn  49- Eme nkwa ekwere.

Hymn  50- Ọ togboro n’ili.

Hymn  51- Kel’ubọchi nrigo-Ya.


Hymn  52- Kraist Ez’ayi biliri ta:

Hymn  53-Isi nke kpururi ogwu.

Hymn  54- Ekele! Eze Galili.

Hymn  55- Anebuli on’uz’ama,.

Hymn  56- Le! Ọ si n’igwĂ© narida.

Hymn  57- Ndi-ozi Onye-nw’ayi.

Hymn  58- Nu uda onu! Ọ nabia.

Hymn  59- Kraist nabia! K’ih’eker’eke.

Hymn 60- Onye-nzọputam biara Betlehem.

Hymn  61- Ma Jisus bia ile ndi-Ya olu.

Hymn  62- Tutu Jisus ala n’igwé.

Hymn  63- Mọ Nsọ, ezi Onye-ndu.

Hymn  64- Mọ nk’amara, biyerem!

Hymn  65- Kuyem ume, Chuku.

Hymn  66- Mọ Nsọ, noyer’ekpere nk’ayi.

Hymn  67- Were ihe-I di ngọzi.

Hymn  68- Mọ Nsọ, Ony’obi-ọma.

Hymn  69- Bia, Mọ Nsọ, Nduru nke igwé.

Hymn  70- Mọ Nsọ, kuye ume-Gi.

Hymn  71- Mọ Nsọ, nur’olu-ayi.

Hymn  72- Okwu nke ghoro madu.

Hymn  73- Chineke, okwu-I di.

Hymn  74- Akwukwo Nsọ Chineke.

Hymn  75- Nyawaram achicha

Hymn  76- Bia n’etiti ayi Chineke.

Hymn  77- Kwue, mgb’oge dajuru.

Hymn  78- Bu-kwa-ram abu ndia ozo.

Hymn  79- Mọ Nsọ kekunye okw’ume.

Hymn  80- Oriona diri ukwu-ayi.

Hymn  81- Nzuko-Kraist nw’otu nt’ala.

Hymn  82- Jisus, nonyere Nzuko-I.

Hymn  83- K’ala-eze-Gi bia.

Hymn  84- Jisus gachi n’ebe nile.

Hymn  85- Chineke, okwu-Gi.

Hymn  86- Nn’ani, tute olu-Gi

Hymn  87- Eze Zaion gachi na nmeri.

Hymn  88- Onye etere manu.

Hymn  89- Nna k’ala-eze-Gi bia.

Hymn  90- Chuku nk’igwĂ©, nur’abu-ayi

Hymn  92- Onye-nwe-ndu, eb’o bula.

Hymn  93- Nka b’ubọchi Chuku doro.

Hymn  95 -Ulo-I n’igwĂ© mara nma.

Hymn  96- Ubochi ta, n’Okwu nke-Gi

Hymn  97- Agajem ulo-I Chuku.

Hymn  98- Chuku, ayi abia ugbua.

Hymn  99- Nna, ayi zukot’ozo n’aha Jisus.

Hymn  100- Chineke, ayi abia.

Hymn  101- Nna were ngọzi-I zilag’ayi.


Hymn  102- Mọ Nsọ, si n’elu ridata.

Hymn  103- Chuku, Ike n’Olil’any’ayi

Hymn  104- Jisus, ayi cher’obi’ayi n’iru I.

Hymn  105- Gi ony’ogu obe.

Hymn  106- K ‘I ghar’ it’ ujo ib’ onye.

Hymn  107- Chuku nk’onyinye otuto.

Hymn  108- Nna, chebe umu-ayi.

Hymn  109- Jisus, ekwerewom nkwa

Hymn  110- Jisus, eburuwom obem.

Hymn  111- Chukum, nara nkpur’obim ta.

Hymn  112- Nke-I mgbe dum! Chuku ọma.

Hymn  113- Jisus, Gi onu nke obi.

Hymn  114- Ugbu a, Nna , necheta ihu-n’anya.

Hymn  115- Jehova bu onye nazum.

Hymn  116- Jisus, dik’Okwu-Gi si di.

Hymn  117- Bia n’okukwe nar’aru Onye-nwe-I.

Hymn  118- Chukum, I dozir’oriri.

Hymn  119- Ekwesighm, Onye-nw’ayi di nsọ.

Hymn  120- N’abal’ahu k’arara Ya.

Hymn  121- Jisus, dut’ayi n’oriri-I.

Hymn  122- Nri nenye ndu nagum.

Hymn  123- “Rue mgb’Ọ gabia!”-K’okwu nka.

Hymn  124- Icheta ihu-n’anya Kraist.

Hymn  125- Bia, Mọ Nsọ, Kwalie obi ayi.

Hymn  126- Chineke, wusa Mọ Nsọ-Gi.

Hymn  127- Chineke, wedat’onwe-Gi.

Hymn  128- Were ndum, Nna, k’o buru.

Hymn  129- Jisus, gwam okwu, ka m’were.

Hymn  130- Na nkwere nke zur’oke.

Hymn  131- Otu m’di ibu nke-I, Onye


Hymn  132- Gi Ihu-n’anya, kachas’uche madu

Hymn  133- Njiko nke di ngọzi.

Hymn 134- Chineke nke ihu-n’anya.

Hymn  135- Chuku, Nna, Ony’okike

Hymn  136- Ọ bu n’aka nke Jisus

Hymn  137- N’utut’ubọchi Nbilite

Hymn  138- Ge nti! akuko di ebube.

Hymn  139- N’ebe a k’ayi nenwe nsọgbu

Hymn  140- Ndi kwuru nwe ngọzi.

Hymn  141- Mgbe ayi ruru n’ahuhu.

Hymn  142- Abum obia n’ebe a.

Hymn  143- Abal’adigh n’igwĂ©.

Hymn  144- Ayi nekwu okwu banyere.

Hymn  145- Ala di mara nma kar’ihe.

Hymn  146- Tob’Onye kasi nsọ n’elu.

Hymn  147- K’ora tobe ike Jisus.

Hymn  148- Obim, tob’Eze nk’el’igwĂ©.

Hymn  149- Madu nile bi n’uwa.

Hymn  150- K’ebo nile kpo isi’ala.

Hymn  151— Chukwu, mgb’obim nech’echiche

Hymn  152- Too Chuku Abraham.

Hymn  153- Too Chineke, b’Eze-ayi;

Hymn  154- Otutọ diri Chuku n’ih’Ọ luru.

Hymn  155- To Jisos, Onye ngbaputa nke di ngọzi.

Hymn  156- Tob’Eze nke ni n’otuto n’elu.

Hymn  157- Ka m’nw’obi agbaputara.

Hymn  158- Otutọ na nsọpuru,

Hymn  159- Ihu-n’anya nke kachasi.

Hymn  160- Nuri onu nim’Onye-nw’ayi.

Hymn  161- Agamet’Onye-ngbputam.

Hymn  162- Ọ dim ka’nabu mgbe nile.

Hymn  163- Ka ndi nile bi n’el’uwa.

Hymn  164- K’ayi wer’abu onu soro.

Hymn  165- Mgbe chi boro n’igwĂ©.

Hymn  166 – Sopuru Chineke n’ima-nma nk’idi-nso!

Hymn  167- To Chineke, Ony’okike, Eze nk’uwa nile.

Hymn  168- Chinekem, ekelem Gi, Onye ker’uwa.

Hymn  169- Mejue ndum n’akuku-ya dum.

Hymn  170- Otu m’di-nenwegh agugo.

Hymn  171- Jisus, na mgb’ebere-I nka.

Hymn  172- Onye-nw’ayi, nechetam.

Hymn  173- Mu, di njọ, nacho ngọzi.

Hymn  174- Onye-nwem, Gi ka m’kpokuru.

Hymn  175- Nna, esetirim Gi akam.

Hymn  176- Agabigalam, Onye-nwem.


Hymn  177- Jisos Onye nwayọ.

Hymn  178- Akw’apugh izọputam.

Hymn  179- Onye-nzọtam, nur’akwam.

Hymn  180- Ndi nagabiga

Hymn  181- Chuku, Inye’ak’ayi na mgb’ochie.

Hymn  182- Jisus, Enyi nke obim.

Hymn  183- Okwukwem di na Gi,

Hymn  184 – Site n’ihu-n’anya Jisus

Hymn  185- Natukwasi Ya obi-I

Hymn  185- Natukwasi Ya obi-I

Hymn  186- Chuku, ka m’so uzọ-I.

Hymn  187- Jisus, Ka m’kwere Gi, tukwasi I obim,

Hymn  188- Gi atula egwu.

Hymn  189- Ekesiworom dum nile.

Hymn  190- Ezi udo, nim’ajo uwa nka?

Hymn  191- Mgb’udo, dik’osimiri, neru n’uzọm.

Hymn  192- Ọ gabu na m’gerit’uru.

Hymn  193- Chinekem, Nnam, me ka m’d’ike.

Hymn  194- Dik’agu miri si agu.

Hymn  195- Chukum, ka m’no nsọ Gi.

Hymn  196- Jisus nakpo ayi! n’ebili.

Hymn  197- Jisos abum nke-I, anuwom olu-I.

Hymn  198- Achorom ka m’yie Jisus.

Hymn  199- Nkpa-Gi nakpam mgbe dum.

Hymn  200- Ndi di’ọcha nwe ngọzi.

Hymn  201- Apughm iwezuga Gi.

Hymn  202- Jisus, Onye-nwem, Chinekem.

Hymn  203- Anuwom banyere ngọzi.

Hymn  204- Jisus, echiche banyere I.

Hymn  205- Chuku, nyocham, nwa omumem.

Hymn  206- Umu nke Eze igwé.

Hymn  207- Nime abali nk’ahuhu.

Hymn  208- Nna nk’igwĂ©, biko, nedu ayi

Hymn  209- Nedum, Gi Jehova uku.

Hymn  210- Ihe ọma, nedum nim’ohichi.

Hymn  211- Jisos, dugide.

Hymn  212- “Bulie obe-i,” Jisos siri,

Hymn  213- Chuku, zim uzọ-Gi.

Hymn  214- Jisos, nedum n’uzọ ndu.

Hymn  215- Jis’ike! asula ngongo.

Hymn  216- Ka m’so Onye-nwem rida na ndagwurugwu.

Hymn  217- Ngozi dir’obi ndi nahu.

Hymn  218- Mgb’ebili-miri nke ndu namaghari i.

Hymn  219- K’utọ uwa nefe.

Hymn  220- Nwa-madu, makua nwa-nna-gi n’obi-gi.

Hymn  221- Ony’ogu Kraist, bilie.

Hymn  222- Gaba, ndi-agha Kraist.

Hymn  223- Onye diri Jisus.

Hymn  224- Guzọ, guzọro Jisus.

Hymn  225- Ndi Chineke, bilie.

Hymn  226- Verse 1

Hymn  227- Chineke bu Ota-i.

Hymn  228- Wer’amara-Gi nonyer’ayi.

Hymn  229- Abala n’onwunwa: nka gabu nmehie.

Hymn  230- Egwu natu gi n’ony’iro gemeri.

Hymn  231- Nuria n’Onye-nw’ayi! k’ebere-ya

Hymn  232- B’uzọ cho, o bugh ih’uwa.


Hymn  233- Wer’ike-i dum gba ngba ọma.

Hymn  234- Jisus! o gabu n’ihere-I.

Hymn  235- Ihere Onye-nwem emeghm.

Hymn  236- Umu, je kwuputa Jisus.

Hymn  237- Gab’olu! gab’olu! ayi bu ndi Chineke.

Hymn  238- Tukwasi Chuku-i obi.

Hymn  239- Nagafe dika kpakpando ututu.

Hymn  240- Jisus si k’ayi wer’ez’ihe nenwu.

Hymn  241- Ndi kwesiri ntukwas’obi mbge nile,

Hymn  242- Ahurum Jisos n’anya.

Hymn  243 – Ahurum Jisus n’anya,

Hymn  244- Nna, Nke si n’ulo-aku-Gi.

Hymn  245 – Ekpere b’ochicho obi,

Hymn  246 – Obim, bia nso och’ebere

Hymn  247 – Obim, Jiker’aririo-I,

Hymn  248- Anya di nke ura natugh.

Hymn  249- Jisus bu eyi-ayi.

Hymn  250- Guzọ n’etiti ayi.

Hymn  251- Jisus, zi ayi ik’ekpere.

Hymn  252- Miri-ozuzuo nke ngọzi.

Hymn  253- Dibia ku no nsọ ugbu a.

Hymn  254- Na nsọ ka mmadu bi n’ochichi.

Hymn  255- Ayi nuru olu onu:

Hymn  256- Ndi bi n’ebe di anya nakpo oku.

Hymn  257 – “Onye nke nuru!” tisie nkpu nka ike!

Hymn  258- I jekuru Jisus n’ih’ike nsacha.

Hymn  259- Onye-nzọputa! Ọ nwuru n’ihim.

Hymn  260- Bia nsọ Jisus—- ugbu a

Hymn  261- Jisus gewere ndi’njọ!

Hymn  262- Bia, nkpur’obi njọ nanyigbu

Hymn  263- Biakute Jisus, anol’odu

Hymn  264- Onye biara n’uwa nka.

Hymn  265- Uwa nile furu n’ochichi nke njọ

Hymn  266- Ony’isi jekuru Jisus n’abali

Hymn  267- Onodu gadiri Jisus

Hymn  268- Gini gasachapu njom?

Hymn  269- Ony’obia no n’on’uzọ:

Hymn  270- Obim! nu, Ọ bu Jisus

Hymn  271- Ike gwuru i, i dar mba

Hymn  272- Anurom olu Jisus si

Hymn  273- Bianu, ndi-nmehie fur’efu,

Hymn  274- I nuwo kwa Ozi ọma

Hymn  275- K’umu-ntakiri bia !

Hymn  276- Jisus, Eny’umu-ntakiri

Hymn  277- Ndi mar’ihe geweta

Hymn  278- Jisus hur’umu-nta n’anya

Hymn  279- Jisus Kraist hurum n’anya!

Hymn  280- To Ya, to Ya, un’umu-nta nile

Hymn  281- Ayi b’umu-nta nadigh ike

Hymn  282- Umu-ntakiri, to Jisus

Hymn  283- Ayi b’umu-ntakiri

Hymn  284- Gburugburu Oche Chuku

Hymn  285- Umu-nta Jerusalem

Hymn  286 – I mawo isi onu-ayi

Hymn  287- Ma m’biakute Jisus

Hymn  288- Jisus, obi-ayi geto Gi

Hymn  289- Jisus, Onye-nchem, nur’olum

Hymn  290- Jisus, Nke bi m’elu

Hymn  291- Nna, zi nwa-I ikpe ekpere

Hymn  292- Chineke nanom nsọ

Hymn  293- Mgbe Ọ gabia, mgbe Ogabia

Hymn  294- Ọ bu ihe di ebube


Hymn  295- Jisus, Onye di nwayọ

Hymn  296- Ihe ọma nke ututu

Hymn  297- Kraist, Anwu nk’ezi’omume

Hymn  298- Biakutem, Kraist, mgbe m’tetara

Hymn  299- Obim, teta, so anyanwu

Hymn  300- Chukum, o di mgbe di utọ

Hymn  301- Ugbu ak’anyanwu putara

Hymn  302- Come to the morning prayer

Hymn  303- Onye-nwem, ka m’je n’Aha-Gi

Hymn  304- Kraist, n’ukwu-I k’ayi dobara

Hymn  305- Nteta n’ututu negosi

Hymn  306- Nonyerem: o rube wo anyasi;

Hymn  307- Uboch’I nyere, Nna, agwuwo

Hymn  308- Jisus, ayi nabu abu ikp’azu

Hymn  309- Jisus, nye ngọzi anyasi

Hymn  310- Chineke, otuto diri I

Hymn  311- Anwu nk’obim, Onye-nzọtam.

Hymn  312- N’anyasi, tut’anwu ada.

Hymn  313- Ehihie agawo

Hymn  314- Ubochi ta nagwu.

Hymn  315- Tutu mu araru ura

Hymn  316- Jisus, chi ejiwo.

Hymn  317- Ubochi agafewo;

Hymn  318 – Buanu, ndi ji ekele

Hymn  319- Ayi nasu ala ubi,

Hymn  320- Chineke nk’el’igwĂ© n’ala,

Hymn  321- Ayi nekele Gi, Onye nw’ayi!

Hymn  322- Ayi nenye I ihè-Gi;

Hymn  323- K’ayi kele Nn’ayi ugbu a,

Hymn  324- Aro ole-n’ole

Hymn  325- N’ih’ebere-I amara-I

Hymn  326- nime ngbanwe nile nke dum,

Hymn  327- Mgbe nkem di n’aka-Gi:

Hymn  328- – Chineke, Nna, kwe ka m’do

Hymn  329- Nn’ayi, gozie ar’ohu nka

Hymn  330- Ar’ohu namalite.

Hymn  331- Gi, onye ndi no nim’oria

Hymn  332- Aka-Gi, Kraist, na mgbe ochie

Hymn  333- Chukunonyere I k’ayi zuk’ozo.

Hymn  334- Atul’egwu ih’obula:

Hymn  335- N’ihi ndi-ayi no n’eb’ozo.

Hymn  336- Nna dinsọ, wer’ebere-Gi

Hymn  337- Kraist bu Nto-ala-ayi,

Hymn  338- Chineke, ayi nahu.

Hymn  339- Ezi’Onye-nche ndi-Gi, nuru.

Hymn  340- Kraist bu Nto-ala di ike,

Hymn  341- Nna nk’amara, nonyer’ayi ta;

Hymn  342- Jisus, nonyer’ayi n’oriri;

Hymn  343- Onye-nw’ayi, ayi nekele Gi.

Hymn  344- Onye-nwem, nedum n’ezi-omume-I.

Hymn  346- Chineke bu Mọ: ndi nekpere Ya


Hymn  347- K’ebere-Gi, Nna, nonyer’ayi

Hymn  348- Chineke, Onye mara nkp’ayi,

Hymn  349- Ayi nario Gi, Nna nk’ebere,

Hymn  351- K’amara nk’Onye-nzoput’ayi  

Hymn  352- Tutu ayi agbasa  

Hymn  353- To Chineke, Onye-ngozi  

Hymn  354- Otuto diri Chukwu: Nna  

Hymn  355- Chukwu, no n’isim 

Hymn  356- Chukwu gozie gi, debe gi 

Hymn  357- Neto Jisus! Neto Jisus!  

Hymn  358- Rionu, agenye kw’unu  

Hymn  359- Ubochi ok’onu 

Hymn  360- Nano nso Jisus 

Hymn  361- Kraist di ndu nimem! 

Hymn  362- O bu ezie! obu ezie! 

Hymn  363 – ibu njom, ibu njom

Hymn  364- Anameri ezi nri nke ndu 

Hymn  365- Anamabia ososo 

Hymn  366- Enyi kachasi nma bu Jisus! 

Hymn  367- Nani Kraist gegbo nkpam ugbu a 

Hymn  368- Nna nk’ihu-n’anya 

Hymn  369- Chineke bu Ony’Okike 

Hymn  370- Jisus, Nw’amuru ta 

Hymn  371- Baba, baba, Ihe’oma 

Hymn  372- Jisus biara ka O gbaput’ayi 

Hymn  373- Enyim, bia, nu akuko 

Hymn  374- Ubochi nk’ir’uju 

Hymn  375- ALELUYA! ALELUYA! ALELUYA! 

Hymn  376- N’uboch’analegh anya-Ya 

Hymn  377- Nna, meghe obi-ayi 

Hymn  378- N’ulo-Gi, Chineke 

Hymn  379- Chineke, me k’okwu-Gi 

Hymn  380- Mo so nke ihu-n’anya 

Hymn  381- Chineke nke ebere 

Hymn  382- Chukwu, nyere ayi aka 

Hymn  383- Chineke, biko, chebe 

Hymn  384- Ayi nacho ihu Jisus 

Hymn  385- Ayi aghagh igabiga 

Hymn  386- Eguzowom n’on’uz’obi 

Hymn  387- Jisus, Eze neme udo 

Hymn  388- Nka bu oge ekpere 

Hymn  389- Umu-nnam, unu bia ge nti 

Hymn  390- N’ihi na Chukwu hur’uwa n’anya 

Hymn  391- Onye gewer’onwe-ya nye Chineke 

Hymn  392- Nnam. nuru ekperem 

Hymn  393- Gini k’umu-nta genye 

Hymn  394- Chukwu di nso, ayi  ekele i

Hymn  395- Ekelem Gi, Nnam, Chinekem 

Hymn  396- Ta k’ayi nile nanuri 

Hymn  397- Kraist, Onye nenyer’ayi aka 

Hymn  398- Tutu ayi ejikere ije nke-ayi 

Hymn  399- Agamenye unu obi ohu 

Hymn  400- Chineke, ayi narịọ Gị K’I nye ndị-otu-ayị  ngọzi


Hymn 1- Nsọ, Nsọ, Nsọ! Chuku-Okike

 

Verse 1
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Chuku-Okike,
N’isi ụtụtụ ayị gabụ abụ nye Gi;
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Onye-ebere,
Atọ nim’Otu, Chuku dị ngọzi.

Verse 2
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Ndị nsọ neto Gị,
Natụda okpu-ha n’iru oche-eze-Gị;
Cherubim na Serafim nada n’iru Gị,
Onye nọri, nanọ, ganọgide.

Verse 3
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Gị dị ebube,
Anya ndị-nmehie apụgh ihụ otuto-Gị;
Ọ bụ nanị I di nsọ: ọ digh ony’ọzọ
Zur’oke n’ike, na ihu-n’anya.

Verse 4
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Chuku-Okike,
Ọlu-Gi dum n’igwĂ© n’uwa geto aha-Gi.
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Onye-ebere,
Atọ nim’Otu, Chuku di ngọzi. Amen.

 

 

hymn 2- Nsọ, Nsọ, Nsọ Chuku

 

Verse 1
Nsọ, Nsọ, Nsọ Chuku
Eze di mgb’ebigh-ebi,
Ony’igwĂ© n’uwa neto;
Ndi-m’ozi nabu abu,
Neto mgbe ebigh-ebi
Triniti nke di ngọzi.

Verse 2
Gi kere ihe nile,
Na Gi ka ha nadi ndu,
Gi nwe nsọpuru nile:
Ihe nile neto Gi.
Neto mgb’ebigh-ebi
Triniti nke di ngọzi.

Verse 3
Cherubim na Serafim
Ji nku-ha kpuch-iru-ha;
OtĂą nazu ibe-ya
Si, Nsọ, Nsọ, Nsọ;
Neto mgb’ebigh-ebi
Triniti nke di ngọzi

Verse 4
Aleluya! ayi neto
Nna, n’Ọkpara na Mọ Nsọ,
Atọ nim’Otu di nsọ;
Ayi soro usu nd’igwĂ©
Neto mgbe ebigh-ebi
Triniti nke di ngọzi. Amen.


 

Father of heaven, whose love profound

Hymn 3- Nna nk’igwĂ©, Nke hur’ayi n’anya

Verse 1
Nna nk’igwĂ©, Nke hur’ayi n’anya,
We cheputar’ayi ngbaputa,
Ayi nd’ọjọ gburu I ikpere;
Biko, gbaghar’ayi njọ nile.

Verse 2
Ọkpara, Okwu Chineke,
Onye-ngbaputa, n’Eze-ayi,
Ayi nd’ọjọ gburu I ikpere;
Wer’amara-Gi zọput’ayi.

Verse 3
Mọ Nsọ nke neme nkpur’obi
K’ọ puta na njọ na ọnwu,
Ayi nd’ọjọ gburu I ikpere;
Nye ayi ike nke ndu ọhu.

Verse 4
Jehova . . . Nna, Ọkpara, Mọ . . . .
Chineke, Atọ, nim’Otu,
Ayi nd’ọjọ gburu I ikpere:
Gbahara nmehie, nye ayi ndu. Amen.

 

Father of heaven above

Hymn 4- Chineke Nna, nk’igwĂ©,

Verse 1
Chineke Nna, nk’igwĂ©,
Onye bi nim’ihè,
Ony’ebube.
Ihè nenwu nk’ukwu,
Ihu-n’anya d’ike,
Ony’anahugh anya,
Ayi neto Gi.

Verse 2
Chineke Ọkpara,
Kraist Onye ghọr’aru,
Onye-nzọta.
Onye nọ n’aka nri
Nna nke di ebube,
Ọnu-nekwuru-ayi,
Ayi neto Gi.

Verse 3
Chineke, Mọ di nsọ,
Onye nenye ayi ndu,
Onye-nkasi.
Mọ nke amam-ihe,
N’ihu-n’anya n’ike,
Onyinye nke igwé,
Ayi neto Gi.

Verse 4
Madu nile n’uwa
Soro usu nk’igwĂ©
To aha-ha Ya.
Otutọ diri Gi,
Atọ nime Otu,
Rue mgbe ebigh-ebi,
Chuku di nsọ. Amen.

Command Thy blessing from above

Abu 5- Chineke Nna zite ngọzi

Verse 1
Chineke Nna zite ngọzi
Nye ayi, ndi zukọrọ n’ebe a
Le ayi anya n’ihu-n’anya,
Bu umu nasọpuru Gi.

Verse 2
Kraist Ọkpara zite ngọzi,
Kwe k’ayiso uzọ-Gi n’ezie;
Me k’Okwu-Gi ba n’obi-ayi,
Nye ayi ike nke ndu ohu.

Verse 3
Mọ nke di nsọ zite ngọzi,
Wer’ike-Gi mej’ulo nka;
Mukwasi ndi di um’ala,
Kpughere ha amara-Gi.

Verse 4
Chineke, Atọ nim’Otu,
Nna, na Ọkpara na Mọ Nsọ,
Eb’ayi nario I n’otu obi,
K’ayi fegide Gi mgbe nile. Amen.


 

 

Holy Father, hear me

 Abu 6- Nna di nsọ, nur’olum

 

Verse 1
Nna di nsọ, nur’olum;
Gi bu Onye-nzọtam;
Nanọm nso mgbe nile,
Gi Onye-amara.

Verse 2
Jisus, Onye-nwe-ayi,
Eze ndu n’ebube,
Ka mgbe ahu bia ngwa,
Mgbe m’gada n’iru Gi.

Verse 3
Mọ Nsọ, Onye-nkasi,
Nke bi nime obim,
Mazuru nkpam nile,
Dọruem nso I, mem nke-Gi.

Verse 4
Nsọ, Nsọ, Nsọ,
Bia, arapukwalam;
N’obim nke dia ala,
K’I gebi mgbe nile. Amen.

 

Eternal Light! Eternal Light!

Abu 7- Le, k’obi’ahu gesi di’ọcha

Verse 1
Le, k’obi’ahu gesi di’ọcha
Nke nabia n’iru-Gi;
Nelekwaswi ihe nsọ-Gi,
Naáą…uri ọnu n’obi n’obi’utọ
N’iru Gi, Chineke.

Verse 2
Mọ ndi nọ nsọ och’eze-Gi
Nenwe ọnu ahu;
Ọ bu nani ha mara ya,
Ebe ha namaghkwa nmehie,
Ha adagh kwa ada.

Verse 3
M’gesi ana, mu b’onye-njọ,
Ony’obi gbachiri,
Bia n’iru Ya, Nke di egwu,
Mọ nkem gesi ana hu Ya:
Ih’anakegh eke!

Verse 4
Uzo di ayi gesi bilie
Ba nim’ihe ahu:
Otu Aja nke zur’ezu,
Ike Mọ Nsọ Ony’amara,
Ọnu-nekwuru-ayi.

Verse 5
Ọ bu ndia nakwadebe ayi
Iru ebe-nsọ-Gi,
Umu ochichiri na njọ
Gebi n’ihe ebigh-ebi
Site n’ihu-n’anya-I. Amen.

 

Immortal, invisible, God only wise.

Abu 8- Chuku ebigh-ebi, Ony’amam-ihe

 

Verse 1
Chuku ebigh-ebi, Ony’amam-ihe,
Oke ihè-Gi kpudoro anya-ayi;
Gi nw’otuto n’ike, Nna di mgbe ochie;
Ayi neto aha-Gi, Onye nwe nmeri.

Verse 2
Gi ji ike n’uche, nachi ihe dum;
ihè-Gi ji nwayọ nenwu n’el’uwa;
Ez’ikpe-Gi kasi ihe dum elu;
Gi bu Onye nwe ihu-n’anya ukwu.

Verse 3
Gi nenye ora madu ume na ndu;
Ndu ahu nke I nyere bu ndu n’ezie;
Ma dika osisi k’ayi nami nkpuru,
Ayi nanwu nagafe-Ma I nogide.

Verse 4
Chineke nk’otuto, Nna nke di ngọzi,
Ndi-m’ozi neto kwa Gi n’elu-igwĂ©;
K’ayi nye Gi otuto, nna nke bu ihe,
Chuku ebigh-ebi, Ony’amam-ihe. Amen.


 

My God, how wonderful Thou art.

Abu 9- Chinekem, I d’itu-n’anya

Verse 1
Chinekem, I d’itu-n’anya,
Ebube-Gi nenwu;
Och’ebere-Gi di no nma
Nime oke ihe.

Verse 2
I di egwu, Chineke nkem,
Nna di ebigh-ebi;
Ndi-m’ozi nada n’ukwu-Gi,
Nefe Gi mgbe nile.

Verse 3
Iru-Gi mara nma n’ezie;
Amam-ihe nke-Gi,
Na idi-ọcha n’ike-Gi
Di kwa ok’ebube.

Verse 4
Le, ka m’si atu egwu-Gi,
Chineke nke di ndu;
Nefe Gi n’ezi ncheghari
N’olil’anya nk’igwĂ©.

Verse 5
Ka m’hu Gi n’anya, Chineke,
Gi, Onye di ike,
N’ihi na I nario n’akam
Ihu-n’anya nk’obim.

Verse 6
Nnaa nke Jisus, Nna nk’amara,
Ida n’ir’oche-Gi,
Na ilekwasi iru-Gi,
B’onu ebigh-ebi. Amen.

 

 

Yes, God is good; in earth and sky.

Abu 10- Chineke di nma; n’el’igwĂ©

Verse 1
Chineke di nma; n’el’igwĂ©,
N’akuku nile nke uwa,
K’ọtutu olu naza, si,
Chuku, Onye ker’ayi, di nma.

Verse 2
Anyanwu nke nag’ije-ya,
Nasmus’ihe nile n’uwa,
Usu mbara nke el’igwĂ©,
Ha dum nasi, Chuku di nma.

Verse 3
Umu-nnunu ndi ji ọṅu
Nabu abu-ha kw’ubọchi;
Miri-ozuzọ n’ikuku
Nekwu nwayọ: Chuku di nma.

Verse 4
Anurum ya nim’ok’ọhia,
N’el’ugwu na osimiri;
Ha nile nesonye n’abu,
Nekwus’ike: Chuku di nma.

Verse 5
Ihe nile ekere’eke
Nekwu si, Chineke di nma;
Madu j’onu neto s’ike,
Naza n’abĂą: Chuku di nma.

Verse 6
Ayi neso ihe dum nk’uwa
Neto Gi, Onye-amara;
Ma nke ka, n’ihi Jisus Kraist,
Ka ayi gasi, Chuku di nma! Amen.

 

God, who made the earth

Abu 11- Chuk’Ony’Okike

Verse 1
Chuk’Ony’Okike
Nke uwa n’el’igwé,
Onye ker’anyanwu,
Nelekọtam.

Verse 2
Onye ker’ohia,
Osisi na nkpuru,
Ehihie n’abali,
Nelekọtam.

Verse 3
Onyr ker’anwu,
Onwa na kakpando,
Mgb’ahuhu biara, Ọ
Nelekọtam.

Verse 4
Ya ziri Nwa Ya
K’Ọ nwua na Kalvari;
Ma m’dabere Ya, Ọ
Gelekọtam.

Verse 5
Mgbe m’ruru n’igwé,
Ma hu ndi-eyi-Ya,
M’geso ndi nsọ bua: Ọ
Lekotaram! Amen.


 

Angel voices, ever singing

Abu 12- Abu nke ndi-m’ozi nada

Verse 1
Abù nke ndi-m’ozi nadà
N’och’eze-I mgbe dum;
Ọkpukpọ-ubọ ndi-m’ozi
Enwegh iz’ike;
Ha di ndu nani igọzi I,
N’ikwuputa I
Nna nk’ike.

Verse 2
Gi Nke bi n’ebe di anya
Kari k’ayi gahu;
Ọ gabu na I nege nti
N’abu ndi-nmehie?
Ayi pur’ima n’I nọ nsọ ayi,
N’I gahu ayi?
É, n’ezie!

Verse 3
É, ayi mara n’I naṅuri
N’ọlu-Gi nile;
I ker’aka, n’olu na nti,
Inye I otuto;
Olu ndi-nka, n’olu abu,
Jikọrọnu
Ito Gi.

Verse 4
Chuku, n’ulo-Gi k’ayi neche
Ihe-Gi n’iru I;
Ayi ji ekwesigh-ekwesi
Newetara Gi
Obi, n’uche, n’aka, n’olu,
N’abù-ayi n’ike
Kasi nma.

Verse 5
Nsọpuru, otuto n’ike,
Gabu nke-I mgbe dum:
Nna, na Ọkpara, na Mọ Nsọ,
Atọ nim’Otù;
Ihe kasi nma nk’I nyere,
Uwa n’igwé
Nenye Gi. Amen.

 

 

How sweet the name of Jesus sounds

 Abu 13- Aha Jisus di ok’utọ

Verse 1
Aha Jisus di ok’utọ
Na nti onye kwere;
Ọ nakasi ya n’ahuhu,
Nachupu egwu-ya

Verse 2
Ọ nagwo oria nkpur’obi,
Najur’obi nsọgbu;
Ọ bu nri nke onye-agu,
Nenye izu-ike.

Verse 3
Nkume ebe m’wuru ulom,
Otam n’Ebe-ngbabam;
Ulo-Ă kĂąm di mgbe nile,
Juputa n’amara.

Verse 4
Jisus, Eyim, Onye nazum,
Ezem, Ony’ozizim,
Onye-nwem, na Ndum na Uzọm,
Nar’otuto m’ji bia.

Verse 5
Obim jiker’ike adigh,
Echichem jur’oyi;
Ma mgbe m’gahu Gi k’I si di,
Aghaghm itozu Gi.

Verse 6
Ka m’kwusa ihu-n’anya-Gi,
Site n’ikem nile;
K’Aha-Gi nke tọkar’utọ
Nye obim ndu n’ọnwu. Amen.

 

In the Name of Christ Jesus.

Abu 14- N’Aha nke Kraist Jisus

Verse 1
N’Aha nke Kraist Jisus
K’ọra gb’ikpere,
Ire dum kwuputa
Eze nk’otuto;
Ọ nato Nna utọ
K’ayi kpo Y’Onye-nw’ayi,
Onye site na mbu
Bur’Okwu d’ike.

Verse 2
O si n’igwé we bia
K’Ọ we new Aha
N’onu ndi-njọ nile,
Ndi nke Ọ biara.
O bur’Aha ahu
Nke nenwegh ntupo,
Weta Ya na nmeri
N’ilugbu ọnwu.

Verse 3
Umu-nnem, tue Y’aha
Nim’ihu-n’anya,
Ma me ya n’it’egwù,
N’obi di’um’ala;
Ọ b’Onye-nzọputa.
Jisus Onye-nw’ayi;
Ony’ora ganefè,
Nenye nsọpuru.

Verse 4
Me Ya Eze n’obi;
Kwe ka Ọ chupu
Ihe dum nadigh nsọ,
Na ihe b’ugha;
Me Ya Onye-isi
N’oge onwunwa;
K’uche-Ya duz’unu
N’ike na ihè.

Verse 5
Umu-nnem, Jisus a
Gabia kwa ozo,
N’otuto nke Nna-Ya,
N’usu ndi-m’ozi;
Okpu-eze nile
Ha gabu nke-Ya;
Obi-ayi gakpo Ya
Eze nk’otuto. Amen


 

 

Thou art the way, to Thee alone.

Abu 15- Gi bu Uzo–Ọ bu na Gi         

Verse 1
Gi bu Uzo–Ọ bu na Gi
K’ayi nagbanari njọ;
Onye o bula gacho Nna,
Gacho Ya nime Gi.

Verse 2
Gi b’Ezi-okwu–okwu-Gi
Nenye amam-ihe;
Gi nwer’ike inye uche,
Me k’obi di ọcha.

Verse 3
Gi b’ezi Ndu–nbilite-Gi
Nekwusa nmeri-Gi;
Ndi tukwasiri Gi obi
Gbanari onwu.

Verse 4
Gi b’Uzo, Ez’okwu, na Ndu;
K’ayi mar’Uzo ahu,
Jid’Ez’okwu, new Ndu ahu,
N’onu ebigh-ebi. Amen.

Jesus, Thy blood and righteousness.

Abu 16- Jisus, uwem di ebube

Verse 1
Jisus, uwem di ebube
B’ez’omume n’obara-Gi;
Mgbe uwa nile gagb’oku,
Agamanuri kwa onu.

Verse 2
Ndu na onwu enwegh ike
Imebi uw’ebube nkem;
Uwe ọma Jisus nenye
Nadi ohu rue mgbe nile.

Verse 3
Mgbe m’si n’ọnwu, bilie ije
N’ulo omam di n’el’igwé;
Mgb’ahu, ngopum nile gabu:
Jisus di ndu, nwu kwa n’ihim.

Verse 4
N’uboch’ahu m’gagh-at’ujo,
Onye pur’ibom ebubo?
Obara Jisus newepu
Nkocha, n’ihere nke nmehiem.

Verse 5
Ka ndi nwur’anwu nur’olu-I;
Jisus, gwa ndi nke-Gi nuria;
Obara-I n’ezi-omume-I
Bu uwe ebube nke ha.

Verse 6
Chuku nk’ihu-n’anya n’ike,
Kwe k’uwa mara ebere-I;
Ka okwu nke-Gi gbasa kwa,
Meri onwu na oku-mo. Amen.


 

Jesus, who lived above the sky.

Abu 17- Jisus, Onye biri n’igwé

Verse 1
Jisus, Onye biri n’igwé,
Ridatara gho madu, nwua;
Nim’Akwukwo Nsọ k’ayi gahu
Aha madu ọma Ọ bu.

Verse 2
Ọ nejeghari neme nma,
Nemeghe anya ndi-isi;
Ndi nari’oria na ndi-ngwuro
Ọ mekwa aru-ha d’ike.

Verse 3
Nke kari nka Ọ gwara ha
Ihe nke Chineke nacho;
Ọ bu kwa onye-omiko,
Ọ nege nti olu nwata.

Verse 4
Ma Ọ nwuru onwu ojo,
Akpogburu Ya n’osisi;
Aka-Ya Ọ ji neme nma
Ka ha kpogidere n’obe.

Verse 5
Ma Akwukwo Nsọ koro ayi
Ihe kpatara onwu-Ya;
Ọ biara gho madu, ma nwua
K’ewe gbaghara nmehie ayi.

Verse 6
Chuku gaghara ndi nario,
Nachos’ike ipu na njọ;
K’ayi choba iru-Ya ngwa ngwa,
We ket’oke n’ebere-Ya. Amen.

 

I know that my Redeemer lives.

Abu 18- Onye-ngbaputam di kwa ndu

Verse 1
Onye-ngbaputam di kwa ndu;
Okwu nka neny’ezi onu!
Ọ di ndu, Onye nwururi;
Ezem mgb’ebigh-ebi di ndu.

Verse 2
Ọ di ndu k’Ọ nenyem ngọzi,
Nariorom aririo n’elu;
Ọ di ndu, we me ka m’bilie
Ba na nzọput’ebigh-ebi.

Verse 3
Ọ di ndu, Eyim, Ony’oma;
Ọ gedebem rue mgbe onwu;
Ọ di ndu, m’ganuri onu,
Jisus, Ajam na Eze nke.

Verse 4
Ọ di ndu, Ọ gakporom la
Na ebe nke Ọ dozirim;
Ọ di ndu, k’ayi to aha-Ya;
Jisus di ndu mgb’ebigh-ebi. Amen.


 

Hark! The herald angels sing.

Abu 19-Ge nti! Ndi-mozi nabu.

Verse 1

Neto Ez’amur’ohu;

Udo di n’elu uwa,

Chuku na ndi-njo edo!

Nuria onu mba nile,

Oro n’onu nke igwe;

Igwe na ala nasi,

Ta k’amuru Jisus Kraist.

 

Verse 2

Kraist, Onye nd’igwe nja;

Kraist, Eze ebigh-ebi;

Na mgbe nke-Ya k’O biara,

Nwa nke Agbogho din so.

Le, Chuku yiri aru;

To Onye ghoro madu;

O toro Y’igho madu,

Jisus Kraist, Immanuel.

 

Verse 3

Kelenu Eze udo,

Kel’Onye-ez’omume;

Ihe na Ndu k’O ji bia,

Nagwo oria  madu dum.

O rapur’ebube-Ya,

Bia ka madu ghar’inwu,

Ka madu nile bilie,

Ka amukwa ha ohu.

 

Verse 4

Bia, Onye mba dum nacho,

Biri nime ayi nile;

Bilie, Nkpuru nke nwanyi,

Chifia isi nke Agwo.

Hichap’onyinyo Adam,

Tiyechie onyinyo-Gi;

Nye madu dum Onwe-Gi,

Kpua Onwe-Gi n’obi-ayi.

Amen.


 

While shepherds watch.

Abu 20- Mgbe ndi naz’aturu neche

Verse 1
Mgbe ndi naz’aturu neche
Aturu n’abali,
M’ozi we bia guzọ ha nsọ,
Ok’ebube nwuba.

Verse 2
“Atula egwu,” o siri,
Ka egwu natu ha,
“Ozi ọma nk’oke onu
Ka m’nezi unu dum.”.

Verse 3
“Ta, nim’obodo nke Devid,
K’amuru nye unu
Onye-nzọputa nke bu Kraist,
Nka gabu ih’ama: –

Verse 4
Unu gahu Nwa ekere
Nim’akwa-okike,
Dina n’ihe anetiye
Nri nke anu-ulo.”.

Verse 5
Otu a k’o kwuru; le, ha hu
Usu ndi mo-ozi,
Ndi nenye Chinek’otuto;
Ha nabu abu, si: –
Verse 6
“Otutọ diri Chineke
N’ebe kasi elu,
Udo n’uwa nime madu
Rue mgbe ebigh-ebi.” Amen.

 

Christians, awake!

Abu 21- Ndi Kraist, teta, kel’utut’ona nka.

Verse 1
Ndi Kraist, teta, kel’utut’ona nka,
Mgbe amur’Onye-nzọputa nk’uwa;
Bilie, to ihu-n’anya Chineke,
Nke ndi-m’ozi si n’el’igwĂ© neto;
Ha bu uzọ zi ozi om’ahu
Na Nwa Chineke ghoro Nwa madu.

Verse 2
Mgbe ahu ndi neche aturu-ha
Nur’olu otu m’ozi si ha: “Le,
Ewetaram unu ozi ọma
Na amur’unu Onye-nzọputa:
Chineke emezuwo nkwa-Ya ta,
Ta k’amuru Onye-nzọputa, Kraist,”

Verse 3
Ọ kwusia; ma, le, ndi-abu nk’igwĂ©
Ji onu b’abu akanugh na mbu,
Neto ihu-n’anya nke Chineke,
Haleluya-ha juputa igwé;
Otutọ Chineke bu abu-ha,
Udo di n’uwa n’etiti madu.

Verse 4
Ndi-nch’aturu jeer na Betlehem
Ihu ih’ebube Chuku mere;
Ha hu Josef, na Meri di ngọzi,
Na Nwa o muru, bu Onye-nwe-ayi;
Ha we ko akuko ebube nka,
Buru nd’ozi mbu nke Nw’ohu ahu.

Verse 5
Ọ kwesir’ayi, dika ndi-nch’aturu,
Ij’ekele zisa oz’ọma nka;
Soro Jisus, b’Onye-ngbaputa-ayi,
Site n’omumu-Ya rue n’onwu-Ya;
Neso nzo-ukwu-Ya n’ike nke-Ya,
Rue mgbe ayi genwe onodu n’igwĂ©.

Verse 6
Mgb’ahu n’etiti ndi bi n’el’igwĂ©,
Ayi gabu abu onu ngbaputa;
Onye amuru ta geme k’ayi hu
Ebube-Ya gburugburu ayi dum;
Ayi gabu abu mgbe ebigh-ebi,
Neto Eze ndi-m’ozi na madu. Amen.


 

Oh come, all ye faithful, joyful and triumphant.

Abu 22- Bianu, nd’okwukwe.

Verse 1
Bianu, nd’okwukwe,
N’onu nke di Ukwu,
Bianu, bianu, k’ayi je rue Betlehem;
L’Eze ndi-m’ozi,
Nke amuru n’uwa;
Bianu, k’ayi sopuru Ya,
Bianu, k’ayi sopuru Ya,
Bianu, k’ayi sopuru Ya, nu Eze Kraist.

Verse 2
Chuku, Nwa Chuku,
Ihe ebigh-ebi,
Le, Ọ leligh afo nke Nw’agboho;
Ezi Chineke,
Nke anekegh eke;
Bianu, k’ayi sopuru Ya,
Bianu, k’ayi sopuru Ya,
Bianu, k’ayi sopuru Ya, nu Eze Kraist.

Verse 3
Nd’abu ndi-m’ozi,
Buanu n’oke onu,
Buanu, unu ndi nile bi n’igwĂ©;
Otutọ diri
Chineke n’el’igwĂ©;
Bianu, k’ayi sopuru Ya,
Bianu, k’ayi sopuru Ya,
Bianu, k’ayi sopuru Ya, nu Eze Kraist.

Verse 4
Ayi ekele Gi,
Onye amuru ta;
Jisus, Otutọ nile diri Gi;
Okwu Chineke,
Onye ghoro madu;
Bianu, k’ayi sopuru Ya,
Bianu, k’ayi sopuru Ya,
Bianu, k’ayi sopuru Ya, nu Eze Kraist. Amen.

 

Who is He in yonder stall?

Abu 23- Onye no n’ulo anu.

Verse 1
Onye no n’ulo anu,
Ndi-nche nada n’ukwu-Ya?

Kọrọs:-
Nuru akuko ebube!
Ọ bu Jisus, Ez’otuto!
Ayi gada n’ukwu nke-Ya,
Me Ya Eze, Ez’ora.

Verse 2
Onye no nim’ahuhu,
Nebu onu nim’ohia?

Verse 3
Onye k’ora nagozi,
N’ihi okwu ọma-Ya?

Verse 4
Onye ka ha kutere
Nd’oria na ndi ner’uju?

Verse 5
Onye guzọ nakw’akwa
Na nsọ ili Lazarus?

Verse 6
Onye k’ora nekele,
Neto Ya n’abu onu?

Verse 7
Onye nekpere Chuku
N’ogige Getsemani?

Verse 8
Onye no n’elu obe
Nanwu n’ok’ihe-nwuta?

Verse 9
Onye si nime ili
Puta k’Ọ nyer’ayi aka?

Verse 10
Onye no n’och’eze-Ya,
Buru Eze uwa dum? Amen.


 

 

As with the gladness men of old.

Abu 24- Dika nd’ochie ji onu

Verse 1
Dika nd’ochie ji onu
Hu kpakpando duru ha;
Wer’onu so ihe-ya,
Nk’o ji nedu ha n’uzọ;
Kwe, nn’ayi, ka esi otu a
Duru ayi biakute Gi.

Verse 2
Otu ha ji onu ga
We rue n’ebe Jisus no;
Gbue ikpere n’iru Ya,
Ony’igwĂ© n’uwa neto;
Otu a me ka ukwu-ayi
Ga rue och’ebere-Gi.

Verse 3
Otu ha nyer’onyinye
Nke di ok’onu-ahia;
Otu a k’ayi were onu,
Nke njọ n’aghugho nadigh,
Weta aku-ayi nile,
Nye Gi, kraist, Eze nke-ayi.

Verse 4
Jisus di nsọ, kw’ubọchi
Deb’ayi n’uzọ nkpagide;
Mgbe ihe uwa gafe,
kpobat’obi-ayi n’ebe
Kpakpando agagh-edu,
Eb’ebube-Gi nenwu.

Verse 5
N’obodo omank’igwĂ©
ha achogh ihe nk’uwa;
Gi b’ihe na Ọnu-ya,
Gi Anwu namu mgbe dum;
N’eb’ahu ayi ganabu,
Neto Ez’ayi mgbe nile. Amen.

 

 

Still the night, holy the night.

Abu 25- Abali nsọ, nke di kwa ju.

Verse 1
Abali nsọ, nke di kwa ju!
Mgbe uwa no n’ura,
Meri na Josef no n’ulo anu
Neche Nwa olu nk’ahuru n’anya,
No n’ura udo igwĂ©,
No n’ura udo igwĂ©.

Verse 2
Abali nsọ, nke di kwa ju!
Ndi nazu aturu-ha
Huru ihe-ọma n’igwĂ©,
Nu Ka ndi-m’ozi nabu, si:-
“Onye-ngbaputa biara!
Onye ngbaputa biara!”

Verse 3
Abali nsọ, nke di kwa ju!
Nwa Chineke ọma,
Iru-Gi negos’ihu-n’anya!
Nye ayi amara n’oge d’ugbu a,
Gi Onye-nzọputa,
Gi Onye-nzọputa. Amen.

 

Angels from the realms of glory

Abu 26- Unu ndi-m’ozi nke igwĂ©

Verse 1
Unu ndi-m’ozi nke igwĂ©,
Fesanu n’uwa nile;
Ndi kor’akuko okike,
Kwusanu omumu Kraist:
Bianu, kele
Eze amuru ohu.

Verse 2
Ndi-nche-aturu no n’ohia,
Nech’aturu n’abali;
Chineke nonyere madu,
Ihe Nwa ohu nenwu:
Bianu, kele
Eze amuru ohu.

Verse 3
Ndi-amam-ihe bilienu,
Ihe nenwu n’ir’unu;
Chonu Onye mba-dum-nacho,
Lenu kpakpando ahu:
Bianu, kele
Eze amuru ohu.

Verse 4
Ndi nsọ neche n’iru Chuku
N’olile-anya n’egwu;
Na mberede Jisus abia,
Agahu Ya n’ulo-Ya;
Bianu, kele
Eze amuru ohu. Amen.


 

 

Thou didst leave Thy throne.

Abu 27- Gi rar’och’eze-I na okpu-eze-I.

Verse
Gi rar’och’eze-I na okpu-eze-I
K’I biara n’uwa nka n’ihim;
Ma o digh ulo din a Betlehem
Ebe agamu Gi, Jisus!
Onodu diri Gi n’obim.

Verse 2
igwĂ© dar’uda n’olu ndi-m’ozi
Nekwusa na Gi bu Eze;
Ma nwany’ogbenye muru Gi n’uwa,
N’onodu d’ala k’I biara.
Biko, bia nim’obim, Jisus!
Onodu diri Giri n’oim.

Verse 3
Anu nez’ike, nnunu nwe akwu
Nan ndo osisi ok’ohia;
M’ala b’ihe-ndina-Gi, Nwa Chuku,
N’ozara din a Galili.
Biko, bia nim’obim, Jisus!
Onodu diri Gi n’obim.

Verse 4
Gi Onye-nwe-ayi, ji Okwu ndu dia,
NMke gazọputa umu-Gi;
Ma n’ikwa-emo na okpu ogwu
K’eji duga I na Kalvari.
Biko bia nim’obim, Jisus!
Onwu-Gi bu kwa nzọputa.

Verse 5
Mgb’igwĂ© dar’uda, ma nd’abu-ya bua
N’obibia nke-Gi na nmeri,
K’olu-Gi kpom si “Onodu di kwa-
Onodu dir ii n’akukum.”
Ọṅu geju obim, Jisus,
Mgbe I gabia ikporom la. Amen.

Joy fills our in most heart to-day

Abu 28- Inu juru obi-ayi ta.

Verse 1
Inu juru obi-ayi ta;
Amuru Nwa Eze:
Usu ndi-m’ozi naáą…uri
N’ih’obibia-Ya ta.

Kọrọs:-
Nuria onu! Nwa Chineke
Biara ibi n’uwa;
Ọ digh aha tokari nka:-
Immanuel.

Verse 2
Ayi negbu ikpere nye Ya,
Neto, nasopuru,
Mgbe ayi huru Gi n’aka nne-I,
Gi nwa nke Chineke.

Verse 3
Gi Ihe anekegh eke,
Mukwasi’ayi, Nwa di nsọ;
K’ayi deb’ubọchi-omumu-I,
Nete I n’obi-ọcha. Amen.


 

 

Once in royal Davd’s city.

Abu 29 -Otu mgbe n’obodo Devid.

Verse 1
Otu mgbe n’obodo Devid
Otu ulo anu di,
Eb’otu Nwanyi nyibere
Nwa-ya o muru ohu;
Meri bu nne om’ahu,
Jisus Kraist bu Nwa nke-ya.

Verse 2
Ọ si n’igwĂ© rida n’uwa,
Onye bu Chineke-ayi;
Ulo anu zere Ya ndu,
Ọ dina n’ebe ahu;
Nd’ogbenye ndi di ala
Ka Jisus-ayi binyere.

Verse 3
Mgbe nile Ọ dina nwata
Ọ ji nsọpuru nanu
Okwu nwanyi nke muru Ya,
Nke kuru Ya n’aka-ya;
Umu-nta Jisus geme
Ez’omume dika Ya.

Verse 4
Ya bu Onye ayi genomi,
Ọ tutọ dik’ayi si eto,
Ọ dichasi otu ayi di,
Ọ mara akwa n’ochi;
Nwuta-ayi newuta Ya,
Ọṅu-ayi bu kwa nke-Ya.

Verse 5
M’emesia any’ayi gahu Ya,
Site n’ihu-n’anya-Ya;
N’ihi na Nwata ọma nka
Bu Eze-ayi n’el’igwĂ©;
Ọ nedu umu nke-Ya
We rue n’eb’ahu Ọ no. Amen.

 

 

Good Christian men, rejoice.

Abu 30 -Ezi ndi Kraist, nuria.

Verse 1
Ezi ndi Kraist, nuria
N’olu na nkpur’obi!
Ge nti n’ihe ayi nekwu:
Ozi!
Ta k’amuru Jisus Kraist,
An’ulo da n’ukwu-Ya.
Ọ no n’ulo-anu ugbu a:
Ta k’amuru Kraist.

Verse 2
Ezi ndi Kraist, nuria
N’olu na nkpur’obi! Akuk’onu mgbe nile:
ọṅu!
Ya mere ka Kraist ji bia:
Ọ meghew’uzọ igwĂ©,
Madu b’onye agoziri:
Ya mor’Ọ ji bia.

Verse 3
Ezi ndi Kraist, nuria
N’olu na nkpur’obi!
Uj’onwu adigh ozo:
Udo!
Jisus Kraist biar’izota,
Nakpo ayi n’otu n’otu
Ir’ulo ebigh-ebi-Ya:
Ọ biar’izota. Amen.


 

When I survey the wondrous cross.

Abu 31- Mgbe m’nele anya n’osisi.

Verse 1
Mgbe m’nele anya n’osisi
Ebe Eze nke ndu nwuru,
Uru akum na nganga nkem,
Agurum ha n’ihe-efu.

Verse 2
Chuku, ekwelam nya isi
M’obugh n’onwu Kraist, Onye-nwem;
Ih’efu nke natom utọ,
Arapuwom ha n’ihi Ya.

Verse 3
Le, site n’aru-Ya nile
Ihu-n’anya nerudata;
Ọ di mgbe eji ogwu me
Okpu-eze di nma otu a?

Verse 4
Ma uwa nile buru nkem,
Ọ zugh inye Ya onyinye;
Ihu-n’anya d’ukwu otu a
Kwesiri inwe ndum nile. Amen.

 

There is a green hill far away.

Abu 32- Ugwu di n’ebe di anya.

Verse 1
Ugwu di n’ebe di anya,
N’azu ot’obodo,
Ebe akpogburu Jisus,
Nke nwuru n’iayi.

Verse 2
Ayi apugh iko akuku
Ihe-nwuta nke-Ya;
Ayi kwere n’o bu n’ihi ayi
K’Ọ huru ahuhu.

Verse 3
Ọ nwuru k’agbahara ayi,
K’ayi we gho ndi ọma,
K’ayi la n’igwĂ© n’ikpe-azu,
N’ike obara-Ya.

Verse 4
Ọ digh onhye ozoz puru
Ikwu ugwo nke njọ;
Nani Ya pur’imegh’uzọ
Nke igwĂ©, k’ayi bata.

Verse 5
Ọ huru ayi n’anya nk’ukwu;
Ayi gahu-kwa-ra Ya,
Tukwas’obi n’obara-Ya,
Nalu olu nke-Ya. Amen.


 

 

We sing the praise of Him who died.

Abu 33- Ayi neto Onye nke nwuru

Verse 1
Ayi neto Onye nke nwuru
N’el’obe n’ihi ndi-nmehie:
Madu nakwa Jisus emo:
N’ihi nka ayi aju uwa.

Verse 2
Onwu-Ya n’obe nezi ayi
K’ihu-n’anya Chineke ra:
Ọ buru njọ-ayi n’osisi,
Ọ wedatar’ayi ebere.

Verse 3
Onwu-Ya nebupu nmehie,
Ọ netinye ndu n’obi-ayi;
Ọ nenye olili-anya,
Ọ neme k’ilu di utọ.

Verse 4
Ọ newepu ujo n’obi,
Nagba ndi nadigh ik’ume;
Ọ nachupu egwu ili,
Nye ihe n’ubọchi onwu.

Verse 5
Kraist, Onye j’ahuhu d’ilu
Wetara ndi-njọ amara,
Ka ndi nil’agbaputara
Neto Gi rue mgb’ebigh-ebi. Amen

Rock of Ages, cleft for me.

Abu 34- Nkume mgbe ebigh-ebi.

Verse 1
Nkume mgbe ebigh-ebi,
Kwe ka m’zoro nime Gi;
Ka miri na obara
Nke si n’akuku-I puta,
Buru ih’isacha njom,
Nzọputam n’ike nke-ya.

Verse 2
Ọ bugh olu nke akam
Gemezu iwu nke-Gi;
M’jisiwo’ike mgbe dum,
Nakwa kw’akwa mgbe nile,
H’apugh iwepu nmehiem:
Nani Gi gazọputam.

Verse 3
Agbam aka biakute I,
Amakurum obe-Gi;
Agbam oto nim’obim,
Nyem uwe, nyerem aka;
Abiam n’is’iyi n’inyi;
Onye-nzpoutam, sacham.

Verse 4
Ebe m’nek’ume ndu nka,
Mgbe m’echir’anyam n’onwu,
Mgbe m’gala n’uwa ozo,
Hu Gi n’oche-ikpe-Gi,
Nkume nke ebigh-ebi,
Kwe ka m’zoro nime Gi. Amen.

 

 

I gave my life for thee.

Abu 35- Anwurum n’ihi gi.

Verse 1
Anwurum n’ihi gi,
We wusi obaram,
K’ewe gbaputa gi,
K’i ba na ndu ohu.
Anwurum n’ihi gi;
Gini ka gi merem?

Verse 2
Ejim otut’aro,
N’ik’ogwugwu n’akwa,
Ime ka gi we nwe
Onu ebigh-ebi.
Enyerem arom dum;
Ole ka gi nyerem?

Verse 3
Ulo ihe nke Nnam,
Och’ezem mara nma,
Ka M’rap’ru bia n’uwa
Ino n’ihe-nwuta.
M’rapuru ha n’ih’i;
Gini k’i rapura?

Verse 4
Ahuhu M’huru gi,
Ibu-obi d’ilu,
Ha nanaputa gi
N’onwu ebigh-ebi.
Ahuhu ka M’huru i;
I gahuum gini?

Verse 5
Ewetaram nye gi,
Site n’ulom n’igwĂ©,
Nzọputa na udo,
Na ihu-n’anya nkem.
Akum ka M’wetara i;
I wetaram gini?

Verse 6
Onye-nwem, ka m’nye ndum,
Ka m’nye arom nile/;
Ka m’opu agb’uwa
N’ihi Gi, Chinekem.
Gi nyerem Onwe-Gi;
Le, enyem I onwem. Amen.


 

Hark! the voice of love and mercy.

Abu 36- Ge nti! olu ihu-n’anya.

Verse 1
Ge nti! olu ihu-n’anya
Nke nada na Kalvari;
Le, o nagbawa kwa nkume,
Kwaghar’uwa, kpuch’igwĂ©;
“Ọ gwusiwo,”
Nur’olu’Onye-nzọputa.

Verse 2
“Ọ gwusiwo.” Le, ob’utọ
Okw’ebube ndia nyere!
Ngozi igwé nenwegh atu
Si na Kraist nerudata.
“Ọ gwusiwo,”
Ka ndi-Ya chet’okwu nka.

Verse 3
“Ọ gwusiwo,” onyinyo dum
Bu nk’iwu mgb’ochie nwere;
Emezuwo nkwa Chineke;
Onw’apugh iy’egw’ozo.
“Ọ gwusiwo,”
Nsi-Ya nwe nkasi-obi.

Verse 4
Ndi-m’ozi, chir’ubo-unu,
Tob’aha Immanuel.
ndi bi n’uwa, ndi bi n’igwĂ©,
Sorornu n’abu nmeri.
Haleluya!
To Nw’aturu Chineke. Amen.

 

Not all the blood of beasts.

Abu 37- Obara anu dum

Verse 1
Obara anu dum,
Ndi-Ju ji chu aja,
Emegh k’obi ojo di nma,
Ma sachapu njọ-ya.

Verse 2
Kraist, Nw’aturu igwĂ©,
Nebupu nmehie-ayi;
Ya bu aja di ok’onu
Kari aja nile.

Verse 3
Okwukwem getinye
Aka-ya n’isi-Gi,
Ka m’neguzọ ikwuputa
Ih’ojo dum m’mere.

Verse 4
Nkpur’obim necheta
Ibu nke I buru,
K’akpogidere Gi n’obe,
Na njọ-ya di n’isi-I.

Verse 5
Ayi kwere, we nuria
N’ebupuru njọ-ayi;
K’ayi gozie Nw’aturu Chuku,
To ihu-n’anya-Ya. Amen.

 

Redemption! Ọ wonderful story.

Abu 38- Ge nti! akuko di ebube.

Verse 1
Ge nti! akuko di ebube!
Ozi’ọma n’ihi mu na gi:
Na Jisus wetar’ayi ngbahara,
Ọ kwusia ugwo-ayi n’obe.

Kọrọs:-
Kwere ya, ony’ojo, kwere Ya;
Nara ozi onu ahu;
Tukwasi obi-gi na Jisus,
Nzọputa k’Ọ nenye gi ta.

Verse 2
Ọ zọput’ayi n’onwu k’ayi di ndu,
Ọ me k’ayi gho umu Chuku;
Otu nsacha di n’ihi ndi-njọ:
Nsacha n’obara nke Jisus.

Verse 3
njọ agagh-enwe ike ozo,
Ọ bu ezie n’o ganwa gi;
N’ihi na Kraist, site n’onwu-Ya,
Gemeb’ike nile nke njọ.

Verse 4
Ugbu a nara ebere Chuku,
Gba oso jeku Jisus ta;
Ọ gakpobata onye biara,
Ọ digh onye Ọ gachupu. Amen.


 

There is life for a look at the crucified One.

Abu 39- Ndu di n’ih’ile Ony’akpogburu anya.

Verse 1
Ndu di n’ih’ile Ony’akpogburu anya,
Ndu diri gi na mgbe di ugbu a;
Le Y’anya, onye-njọ, k’Ọ we zọputa gi,
Ya bu Ony’egburu n’osisi.

Kọrọs:-
Le! le! k’i di ndu!
Ndu di n’ih’ile Ony’akpogburu
anya,
Ndu diri gi na mgbe di ugbu a.

Verse 2
Gini k’Ọ ji no ka Onye nebupu njọ,
M’o buru na ebogh Jisus njọ-i?
Obar’isacha njọ neru n’aru-Yanya,
Ma onwu-Ya akwugh ugw-gi?

Verse 3
Ọ bugh anya-miri-i m’obu ekpere-gi,
Ọ b’obara nekpuchi nmehie-i;
Ngwa biakute Jisus Onye nebu njọ-gi,
Wusi-kwa-ra gi obara-Ya.

Verse 4
Enwela ob’abua, n’ihi na Chineke si
N’o digh ihe fọduru ime;
Na Ọ biara otu ugbo na uwa nka,
Lusia olu Ọ malitere.

Verse 5
Ngwa, were onu nara Jisus ososo,
Ndu ebigh-ebi Ọ nenye gi;
Mara na nkpuru-obi-gi apugh inwu,
N’ihi na Jisus di mgbe nile. Amen.

 

The love that Jesus had for me.

Abu 40- Ihu-n’anya Jisus jirim.

Verse 1
Ihu-n’anya Jisus jirim,
N’ihu ahuhu n’osisi,
K’Ọ buru Onye-ngbaputam,
Madu apugh iko!

Kọrọs:-
Ihu-n’anya di ebube!
Ihu-n’anya di ebube!
Ihu-n’anya Jisus jirim,
Madu apugh iko!

Verse 2
Ọ bur’ibu-obi d’ilu,
Le, okpu ogwu Ọ kpuru,
Ka m’we di kwa ndu mgbe nile,
Madu apugh iko!

Verse 3
Udo m’nwere nim’Onye-nwem,
Onye nario n’iru Chuku,
Olu obara-Ya luru,
Madu apugh iko!

Verse 4
Onu Ọ wetara ndi-Ya,
Iz’ike ayi nenwe na Ya,
Na ezi olile-anya,
Madu apugh iko! Amen.


 

Ride on, ride on in majesty!

Abu 41- Naga! naga dika Eze!

Verse 1
Naga! naga dika Eze!
“Hosanna!” k’ebo dum neti;
Onye-nzota, so uzọ-Gi
Nk’atusar’igu-nkwu n’uwe.

Verse 2
Naga! naga dika Eze!
N’idi-nwayọ ga n’onwu-Gi;
Kraist, nmeri-Gi namalite
N’elu onwu na nmehie dum.

Verse 3
Naga! naga dika Eze!
Usu ndi-m’ozi n’el’igwĂ©
Wer’anya-nwuta lekwasi
Aja ahu nke agachu.

Verse 4
Naga! naga dika Eze!
Ogu-Gi nk’ikp’azu di nsọ;
Nna, n’och’eze-Ya, nechere
Ọkpara etere manu.

Verse 5
Naga! naga dika Eze!
N’idi-nwayọ ga n’onwu-Gi;
Ruber’ihe-ngb’uwa isi-I,
Wer’ike-Gi, Kraist, bur’Eze! Amen.

 

Christ the Lord is risen today.

Abu 42- Kraist Ez’ayi biliri ta.

Verse 1
Kraist Ez’ayi biliri ta:
Haleluya!
Ka madu na m’ozi si:
Haleluya!
Kwesienu abu ike:
Haleluya!
igwé na ala, kwenu.
Haleluya!

Verse 2
Ọ lusiwo olu-Ya;
Haleluya!
Ọ luwo ogu, merie;
Haleluya!
Anwu nk’ezi-omume;
Haleluya!
Ọ gagh-anwu kwa ozo.
Haleluya!

Verse 3
Ndi-nche neche nche n’efu;
Haleluya!
Kraist etiw’uzọ ili;
Haleluya!
Onwu ejidegh kwa Ya!
Haleluya!
Kraist emeghewo igwé.
Haleluya!

Verse 4
Eze-ayi di ndu ozo;
Haleluya!
Onwu, ole ike-gi?
Haleluya!
Ọ nwuru, k’ayi we di ndu;
Haleluya!
IIi, ole nmeri-gi?
Haleluya!

Verse 5
K’ayi rigokuru Ez’ayi,
Haleluya!
Neso Ya, bu Isi-ayi;
Haleluya!
Ayi geyi Ya, we bilie;
Haleluya!
Nadi ndu nmeri nk’obe.
Haleluya!

Verse 6
To Eze igwĂ© n’uwa,
Haleluya!
K’ihe nile neto Gi;
Haleluya!
Onye-nmeri, ayi neto I,
Haleluya!
To Gi, Nbilite-n’onwu.
Haleluya! Amen.


Jesus Christ is risen to-day.

Abu 43- Ta Ka Jisus biliri.

Verse 1
Ta Ka Jisus biliri, Haleluya!
Ya mere ayi nan’onu Haleluya!
Ọ nwuru n’elu obe, Haleluya!
K’Ọ we gbaput’ayi n’oru. Haleluya!

Verse 2
K’ayi wer’abu tobe Ya, Haleluya!
To Kraist Eze nke igwé; Haleluya!
Ọ nagider’onw’obe, Haleluya!
K’Ọ zọputa ndi-nmehie. Haleluya!

Verse 3
Nhuj’anya Ọ hujuru, Haleluya!
Ka Ọ ji natar’ayi ndu; Haleluya!
Ọ b’Eze n’igwĂ© ugbu a, Haleluya!
Ebe ndi-m’ozi nabu Haleluya!

Verse 4
To Ọkpara biliri; Haleluya!
To Nna-Ya, bu Chineke; Haleluya!
To Mọ Nsọ nke di ngọzi; Haleluya!
K’ora nile naza, si. Haleluya!

 

 

The strife is o’er, the battle done.

Abu 44- Okwu agwu; ogu ebie.

Verse 1
Haleluya! Haleluya! Haleluya!
Okwu agwu; ogu ebie:
Jisus emeriwo onwu;
Bubanu abu ok’onu:
Haleluya!

Verse 2
Onwu mere k’ike-ya ra,
Ma Kraist lugburu ya n’ogu;
K’ayi tisie nkpu onu ike:
Haleluya!

Verse 3
Uboch’ato gabigara,
Ọ si n’onwu bilie, din du;
Otutọ nile diri Kraist!
Haleluya!

Verse 4
Ọ kujiri nkporo onwu;
Ọ kwaghe uzọ el’igwĂ©;
K’ayi buara Ya abu nmeri:
Haleluya!

Verse 5
Jisus, site n’onwu nke-Gi,
zọputa ayi n’egwu onwu,
K’ayi di ndu, nabuku I abu:
Haleluya!

 

Jesus lives! Thy terrors now.

Abu 45- Jisus di ndu! gi, onwu.

Verse 1
Jisus di ndu! gi, onwu,
I pugh ime k’ayi tua egwu;
Jisus di ndu! gi ill,
I pugh ime k’ayi bur’oru.
Haleluya!

Verse 2
Jisus di ndu! rue ugbu a
Onwu bu on’uzọ nke ndu;
Nka gewepu egwu-ayi
Mgb’ayi gagabiga uzọ-ya.
Haleluya!

Verse 3
Jisus di ndu! Ọ nwur’ayi:
K’ayi diri nani Jisus ndu;
K’ayi biri n’obi ọcha,
Neto Onye-nzọputa-ayi.
Haleluya!

Verse 4
Jisus di ndu! ayi mara
Ọ digh ihe gekewp’ayi;
Ndu, Onwu na Ekwensu,
H’apugh inap’ayi n’aka -Ya.
Haleluya!

Verse 5
Jisus di ndu! ewere
Oche-eze nile nye Ya;
Ayi pur’iru eb’Ọ no,
So Ya buru eze n’igwĂ©.
Haleluya! Amen.


 

Welcome, happy morning.

Abu 46- “Utu’on’ekele!” ogbo nile si.

Verse 1
“Utu’on’ekele!” ogbo nile si;
Emeriwo onwu, emegh’igwĂ© ta.
Onye nwuru di ndu, Ez’ebigh-ebi!
Ihe dum ekere to Ony’okike!

Kọrọs:-
“Utut’on’ekele! “ogbo nile si;
Emeriwo onwu, emegh’igwĂ© ta.

Verse 2
Uwa, nekwuputa olu Eze-ayi,
Na onyiny’ọma nile Ọ nyere ayi;
Ohia na ozara nekwuputa, si
N’ahuhu-ya ebie, Ọ meriw’onwu.

Verse 3
Onye-ngbaputa-ayi, Onye nenye ndu,
Gi si n’igwĂ© leta madu dar’ada;
Otu Ọkpara-Nna, Onye b’Ez’okwu,
Onye ghoro madu k’Ọ we zọput’ayi.

Verse 4
Gi, Onye b’isi-ndu, I nwu-kwa-r’anwu,
Zor’uz’ochichiri, gosi kwa ike;
Bia, Gi Ezi-okwu, mezue okwu-Gi;
Ta b’ubọchi ato-I; bilie, Onye-nwe’ayi!

Verse 5
Topu obi ndi Ekwensu ker’agbu;
Ndi nile dar’ada nye ha ndu ohu!
Gos’iru-ọma-Gi, ka mba nile hu;
Weghachi kwa ihe: ihe nk’okwu-Gi. Amen.

 

Christ the Lord is risen again!

Abu 47 -Haleluya, Ọ biliwo!

Verse 1
Haleluya, Ọ biliwo!
Jisus arigo n’elu!
Tikpo kwa ike nke onwu;
M’ozi buanu, madu za:
Ọ biliwo, Ọ biliwo,
Di ndu, Ọ pugh inw’ozo.

Verse 2
Haleluya, Ọ biliwo!
Onye-isi-ayi ukwu
Zite Mọ Nsọ, Onye-ama,
Bu Onu-nekwuru-ayi.
Ọ biliwo, Ọ biliwwo!
Ikpe amagh ayi ozo.

Verse
Haleluya, Ọ biliwo!
Onwu enwegh ik’ozo;
Kraist, bu kwa Nbilite-n’onwu,
Gakpote ndi-Ya n’ili.
Ọ biliwo, Ọ biliwo,
Ọ di ndu, Eze nabia. Amen.

 

Halelujah! Halelujah!

Abu 48- Haleluya! Haleluya!

Verse 1
Haleluya! Haleluya!
K’obi n’olu-ayi neto,
Nabuku Chuku ab’onu,
Nabu abu otuto.

Onye nwuru n’elu obe
N’ihi nzọputa nke-ayi,
Jisus Kraist, Eze otuto,
Si n’onwu bilie ozo.

Verse 2
Ugbu a etiwawo ili,
Kraist si n’onwu ban a ndu,
Ndu ebube nk’ebigh-ebi,
N’ututu ubọchi ta;

Ayi gesoro Kraist we meri,
Site na ike nke-Ya;
So Ya ban a nd’ebigh-ebi,
Site na Nbilite-Ya.

Verse 3
Kraist, Onye bu Nkpuru nke mbu
Mus’ayi amara nk’igwĂ©,
Ihu-n’anya ika ihe
Si n’iru Ya nenwupu:

K’ayi d’obi-ayi n’elu igwĂ©,
Namiri Gi nkpur-ọma,
Nke genye Gi otuto rue
Mgbe ayi gahu iru-Gi.

Verse 4
Haleluya! Haleluya!
Otutọ diri Chuku,
Diri Nna, n’Onye-nzọputa
Kraist, bu Onye nwe nmeri;

Otutọ di-kwa-ra Mọ Nsọ,
Is’iyi nk’ihu-n’anya;
Haleluya! Haleluya!
Diri Atọ nim’Otu. Amen.


 

The promise is fulfilled.

Abu 49- Eme nkwa ekwere.

Verse 1
Eme nkwa ekwere,
Olu nzọput’agwu;
Ikpe n’ebere di n’otu,
Nna, akpote Nwa-Ya.

Verse 2
Obim, tobe Jisus,
Onye kpogburu njọ-i;
Onye nwur’anwu di kwa ndu,
Ọ gagh’anwu ozo.

Verse 3
Onwu-Ya g’enye i ndu,
Nbilite-Ya bu nke-i;
Kwe Chineke gasacha i
Nim’obara Jisus. Amen.


 

Low in the grave He lay.

Abu 50- Ọ togboro n’ili.

Verse 1
Ọ togboro n’ili-
Onye-nzọputam!
Nech’ubọchi ahu-
Jisus Ezem!

Kọrọs:-
Ọ siwo n’ili bilie,
Ọ meriwo ndi-iro-Ya;
Onye-nmeri nke ike ochichiri,
Ya na ndi nsọ-Ya gachi ebigh-ebi;
Ọ bilie, Ọ bilie,
Haleluya! Ọ bilie!

Verse 2
Ha nech’Ozu-I n’efu-
Onye-nzọputam!
Mech’ili-Gi n’efu-
Jisus Ezem!

Verse 3
Onwu ejidegh Gi-
Onye-nzọputam!
I tiw’ogba ili-
Jisus Ezem! Amen.


9 thoughts on “Abu Anglican Communion (Church Hymnal) 1 – 50

  1. Pingback: - 9JAINFORMED.COM

Comments are closed.